Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Laycon meriri Big Brother Lockdown eritela ụlọ, ego, na ọkwa gọọmenti
Ebe foto si, Ogun state government twitter page
Olamilekan Agbelesebioba
eji Laycon mara na Big Brother eritela ụlọ, naira nde ise, ọkwa dịka onye nnọchiteanya
ndị ntoroọbịa n’aka gọvanọ Ogun steeti bụ ebe o si.
Gọvanọ Ogun steeti bụ
Dapo Abiodun depụtara n’akara twitter ya ihe nile a Laycon ritere bụ iji too
agwa ọma ọ kpara na amamihe o gosiri ụwa niile n’elu onyonyo ọha na-ekiri.
Gọvanọ Abiodun kwuru na
Laycon gbadoro anya agbanyeghị ọnwụwa na mkpasuiwe niile biara ya n’ihe nkiri
Big Brother Lockdown.
O kwuru na nke a gosiri na
akwụkwọ ọ gụrụ abụghị ihe efu.
Gọvanọ Abiodun jikwa
ohere a wee kwupute na Ogun steeti na-ahazi ebe ndị na-eme egwuregwu nakwa ndị
na-ese ihe ga-ezukọ iwulite ọnatarachị ha.
Ebe foto si, Ogun state government twitter page
Kọntena esila Chaịna batawa Onitsha!
Ebe foto si, @Ianreneville/Twitter
Akụkọ na-ekwu na kọntena bụ ibu abatala ọdọ ụgbọ mmiri nke dị n'Onisha.
Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala na soshal Midịa bụ Bashir Ahmed tinyere nke a na Twitter ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 4
Ndị otu oyi egwu atọhapụla onye ọrụ gbata gbata na onye ndọrọndọrọ ọchịchị ha tọrọ.
Ezinụlo Sophie Petronin gbara afọ iri asaa na anọ bụ onye ndị otu oyi egwu nke alakụba tọrọ ekwuola na onwerela onwe ya.
Ha kwuru na o bidola njem ịloghachị isi obodo Mali bụ Bamako.
A tọrọ ya ebe ọ na-arụọrụ enyemaka na mpaghara ugwu nke Gao.
Ndị otu oyi egwu a tọhapụkwara Soumaila Cisse bụ onye zọbụrụ ọkwa onyeisiala mba ahụ.
Akụkọ na-ekwu na ntọhapụ a mere dịka ndị gọọmentị mba ahụ tọhapụrụ ihe karịrị mmadụ otu narị bụ ndị agha Jihad iji gbara isi mmadụ abụọ a.
enwebeghị ihe gọọmentị kwuru maka ihe a niile.
Unu asaala Chi!
Soro anyị taa maka akụko ihe na-eme n'ụwa niile.
Ya gaziere gị taa!
Ụnụ emeela
Igbo ndị ọma, anyị abịala n'isi njedebe mgbasaozi nke taa.
Ka ọ dịnụ echi.
Ndewo
Akụkọ na a wakporo ndị uweojii n'Enugwu bụ okpotokpo asị - Kọmishọna Uweojii
Kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu Steetị bụ Ahmad AbdurRahman ekwuola na na o nweghi ụlọ ndị uweojii awakporo n'Enugwu.
Nke a dị n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru uwojii n'Enugwu Steetị bụ Daniel Ndukwe wepụtara bụ nke sị n'akụkọ a sị na awakporo ma gbuo ndị uweojii isii bụ asị ọcha.
Kọmishọna gwara ọhanaeze na ndị Enugwu ka ha gbaa akụkọ ụgha a nkịtị na ọ bụ aka ọrụ ndị obi ọjọọ na ndị na-achọghị ọ ga n'ihu.
Ọ gara n'ihu nye iwu ka enyochaa ma chọpụta ndị malitere akụkọ ụgha ma taa ha ahụhụ ruru ha.
N'ikpeazụ ọ gwara ndị bi n'Enugwu ka ha gaa n'ihu n'ime mkpa dịịrị ha ma na-erubeisi n'iwu na-achị obodo.
Davido achụọla Lil Frosh maka ịkụza nwaanyị anya
Ebe foto si, Instagram/@lhilfrosh
Nkọwa foto, Lil Frosh na Davido
Onye oti egwu a ma ama bụ Davido achụọla nwa ọrụ ya a kpọrọ Lil Frosh maka ịkụza enyi ya nwaanyị anya.
