Etu e si nwuchie ụmụ Nigeria e boro ebubo izu ohi ụgbọala na Canada ma na-ebubata n'Africa

Ebe foto si, Peel Regional Police
Aka ndị uweojii mba Canada akparala opekata mpe ụmụ Nigeria asatọ bụ ha boro ebubo na ha so n'otu ndị ohi ọrụ ha bụ izu ụgbọala dị icheiche na Canada buru ha bata mpaghara Africa ree ha.
Ndị uweojii n'obodo Peel, dị na Ontario, Canada kwukwar na ha chọtara ụgbọala ndị dara oke ọnụ ahịa ọnụọgụgụ ha ruru 96, bụ nke ndị ohi a tinyerela n'akpati 'container' iji tinye ha n'ụgbọmmiri ga-eburu ha gawa mpaghara West Africa.
Ọnụahịa ụgbọala ndị ahụ ruru nde dọla anọna ọkara ($4.5m).
Otu ndị ohi ahụ ndị uweojii Canada na-ebo ebubo a dị 12 n'ọnụọgụgụ, asatọ n'ime ha bụ ndị Nigeria, ebe opekatampe, abụọ n'ime ha bụ ndị Igbo, dịka aha ha si dị.

Ebe foto si, Peel Regional Police
Ndị uweojii kwuru na ha ga-akpụpụ ndị a ha jidere ụlọikpe ebe ha ga-azara ọnụ ha gbasara ebubo ruru 231 nke e boro ha, ụloikpe enyekwala akwụkwọ ikike iji nwụchie ndị otu ndị ohi ahụ ka nọ n'ọsọ.
Ọ bụrụ na a maa ndị ahụ ikpe, ndị uweojii kwuru na ha nwereike izighachi ụfodụ n'ime ha n'obodo ha si bata Canada.
Njide e jidere ndị omekome a na-abịa dịka ndị uweojii malitere atụmatụ pụrụ iche iji kwụsị etu izu ohi ụgbọala si arị elu nke ukwuu na mba Canada bụ nke ha malitere n'ọnwa March afọ a site na njikọ aka nke ngalaba na-ahụ maka okeala na Canada.
Ndị ọrụ iwu chọpụtara otu ụlọ nchekwa ebe ndị ekperima ahụ na-edobe ụgbọala ha zutere n'ohi.
Ha chọpụtakwara na ndị ohi ahụ nwere mmadụ ise ndị na-ahazi etu ha si ezu ma na-ebupu ụgbọala ndị ha zutere, ebe ndị ọzọ na-enye aka n'ụzọ ndị ọzọ dị icheiche.
Akwụkwọ ozi ndị uweojii wepụtara kwuru ha chọpụtara etu ndị ohi ahụ si edegharị nọmba njirimara ụgbọala ndị ahụ nke a kpọrọ 'VIN Number', tinye ha n'akpati eji ebupu ngwahịa ma bupu ha gaa mba Africa dị icheiche.
Ndị ọchịchị mba Canada kwuru na izu ohi ụgbọala aghọọla ihe na-abawanye nke ukwuu na mba ahụ dịka otu ndị dị icheiche tinyere aka na ya.
"Izu ohi ugboala bụ nnọọ nnukwu azụmahia nke ndị otu ekperima dị icheiche ji eyi ọtụtụ ezinụlọ egwu ma werekwa ego ha na-enweta na ya na-ewulite ọrụ ọjọọ ha ndi ọzọ," Nick Milinovich, bụ osote onyeisi ndị uweojii mpaghara Peel, kwuru.
Isite na mpaghara North America nakwa Europe buru ụgbọala e zuru n'ohi bufee mpaghara Africa so n'otu ihe nnukwu ịwa isi nyere ndị ọrụ nchekwa mba dị icheiche na mpaghara ọdịda anyanwụ ụwa.
N'afọ gara aga, otu Interpol kwuru na ha achọtala ma weghachite ihe karịrị ụgbọala 100 dara oke ọnụ ahịa e zuru na mba Canada nakwa Europe, ma gbakwaa otu ndị ekperima na-ezu ụgbọala ndị a ma na-ebubata ha na mpaghara West Africa.
Ndị ọrụ nchekwa mba Ghana kwukwara na ha chọtara na weghachite ụgbọala 43 e zuru na mba Europe na North America ma bubata na mba ha.
Ha kwuru na nke ahụ bụ site na njikọ aka nke ndị ọrụ nchekwa nke mba dị icheiche n'ụwa.




























