Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Ka chi fo
Gbaanụ mbọ soro anyị echi maka akụkọ ndị dị mkpa na-ewu n'ogbe gị.
Gọvanọ Anambra steeti amanyela ụbọchị ezumike maka Nnamdi Azikiwe
N'ozi ha ziputere, Gọọmentị Anambra steeti kwuru na ha-ekewapụtala otu ụbọchị dịka ụbọchị ezumike iji cheta ma kwanyere Nnamdi Azikiwe ugwu.
Ụbọchị ahụ ahọpụtara bụ ụbọchị iri na isii nke ọnwa Nọvemba afọ 2020.

Ebe foto si, Chief Willie Obiano
Ndị bu egbe egbuola mmadụ 34 n'Itiopia
Ndị omekome bu egbe agbabupla ihe ruru mmadụ iri atọ na anọ na ọdịda anyanwụ Itiopia mgbe ha wakporo out ụgbọala njem n’ebe ahụ.
Ngalaba na-ahụ maka ikike ruru onye na mba ahụ na-ekwu na ọtụtụ mmadụ ka nwereike ịnwụ na mwakpo ahụ mere na mgbede ụbọchị satọde.
Ka chi fonu!
Ọ bịara ije nwe ụna! Ka ọ dịnụ echi.
Igbos: Ọchịchị 2023 akpalitela aha ndị Igbo na Twitter ọzọ, Ihe ndị mmadụ na-ekwu mere 'Igbos' ji malite iwu na soshal midia
Dịka afọ 2023 na-abịa nso nso, ọtụtụ nkata gbasara ọchịchị Naịjirịa n'afọ ahụ na-apụta.
Nke dapụtara taa metụtara ndị Igbo mekwara ka ha wuo ewu na soshal midia.
Ọ malitere mgbe otu onye bụ Hayatu kwuru na otu APC na PDP agaghị enye ndị Igbo ohere ịzọ ọkwa onyeisiala na otu ha.
Skip X post, 1Hapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Okwu ya kpalitere mmụọ ndị ọzọ nke mere na ụfọdụ mmadụ katọrọ ya na-ekwu na ọ kpọrọ ndị Igbo asị.
Otu onye akpọrọ Dokun Ojomo pụtakwara rịọ ka ndị Igbo gbaghara ya ma kwuo na ndị Igbo agbalịala otu PDP hoo haa.
Skip X post, 2Hapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Afam Deluxo bụ onye a ma ama kwukwara na ọ bụrụ na ha arịọghị mgbaghara na ọ ga-esi imi n'ala hụ na ndị Igbo atụnyeghịrị Atiku na ntụliaka afọ 2023 na-abịa.
Kedụ ihe bụ uche gị maka okwu a a na-ese?
Skip X post, 3Hapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ndị Israel gburu otu onyeisi ndị Al-Qaeda

Ebe foto si, Reuters
N'Ofesi ndị nta akụkọ Reuters ekpuheela na ndị ọrụ nchekwa nzuzo mba Israel egbuola ọnyeisi nke abụọ ndị otu Al Qaeda na mba Iran.
Ha gbagburu Abdullah Ahemed Abdullah n'ụbọchị asaa nke ọnwa ọgụst.
Abdullah bụ onye kpara nkata ogbunigwe gbara n'ụlọ nnọchịte mba Amerịka ndị dị n'afrịka n'afọ 1998.
Agbagburu Abdullah bụ onye eji Abu Muhammad al-Masri mara na nwa ya nwaanyị bụ nwunye nwa Osama Bin Laden bụbu onyeisi otu ahụ.
Ndị mba Iran na-ekwu na akụkọ a abụghị eziokwu n'ihi na enweghị otu Al Qaeda na mba ha.
Ekpuheela ụgbọala ji ọku latrịka agba na Legọs steeti

