Ụzọ ole ma ole mba America na-akwado Nigeria ịdị njikere maka ntuliaka 2027

Onyeisiala Nigeria bụ Bola Tinubu na Onyeisiala mba America bụ Donald Trump
Nkọwa foto, Bola Tinubu na Donald Trump
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Nigeria bụ Ọchịagha Christopher Musa ekwuola na mba America na-enyere Nigeria aka ibu agha megide ndị omekome na ndị na-eyi ọha egwu ma na-echekwa ntuliaka nke afọ 2027 na-abịa abịa.

Christopher Musa kwuru nke a n'ụbọchị Monde ma kwuo na mba America ji akụrụngwa na-agbara Nigeria ama ihe ndị ojiegbe, ndị omekome na-eyi ọha egwu na-eme nakwa etu ha si eme njem na mpaghara ugwu Nigeria.

Musa kwuru na ọ bụ nke a na-enyere Nigeria aka iwakpo ndịisi ndị omekome ahụ ma meminaa ọtụtụ n'ime ha.

Ọchịagha Christopher Musa bụ mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Nigeria.
Nkọwa foto, Christopher Musa

Etu ama mba America na-agbara Nigeria si enyere aka - Musa

Ọchịagha Christopher Musa kwuru sị na ama mba America na-agbara Nigeria na-enyere ha aka iwakpo ndị omekome na mpaghara ugwu Nigeria.

N'okwu ya "Anyị ememinaala ọtụtụ ndị na-eyi ọha egwu, ndị ojiegbe nakwa ndị ntọrị mmadụ site n'ama mba America na-agbara anyị".

Mana ka ọ dị ugbua, Nigeria na-atụanya inwete ụgbọelu agha 'Helicopta' si mba America nakwa mba Italy.

N'ọnwa May, Nigeria na America jikọrọ aka ọnụ gbuo nwoke a na-akpọ Abu-Bilal al-Minuki nke Onyeisiala mba America bụ Donald Trump kọwara dịka osote onyeisi otu ISIS na-eyi ọha egwu.

Ọzọ bụ mgbe mba America tụrụ ogbunigwe n'ụbọchị Christmas na Sokoto state ma gbuo ndị na-eyi ọha egwu a sị chọrọ iwakpo ndị ụka.

Ngwaagha Nigeria

Etu Nigeria si akwado ọnọdụ nchekwa maka ntuliaka 2027 – Musa

Musa na-ekwu na ngalaba ụlọọrụ nchekwa dị iche iche na Nigeria na-akwado nke ọma maka ntuliaka 2027 ma jiri akụrụngwa akọnauche ga-egbochi ọgbaaghara, tupuu ebido ntuliaka, n'oge ntuliaka nakwa mgbe e mechara ntuliaka.

Nigeria na mba Amerika jikọrọ aka na-enyochakwa ihe n'eme na mbara igwe intaneti bụ Starlink, na ngalaba azụmaahịa ego bụ 'Cryptocurrencies' iji gbochie ndị na-eyi ọha egwu ohere iji ego na-akwado mkpamkpa ha na-akpa.

Musa gara m'ihu kwuo na Nigeria na mba ndị ọzọ gbara ha okirikiri dịka Cameroon, Niger na Chad nwere nkwekọrịta ibuso ndị na-eyi ọha egwu agha gafee okeala ibe ha ruo 'kilomita' ise '(3 mile)'.