Ụlọọrụ ya a kpọrọ Davido Music Worldwide (DMW) sị na ha mere nke a site na nyocha ha mere banyere agwa Lil Frosh kpara.
Ha sị dịka iwu na-achị otu iti egwu ha sị dị na ha anaghị anabata ụdị akparama agwa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 1
Cheta na akụkọ pụtara n'ụbọchị Mọnde maka etu Lil Frosh si akụ enyi ya nwaanyị ihe tinka na-akụ pan.
Onyonyo nwa agbọghọ ahụ pụtara na soshal midia nke gosiri ya ebe o bu anya ikputu.
Ndị mmadụ malitere ịkpọ oku ka ndị uweojii nwuchie ya bụ nwaokorobịa ma kpụpụ ya ụlọikpe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 2
Otu onye aha ya bụ @dahtgirl_ajex na Twitter tinyekwara ihe onyonyo na-egosi ebe Lil Frosh na-arịọ enyi ya nwaanyị mgbaghara dịka ọ kụchara ya ihe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 3
Lil Frosh bụ nwata nwaokorobịa a mụrụ n'afọ 1998 na Legọs.
Ọ gụrụ akwụkwọ elementịrị nakwa sekọndịrị na Legọs, mana ọ gabeghi mahadum.
Idemmiri enwerela ọnọdụ na Umueze Aman dị n'Anambra steeti
Ebe foto si, Eucharia
Nke na-eme ugbua bụ na oke idemmiri sitere n'oke mmiri ozizo anọchiela
ezi na ụzọ dị na ụfọdụ ebe n'Umueze Anam dị n'Anambra steeti.
Ndị ọrụ gbata gbata n'Anambra steeti bụ Anambra State Emergency
Management Agency agbarala ndị niile bi na-ogbe ahụ ama ka ha gbaa ọsọ ndụ ha
mgbe oge ka dị.
Mkparịtaụka Naira Marley na Frank Mba e nweela mkparịtaụka n'elu instagram maka FSARS
Ebe foto si, Naira Marley Instagram
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Naịjirịa bụ Frank Mba na otiegwu ama ama bụ Naira Marley na-enwe mkparịtaụka gbasara mmegide Federal Special Anti-robbery squad(FSARS) na-emeso ụmụ Naịjirịa.
Lee ihe ha kpara maka ya:
Mba kwuru na ha e jighị mmachị FSARS inyocha ekwenti na kọpmụta ụmụ Naịjirịa n'okporoụzọ egwu egwu
Naira Marley kwuru na ya achọghịzị ka ndị otu FSARS na-amaja ụmụ Naịjiịa maka uwe ha yi n'ahụ maọbụ udiri isi ha kpụrụ
Frank Mbah kwuru na ọ chọrọ ka ụmụ Naịjirịa ghara iji ozi ọhụrụ a ha zipuru n'ikpeazu maka mmachị ngagharị ọrụ FSARS gwu egwu.
O kwuru na o nweghị onye uweojii kwesiri ị na-eyi akwa nkịtị eme ọrụ ya
Mba kwuru na sọsọ ndị ga-anagharị ugbua bụ ndị uweojii a kpọrọ "Rapid Response Team"
O kwuru ka ndị Naịjirịa na-etinye akwụkwọ mgbe ọbụlka ohere pụtara n'ụlọ ọrụ ndị uweojii maka iwee ndị madụ n'ọrụ, ka ha wee sonye n'ime oke ha n'imezi ihe mebiri emebi na ngalaba ahụ
O kwukwara na ọ bụrụ na ụmụ Naịjirịa hụ onye uweojii na-akpa agwa ọjọ, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe gị omume site ya n'onyonyo zitere ndị uweojii.
Ihe mere Naira Marley ji yigharịa ngagharaiwe ọ chọbụrụ ime
Azeez Adeshina Fashola eji Naira Marley mara agwala ụmụ Naịjirịa ha agaghị emezi ngagharịwe gbasara mmegide ụfọdụ ndị otu Federal Special Anti-robbery squad(FSARS) na-emeso ụmụ Naịjirịa.