Ebe foto si, Lagos state Govt/ Twitter
Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu ekpuheela ụgbọala mbụ arụrụ na Naijirịa nke na-eji ọkụ latrịk agba.
Ọ bụ ndị ụlọọrụ Satllions Automobile rụrụ ya bụ ụgbọala nke agha ya bụ Hyundai Kona.
Dịka Sanwo-Olu na-ekpuhe ya ka o kwuru na gọọmentị Legọs steeti ga-arụ ebe ndị mmadụ a ga-aga tinye latrịk na ya bụ ụgbọala.
N'otu aka ahụ ka Sanwo-Olu ji ohere a kwe ndị mmadụ nkwa na gọọmentị ya dị njikere ịrụcha okporo ụzo nke Legọs-Ibadọn ma banye kwa n'agba nke abụo nke ụzọ Aradagun Imeke.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mmadụ 156 ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa

Ebe foto si, NCDC
Ngalaba NCDC edepụtala na ọnụ ọgụgụ ndị buterela Coronavirus na Naijirịa kamgbe o bidoro nọzị na puku iri isii na anọ, narị asatọ na iri asatọ na anọ.
Ndepụta ọhụrụ ha depụtara gosiri na otu onye ọzọ anwụọla sịta n'aka ya bụ ọrịa ebe mmadụ otu narị na iri anọ na isii ọzọ agbakeela ebe otu onye ọzọ nwụrụ n'aka ya bụ ọrịa.
Ị bọọla chị!
Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị
Ụmụ Naijiria 32 mba Germany chụrụ alọtaala
Ụmụ NAijiria 32 mba Jamanị gbara ụgbọ nwa mkpi alọtala na Naijiria ụbọchị Fraide.
Otu onye ọrụ ụlọọrụ na-ahụ maka mbata na ọpụpụ gwara ndị ntakụkọ na ọ bụ ụgbọelu 'EnvelopeAirlines' bulatara ha n'ọdọụgbọelu 'Murtala Muhammed Airport dị na Legos.
Naijiria ga-agbazite ego dị nde dọla 750 n'aka 'World Bank'
Gọọmenti Etiti na-achọ ịgbazitere ego dị nde dọla narị iri asaa na iri ise n'aka ụlọakụ mbaụwa Bekee kpọrọ 'World Bank'.
Mịnịsta na-ahụ maka ego na Bọjeti bụ Zainab Ahmed bụ onye gbara ama ụbọchị Fraide n'Abuja n'emume nhibe kọmịtị na-agba mbọ maka gbapụta na nsogbu Covid-19 dọbara akụnaụba Naijiria.
Ahmed kwuru na ego mgbazite ahụ bụ iji kwalite akụnaụba Naijiria nke Covid-19 kụpịara.
“Niajiria dịka omba kachasị n'Afrịka agaghị arịanwụ ịtọ n'ọtanisi; ịzọta ndụ mmadụ dị nde narị abụọ bụ mgbado ụkwụ ihe anyị na-ekwu."

Ebe foto si, Federal Ministry of Finance
Buhari ebinyeela aka akwụkwọ maka ụlọakụ

Ebe foto si, Ahmad Bashir
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ebinyela aka n'iwu ọhụ nke nke a ga-eji hiwe ụlọikpe pụrụ iche maka ikpe metụtara ego nakwa ụlọakụ nke a kpọrọ 'Banks and Other Financial Institutions Act 2020' na Bekee.
Dịka ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Garba Shehu siri kọwaa, iwu a bụ nhazigharị iwu nke dịbụ mbụ iji were gboo mkpa ndị dapụtara n' ihe gbasara ụlọakụ na ihe so ya n'afọ iri abụọ gara aga.
INEC sị ha ga-emegharị ntuliaka ndị fọrọ afọ n'ụbọchị ise ọnwa Disemba

