Unu asaala chi!
Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

Ebe foto si, @Mr_JAGs/Twitter
Aka na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwo Olu ewepụtala atụmatụ ga-akwụsị ụgwọ ezumike nka nyere ndị niile chịburu dịka Gọvanọ nakwa osote gọvanọ na steeti ya.
Ọ kọwara na nke a bụ iji belata ego a na-emefu n'ọchịcị ma tinye ya ebe ọ dị mkpa.
Nke a pụtara ihe mgbe ọ bugaara ndị omeiwu Legọs steeti bọjetị steeti ahụ nke afọ 2021.
Bọọjetị ahụ ga-ewe ihe ruru otu tarịị naira na ụma ise n'uju ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Dịka ndị otu PENGASSON kpọrọ oku ka ndị otu ha malite abụbọ ọrụ na ebe dị iche iche na-ala anyị, ya bụ oku amịtabeghị mkpụrụ n'Enugwu.
Ụlọọrụ niile ebe a na-ere mmanụ ụgbọala n'Enugwu ka na-erekwa mmanụ ụgbọala dịka ọ dị na mbụ. BBC gagharịrị ebe niile n'ime Enugwu dịka New haven, Obiagu, Asata, Abakpa nakwa Gariki were hụ na ndị na-ere mmanụ ụgbọala ka na erekwa ya ka ọ dị n'mbụ.

Ebe foto si, Bashir/Ahmed
Onyeisiala Muhammadu Buhari anabatala ọgwụ coronavirus ọhụrụ e wepụtara nke gosiri ikike ọrụ ya ruo pasentị iri itoolu.
Nke a dị n'akwụkwọ ozi onye enyemaka ya pụrụiche na mgbasaozi bụ Garba Shehu wepụtara.
Buharị sị na nke a bụ oke ihe nye ndị ọrụ ahụike na mbaụwa ma kpọọ oku ha mbaụwa gbakọọ aka ọnụ n'ịhụ na ọgwụ a ruru mba niile aka etu kwesịrị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, Getty Images
Amadou Toumani Tourịe bụbu onyeisiala mba Mali anwụọla dịka ọ gbachara afọ iri asaa na abụọ.
Ọ nwụrụ n'isi ụtụtụ ụbọchị tuzde na mba Turkey ebe ọ na-anata ọgwụgwọ.
Ọ wuchiri na Istanbul bụ isi obodo Turkey n'ụbọchị ole na ole gara aga.
Tupu ọ hapụ Mali, a wara ya obi n'isi obodo ha bụ Bamako.
Tounami chịrị mba Mali site n'afọ 2002 ruo afọ 2012 mgbe ndịagha nke ọchịagha Amadou Haya Sanogo nọ n'isi ya ji aka ikike chụpụ ya n'ọkwa.
A na-etu Touré aha n'ihi etu o si na-apụ ndịagha ikike ma were nye ndị nkịtị site n'ịhazi ntuliaka n'afọ 1992.
A na-akpọ ya "onye agha ọchịchị onye kwuo uche ya".

Onyeisi ụlọọrụ INEC bụ Mahmood Yakubu enyefela ọrụ ya n'akaAhmed Mu'azu ruo mgbe ndị ụlọomeiwu ga-emecha nyochama nyegharịa ya ọkwa ahụ.
O mere nke a n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja n'ụbọchị Mọnde dịka o nyefere Mu'azu bụ otu n'ime ndị kọmishọna ụlọọrụ Inec nwere.
Yakubu sị na nke dị n'ihu na ọ ga-arịtu mgbe oge ya gwụrụ n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Nọvemba, 2020. Mana ọ ga na-eche ruo mgbe ndị omeiwu ga-akwado ya.
Cheta n’ọnwa Ọktoba ka Onyeisiala Buhari họpụgharịrị Yakubu ịbụ onyeisi ụlọọrụ Inec nke ugboro abụọ.
Unu abọọla chi? Biko buru oche gị bịa nọnyere anyị n'ọgbakọ nke taa.
Anyị abịala n'isi njedebe nke mgbasa ozi taa.
Biko sonyekwara anyị ọzọ echi.
Ndewo.
Mmadụ Naịjirịa isii nọ n’ụlọ mkpọrọ na mba United Arab Emirates dịka amara ha ikpe ịzịgara otu Boko Haram ego enyemaka.
A mara ha ikpe a n’afọ 2019 mana ezinaụlọ ha gwara ụlọ ntaakụkọ Daily Trust na aka ụmụ nwoke ahụ dị ọcha.
Ikpe ahụ mara ha kwuru na ha zigaara otu ahụ na-eyi ndụ egwu ihe ruru dọlla puku narị iri asaa na iri asatọ na abụọ.

