International Flights: Ewepụla mmachị amachiri ụgbọelu Lufthansa na ndị ọzọ' - Hadi Sirika

Ebe foto si, Hadi SIrika / Twitter
Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu bu Hadi Sirika edepụtala n'akara Twitter ya na ha na mịnịstry na-ahụ maka ahụike, CACOVID na ngalaba PTF na-agba mbọ ịhụ ma ha e nwereike ịmpepe ọdọ ụgbọelu Kano. Enugwu na nke Pọthakọt tupu afọ a agaa.
N'otu aka ahụ ọ kwukwara na ha enyela ụlọọru ụgbọelu Lufthansa, Air France/KLM ikike ka ha bido ọrụ na Naijirịa.
Ha nyekwara Qatar Airways ikike ka ha bido ọrụ n'ọdọ ụgbọleu nke dị n'Abuja.


