Ebe foto si, INEC
Ụlọọrụ Inec ekwuola na ha ga-emegharị ntuliaka iri na ise fọrọ afọ na Naịjirịa n'ụbọchị ise nke ọnwa Disemba, afọ 2020.
Nke a dị n'ozi onye ọrụ ha na-ahụ maka nkuzi usoro ntuliaka bụ Festus Okoye deegara ụlọọrụ ntaakụkọ 'Leadership' na Fraịde.
Cheta na ụlọọrụ a kagburu ụbọchị ha kwesịrị ime ntuliaka ndị a maka ọgbaghara dapụtara na Naịjirịa mana site na nzuko ndịisi ha nwere ka e ji hiwe ya.
Okoye sị na ụlọọrụ Inec kelere ndị gọọmentị, ndị ọrụ nchekwa, otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa ndị Naịjirịa maka nkwado e nyere ha.
Ha rịọkwara ndị mmadụ ka ha kwanyere onwe ha ugwu dịka a na-eme ntuliaka ndị a fọrọ afọ.
Lee nụ etu Super Eagles si kwọọ aka tiere ndị Sierra Leone akị

Ebe foto si, Super Eagles/Twitter
Ndị Super Eagles nke Naịjirịa ji gara agara bata n'asọmpi ha ndị Sierra Leone gbara taa mana Sierra Leone gwara ha na ogologo abụghị na nwa m etoola.
Asọmpi a biri n'ọkpụ goolu anọ anọ nke otu egwuregwu abụọ ndị a nyeritara onwe ha.
N'ụzọ ụtụtụ nkeji 4' ka Alex Iwobi ji inye goolu gbapere ọnụụzọ neetị ndị Sierra Leone.
Victor Osimhem sochiri ya azụ mgbe o nyere goolu na nkeji 21', ebe Alex Iwobi nyekwara goolu ọzọ na nkeji 27'.
Goolu zokwara ka mmiri ọzọ, mgbe Samuel Chukwueze mezuru ya goolu anọ nke Naịjirịa na-enye n'ime nkeji 29'.
Super Eagles chere na ụka ebiela mana ndị Sierra Leone gwara ha na e jighi ụtụtụ ama njọ ahịa ka ha malitere ịsa goolu ndị a na nkeji 41' site n'aka Kwame Quee.

Ebe foto si, Super Eagles/Twitter
Ka Super Eagles ka na-agba ọnyụpa ọnyụpa, ndị Sierra Leone sara goolu atọ fọrọ afọ nkeji 72', 80' na 86' site n'aka Al-Hadji Kamara, Mustapha Bundu na Al-Hadji Kamara ọzọ.
Nke a mere pụtara na ụzọ ka dị anya ka Naịjirịa itozu oke n'asọmpi Iko Mba Afrịka afọ 2021.
Naịjirịa ga-ezute Sierra Leone ọzọ n'ọgbọegwuregwu Siaka Stevens dị na Freetown n'ụbọchị 17 ọnwa Nọvemba, afọ 2020.
Nkeji Coronavirus
Gere akụkọ gbasara Coronavirus ka o si dị n'Afrịka taa.
Ndị uweojji si na ọ bụghị isi mmadụ ka a hụrụ n'aka ụkọchukwu Umunze

Ebe foto si, Mbonu Watson
Ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na akụkọ kwuru na e jidere otu ụkọchụkwu a hụrụ isi mmadụ n'aka ya n'ụmunze dị n'Anambara steeti abụchaghị eziokwu.
Ha kwuru na ya bụ onye a na-enyo enyo abụghị ụkọchụkwu nke e ji ahụ isi mmadụ n'aka ya.
Ndị ntorobia Umunze wakporo Rev Bishop Elijah Chukwuebuka nke ụlọụka, "God of Light Ministry' bụ ụkọchukwu na-ewu ewu na Umunze nke a ma ama maka ibu amụma na ịrụ ọrụ ebube, tie ya ihe ma kpụrụ ya ya na ngwogwo na ngwongwo ha hụrụ n'ogige ya kpụga be eze obodo ha maka ebubo ịhụ isi mmadụ n'aka ya.
Otu onye nọ ebe ihe mere kwuru na "Ndị ntorobịa hụrụ ya ka ọ na-agba aja. A hụrụ isi mmadụ, ọtụtụ ọkpụkpụ, foto ndị mmadụ e kere eke nakwa Akwụkwọ Nso e kere eke."
"Ihe a bụ ụkọchukwu a ma ama n'Ihite Umunze dịka onye amụma na-ahụ ụzọ."
Mana Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Haruna Mohammed kwuru ya bụ okwu metụtara "ebubo ịgwọ ọgwụ".
O sị na " ọ bụghị isi mmadụ ka a hụrụ n'aka ya, ọ bụ isi ewu nke e ji akwa mmemme kee."
Mohammed gara n'ihu kwuo na nwoke ahụ bụ dịbịa na-ezo onwe ya dịka ụkọchụkwụ nke ndị ntorobịa wakporo ma mebie okwu arụsị ya, kpụrụ ya gawa be Igwe ha ebe ha bụ ndị uweojii bịara gbapụtara ya.
Ka ọ dị ugbua, Igwe obodo ahụ enyela ya bụ nwoke iwu ka o si n'ala ha pụọ.
Ndị omeiwu Imo Steetị achụpụla onyeisi ha bụ Chiji Collins

