Nnyocha e mere n'ahụ mmadụ abụọ a na-enyo bu ọrịa Ebola na Nigeria gosiri na ha ebughi ọrịa a -NCDC

Nwaanyị a na-eme nnyocha ahụ maka ọrịa Ebola
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọọrụ na-ebu megide mfesasị ọrịa na Nigeria bụ Nigeria Centre for Disease Control and Prevention (NCDC) kwuru nke a n'abalị Satọde, mgbe ha buru ụzọ kwuo na e nwere mmadụ abụọ a na-enyo enyo na ha nwere Ebola n'obodo Yola, isi obodo Adamawa.

Onye isi NCDC bụ Dọkịta Jide Idris, kwuru na ndị ọrụ ahụike natara akụkọ banyere mmadụ abụọ nwere mgbaama yiri nke Ebola. N'ihi nke a, e kewapụrụ ha n'ebe ndị ọzọ nọ ka e wee nyochaa ha nke ọma.

Ọ sịrị na a kpọrọ ndị a gaa n'ụlọ nyocha ugboro abụọ, ma nsonaazụ niile gosiri na ha enweghị Ebola.

"E weere akụrụngwa n'ahụ ndị a a na-enyo enyo ma gaa n'ụlọ nnyocha iji chọpụta ihe kpatara ọrịa ahụ. Ihe na-enye obi ụtọ bụ na mpụtara nnyocha abụọ e mere gosiri na ndị a enweghi nje Ebola".

Ọ gbakwụnyere na naanị onye nwere Ebola na Nigeria bụ nwunye otu onye ọrụ gọọmenti Switzerland bụ onye a chọpụtara ọrịa ahụ n'ahụ n'Abuja.

NCDC kwuru na ha ga-aga n'ihu na-enyocha akụkọ mbụ nke mere ka e chee na Ebola apụtala n'Adamawa. Ha kpọkwara ndị mmadụ oku ka ha ghara ikesa asịrị maọbụ ozi na-enweghị nkwenye gbasara ọrịa ahụ.

Ka ọ dị ugbua, Democratic Republic of Congo (DRC) ka bụ ebe ọrịa Ebola kacha gbasaa, ebe ọtụtụ puku mmadụ ebutela ọrịa ahụ, ma ọtụtụ puku ndị ọzọ anwụọla n'ihi ya.

Ọtụtụ mba ugbua na-eme ka usoro nchedo ahụike sie ike iji gbochie ọrịa Ebola ịgbasa n'ihu.

NCDC malitere inyocha mmadụ abụọ a na-enyo na ha bu Ebola

Mmadụ abụọ yi uwe nchekwa

Akụkọ na-eru anyị ntụ na-ekwu na mmadụ abụọ eburula ọrịa a na-enyo na ọ bụ Ebola Ọwụwa Anyanwụ Ugwu Nigeria, dịka ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi nkesa ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control and Prevention (NCDC).

NCDC kwuru n'ozi mgbasaozi ha wepụtara n'akara ọbaozi ha na X n'ehihie Satọde na e dotala mmadụ abụọ ahụ iche ma malite ịchọ ndị ha na ha zukọtarala.

Ụlọọrụ ahụ kwuru na o dobeghị anya kpọmkwem na ọ bụ Ebola , dịka ha ga-eme nnyocha tupu ekwubie nke ahụ.Ha gara n'ihu dọọ aka na ntị ka ụmụamala na-edowe onwe ha na mgburugburu ha ọcha iji chekwaa onwe ha.

Cheta na Nigeria enweela onye mbụ butere ọrịa Ebola na Nigeria na nsonso a.

Nwaanyị ahụ bu nwunye, onye ọrụ nnọchite obodo Switzerland si mba Uganda bata Nigeria mana e mechara bupụ ya na Nigeria.