Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Gịnị na-esere ndị Ọkada, ndị agboro na ndị ọrụ nchekwa na Festac, Legọs?

    Ndị ọkwọ ọgbatumtum

    Ebe foto si, Getty Images

    N’ehihie a ka akụkọ ọgbaghara dapụtara n’ebe a na-akpọ Apple Junction dị Festac nke Legọs Steetị.

    A malitere ịnụ ụda egbe aghara aghara, ịmụ ụkwụ ‘tire’ ụgbọala ọkụ nke mere ka ndị bi n’ogbe ahụ ji na-azọ isi onwe ha.

    Okporoụzọ e mechiri emechi

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo bi nso n’ogbe ahụ sị kepu kepu ọ nụrụ bụ na ọgbaghara a bụ n’etiti ndị uweojii na ndị ọkwọ ụgbatumtum bụ Ọkada.

    Ọ sị na ọ nụrụ ụda egbe ma hụkwa dịka a mụnyere ọtụtụ ụkwụ ‘tire’ ụgbọala ọkụ.

    Ọ sị na ọ hụkwara ka ndị ọgbatumtum bucha ngwa ọgụ dị iche iche na-agba n’okporoụzọ.

    Ndị ọgbatumtum nọ n'okporoụzọ

    Akụkọ kwuru na ndị uweojii jichiri ọgbatumtum otu nwoke, nke mere ndị ọgbatumtum ọzọ na-eti mkpu sị ka e mechie uweojii “end police”.

    Na ndị a chọkwara ịgba ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ọkụ nke mere ndị uweojii ji na-agba egbe iji chụsasịa ha.

    Ndị uweojii a mechisiri ụzọ e si abata maọbụ agafe n’ụlọọrụ ha.

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo mekwara ka anyị mata na ndịagha ejupụtalan’ụzọ niile gbara ebe ahụ gburu gburu.

    Ọ sị na ụgbọala niile na-agbafe ebe ahụ tinyechara akwụkwọ ahịhịa ndụ ndụ n’ihu ụgbọala ha.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Olumuyiwa Adejobi azaghị ekwentị ya mgbe BBC Igbo kpọrọ ya.

  2. Gọọmentị Legọs adọọla ndị isi ụka aka na ntị ka ha gbochie coronavirus ịlọghachi ọzọ

    Ndị Ụka

    Gọọmentị Legọs steeti adọọla ndị ndu otu okpukperechi dị icheiche aka na ntị ka ha kpachapụ anya iji gbochie ọrịa coronavirus ịmalite ifesa ọzọ.

    Ọkwa a gọọmentị mara bụ ka ndị isi ụka gbaa mbọ hụ na ndị mmadụ na-edebe iwu niile etinyere maka mgbochi mfesa coronavirus.

    Kọmịshọna na-ahụ maka okwu gbasara ezinụlo na Legọs steeti bụ Anofiu Elegushi kwuru nke a ma sịkwa na gọọmentị Legọs ga-eri ndị ọbụla na-erubeghi isi n’usoro nchekwa ha hibere iwu.

    Elegushi kwuru sị: “Anyị niile ma nke ọma ihe mba dịka Amerịka, Fransi na Briten na-agabiga dịka coronavirus na-akpa mkpamkpa nke abụọ, anyị achọghị ka o mee ebe a”.

    Ọ rịọrọ ndị mmadụ ka ha na-eyi mkpuchi imi ha, na-akwọ aka ha ma na-enye mmadụ ibe ha ohere ziri ezi iji gbochie mkpamkpa ọrịa coronavirus.

  3. Biden agbaala afa maka coronavirus

    Biden na Trump

    N'ofesi, Onye ana atụanya na ọ ga-abụ onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ekwuola na ọ bụrụ na Donald Trump nke nọ n'ọchịchị ugbua ka jisike na-akpụ ụkwụ n'ala maka ịnyefe ya ọchịchị, na nje coronavirus nwereike Igbu ọtụtụ mmadụ.

    Biden sị na ya bụ ọrịa kwesiri ijikọ aka ọnụ, ọ bụghị ntisa Trump na ewete.

  4. NLC agbaala egbe ọnụ maka ọnụahịa mmanụ ụgbọala riri elu

    Nigeria Labour Congress (NLC) bụ otu jikọtara ndị ọrụ niile na Naịjirịa adọọla gọọmentị aka na ntị ka ha were ọsọ were ije wechie ọnụego mmanụ ụgbọala ha buliri.

    Onyeisioche otu a bụ Ayuba Wabba katọrọ ya bụ mbuli mana onweghị ihe okwuru ga-eme ma gọọmenti ebudaghị ya.