Ebe foto si, Getty Images
Nnyocha egosila na ọgwụ mgbochi mbụ e mepụtara maka ọrịa Coronavirus na-arụ ọrụ ruo pasentị iri itoolu (90%).
Ụlọọrụ Pfizer na BioNTech, bụ ndị mepụtara ọgwụ mgbochi a, kwuru na nke a bụ nnukwu ihe aṅụrị maka mmụta sayensị nakwa ụwa niile gbaa gburugburu.
E nyochara ọgwụ mgbochi ahụ n'ahụ mmadụ 43,500 ndị nọ na mba isii, mana onwebeghị mkpesa ọbụla ha wetara.
Ndị ọkachamara kwuru na ọ bụ ọgwụ mgbochi bụ ụzọ a ga-esi pụta n'ọrịa coronavirus nke ndị otu ahike mbaụwa bụ 'World Health Organisation' kpọpụtara dịka ọrịa ozuruụwa ọnụ.
Ka ọ dị ugbua a na-enyocha ọgwụ mgbochi ruru iri na abụọ n'akụkụ ụwa niile maka ọrịa coronavirus, mana nke a bụ nke mbụ gosiri mpụtara dị mma.

Onye bụbu onye ndu otu egwu bọọlụ Kameruun bụ Samuel Eto'o agbanahụla ọnwụ na mmerụ ahụ n'ihe mberede okporoụzọ mere na Sọnde.
Nwamadị a gbara afọ 39 si na Douala na-aga Bafoussam dịcha n'ime Kameruun mgbe ụgbọala ọkwụọtọ ekele eze ya na ụgbọala bus sọkatara isi.
Ihu ụgbọala ya mebiri ebe ọ dị ukwuu mana o nweghj onye merụrụ ahụ.
Ọnụ na-ekwuru Eto'o bụ Frank De Happi gwara BBC na o nweghi ihe mere Eto'o na ọ gaala nyocha ahụ n'ụlọọgwụ.
Eto'o kpebiri ka ọ ghara ịkpọpụ ọkwọ ụgbọala ahụ n'ụlọikpe bụ onye chọburu ịgbaọsọ mgbe ihe ahụ mere tupu ndị uweojii anwụchie ya.
Ihe onyonyo siri ka Eto'o na-asị ọkwọ ụgbọala ahụ ka o jiri nwayọọ na-agba n'ụzọ ma ndụ ya na ndị o bu.

Otu n’ime ndị kachasị baa ụba n’Afrịka bụ Patrice Motsepe nke Saụt Afrịka sị na ọ chọrọ ịzọ ọkwa onyeisi otu egwuregwu bọọlụ n’Afrịca bụ Confederation of African Football.
Motsepe bụ onyeisi otu egwuregwu Mamelodi Sundowns nke Saụt Afrịka bụ onye nke atọ ga-etinye uche n'ịzọ ọkwa, dịka Ahmed ji ọkwa ugbua na acques Anouma nke Ivory Coast.
Motsepe bụ onye nke iri kachasị enwe ego na mba Afrịka dịka ụlọọrụ Forbes si depụta na ego ya ruru ijeri dọla 2.4.
Onyeisi otu egwuregwu bọọlụ n'Afrịka bụ Danny Jordaan sị na Motsepe bụ onye ha ma kachasị tozuo oke inwete ọkwa idu ndị Caf.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ dịka a ga-asị na ọrịa coronavirus eselitewala isi n'Afrịka ọzọ dịka o si eme na mba Yurope dị iche iche.
Nke a bụ maka na ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa a na mpaghara ụfọdụ kwa ụbọchị arịwakwala ọrụ ọzọ.
Na Naịjirịa ndị butere ọrịa a n'ụbọchị Sọnde abalị asatọ nke ọnwa Nọvemba bụ narị atọ.
N'otu aka ahụ ọnụọgụgụ ndị butere coronavirus agbagoola elu na Gana site na mmadụ iri abụọ na ise ruo otu narị na iri atọ.
Onyeisiala ha bụ Nana Akufo-Addo sị na gọọmentị ga-eke nkwụcha iji belata mfesasị ya ọzọ.
Ọ sị na nyocha ahụ ga-amalitekwa n'uju, ebe a ga-agba mbọ chọpụta mmadụ niile ha na ndị bu ya nwere mmekọ
Anyị ji aka na unu hiri ụra nke ọma?
Biko gbalịa nọnyere anyị n'ụbọchị taa.
Daal dịka ị nọnyere anyị taa...ka ọ dị echi

Ebe foto si, NYSC Twitter
Adenike Adeyemi bụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi ngalaba na-ahụ maka ndị na-efe ala nna ha bụ Nigerian Youth Service Corps ekwuola na ha agaghị emechi ogige ọzụzụ NYSC ọbụla ha chọpụtara otu onye bu Coronavirus na ya.
O kwuru na ọ bụ dịka onyeisi ngalaba NCDC bụ Chikwe Ihekweazu kwuru nke a dịka ha mere nzụko n'ihe onyonyo maka ndị ntoroọbịa na-akwado ife ala nna ha.
O kwuru na ha dị njikere dịka NYSC na NCDC ga-etiko aka ọnụ hụ na enweghi onye ga-ebu ọrịa coronavirus ga-abata ogige ọzụzụ ahụ.

