Ọ bụ eziokwu na ụka 'Fountain of Life' ewepụla Jimmy Odukoya dịka onyeisi?

Ebe foto si, Jimmy Odukoya/Instagram
Akụkọ si n'aka ụfọdụ ụlọntakụkọ Nigeria na-ekwu na ụlọụka'Fountain of Life Church dị na Lagos ewepụla Pastọ Jimmy Odukoya dịka onyeisi nchụaja ha mana ozi si n'akara ọbaozi ụlọụka ahụ kwuru na ha "anabaghị mkpebi ahụ".
Fountain of Life Church bụ ụka Taiwo Odukoya na nwunye ya bụ Bimbo Odukoya bụ onye mgbasa oziọma Kraisti n'ihe onyonyo TV a ma ama hiwere n'afọ 1992 tupu ha laa mmụọ.
Ozi mgbasaozi nke isiụlọọrụ ụlọụka ahụ wepụtara n'etiti ụbọchị Tuzde n'akara Facebook ụlọụka ahụ kwuru sị,"Anya anyị eruola akụkọ na-ebo ebubo na e wepụla Pastọ Jimmy Odukoya dịka onyeisi nchụaja nke ụka " Fountain of Life Church".
"Anyị na-ajụ mkpebi a sị e nyere ma na-ekwu na ọkwa ahụ a mara esighị n'aka ndị isi ụka ahụ Bekee kpọrọ " Board of Trustees" nke ụka "Fountain of Life Church".

Ebe foto si, Jimmy Odukoya/Facebook
Ozi ahụ gara n'ihu bo ebubo na ozi mbụ kwuru na e wepụla Pastọ Jimmy Odukoya bụ akaọrụ ndị kpọrọ onwe ha, "ndị isi ụka ihe metụtara"(Concerned Members of the Board) bụ ndị a gwaburu ka ha gbaa arụkwaghịm.
" Ọ dị mkpa ka amata na n'abalị 14 nke ọnwa Maachị afọ 2026, ndị ndu a ka a gwara ka ha tinye akwụkwọ arụkwaghịm n'ihi ịda iwu nke ụka ugboro ugboro.Ha nwetara ozi ahụ, ebe otu n'ime ha gbara arụkwaghị ."
Ozi nke bụ ozi nke abụọ na-apụta n'otu ụlọụka n'otu ụbọchị kwusiri ike na Jimmy Odukoya ka ba bụ onyeisi ụlọụka ahụ.
Ihe alaka ụka 'Fountain of Life Church' kwuburu

Ebe foto si, Getty Images
Ozi mgbasaozi nke alaka ụlọụka ahụ wepụtara ụbọchị Tuzde kwuburu na ndị ndu ụlọụka ahụ nwere mkpebi iwepụ Jimmy Odukoya dịka ha lere anya ọzọ n'iwu nke ụka ahụ nakwa ozi onyeisi ụlọụka ahụ bụ Taiwo Odukoya lara mmụọ hapụrụ tupu ọ laa mmụọ n'afọ 2023.
Ozi ahụ gara n'ihu kwu sị, "N'ihi nke a, Pastọ Jimmy Odukoya abụghịkwa nnukwu Ụkọchukwu nke ụlọụka 'Fountain of Life Church' malite ugbua."

Ebe foto si, Jimmy Odukoya/Facebook
Dịka ozi ahụ siri kwuo, ndị ndu ụka ahụ họpụtara Jimmy bụ ọkpara Taiwo Odukoya dịka Onyeisi ụlọụka ahụ ka nna ya nwụchara mana na nsonso a, ha hụrụ ihe onyonyo nna ya hapụrụ bụ ebe o nyere ha ntuziaka etu a ga-esi eme okwu onye ga-eweghara ọkwa onye ndu ụka ahụ.
Ha kwuru na e nyeghị ha ozi ahụ dị n'ihe onyonyo ahụ na mbụ.
Cheta na nsonso a, Jimmy Odukoya bụ onye ya na nwaanyị mbụ ya bụ Kemi gbasaarala, gbara n'anwụ n'ọha na ya alụọla nwaanyị ọhụrụ dịka o gosiri ndịụka ya nwunye ya, Mo Jasmine Daniel.
Ọkwa ahụ Jimmy Odukoya mara butere ndọrịtaụka na soshal midia, dịka ụfọdụ na-akatọ ya sị na ọ gbasoghị nkuzi nke Akwụkwọ Nso, na onye nwunye ya dị ndụ ekwesịghị ịlụ nwaanyị ọzọ, na-agbanyeghị ya na nwunye mbụ ya agbasaala.































