Ihe ndị dị n'iwu nwereike ibelata ụgwọ ụlọ nke ụlọomeiwu Enugu State kwadoro

Ebe foto si, ESHDC/ESHA
Ụlọomeiwu Steeti Enugu State akwadola iwu ọhụrụ nke na-achọ igbochi ndị nwe ụlọ ibuli ụgwọ ụlọ karịa pasenti abụọ n'ime afọ anọ ọbụla. Atụmatụ a nwereike ịgbanwe mmekọrịta dị n'etiti ndị nwe ụlọ na ndị na-ebi n'ụlọ ha n'ebe ọ dị ukwuu ma atụmatụ a bụrụ iwu.
Onye kwadoro iwu ahụ bụ omeiwu Anthony Okey Mbah na-anọchiteanya mpaghara Nkanu East ma bụrụkwa Onyeisi kọmitii na-ahụ maka ụlọ. Ọ kwadoro nwogharị iwu a a kpọrọ 'landlord and tenant 2nd amendment bill' n'afọ 2025.
Okey Mbah gwara BBC na atụmatụ iwu gafere ogogo na usoro niile o kwesịrị ịga tupu ndị omeiwu akwadoo ya.
O kwuru na a kpọtụụrụ ndị niile ọnụ na-eru n'okwu, ohanaeze nakwa ndị ometụtara ka ha nyochaa atụmatụ iwu tupuu o ruo ogogo ọ nọ ugbua.
Nwogharị atụmatụ iwu a na-abịa n'oge a na-enwe mkpesa banyere mbuli elu ụgwọ ụlọ obibi, ọkachasọ na-enweghị usoro doro anya, mbulielu n'ego a na-akwụ ndị nyere aka chọta ụlọ a kpọrọ agent.
Ọ bụ eziokwu na iwu ahụ agafeela ngụpụta nke atọ n'ụlọomeiwu Enugu State, a na-echezi ka Gọvanọ Peter Mbah binye aka na ya ka ọ bụrụ iwu.
Ọ bụrụ na Gọvanọ Mba kwadoo ya, iwu ọhụrụ a nwereike ịmachi etu ndị nwe ụlọ si ebuli ụgwọ ụlọ, chekwaa ikike ndị bi n'ụlọ ma belata ụmụ ururu ego ndị a na-akwụ ma mmadụ na-achọ ụlọ.
Ụfọdụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n'iwu a gụnyere;
Onye nwe ụlọ 'landlord' agaghị na-ebuli ụgwọ ụlọ kwa afọ
Otu n'ime ihe kachasị gbapụta ihe n'iwu a bụ mmachi e tinyere n'etu ndị nwe ụlọ nwereike isi bulie ụgwọ ụlọ.
Dịka iwu a si kwuo, ndị nwe ụlọ agaghị ebulinwu ụgwọ ụlọ ya opakatampe n'ime afọ anọ, mana afọ anọ ahụ gachaa, ha agaghị ebuli ụgwọ ụlọ ahụ ihe karịa pasentị abụọ n'ego ndị bi n'ụlọ na-akwụbu.
Nke a pụtara na ndị bi n'ụlọ agaghị enwe nchekasị ahụ na ụgwọ ụlọ ha nwereike ịrị elu n'otu ntabi anya.
Iji maa atụ, onye bi n'ụlọ na-akwụ N500,000 kwa afọ ugbua, ọ bụrụ na e jiri pasentị abụọ bulie ụgwọ ụlọ ya – nke bụ N10,000, ihe ọ gaa na-akwụzi kwa afọ bụ N510,000.
Onye nwe ụlọ rụzigharịrị ụlọ nwereike ibuli ụgwọ ụlọ ya
Iwu ọhụrụ a nyere ndị nwe ụlọ ohere pụrụiche maka ịrụzi ụlọ ha n'ụzọ kwesịrị ekwesi.
O kwuru na onye nwe ụlọ ọbụla rụzigharịrị ụlọ ya nwereike ibuli ụgwọ ụlọ ahụ kama mbuli ụgwọ ụlọ ahụ agaghị agafe pasentị iri.
Nke a pụtara na onye bi n'ụlọ ahụ ga-akwụ ụgwọ ụlọ ọhụrụ karịrị pasentị abụọ n'ihe ọ na-akwụ na mbụ.
Iji maa atụ, ọ bụrụ na a na-akwụ ₦500,000 kwa afọ n'ụgwọ ụlọ, mbuli pasent iri ga-abụ ₦50,000, nke ga-eme ka ụgwọ ụlọ ọhụrụ bụrụ ₦550,000 kwa afọ.
Atụmatụ a ga-enye onye nwe ụlọ ohere iweghachịte ụfọdụ ego ndị o mefuru n'imezigharị ụlọ ya.
Ego ole a ga-akwụ ndị 'agent' na ndị ọkaiwu nyere aka chọta ụlọ
Iwu ọhụrụ a kwuru na ego ole a ga-akwụ ndị nyere aka chọta ụlọ a kpọrọ 'agent fee' agaghị akarị pasentị ise (5%) ego ole ụgwọ ụlọ ahụ bụ kwa afọ. A ga-akwụ ụgwọ a naanị n'otu afọ ọ gaghị akarị ya.
N'aka nke ọzọ ego a ga-akwụ onye ọkaiwu nyere aka n'ịhazi nkwekọrịta n'etiti onye nwe ụlọ na onye chọrọ ibi n'ụlọ agaghị akarị pasentị iri (10%) n'ego ole a na-akwụ n'ụgwọ ụlọ kwa afọ.
Tupu mmadụ abụrụ onye 'agent' n'Enugu State, onye ahụ ga-edebanye aha ya ma nata akwụkwọ ikike na ngalaba Enugu State Housing Development Corporation.
Akwụkwọ ikike ahụ bụ nke a gaa na-enwogharị kwa afọ ọbụla.




























