Gịnị bụ 'high altitude' na etu o nwere ike isi metụta ahụike gị?

Ebe foto si, Getty Images
Na nsonso a, Ụlọọrụ nnochiteanya Nigeria na mba Ethiopia gbara ama na ụmụamaala Nigeria mmadụ 16 nwụrụ n'Adis Ababa, isiobodo Ethiopia ahụ.
N'ozi mgbasaozi ụlọọrụ ahụ wepụtara na ngwụcha izuụka, ha kọwara na etu Addis Ababa si dị n'ogogo elu nke Bekee kpọrọ 'high Altitide'mere ka ọnọdụ ahụike ndị ahụ kawanye njọ nke butere ọnwụ ha.
Ụlọọrụ ahụ gara n'ihu dọọ aka na ntị "ka ụmụafọ Nigeria ndị nwere ọnọdụ ahụike nwereike ịkawanye njọ n'ebe dị elu kpachara anya ma ha chọọ ịme nje gaa n'Addis Ababa."
Addis Ababa ji mita 2,355 karịa elu osimmiri; Abuja ji mita 360, Lagos ji agbata mita ise na iri anọ na otu karịa elu Osimmiri, ebe Accra ji mita 51 karịa elu osimmiri.
Gịni bụ 'high altitude'?

Ebe foto si, Getty Images
Dịka akwụkwọ mmụta ScienceDirect sị kọwaa, "High altitude' bụ mpaghara ọbụla n'elu ụwa ebe rịrị nnukwu elu ihe dịka mita 2,400 (fiti 8,000 ) rue mita 3,500 (fiti11,500) karịa elu osimmiri.
Ihe nke a pụtara dịka ndị ọkammụta si kọwaa bụ na ikuku nakwa ihe Bekee kpọrọ 'gravity' ga-agbatu.
Ndị ọkachamara ahụike kwuru a nke nwereike ibute ndapụta ahụike maọbụ ọnwụ nye ndị nwere ụfọdụ ọnọdụ ahụike.
Dịka Dọkịta Chidinma Wogu nke Federal Medical Centre Asaba si kọwaa nke a bụ n'ihi na dịka mmadụ na-agbago elu, ikuku e ji eku ume na-agbatu maọbụ dị ntakịrị nke nwereike ime ka ume chụwa mmadụ ọsọ.
"Mgbe mmadụ gara ebe ogogo ya ka ogogo onye nọ n'ala nke Bekee na-akpọ 'sea level', e nwere ihe ọ ga-eme ndị na-efe n'ụgbọelu maọbụ ndị na-arị elu ugwu; ihe na-akpata ya bụ n'ogogo 'high altitude' ikuku e ji eku ume bụ 'oxygen na-agbatụ."
Kedụ ụdị ọnọdụ ahụike ha nwereike itinye ndụ ha na nsogbu na 'high altitude'?

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ndị mmadụ na-eme njem aga ebe nọ n'ugwu maka ọrụ maọbụ nlegharịanya, ha mara na ikuku 'oxygen na-akọ ụkọ n'ebe dị elu nke nwereike ibute nsogbu nye ndị nwere ụfọdụ nsogbu ahụike.
Dọkịta Wogu na otu 'American Heart Organisation si kwuo, ndị nwereike ịdanye na nsogbu ma ha gaa n'ebe nwere 'high altitude' gụnyere ndị nwere:
- Ọbara mgbalielu
- Ọrịa Obi
- Ọrịa ngụgụ
- 'Asthma'
- Chronic obstructive pulmonary disease
Gịnị ka i kwesịrị ime?

Ebe foto si, Getty Images
- Nyocha ọnọdụ ahụike tupu ime njem: Ọ bụrụ na i nwere ọrịa obi, ọbara mgbalielu maọbụ ọrịa ngụgụ maọbụ nke obi ndị ọzọ, gbaa mbọ chọpụta ma ebe ị na-akwado ime njem ọ nọ n'ogogo dị nnukwu elu karịa osimmiri, chee na ihe ị na-aga ime ọ dị nnukwu mkpa.
- Jide ihe nchekwa: Ọ bụrụ ebe bụ iwu na ị ga-aga njem ebe ogogo ya dị elu, Dkta Wogu nyere ndụmọdụ, onye ọbụla nwere ọrịa obi maọbụ ọrịa ngụgụ kwesịrị ikpu akpa ikuku nke Bekee a kpọrọ, 'oxygen mask' iji nweta ikuku zuuru ya.