O kwuru na nkea bụ makana o nwere ọtụtụ mgbanwe a na-eme ugbua. N'okwu ya. "dịka ndị Marlian anyị bụ, anyị ga-enye ha otu izu ụka iji hụ mgbanwe ndị a , emeghị etu a, anyị ga-aga n'ihu mee ngagharịwe."
O jikwa ohere ahụ kwuputa na ya na onụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Naịjirịa bụ Frank Mba ga-enwe mkparịtaụka n'elekere iri na otu nke ụtụtụ Ọktoba 6,2020.
Ndị uweojii apụtabuola kwuo na ha anụla mkpesa ndị ntoroọbịa na-eme gbasara agwa ọjọ ụfọdụ ndị FSARS na-akpaso ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 4
Arsenal akwuzuola £45m n'isi Thomas Partey nke Atletico Madrid
Ebe foto si, European Photopress Agency
N'egwuregwu,
dịka ọzụzụ na orire ndị egwu bọọlụ na-abịa na ngwụcha na Premier League taa,
Arsenal akwụọla nde Euro iri anọ na ise n'isi Thomas Partey nke Atletoco Madrid.
Ya bụ nwaamadị si mba Gana na-agba etiti na Atletico Madrid putagoro ugboro iri atọ na ise (35) ma nyekwara ha goolu atọ bụ nke so nyere ha aka ịnwete ọkwa nke atọ na La Liga na afọ gara aga.
Ọ gbara bọolụ ugboro 188 na Atletico kemgbe ọ banyere ebe ahụ na 2011.
'Nigeria keenụ nkwụcha maka ogogologo abụbụ ọrụ' - ASUU
Ebe foto si, Getty Images
Dịka a na-akwado ịmepe akwụkwọ, otu jikọtara ndị nkuzi mahadum bụ ASUU nakwa ogbo ha bụ NASU n'aha ịchafụ
ekwuola ooloo, na aha agaghị eso mepee akwụkwọ n'izuụka na abịa n'afọ efu.
Onyeisi ndị
otu Academic Staff Union of Universities (ASUU) bụ Biodun Ogunyemi kwuru na
eziokwu atọgbọghị na ya bụ nkwa gọọmentị etiti kwere ha maka ịkwụ ha ụgwọ ọnwa.
Ogunyemi kpọrọ okwu aha n'isi onyeisi okwu mgbakọ ego Naịjirịa dị n'aka bụ Ahmed Idris bụ onye ha sị na ọ bụ ya mebiri iwu Onyeisiala, Muhammadu Buhari, nyere maka ịkwụ ha ụkwọ ha.
Ọ dọrọ aka na ntị ka ndị gọomenti kwadoo maka ogologo abụbụ ọrụ n'aka ndị nkuzi mahandum maka otu ha sịghi were ọrụ ha kpọrọ ihe.
Ndị otu a malitere abụbụ ịdọ aka na ntị nke izuụka abụọ ụbọchị Monde maka gọọmentị ikpọ ekwo nkụ tinye ha na usoro IPPIS bụ usoro gọomenti chọrọ iji na-akwụ ha ụkwọ ọnwa bụ nke ha sị na ọdabachaghị.
Nke a na-abịa dịka Minista agụmakwụkwọ na Naịjirịa bụ Adamu Adamu nyereikike ụbọchị Fraịde ka ụlọakwụkwọ niile mepee ụbọchị Monde bụ ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa ọktoba dịka ha mechichere kemgbe ọnwa Maachi afọ a maka COVID-19.
Mana tupu mmechi a abịa, gọomentị na ASUU na-akwakọrịta mpị gbasara usoro IPPIS bụ nke ha sị na ọ ga-eme ka gọọmenti kpanye ha n'abụ.
Onyeisiala Buhari enyebuola iwu ka etinye ndị ministri niile na ndị ọrụ ndị ọzọ na ya bụ usoro akwụmụgwọ ọhụrụ iji belata oshi na nururu aka n'akwụmụ ụkwọ ndị ọrụ.
ASUU sị na ha degaare gọomenti akwụkwọ n'Ọgụst ka ha nye ha ohere ịhụ usoro nke ha wepụtere maka ịkwụ ụkwọ onwa ha bụ nke ha kpọrọ University Transparency Accountability Solution.
Ọ sị na gọomentị azaghị ya bụ oku ruo ụbọchị iri atọ nke ọnwa Septemba dịka ha bu n'obi ịkpasasi ya bụ usoro nke ha weputere.