Aka chịburu Abia steeti bụ Theodore Orji ekwuola na Onyeisiala Muhammadu buhari kwesịrị ịkpọ ndị otu 'Indigenous People of Biafra' ka ya na ha nwee ọgbakọ gbasara ihe bụ iwe ha na Naịjirịa.
Dịka ụlọntaakụkọ Punch si depụta, Orji kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Sọnde n'Abuja.
O kwuru na ihe ga-eme ka iwe dị ndị mmadụ n'obi dajụọ bụ ma ọ bụrụ na gọọmentị kpọọ ha ka a nọrọ ala kpazie ihe bụ iwe ha.
O kwuru sị: "Ọ bụrụ na e nwere ndị iwe dị n'obi, onyeisiala kwesịrị ịkpọ ha ka ya na ha kpaa."
"O kwesịrị ịchọpụta ihe bụ iwe ha ma gbaa mbọ etu ọ ga-esi mezie ya."
"Ọ bụghị ihe ọjọọ ma onyeisiala kpọọ ndị Ipob ka ha nwee ọgbakọ. Ọ bụrụ na ọ kpọghị ha, ha ga-aga n'ihu na-awa ya isi."
"Obi adịghị anyị (ndị Igbo) mma na mpaghara ndị ọzọ nwechara steeti isii, anyị enwee naanị ise. O gosiri na a na-emegbu anyị emegbu. Ọ bụ ya na-akpata esemokwu na-adapụta na mpaghara anyị."

Ebe foto si, Reuters
Eze Obi Chukwuka nke mbụ bụ eze obodo Ute-Okpu nke dị n'okpuru ọchịchị Ika North East nke Delta steeti ekwuola na ọ bụ ọrịa ịba ọchananya, nke Bekee kpọrọ 'Yellow Fever', gburu ihe ruru mmadụ iri na ise n'obodo ya.
Chukwuka kwuru na ndị a nwụrụ n'ime ụbọchi abụọ ma gosikwa njirimara ọrịa ahụ nke gụnyere ọgbụgbọ tupu ha anwụọ
O kwuru na gọọmentị ga-ezitere ha ọgwụ mgbochi a n'ụbọchị Tuzde.
O kwukwara na ha na-ebuga ndị butere ya bu ọrịa n'ụloọgwụ dị n'Agbọ maọbụ ụloọgwu gọọmentị etiti nke dị n'Asaba.
BBC Igbo kpọtụụrụ kọmịshọna na-ahụ maka ahụike na Delta steeti bụ Ononye Mordi ka o tinye ọnụ na ya bụ okwu.
Moord kwuru sị " Eee ọ bụ ọrịa yellow Fever gburu ihe dịka mmadụ iri atọ n'ụfọdụ obodo na Delta steeti"
O kwuru na ọ bụ n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Oktoba ka ha nwetara mkpesa maka ya bụ ọrịa.
Mordi kwukwara na gọọmentị Delta steeti ga-agba ọgwụ mgbochi ọrịa a n'ebe ọ dị ukwu na anaghị ndị mmadụ ego ọbụla.

Ebe foto si, Imo State New Media
Ndị Gọvanọ ọwụwa anywanụ Naịjirịa, onyeisi ndị uweojii bụ Muhammad Adamu na ndị ọzọ ónú na-eru n'okwu na Naíjiría enweela nzụkọ gbasara ọdịmma ndị Igbo niile.
Onyeisi ndị ọrụ onyeisiala bụ Ibrahim Gambari nọchịrị anya onyeisiala sokwa na ndị gara nzụkọ ahụ.
Na nzụkọ ahụ nke ha nwere n’obi gọọmentị n’Enugwu, ha kpọrọ oku ka ewepụta atụmatụ ga-ekpochapụ ndị omekome na ndị Fulani bu egbe ejegharị n’ala Igbo niile.
Ha kelekwara onyeisiala maka ọrụ na-aga n'ihu n'akwammiri Niger nke abụọ, ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dí n'Enugwu, okporoụzọ awarawara si Enugwu gawa Porthacourt nakwa ọrụ ndị ọzọ na-aga n'ihu na mpaghara Ọwụwa Anywanwụ.