Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 02, 2026
Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 02, 2026
Mgbe e biputara ya
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Ndị uweojii Imo State ekwuola na ndị ọrụ nchekwa napụtara mmadụ iri n'ime ndị njem a tọọrọ n'okporoụzọ siri Owerri gawa Onitsha n'ụbọchị 1 Ọktoba 2026, oge ndị ojiegbe wakporo ụgbọala bọọsụ abụọ bu ndị ntoroọbịa na-efe ala nna ha nakwa ndị ọzọ.
- N'ozi o wepụtara n'abalị Tọzde, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Henry Okoye kwuru na ha ezipụla ndị ọrụ ha maara nke ekwe na-akụ iji chọta ma napụta ndị nke fọrọ afọ, ma kwuo na ha ka na-agba mbọ ịmata kpọmkwem mmadụ ole a tọọrọ.
- Mba Ethiopia na Eritrea egbubiela ụdọ mmekọrịta ha dịka a na-enwe ụjọ na ọgụ maliteghachiri na mpaghara ugwu Ethiopia nwereike ibute nnukwu ọgbaaghara.
- N'bọchị Tọzde, ka mba Ethiopia kwupụtara na ha na-emechi Ụlọnnọchiteanya ha dị n'Eritrea ma nye iwu na ndị nnọchiteanya mba Eritrea 10 pụọ na mba ha n'ime ụbọchị abụọ ma boo ebubo na ha na-eme omume ndị na-eyi egwu megide nchekwa mba ha. Na nzaghachi, Eritrea gbubiri ụdọ mmekọrịta ha na Ethiopia.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.