Gọọmentị ka na ekwukwa na ọnweghịzị onye nkuzi ha ji ụkwọ dịka Minista agụmakwụkwọ nke nta bụ Chukwuemeka Nwajiuba si kwuo, ma kwukwa na ndị nkuzi niile nọzị na IPPIS ka ọ dị ugbua.
A dọọla Naira Marley aka na nti ya emela ngagharịwe ọbụla maka FSARS
Ebe foto si, Naira Marley/Twitter
Azeez Adeshina Fashola eji Naira Marley mara akpọọla ụmụ Naịjirịa oku ka ha soro ya pụta
mee ngagharịwe gbasara mmegide ụfọdụ ndị otu Federal Special Anti-robbery squad(FSARS)
na-emegide ụmụ Naịjirịa n'elekere itoolu nke ụtụtụ Ọktoba 6,2020.
A na-ebo ngalaba Federal Special Anti Robbery Squad
(FSARS) ebubo na ha awakpo ndị Naịjirịa aka ha dị ọcha ma ha na-eme ngagharị nyocha.
Cheta onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Mohammed Adamu, machiri FSARS ime ngagharị ọrụ nyocha n'ụbọchị Ọktoba 4,2020.
#EndSARS wukwara na twitter maka onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ebe ndị a na-eche na ha bụ ndị otu FSARS na-awakpo otu nwoke n'ụgbọala ya n'Ughelli.
Mana mịnịsta na-ahụ maka
ihe gbasara ụmụ ntoroọbịa na egwuregwu na Naịjirịa bụ Sunday Dare ekwuola ka Marley ghara ime
nghagharaiwe ọbụla maka mkpesa ha eruola gọọmenti etiti aka ma na-anata
ogbugbo. O kwuru na dịka mịnịsta ndị ntoroọbịa ọ bụ, na ọ ma mkpa mkpa FSARS
na-akpa bụtere nsogbu a ekwesiri ilebe anya mana gọọmenti etiti na-eleba ya anya dịka etu ọ kwesiri.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 2
Unu asaala chi
Unu abọọla chi, biko soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị.
Ize-Iyamu sị na ọ gaghị ama mmeri Gọv. Obaseki meriri ya aka n'ụlọikpe
Ebe foto si, Obaseki na Ize-Iyamu
Onye ji aha APC zọọ ọkwa gọvanọ n'Edo Steetị bụ Osagie IzeI-Iyamu sị na ọ gaghị ewepu mmeri Gọvanọ Obaseki meriri ya n'ụlọikpe kama na ọ ga-agbado anya n'akwụkwọ ọ gbara ya tupu e mee ntuliaka bụ nke nọ n'ụlọikpe ugbua.
Ọ sị na e nwere ọtụtụ ụzọ o nwereike iji maa mpụtara ntuliaka ahụ aka mana ọ gaghị eme ya.
Ọtụtụ ndị ndụ na ndịisi APC ekeleela Gọvanọ Obaseki na mmeri ya.
Dịka o si kwuo, na-agbanyeghi akụkọ na-efegharị na ntuliaka ahụ agaghị dịka o kwesiri, na e nwere ọgbaghara n'ọtụtụ ebe na mpụtara adịgboroja.
Ize-Iyamu gwara ndị ntaakụkọ nke a na Benin sị ọ bụ ihe nwereike ime ka ọ maa mmeri ahụ aka n'ụlọikpe mana o kpebiri na ọ gaghị eme ya iji gbanarị ọgbaghara na steetị.
Ọ sị na ọ ga-elekwasị anya n'ikpe nke na-aga n'ihu ugbua bụ nke ọ gbara tupu ntuliaka.
Na ihe pụtara n'ikpe a ga-emetụta ntuliaka a e mere.
Ndị niile nwere ọzụzụ ikuzi nkuzi agaghị achọzị ọrụ na Naịjirịa - Gọọmentị etiti
Ebe foto si, Getty Images
Gọọmenrị Naịjirịa ekwuola na onye ọbụla nwetara ọzụzụ nkuzi na ga-enwe ọrụ ngwangwa ọ si n'ụlọ akwụkwọ pụta.
Ọ bụ Mịnịsta agụmakwụkwọ bụ Adamu Adamu kwuru nke a n'Abuja n'ụbọchị Mọnde dịka a na-eme emume 'World teachers' Day'.