    NLC

    Ebe foto si, Getty Images

  5. 'Ọnụahịa mmadụ ụgbọala ririelu ga-amara ndị mmadụ ahụ mgbe adịghị anya' - Timipre Sylva

    Mmanụ ụgbọala

    Ebe foto si, Reuters

    N'onu nke ya Minista na ahụ mmaka mmanụ agbidi nke nta bụ Timipre Sylva ekwuola na ya bụ ọnụahịa mmanụ ụgbọala riri elu ga-amara ndị mmadụ ahụ mgbe adịghị anya.

    Sylva sị na ọ bụ ọnụahịa mmanụ agbidi na-ebute ọnụahịa mmanụ ụgbala ji arị elu.

  6. Unu asaala chie e! Taa bụ afọ. Afọ biko wetere anyị ihe ọma taa. Iseeee!

  7. Ka chi fo

    N'ebe a ka anyị ga-apịachi nke taa.

    Echi ga-ewetara anyị ihe ọma.

    Ka emesịa.

  8. A chọrọ m ịzụ Arsenal tie ha ịgba m tiri Enyimba - Orji Uzor Kalu

    Orji Uzor Kalu

    Ebe foto si, Facebook/Orji Uzor Kalu

    Nkọwa foto, Orji Uzor Kalu

    Aka chịburu Abia steeti bụ Orji Uzor Kalu ekwuola na anya ya dị n'otu egwuregwu bọọlụ Arsenal nke mba Ịngland.

    Kalu kwuru nke a n'akara Facebook ya na mgbede Mọnde.

    O kwuru na ya chọrọ imere Arsenal ihe o meere otu egwuregwu bọọlụ Enyimba nke Aba oge ọ nọ n'ọchịchị.

    Cheta na Enyimba chakere nnọọ ka ọnwa oge Orji Uzor Kalu bụ gọvanọ Abia steeti.

    Kalu kwuru sị: "Ihe ọma niile anyị mere n'otu egwuregwu bọọlụ Enyimba malite n'afọ 2000 ruo 2007 mere ka mmasị m n'ebe egwuregwu bọọlụ nọ gbalie."

    "Dịka ide nke egwuregwu n'Afrịka, ana m eche echiche ịzụrụ oke pasentị iri atọ na ise (35%) n'Arsenal."

    "Ebumnobi anyị bụ ibuli iko Champions League nakwa iko Premier Legue dịka anyị si mee n'Enyimba."

    Malite n'afọ 2000 ruo 2007, Enyimba buru iko asọmpi bọọlụ Naịjirịa a kpọrọ 'Nigeria Premier League' ugboro ise: 2001, 2002, 2003, 2005, 2007.

    Ha bukwara iko 'Super cup' abụọ (2001 na 2003), iko 'Champions League' nke Afrịka abụọ (2003 na 2004) nakwa iko 'Super Cup' nke Afrịka abụọ (2004 na 2005)

    Orji Uzor Kalu abụghị onye Naịjirịa mbụ chọrọ ịzụta oke n'Arsenal.

    Ide ego bụ Aliko Dangote ekwukwaala ugboro ugboro na ya chọrọ ịzụrụ otu egwuregwu ahụ, mana o nwebeghị isi.

    Ka anyị lewenụ anya ma Orji Uzor Kalu ọ ga-etinye ego ya ebe o tinyere ọnụ ya.

  9. 'Ọgwụ mgbochi coronavirus kpatara ọnụahịa mmanụ ụgbọala ji gbagoo' - Mịnịsta

    Timipre Sylva

    Ebe foto si, Twitter/Timipre Sylva

    Nkọwa foto, Timipre Sylva

    Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbidi bụ Timipre Sylva ekwuola na ọ bụ n'ihi nchọpụta a chọpụtara ọgwụ mgbochi coronavirus kpatara ọnụahịa mmanụ ụgbọala ji gbagoo na Naịjirịa.

    Sylva kwuru nke a oge ndị ntaakụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ n'obi gọọmentị n'Abuja.

    Ọ kọwara sị: "Oge akụkọ pụtara na achọpụtala ọgwụ mgbochi Covid-19, nke a mere ka ọnụahịa mmanụ agbidi n'ahịa mbaụwa gbalie."

    "Ọ bụ nke a kpatara ọnụahịa mmanụ ụgbọala ji gbagoo na Naịjirịa, n'ihi na ọ bụ mmanụ agbidi ka e ji emepụta mmanụ ụgbọala."

    "N'oge mbụ, gọọmentị ji aka ha tinye ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Naịjirịa, mana ọ dịghịzi etu ahụ ugbua n'ihi na gọọmentị emeela 'deregulation'."

    Mmanụ ụgbọala bụzị otu narị naịra na iri asaa (N170) maka otu lita ugbua. N'izuụka gara ọ bụ otu narị naịra na iri isii (N160).

