Ihe na-atụ anya ka ndịomeiwu America na-enyocha mbọ Nigeria na-agba ịkwụsị ogbugbu ndị ụka Kraịst

Chris Smith bụ onye omeiwu na mba America.
Nkọwa foto, Chris Smith
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dịka ndịomeiwu mba America ngalaba a na-akpọ 'House Foreign Affairs Africa Subcommittee' hiwere ọgbakọ nnyocha ihe Gọọmenti Nigeria na-eme banyere ebubo mkpagbu na ogbugbu ndị ụka Kraịst, ọnọdụ nchekwa na mpaghara Middle Belt, Nigeria, ọtụtụ na-ajụ kedụ ka nke a si gbasa Nigeria?

Mana n'ozi Chris Smith bụ onye omeiwu mba America wepụtara ka o kwuru na ha ga-enyocha mbọ gọọmenti Nigeria na-agba kemgbe otu afọ ịkwụsị mkpagbu ndị uka Kraịst, mwakpo ndịagha nnupụisi Boko Haram na-eme, nakwa ọnọdụ enweghị ezi nchekwa na mpaghara Middle Belt, Nigeria.

Chris kwuru na ndị nnyocha ahụ ga-atụle ihe gọọmenti Nigeria megoro kemgbe otu afọ gara aga dịka ijide ndị ojiegbe maọbụ ndị omekome na-awakpo ndị ụka Kraịst ma kpụpọ ha n'ụlọikpe.

Ọzọ bụ na ha ga-atụle ihe niile mba America megoro iji nyere Gọọmenti Nigeria aka ịkwụsị mwakpo ndị ụka Kraịst nakwa ndị okpukpere Alakụba na Nigeria.

Cheta na ọ bụ n'ọnwa Nọvemba 2025 ka Onyeisiala mba America bụ Onyeisiala Donald Trump nyiri Nigeria egwu, ma kwuo na ha ga-awakpo Nigeria ma ọ bụrụ na gọọmenti egbochighị "ogbugbu a na-egbu ndị ụka Kraịst".

Trump nyiri Nigeria egwu ahụ n'ihe o kwuru n'akara soshal midịa ya bụ 'Truth Social'ma kwuo na ọ ga-emeso Nigeria omume na-adịghị mma site n'inye ndịagha ya iwu ka ha nwakpo Nigeria.

Ọzọ bụ na Sinetọ Texas bụ Ted Cruz, bụ onye na-ekwu okwu banyere nke ọnọdụ ndị ụka Kraịst na Nigeria wpụtere ozi n'Ọktoba 7 n'akara X ya, ma kwuo na "kemgbe afọ 2009, e gbuola ihe ruru ndị ụka Kraịst 50,000 na Nigeria ma kpọọ ụlọụka ruru 50,000 ọkụ ma mebikwaa ụlọakwụkwọ ụlọụka dị 2,000".

Cruz boro gọọmenti ebubo ịgba nkịtị ma na-akwado ogbugbu ndị ụka Kraịst.

Mana Gọọmenti Nigeria gọnarịrị ebubo a ma kwuo na ọ na-agba mbọ ibu agha megide ndị a na-eyi ọha egwu na ọnọdụ nchekwa na-adịghị mma bụ nke na-emetụta ndị ụka Kraịst na ndị Alakụba.