Chelsea egosila Man Utd nkarị ma bulie iko FA

Chelsea
Nkọwa foto, Penarity Eden Hazard nyere mere ka Chelsea nwee ike ibuli iko FA nke ugboro asatọ
Mgbe e biputara ya

Chelsea emeriela Manchester United iji bulie iko FA bụ naanị iko ha nwetara n'afọ a.

Eden Hazard bụ onye egwu ndị Chelsea gbakpuru penariti o nwetara, nke mechara bụrụ naanị goolu e nyere na ngwụcha asọmpi FA nke afọ a.

A gufuru goolu Alexis Sanchez bụ onye egwu Arsenal nyere maka na ọ pụrụ 'offside'.

Ogbu opi bụ Michaeel Oliver ji VAR mee nyocha mere e ji gufuo goolu a.

Onye egwu ndị Manchesyer United bụ Paul Pogba, tafuru isi ọ tara n'ihu poostu, nke kara ime ka ndị otu ya sata goolu Hazard.

O buru aka n'isi ka ọ hụrụ na ihe o mere enyereghị ha aka.

Antonio Conte na Jose Mourinho
Nkọwa foto, Nke a bụ mbụ Jose Mourinho ga-eru ngwụcha asọmpi ma ghara ibuli iko kamgbe o ji bụrụ onye nchịkọta n'England

N'agbanyeghị na Chelsea meriri ndị otu ya, Jose Mourinho bụ onye nchịkọta Man Utd makọrọ Antonio Conte na-achịkọta Chelsea, ebe Mourinho rụburu ugboro abụọ.

Otu Chelsea
Nkọwa foto, Chelsea bulikwara iko FA otu ugboro n'afọ 2006-2007 oge Mourinho bụ onye nchịkọta ha