  10. Ọnụahịa ihe niile na Naịjirịa arịala elu ọjị - NBS

    Nwaanyị na-ere azụ.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ihe oriri so na ihe kacha gdaa oke ọnụ n'ahịa Naịjirịa taa

    Ngalaba ngụkọ na Naịjirịa bụ 'National Bureau of Statistics' ekwupụtala na ọnụahịa ọtụtụ ihe (inflation) agbagoola gafee pasentị iri na anọ na ụma abụọ (14.23%) n'ọnwa Ọkutoba.

    Nke a bụ mbuli ọnụ ahịa kacha njọ na Naịjirịa n'ime afọ abụọ na ọnwa isii.

    N'akwụkwọ ozi ndị NBS zipụtara n'ụbọchị Mọnde, ha kwuru na 'inflation' nọbụ na pasenti iri na atọ na ụma asaa (13.7%) n'ọnwa Sepụtemba.

    Kamgbe Naịjirịa kpọchiri oke ala ya n'afọ 2019, ọnụahịa ngwaahịa dị icheiche na-arị arị, mana nke a kawanyere njọ n'ihi ọrịa coronavirus nakwa ndatu ọnụahịa mmanụ agbidi na-adatu n'ụwa.

    Dịka ndị NBS si kwuo, otu n'ime ihe ndị ọnụahịa ya kacha rịa bụ ihe oriri dịka buredi, ọka, nduku, ji, anụ, azụ, mkpụrụosisi, akwụkwọ nri, na ihe ndị ọzọ.

    Ihe ọzọkwa gbaliri nnọọ elu bụ ọnụego njem ụgbọelu, ụlọọgwụ, njem ụgbọala, ọgwụ, ụgbọala, nruzi ụgbọala nakwa akụrụngwa e ji edozi ya.

    N'ọnwa Ọkutoba, ebe ihe kacha galaa ọnụ bụ na Sokoto, Edo, nakwa Akwa Ibom, mana ebe ọnụahịa arịchaghị elu bụ na Oyo, Taraba, na Jigawa.

  11. Gọọmentị Legọs arịọla gọọmentị etiti ego iji dozie ihe e mebiri n'ọgbaaghara End SARS

    Babajide Sanwo-Olu

    Ebe foto si, Twitter/Babajide Sanwo-Olu

    Nkọwa foto, Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu na-egosi ndị Mịnịsta ọtụtụ ihe e mebiri na steeti ahụ

    Gọọmentị Legọs steeti ekwuola na ihe e mebiri n'ọgbaaghara dapụtara dịka ndị ntorobịa mere ngagharịiwe 'End SARS' n'ọdị nso a.

    Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu kwuru nke a n'ọgbakọ e nwere n'ụbọchị Mọnde iji kpaa etu a ga-esi mezie ọtụtụ ụlọorụ, ụgbọala nakwa akụrụngwa gọọmentị e mebiri.

    Ọ rịọrọ arịrịọ ka gọọmentị etiti wepụta ego pụrụ iche n'ime bọjeetị 2020 iji nyere Legọs steeti aka.

    Sanwo-Olu kwuru sị: "Ọgbaaghara a metụtara akụkụ niile anyị si ebi ndụ na Legọs steeti dịka ụlọọrụ gọọmentị nwe, ihe ọkpụkpụ e ji chọọ obodo mma, ụlọ ebe a na-echekwa ihe mgbe ochie, ụgbọala gọọmentị, nakwa ọtụtụ ụlọahịa na ụlọ obibi ndị mmadụ nkịtị."

    "Ọgbaaghara a adọghachila Legọs steeti azụ nnụkwurunnụ ijeri naịra, mana anyị nwere olileanya na anyị ga-apụta na nnukwu ọdachi a."

    Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo, nọkwa n'ọgbakọ a wee kwe nkwa na gọọmentị etiti ga-enye gọọmentị Legọs nkwado niile dị ha mkpa iji wulikwaa akụnụba steeti ahụ.

    Osinbajo kwuru na ndị ọchịchị Legọs kweskwara iwuli ntụkwasịobi ndị mmadụ nwere n'ebe ha nọ.

  12. Nkeji Coronavirus

  13. Ụmụ Naịjirịa ruru 753 chọrọ isi mba Ghana lọghachi

    Abike Dabiri-Erewa

    Ebe foto si, Twitter/Abike Dabiri-Erewa

    Nkọwa foto, Abike Dabiri-Erewa bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi n'ofesi

    Dịka okwu mmekpa ahụ a na-emekpa ụmụ Naijirịa bi na mba Ghana ka na-arị elu, ụmụ Naijirịa ruru narị asaa na iri ise na atọ ekwuola na ha chọrọ isi Ghana lọghachi.

    Ọ bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi n’ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị Channels TV nwere n'ụbọchị Mọnde.