Ebe foto si, Hon Chiji Collins/Facebook
A chụtuola onyeisi ndị omeiwu Imo Steetị bụ Chiji Collins n'ọkwa ya.
Ọ bụ ndị omeiwu ibe ya chụpụrụ ya n'ụbọchị Fraịde 13 Nọvemba, 2020 dịka ha na-eme nzukọ n'ụlọomeiwu dị n'Owere.
Mgbe okwu i chutu ya dapụtara n'ụlọomeiwu, mmadụ 23 n'ime 27 kwadoro ka a chụọ ya.
Akụkọ sị na ha chụpụrụ Collins maka ebubo mpụ na mmebi ego, aka ike nakwa agwa ọjọọ na ihe ndị ọzọ.
N'ihi nchụpụ a, Paul Emeziem nke na-anọchiteanya okpuruọchịchị Onuimo ga-abụ onyeisi ndị omeiwu dịka ha họpụtara ya.
Mana ọnụ na-ekwuru Chiji Collins bụ Mike Ohaka sị na ọ bụghị eziokwu na a chụọla Collins.
Ọ sị na ndị omeiwu anaghị enwe nzukọ taa na ọ bụ n'izuụka na-abịa abịa.
Ohaka gara n'ihu kwuo na okwu banyere nke a ka na-aga n'ihu n'ụlọomeiwu.
'Ego mmanụ ụgbọala ga-agbago ruo N168 - N170 otu lita'

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọ ntaakụkọ Punch ekwuola na ụlọ ọrụ Petroluem Products Marketing Company (PPMC) bụ ngalaba na Nigerian National Petroleum Corporation ebuliela ego a na-ere mmanụ ụgbọala na depo ha site Naịra otu narị na iri anọ na ụma (N147.67) ruo Naira otu narị na iri ise na ise na ụma (N155.17).
Ha kwuru na ọ bụ n'akwụkwọ ozi maka nanị ndị ụlọọrụ PPMC nke Tijjani Ali binyere aka nke bu akara PPMC/C/MK/003 n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Nọvemba ka ya bụ ozi dị.
Ha kwuru na PPMC kwukwara na ego mmanụ ụgbọala n'ebe a na-ere ya na pụmpụ ga-abụ Naịra otu narị na iri isii na otu na ụma (N161.36).
Kama akụkọ ha kwukwara na onyeisi otu Indepndent Petroluem Marketers Association of Nigeria bụ Mike Osatuyi kwuru na ihe ọ pụtara bụ na ego mmanụ ụgbọala ga-agbago ruo ihe dịka N168 ruo N170.
Nkea na-eme dịka Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbidi bụ Timipre Sylva kwuru na gọọmentị Naijirịa ewepụla aka kpamkpam n'ihe gbasara ịhazị ego mmanụ agbidi.
Mmadụ 212 ọzọ ebutela coronavirus na Naijirịa

Ebe foto si, NCDC
Ngalaba NCDC edepụtala na mmadụ narị abụọ na iri na abụọ ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa. Mmadụ iri abụọ na isii n'ime ha si Imo steeti ebe mmadụ itolu si Rivas steeti.
E nweghị onye nwụru ọhụru site na ya bụ ọrịa.
