Olileanya m bụ na Ụlọikpe Kachasị na mba Finland ga-ekpe ikpe ziri ezi n'ikpe m - Simon Ekpa

Ebe foto si, Screenshot
Onyendu otu alaka otu chọrọ nwereonwe Biafra bụ Simon Ekpa ekwupụtala n'ezie na okwu ya ka nọ n'Ụlọikpe Kachasị na mba Finland na-agbanyeghi na a tọhapụla ya site n'ụlọmkpọrọ.
Ekpa kwuru nke a dịka o si n'ụlọmkpọrọ pụta n'ụbọchị 17 Nọvemba 2026 n'ihe onyonyo Aloy Ejimakor bụ ọkaiwu Otu Indigenous People of Biafra (Ipob) wepụtara na soshal midia.
N'okwu ya, Ekpa sị na "anyị bụ ụmụ Chineke, a na-akpagbu anyị maka okwukwe anyị, okpukpere anyị, omenala na ọdịnala anyị.
"Agaala m ụlọmkpọrọ ma pụta, obi dị m ụtọ etu unu si nabata m site na mpaghara ụwa dị iche iche. Agaghị m n'ụlọmkpọrọ maka na m bụ onye ohi, agara m mkpọrọ maka ịzọ oke ruuru ndị anyị, nwereonwe nakwa ichekwa ndị Biafra.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Ekpa gara n'ihu kwuo na onye aka ya dị ọcha dịka ya gara n'ụlọmkpọrọ nọọ ihe ruru afọ abụọ.
Ọ sị na o nwere olileanya na mgbe ọgụ ikpe a ọ na-alụ ga-ebi na eziokwu ga-apụta ihe. Na onweghi onye Biafra ọbụla ga-aga mkpọrọ n'ihi nke a.
O kwuru na ọtụtụ ndị otu ya na ndị enyi ya nwụrụ n'ihi nnwereonwe Biafra na ọ bụrụ na ọ nọ ya na ọ gaaraghị adị etu ahụ.
"N'ikpeazụ anọ m ebe a, sie ike karịa ka m siri na mbụ. Onye ọzọ ga-apụta bụ Onyendu Indigenous People of Biafra.
Aka m dị ọcha, abụghị m onye oyi ndụ egwu, apụghị m ịbụ onye oyi ndụ egwu. Ndị Biafra abụghị ndị ohi, ha abụghị ndị oyi ndụ egwu.
"Agbanyeghi aha ọbụla i nyeere ka i nweeike maa m ikpe, tinye m n'ụlọmkpọrọ, n'ikpeazụ eziokwu ga-apụta ihe.
O kwuru na o nwere olileanya na Ụlọikpe Kachasị nke mba Finland ga-eme ihe dị mma ka ikpe ziri ezi pụta ihe. Ka mba Finland ghara iso na mba kwadoro igbu ọchụ megide Africa maọbụ ndị agbụrụ Biafra chọrọ nnwereonwe ha.
"Anyị bụ ndị udo na ịhụnanya. Aga m aga n'ihu na-akpọ oku ka ndị Biafra were ụzọ udo na-achụso nnwereonwe ha
Cheta na ụlọikpe dị na mba Finland tụrụ Simon Ekpe mkpọrọ afọ isii n'onwa Septemba afọ 2025 maka ebubo ime mpụ iyi ndụ egwu na mpaghara ọwụwa anyanwụ Nigeria n'agha ịchọ nnwereonwe Biafra.
Dịka otu afọ gachara, Ekpa gbara akwụkwọ n'ụlọikpe mkpegharị dị na Finland megide ikpe ahụ e jiri tụọ ya mkpọrọ.
Ụlọikpe mkpegharị nọrọ n'ọnwa Ọktoba afọ 2026 lebagharịa anya n'ikpe ahụ ma kpebie ibelata afọ isii e nyere Ekpa ka ọ bụrụzie afọ anọ ka ọ ga-anọ.
Mana ọ nọzubeghi afọ anọ ahụ tupu akụkọ na a tọhapụla ya amalite iwu na soshal midia.




























