Robert Pattinson abụrụla James Bond ọhụrụ

Ebe foto si, Getty Images
A kpọpụtala onye ihe ejije America bụ Robert Pattinson dịka James Bond ọhụrụ
Ozi mgbasaozi e wepụtara maka ya na-ekwu na onye ejije mba Britain ahụ gbara afọ 40 kwuru sị, " ịsị na nke abụ mmezu nrọ ya bụ obere okwu."
Pattinson ga-abụ onye nke asaa na-eme agwa James Bond n'ihe ejije a dịrịla ọtụtụ afọ.
Pattinson kwuru na ozi mgbasaozi o wepụtara sị, "James Bond bụ otu n'ime agwa kachasị na Cinema, inye m ohere ịbụ 007 bụ nnukwu nkwanyere ugwu."
N'ọnwa Mee, afọ a, ụlọọrụ 'Amazon MGM Studios' mara ọkwa na ha na-achọ onye game agwa ahụ dịa ha nwetara ikike ime ihe ejije ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Kepukepu na-ekwubu na a ga-eji onye ọzọ tichie Daniel Craig , ebe ndị a na-akpobu aha ha gụnyere ndị ejije dịka Josh O'Connor, Callum Turner nakwa Jack Lowden bụ ndị a sị na anwalere rue agba nke ikpeazụ.
Kemgbe afọ ise, Daniel Craig kwuru na ya agaghị emekwa agwa James Bond ọzọ, okwu a kpụ n'ọnwụ bụ onye ga-enwetali ohere ime agwa so na agwa kachasị n'ihe ejije n'ụwa?
Ndị okwu ihe ejije doro anya na-ekwu na ihe e ji nye Pattinson agwa bụ iji nweta ndị Genz na ndị ọzọ na-eto eto.
Robert Pattinson bụ onye ọtụtụ ma dịka 'R-Patz' bụ onye na-ewu ewu kemgbe o mechara agwa 'vampire Edward Cullen' n'ihe ejije 'Twilight' nke ya na onye ihe ejije America bụ Kristen Stewart soro mee.
O sonyekwara na Harry Potter na Goblet of Fire. bụ ebe o mere agwa ' Hufflepuff hunk Cedric Diggory" .
O sonyekwara na 'Dune: Nke Atọ nakwa 'The Batman' bụ ihe ndị mere ha ji chọọ iji ya dọta ndị ntorobia na ihe nkiri James Bond.































