Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n'ime atụmatụ Tinubu wepụtara iji kwụsị enweghị nchekwa n'ime afọ ise

Ebe foto si, ABAT/Nigeria Army/X
Onyeisiala Bola Tinubu ewepụtala atụmatụ nke ọchịchị ya ga-eji kwụsị ọnọdụ enweghị nchekwa na Nigeria n'ime afọ ise. Ọ kpọrọ ya 'Five-Year Strategic Defence Operations Plan' na bekee.
Pati All Progressives Congress (APC) nke onyeisiala Tinubu nọ na ya, kwupụtara atụmatụ a n'akwụkwọ ozi ha wepụtara n'ụbọchị Sọnde, ma kwuo na ya bụ atụmatụ gụnyere iwe ndịagha na ndị uweojii 78,000 ọhụrụ iji busoo enweghị nchekwa agha.
Atụmatụ a na-abịa dịka ọnọdụ nchekwa ọjọọ na-emekpa Nigeria ahụ kamgbe ihe karịrị afọ 17, malite na ndị otu na-eyi ndụ egwu a kpọrọ Boko Haram.
Kamgbe ahụ, ịkpa ike ndị omekome 'bandit' nakwa ntọrị mmadụ agbasaala n'akụkụ Nigeria niile wee mee ka ndị mmadụ nọrọ n'ụjọ oge dum.
Gịnị ka atụmatu a na-ekwu?

Ebe foto si, Bayo Onanuga/X
Otu ọnụ na-ekwuru otu achụmnta vootu Tinubu bụ Dele Alake, kwuru na atụmatụ afọ ise maka nchekwa a ga-achịkọta usoro ọzụzụ na akụrụngwa ndịagha nakwa mmefu ego niile Nigeria na-eme gbasara enweghị nchekwa ọnụ.
A ga-enwezi otu uzoro doro anya nke ga-agụnye iji teknụzụ chọpụta ma busoo ndị oyi ndụ egwu, ndị omekome 'bandit', ndị ntọrị mmadụ, na ndị ekperima ndị ọzọ agha.
Alake kwuru na ọchịchị Tinubu ewulitela ikike ndị agha Nigeria ibuso enweghị nchekwa agha, nke mpụtara ya bụ na ndị Boko Haram nakwa ndị eperima ndị ọzọ ọnụọgụgụ ha karịrị 15,000 alaala mmụọ n'ime afọ atọ Tinubu nọrọla n'ọchịchị.
Ọnụọgụgụ karịkwara 130,000 nke ndị Boo Haram na ndị na-enyere ha aka iyi ndụ egwu achịliela aka elu nye ndị agha Nigeria site n'atụmatụ 'Operation Safe Corridor' bụ nke gọọmentị etiti hibere maka ndị ekperima chọrọ ichegharị ka ha debe egba ha ma gbanwee ndụ ha.
"Iji mee ka ọrụ ndị agha Nigeria siwanye ike ọkachasị gbasara etu ha si agbata ọzọ enyemaka n'ebe ọnọdụ nchekwa kacha njọ, Onyeisiala Tinubu kepụtara ngalaba ndị agha anọ ọhụrụ ma wugharịkwaa usoro ọrụ ndị agha.
Cheta na n'ọnwa July afọ a, Tinubu kepụtara ngalaba ndị agha anọ ọhụrụ, wee mee ka ngalaba ndị agha dịbu asatọ ruo 12.
N'oge ahu, Tinubu kwuru na nke a so n'atụmatụ ya ime ka ọnọdụ nchekwa Nigeria siwanye ike ma kwalite ọnọdụ ndị agha.
Otu onye ọkachamara na ncekwa bụ Awwal Abdullahi Aliyu gwara BBC oge ahụ sị, "Ọ bụrụ na ha wee ndị agha ọhụrụ n'ọrụ, ọ ga-eme ka ngalaba ọbụ nwee ọnụọgụgụ ndị agha zuru oke, mee ka ndị agha mụbaa ọrụ ha, ma mekwaa ka mpaghara ọbụla na-enwebughị ndị agha na-eche ha, ga-enwetazi ya."
Abdullahi Aliyu kwuru na ya kwenyere na atụmatụ ahụ nwere ike ibutu ọnọdụ enweghị nchekwa ruo pasentị 75.
Onyeisiala kepụtakwara ogige ndị agha abụọ ọhurụ n'Osogbo, Osun Steeti nakwa n'Amasiri-Edda nke dị n'Ebonyi steeti. Otu n'ime ogige ọhụrụ ndị a ga-enweta ndịagha 6000 ọhụrụ tinyere mmadụ 6000 ha nweburu nke ga-eme ka ọnụgụ ha bụrụ 12,000.
N'otu aka ahụ kwa, n'ọnwa Julaị, onyeisiala nyekwara nkwenye ya ka e wee mmadụ 28,000 ọhụrụ n'otu ndị agha nakwa mmadụ 50,000 ọhụrụ n'otu ndị uweojii, iji kwalite ọnọdụ nchekwa ma wulite etu ndị ọrụ nchekwa si ebuso ọnọdụ nchekwaa ọjọọ agha ngwangwa o mere.
Akwụkwọ ozi ahụ ndị APC wepụtara kọwakwara etu Nigeria si tinye ego n'ụlọ obibi ndị agha nakwa ihe nrụpụta dị iche maka ndị agha, nke gụnyere ogige ndị agha nwere ọnụụlọ 700 nke gọọmentị rụrụ n'Ikere-Ekiti, n'Ekiti Steeti.
Ha kọwara na ụlọ ahụ bụ iji wụlite ọnọdụ ọrụ nakwa ọnọdụ obibi ndụ ndị agha nakwa inye ha ihe niile dị ha mkpa iji rụọ ọrụ ha nke ọma.
Mana n'ime atụmatụ afọ ise a, otu achụmnta vootu Tinubu kwuru na ha ga-agbaso usoro ga-edo anya gbasara ihe ndị na-echere Nigeria aka mgba, akụrụngwa dị mkpa a ga-eji buso ha agha, nakwa ihe ndị kacha mkpa na Nigeria ugbua.
Kama otu mperi nke ndị ọkchamara kwuru dị n'ime atụmatụ afọ ise a bụ na Tinubu ekwughị mgbe ya bụ atụmatụ ga-amalite, maọbụ mgbe ọ ga-akụrụ ọnụ.




