Adamu kwuru na Onyeisiala Muhammadu Buhari enyelarị nkwado ka atụmatụ a malite n'egbughị oge ọbụla.
Ọzọkwa bụ na gọọmentị ga na-akwụ ndị ka nọ na mahadu enweta ọzụzụ ịbụ ndị nkuzi obere ụgwọ iji jaa ha ike.
Ebe foto si, Gọọmentị Naịjirịa
Nkọwa foto, Mịnịsta agụmakwụkwọ bụ Adamu Adamu
Adamu kwuru sị: "Gọọmentị achọpụtala mkpa ọ dị inwe ndị nkuzi a zụrụ nke ọma iji wulie ọnọdụ agụmakwụkwọ obodo Naịjirịa ma sikwa otu ahụ wulie ọnọdụ obodo anyị."
"Ihe ndị a gọọmentị na-eme ugbua bụ iji mee ka agụmakwụkwọ n'obodo a bụrụ ọkaibe, ka ụmụakwụkwọ anyị bụrụkwa ndị ga-akwụdosi ike n'ebe bụla ha hụrụ onwe ha."
Adamu kwukwara na ngalaba 'Tertiary Education Fund' (Tetfund) ga na-akụ ndị nkuzi ka nọ ọzụzụ - bekee kpọrọ 'teaching practice' ụgwọ.
A ga-enwekwa ụgwọ pụrụ iche a na-akwụ ndị nkuzi n n'ime obodo, ndị nkuzi sayensị nakwa ndị nkuzi nọ n'ọnọdụ dị aghaa."
Gọọmentị amapụtala ijeri naịra iri maka nkwado 'census'
Ebe foto si, Gọọmentị Naịjirịa
Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela nkwado ka e wepụta ijeri naịra iri (N10 billion) iji mezuo ihe niile fọdụrụ maka ngụkọọnụ (census) ọzọ a ga-eme na Naịjirịa.
Ajuri Ngelale, onye bụ otu n'ime ndị enyemaka Buhari, kwupụtara nke a n'akara Twitter ya.
Ego nke a e wepụtara ugbua bụ iji mee nke a kpọrọ "Enumeration Area Demarcation (EAD)" n'okpuru ọchịchị 546 na Naịjirịa.
Buhari tinyekwara ego dị ijeri naịra anọ na ụma ise (N4.5 billion) na bọjeetị nke afọ 2021, iji mezuo atụmatụ a ma dị njikere maka ngụkọọnụ ọzọ a ga-eme.
Gọọmentị ekwubeghị mgbe a ga-eme ngụkọọnụ a. Nke ikpeazụ e mere bụ n'afọ 2006.
Otu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa enwetala onye nkuzi ọhụrụ
Ebe foto si, Twitter/@CoachWaldum
Ngalaba na-ahazi egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ 'Nigeria Football Federation' (NFF) akpọpụtala onye ọhụrụ ha were n'ọrụ dịka onye nkuzi nke otu egwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa a kpọrọ 'Super Falcons'.
Aha ya bụ Randy Waldrum onye mba Amerịka, ọ gbara afọ iri isii na anọ (64).
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Tupu e wee ya n'ọrụ a, Waldrum bụ onye nkuzi nke otu bọọlụ ụmụnwaanyị Mahadum Pittsburgh.
Ọ rụkwara ọrụ na ụlọakwụkwọ dị icheiche n'Amerịka nke gụnyere:
Ụlọakwụkwọ Austin (Austin College) dị n'obodo Texas
Mahadum ndị ụka Metọdist nke a kpọrọ 'Texas Weslyian University'
Mahadum Tulsa
Mahadum Baylor
Mahadum Notre Dame
Ọ kuzikwara otu bọọlụ ụmụnwaanyị a kpọrọ 'Houston Dash', tupu mba trinidad na Tobaga ji kpọrọ ya ka ọ kuziwere otu bọọlụ ụmụnwaanyị ha, ma mechaa chụọ ya n'afọ 2016
N'ọnwa ọkutoba 2017, ndị Naịjirịa kpọrọ Waldrum ka o sonye n'otu n'ime ndị nkuzi otu bọọlụ, mana ọ nọteghị aka tupu ọ gbaa arụkwaghịm n'ọnwa Disemba afọ ahụ.