    Dabiri-Erewa kwuru na ndị Mịnịsta atọ ya bụ ihe gbasara na-atule etu ha ga-esi gaa kpọlata ndị ahụ chọrọ ịlọghachi ma marakwanụ etu gọọmentị ga-esi nyere ha aka.

    O kwuru sị: "Mmadụ narị asaa na iri ise na atọ bụ ndị binyere aka n'akwụkwọ ma kwuo na ha chọrọ ịlọghachi."

    "Ndị Mịnịsta atọ okwu a gbasara enweela mkparịtaụka ugboro ugboro iji mata ihe ọzọ a ga-eme."

    "Ugbua ndị a kwuru na ha chọrọ ịlọghachi obodo ha, nsogbu adịghị ya. Ha bụ ndị Naịjirịa, obi dị anyị ụtọ na ha chọrọ ịlọghachi, mana ọ dịghị mma ka ha lọghachi na-enweghị ihe ọbụla anyị kwadooro ha."

    Dabiri-Erewa kwukwara na ọ bụghị maka okeala Naịjirịa nke gọọmentị etiti kpọchiri kpatara ụdị agwa gọọmentị Ghana na-akpa.

    O kwuru na o teela ya bụ okwu malitere, nke onyeisiala Muhammadu Buhari na onyeisiala mba Ghana bụ Nana Akfuo-Addo tinyere ọnụ na ya.

    Mana ya bụ okwu ka na-enye nsogbu ruo taa.

  14. Olileanya Inglandi nwere iru agba nke ikpeazụ na Uefa Nation's Lig akpụọla afọ n'ala

    England na Belgium

    Ebe foto si, Getty Images

    N'egwuregwu, n'Uefa Natons League agbara ụnyaahụ, ji ọkpụ goolu abụọ Merie England.

    Nke a pụtara na-olileanya ndị England nwere iwu n'agba nke ikpeazụ egwurrgwu ahụ akpụọla afọ n'ala.

    Ndị Inglandị gbaliri ike ha ịnye goolu maka ya bụ ike ha amịtaghị mkpụrụ.

    Inglandi gbatara ndị nke atọ n'afọ 2019.

  15. Ụgbọ njem urukpuru abụghị nke ndị gọọmentị amalitela njem urukpuru

    Space X

    Ebe foto si, epa

    N'ofesi, mmadụ anọ si mba Amerịka na Japan amapụla njem nchọta na urukpuru bụ nke ha ji ụgbọelu ndị Space X mee.

    Gịnị ka ha na-achọ ebe ahụ? Ụlọọrụ na-eme nchọpụta maka urukpuru nke Amerịka bụ NASA sị na o ruola mgbe ụgbọelu njem urukpuru nke ndị na-achụ ntaego ga-amalitezị ịna aga n'urukpuru.

    Airspace x

    Ebe foto si, Reuters

  16. Ndị ntọ awakpola ụlọakwụkwọ mahadum teknụzụ na Kaduna steeti ebe ha tọọrọ mmadụ atọ

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ntọ awakpola ụlọakwụkọ mahadum teknụzụ dị na Kaduna steeti bụ ebe ha gbara otu onye egbe ma tọrọ mmadụ atọ.

    Onye kwuru nke a bụ Mohammed Jalige bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ onye kwuru na ndị ajọ mmadụ a wakporo mahadum a n'abalị Satọde.

  17. Unu asaala chi ee! Taa bụ Orie ga-ewetere anyị ihe ọma. Ndụ mmiri ndụ azụ. Ndụ nwoke, ndụ nwaanyị

  18. Ka chi fo

    Gbaanụ mbọ soro anyị echi maka akụkọ ndị dị mkpa na-ewu n'ogbe gị.

  19. Gọvanọ Anambra steeti amanyela ụbọchị ezumike maka Nnamdi Azikiwe

    N'ozi ha ziputere, Gọọmentị Anambra steeti kwuru na ha-ekewapụtala otu ụbọchị dịka ụbọchị ezumike iji cheta ma kwanyere Nnamdi Azikiwe ugwu.

    Ụbọchị ahụ ahọpụtara bụ ụbọchị iri na isii nke ọnwa Nọvemba afọ 2020.

    Gọvanọ Willie Obiano

    Ebe foto si, Chief Willie Obiano

  20. Ndị bu egbe egbuola mmadụ 34 n'Itiopia

    Ndị omekome bu egbe agbabupla ihe ruru mmadụ iri atọ na anọ na ọdịda anyanwụ Itiopia mgbe ha wakporo out ụgbọala njem n’ebe ahụ.

    Ngalaba na-ahụ maka ikike ruru onye na mba ahụ na-ekwu na ọtụtụ mmadụ ka nwereike ịnwụ na mwakpo ahụ mere na mgbede ụbọchị satọde.