Doris Ogala: 'Gbaghara m, aganubeghị m mkpọrọ mbụ'

Doris Ogala Umezurike
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onye na-azọ ọkwa gọvanọ Abịa state n'aha otu AAC bụ Doris Ogala Umezuruike esekpurula ala n'ihu ọkaikpe Jọstịs Akintayo Aluko nke Ụlọikpe Ukwu nke Lagos State rịọ mgbaghara ụbọchị Friade maka agwa ya n'ụbọchị Wenezde oge a kpụtaburu ya ụlọikpe ahụ.

Nke a na-abịa dịka Ọkaikpe Aluko gbarụrụ ihu maka agwa Ogala kpara ụbọchị mbụ a kpụtara ya n'ụlọikpe ahụ (Oktoba 28,2026.)

A kpụpụrụ Ogala ụlọikpe n'ụbọchị Wenezde maka ebubo metụtara iji ịntanet eyi mmadụ egwu maka zipụta foto ọtọ ụkọchukwu Chris Okafor na soshal midia .

Ọkaikpe nyeburu iwu ka a tụnye ya na mkpọrọ rue ụbọchị Fraide oge ikpe ahụ ga-amalite.

N'ụbọchị Fraide ka ikpe ahụ malitere, Ogala rịọrọ Ọkaikpe Aluko arịrịọ sị, "Eweelara m iwe ,Onye nwee m. Ana m arịọ mgbaghara maka agwa ọjọọ m kpara."

"Aganubeghị m mkpọrọ mbụ , atụghị m anya na m ga-eme ụdị ihe ahụ. Ọ gaghị eme ọzọ."

Mana na-agbanyeghị arịrịọ ya, a tụghachiri ya n'ụlomkpọrọ dịka e higharịrị ikpe metụtara ntọhapụ ya ka o si n'ụlọ na-abịa ikpe nke Bekee kpọrọ, 'bail', gaa abalị isii nke ọnwa Novemba, afọ 2026.

Etu e si tụnye Doris Ogala na-azọrọ AAC ọkwa Gọvanọ Abia state na mkpọrọ
Doris Ogala

Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị na Lagos atụnyere onye ihe ejije Nollywood mabụrụkwa onye na-azọ ọkwa gọvanọ Abia steeti n'okpuru otu AAC bụ Doris Ogala Umezuruike na mkpọrọ n'ụbọchị Wenezde.

A tụnyere Ogala n'ụlọmkpọrọ maka ebubo metụtara iji ịntanet emekpa ụkọchukwu a ma ama nwe ụlọụka 'Mountain of Liberation and Miracles Ministries' bụ Chris Okafor ahụ nke Bekee kpọrọ 'cyberbulling' nakwa ịgbalị ịnapụta ụkọchukwu ahụ ego.

Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ka Ogala bụ akpa n'isi na-agụ egwu sị, "Revolution Dey!"

"E ji iwu emigide obere mmadụ. Anaghị atụ egwu ị ga mkpọrọ. Aga m apụta."

Ụlọọrụ Ọkaiwu nke Lagos state na-ebo ya ebubo na o ji foto ọtọ nakwa ozi intanet eyi ụkọchụkuw ahụ egwu.

Dịka a kpurụ ya ụlọikpe, ọkaiwu nke steeti bụ Tolulope Mokolu, gwara ụlọikpe na Ogala ma ụma gbaa foto ọtọ Ụkọchukwu Okafor n'anwụ n'ọbaozi soshal midia intanet na anataghị ya ikike n'agbata ọnwa Septemba afọ 2024 na Maachị afọ 2026.

Mana Ogala gọrọ sị na ikpe amaghị ya n'ebubo ahụ.

Akụkọ ka na-abịa