Onye bụ Diana London nwada America gbara Tinubu ajụjụ mere ndị Nigeria ji kpụrụ ya n'ọnụ?

Ebe foto si, Diana London/X
Aha otu nwaada mba America bụ Diana London na-ewu ugbua na Soshal Midia Nigeria dịka ya na Onyeisiala Bola Tinubu nwechara mkparịtaụka.
Nwaada London depụtara maka mkparịtaụka ahụ ya na Onyeisiala Tinubu nwere n'akara X ya, ma too Tinubu maka etu ya na Onyeisiala mba America bụ Donald Trump si arụkọ ọrụ ọnụ iji kpochapụ enweghị nchekwa na Nigeria.
"Nke ka mma ka dị n'ihu. Nigeria enyi kacha mkpa America nwere n'Africa," London dere.
Mana n'ụbọchị Wenezde, nwaada a hichapụrụ ihe ahụ o deburu na X gbasara mkparịtaụka ya na Onyeisiala Tinubu. Nke a mere dịka ọtụtụ ụmụ Nigeria katọrọ ya bụ mkparịtaụka.
Akụkọ kwukwara na a kwụrụ London nde dọla anọ na ọkara maka ya bụ mkparịtaụka ya na Tinubu nwere, mana o depụtara na X na akụkọ ahụ bụ asị.
"Agara m Nigeria ka mụ na Onyeisiala Tinubu nwee mkparịtaụka maka akụkọ anyị chọrọ iwepụta, nakwa ka m hụụ Nigeria n'onwe m. Akụkọ ụgha a bụ naanị mkpọtụ, mana ọ gaghị agbanwe ihe mere eme maọbụ kwụsị m ikwu eziokwu," London dere.
Onye bụ Diana London

Ebe foto si, Diana London?X
Nwaada Diana London bụ onye mba America na-arụ ọrụ na ngalaba mgbasaozi.
Ọ bụ onyeisi ụlọọrụ a kpọrọ London Global Strategies nke o hibere n'afọ 2024, bụ nke ọrụ ha bụ igbasa ozi maka ụlọọrụ maọbụ onye ọbụla chọrọ ka ọha mata akụkọ ọma gbasara ha.
Ọrụ ha gụnyekwara ijikwa mgbasaozi maka ụlọọrụ chọrọ ibelata nsogbu ha nọ na ya, nke bekee na-akpọ 'crisis communication'.
London nwekwara ngalaba ọ na-ahazi n'ụlọọrụ mgbasaozi Newsmax nke a kpọrọ 'The Dispatch with Diana London', bụ ebe ya na ndị otu ya na-atule atụmatụ gọọmentị dị icheiche na mba America.
Nwaada a bụ onye nkwado Onyeisiala America Donald Trump nakwa otu ndọrọndọrọ ya bụ 'Republican'.
London ruburu ọrụ n'ụlọomeiwu mba America bụ 'Capitol Hill'; dịka onye enyemaka nye omeiwu Matt Gaetz nke steeti Florida malite n'ọnwa Eprel ruo Septemba afọ 2019, nakwa dịka odeakwụkwọ mgbasaozi nye omeiwu Lloyd Smucker nke steeti Pennsylvania malite n'ọnwa August 2019 ruo Febrụwarị 2020.
Ụlọọrụ Newsmax kọwakwara Diana London dịka osote onyeisi n'ụlọọrụ X Capital Investments' nakwa onyeisi n'ụlọọrụ a kpọrọ 'The Secret Weapon Agency' nke ọrụ ha bụ ijikwa mgbasaozi ọha ọ kachasị n'oge nsogbu.
Diana London kwukwara na ya na ụlọọrụ a kpọrọ DCI Group na-arụkọkwa ọrụ iwulite mmekọrịta n'etiti gọọmentị Nigeria na nke mba America iji buso ndị oyi ndụ egwu.

Ebe foto si, Diana London/X
Mmekọrịta a malitere dịka gọọmentị Donald Trump kpọpụtara aha Nigeria dịka mba ebe a na-akpagbu ma na-egbu ndị ụka Christ nke ukwuu.
N'ọnwa May afọ a, London depụtara n'akara X ya etu ya na otu onyeisi ụlọọrụ DCI si hazie ọgbakọ n'etiti osote onyeisiala America bu JD Vance, odeakwụkwọ mba ahụ bụ Marco Rubio na Nuhu Ribadu bụ onye ndụmọdụ nchekwa nye onyeisiala Nigeria, gbasara iwulite nchekwa na azụmahịa n'etiti mba abụọ a.
Mana n'aka nke ọzọ, ụfọdụ akụkọ kwuru na nwaada bụ Diana London, n'afọ 2018, kwetara na ya zuru ihe ruru puku dọla 30 nke ụlọọrụ ebe ọ rụburu n'afọ 2017.
Akụkọ ahụ kwuru na London kwetara ebubo a n'ụoikpe iji gbanahụ ịga mkpọrọ, ma kwetakwa na ya ga-akwụghachi puku dọla 25, dịka ọ kọwara na ya achọpụtaghị na mmefu ego nke ya na-agara ụlọọrụ ahụ.
Ka ọ dị ugbua gọọmentị Nigeria ekwubeghị ihe ọbụla gbasara akụkọ a na-ewu na soshal midia.
BBC News Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru onyeisiala Bola Tinubu bụ Bayo Onanuga mana ọ zaghị ekwentị ya, ọ zaghachibekwaghị ajụjụ anyị zigaara ya.


























