Mgbe nne m dị ime m ka Chineke gwara ya na m ga-abụ oke onye amụma - Odumeje

Ebe foto si, Holy Ghost Intervention Ministry
Onye amụma a ma ama bụ Chukwuemeka Ohaneemere e ji Odumeje maara nke ụlọụka Mountain of Holy Ghost Intervention Deliverance Ministry dị n'Onitsha, Anambra State akọwaala etu njem ya n'ịgbasa ọzị Chineke siri malite.
Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC nwere, Odumeje kwuru na ọ maghị na ọ ga-abụ onye amụma Chineke ga-eji kwara ngwaọrụ n'ụwa, ọ sị na mgbe nne ya dị ime ya na Chineke bịakwutere ya ma gwa ya na onye o bu n'afọ ga-abụ oke onye amụma.
"Amaghị m na m ga-abụ onye Chineke ga-eji kwara ngwaọrụ. Nne mụrụ m gwara m na mgbe ọ dị ime na Chineke bịakwutere ya ma gwaa ya na onye a o bu n'afọ ga-abụ oke onye amụma".
O kwuru na oteela ọ malitere ọrụ Chineke n'ihe dịka n'afọ 1996 mgbe ọ malitere ịgbasa oziọma n'okporoụzọ dị n'Onitsha Anambra State. O kwuru na ọ nọruola afọ iri atọ n'ọrụ Chineke.
"O teela m malitere ọrụ Chineke. Ebidoro m n'okporoụzọ na-agbasa oziọma n'ihe dịka ebe afọ 1996 n'Onitsha a, anọọla m iri afọ atọ (30yrs)".
Mgbe ọ na-aza ajụjụ maka etu o si agbasa oziọma ya nakwa ime ihe ịrịbaama, Odumeje kwuru na o metụbeghi ihe ịrịbaama adịgboroja, na ihe niile ọ na-eme nakwa ikpe ndị ọ na-akpa bụ ike Jesus.
"Emetụbeghi m ihe ịrịbaama nke adịgboroja mbụ, enwere m ihe onyonyo, enwerem ihe akaebe. Ihe ọbụla m na-eme taa, eziokwu ka m na-agwa onye ọbụla. Ike m na-akpa bụ ike Jesus".
Ọ gakwara n'ihu kwupụta nsọpụrụ na nkwanye ugwu o nwere n'ebe onye amụma T.B Joshua nwụrụ anwụ. Ọ kwuru na T.BJoshua bụ nna ya ukwu n'ime mmụọ maka na Chineke ji ya akpa ike dịka ya onwe ya.
Odumeje kọwara ihe mere o ji bụrụ onye ti egwu ma sị na onye amụma ọbụla Chineke kpọrọ oku na onye ahụ na-enwe mmụọ ịgụ egwu maka na ọ bụ egwu ka ndị amụma ji akpa ike.
Ọ gakwara n'ihu kọwaa ihe jikọtara ya na otiegwu a ma ama bụ Flavour (Ijele nke mbụ n'Africa) ma sị na ọ bụ itipụta egwu e ji ebuli Chineke elu ka ya na Flavour ji bụrụ enyi.
"Ijele nke mbụ n'Africa, ezigbo mmadụ. I lee anya ị hụụ na egwu anyị na-agụ bụ egwu na-ebuli Chineke elu. Ọ bụ ya mere i jiri nụụ egwu anyị nke mbụ 'Ụmụ Jesus Christ'. Ọ bụ ya bụ ihe jikọrọ mụ na Ijele nke mbụ n'Africa.
Odumeje bụ onye ga-eme emume ncheta afọ iri atọ ọ rụrụ ọrụ mgbasa oziọma Chineke n'ụbọchị 15 Nọvemba 2026, kwuru na obi na-adị ya ụtọ ma o chete ọrụ ọma Chineke ji ya rụọ kamgbe afọ iri atọ gara aga.
"Ihe ọ na-abụ m cheta obi aṅụrị a na-akpa m bụ maka ike Chineke ji m arụ na ndụ ndị mmadụ, Ya mere m na-ahụ etu o si agwọ ndị mmadụ ọrịa kamgbe afọ iri atọ n'ọrụ mgbasaozi ọma, na-atọ agbụ dị iche iche, na-aga n'ezinaụlọ dị iche iche na-emebisi ike ọjọọ, ma ọgwụ a gwọrọ agwọ ma nke e liri eli. Obi na-adị m ụtọ maka ihe Chineke ji m eme n'ụwa a".
Ihe ị kwesịrị ịma maka odumeje

Ebe foto si, Holy Ghost Intervention Ministry
- Odumeje bụ nwa nke atọ n'ime ụmụ isii nne na nna ya mụrụ
- Ọtụtụ na-eche na ọ bụ onye Anambra steeti mana ọ bụghị eziokwu. Nne na nna Odumeje bụ ndị Orsu Ihiteukwa n'Imo steeti
- A mụrụ ya n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Sepụtemba afọ 1982
- Odumeje gụrụ akwụkwọ na 'Prudence Comprehensive Commercial College nke dị n'Ọdọakpụ Onitsha
- Egwuregwu bọọlụ na-amasị ya nke ukwu, nke na o cheburu echiche ịbụ onye ọgbaa bọọlụ oge ọ na-eto.
- Ọ gbara odibo n'aka onye na-azụ ahịa akpụkpọ ahụ ụmụ anụmanụ nke bekee kpọrọ 'leather'
- Odumeje dị afọ 19 oge e ji kpugheere ya na ọ ga-abụ onye amụma. Mana tupu ọ malite ime ekpere, ọ bụ onye isi ike ndị mmadụ ma nke ọma na Fegge, Onitsha bụ ebe ọ nọ too
- Oge o chegharịrị, ọ malitere izisa oziọma nakwa ibu amụma n'okirikiri ogbe ha nke mere ka ndị enyi ya na mbụ na-achị ya ọchị ma na-akwa ya emu
- Odumeje malitere dịka onye otu ekpere 'Charismatic' nke ndị ụka Katọlik tupu ọ malite ụlọekpere nke aka ya
- Dịka akụkọ dị n'ọba ozi ụka ya si kwuo, ọ bụ n'afọ 2000 ka Odumeje malitere ụlọ ekpere ya n'uju
- Ọ bụ nne ya nyere ya obere ego o ji malite ọrụ ụkọchukwu ya
- Odumeje nwekwara nzere 'Doctorate' nke Mahadum Gregory dị n'Uturu, Abịa steeti nyere ya n'ihi ọrụ enyemaka ọ na-arụ
- Odumeje alụọla nwaanyị ma mụta ụmụ anọ
- Nwunye ya bụ onye Umuobom dị na Ideato South n'Imo Steeti




























