Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Ala ọma jijiji mere na Turkey ataala isi mmadụ 100
Ndị nwụrụ n’ihe mberede ala ọma jijiji mere na
mba Tọkị n’ụbọchị Fraịde gara aga eruola otu narị mmadụ ugbua.
Mana n’ụbọchị Mọnde, ndị ọrụ gbatagbata zọpụtara ụmụ aka abụọ gbara afọ
atọ na afọ iri na anọ na ya bụ ihe mberede.
Ihe karịrị mmadụ narị abụọ merụkwara ahụ na ya bụ ihe mberede.
E
Ndịagha Naịjirịa ejichiela ụfọdụ ndị otu ha e gosiri n’onyonyo ebe ha
na-apịa otu nwaagbọghọ ụtarị n’ike n’Oyo steeti, maka na ha sị na o yi akwa adịghị
mma.
Akụkọ kwuru na ndị agha ahụ jidekwara ụfọdụ ụmụokorobịa ma kpụchaa ha isi,
maka na ha sị na ha bu ntutu ekwesịghị ekwesị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Onyeisi otu ndịagha a kpọrọ 'Operation Burst', rịọkwara ezinụlọ nwata nwaanyị ahụ ka ha gbaghara ihe niile ndị agha ahụ mere ha.
O kwuru na ndị mere ihe ahụ ga-anata ntaramahụhụ dịịrị ha.
Gọọmentị ga-akwado ụlọọrụ ụgbọelu maka ihe isi ike coronavirus kpatara
Ebe foto si, Hadi Sirika
Nkọwa foto, Hadi Sirika, Mịnịsta na-ahụ maka njem na Naịjirịa
Gọọmentị etiti ewepụtala ijeri naịra ise iji nyere ngalaba njem ụgbọelu
aka ma kwado ha maka ihe isi ike so ọrịa coronavirus n’azụ.
Mịnịsta njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika kwuru nke a n’ụbọchị Mọnde oge ya na ndị omeiwu nwere mkparịtaụka n'Abuja n'ụbọchị Mọnde.
Mkparịtaụka a bụ maka mmegharị ndị omeiwu chọrọ imegharị iwu hibere otu dị icheiche dịka 'Nigerian Civil Aviation Authority' (NCAA), 'Nigerian Airspace Management Agency' (NAMA), 'Accident Investigation Bureau' (AIB), 'Nigerian College of Aviation Technology' (NCAT), 'Nigerian Meteorological Agency' (NIMET) na 'Federal Airports Authority of Nigeria' (FAAN).
Mana ụfọdụ ndị omeiwu a kwuru na ijeri naịra ise agaghị ezu iji kwado ụlọọrụ ụgbọelu dị icheiche na Naịjirịa.
NECO akpọpụtala ụbọchị uleakwụkwọ ha ga-amalite ọzọ
Ebe foto si, Neco
Ụlọọrụ uleakwụkwọ bụ National Examiniation Council (NECO) ekwuputala ụbọchị Mọnde, na ha ga-amalitekwa uleakwụkwọ ha nke afọ 2020 maka ụmụakwụkwọ ndị ngụcha sekọndịrị na Naịjirịa gbaa gburugburu ụbọchị itoolu nke ọnwa Nọvemba a.
Ọnụ na-ekwuru ha bụ Azeez Sani kwuru nke a ụbọchị Mọnde maka ya bụ uleakwụkwọ ha kwusiburu n'ike maka ngagharịiwe Endsars.
N'olu ya, Saani sị na " n'ihi nlọhachite udo na Naịjirịa nakwa Abuja, anyị ga-amalitekwa uleakwụkwọ ahụ akwusiburu site n'iwepụta usoro ọhụrụ a aga eji mee ya site na ụbọchi itoolu nke ọnwa Nọvemba ruo ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Nọvemba 2020."
O kwuru na ha ga-ezigara ụlọakwụkwọ na ndị mmadụ usoro a na ọnwa a.
Unu asaala chi e! Ndụ mmiri ndụ azụ
Jiri otu nkeji gere akụkọ gbasara coronavirus ka ọ dị n'Afrịka
Mpụtara ule Waec afọ 2020 apụtala
Ụlọọrụ nhazi ule ndị na-agụcha sekọndịrị n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka, bụ 'West Africa Examination Council' (Waec), ewepụtala mpụtara ule nke afọ 2020.
Onyeisi ụlọọrụ a na Naịjirịa bụ Patrick Areghan kwuru na ihe karịrị mmadụ otu nde na ọkara debanyere aha iso lee ule nke afọ a.
N'ime ha ihe karịrị pasentị iri asatọ na isii (86.99%) nwetara akara 'credit' ise mọbụ karịa.
Mmadụ pasentị iri isii na ise na ụma nwetara 'credit' ise, tinyere Asụsụ Bekee na mgbakọ (English & Maths).
Mana ihe karịrị mmadụ puku narị abụọ na iri na ise agaghị ahụ mpụtara ule nke ha, n'ihi ebubo nrụrụaka ule.
Areghan kwuru na nnyocha ka na-aga n'ihu maka ndị a e boro ebubo nrụrụaka.
O kwuru na onye ọbụla a chọpụtara na aka ya dị ọcha, a ga-ewepụta mpụtara ule nke ya.
Ndị lere ule a gụnyere ndị nọ na ogogo sekọndịrị nke isii na mba Benin Republic, Ivory Coast, Equatorial Guinea na Naịjirịa.
Ebe foto si, Waec
Etu ị ga-esi achọpụta ihe i nwere na Waec
Maka ndị so wee lee ule Waec nke afọ 2020, lee etu ị ga-esi chọpụta ihe i nwere:
Banye n'ọbaozi Waec nke bụ www.waecdirect.com
Tinye akara ule gi nke bekee kpọrọ 'Examination number'
Tinye akara 'smartcard' gị, bụ nke e nyere gị oge ị na-edebanye aha maka ule a
Tinye afọ i lere ule, nakwa ụdị ule nke ọ bụ, iji maa atụ e nwere nke a kpọrọ 'private' nakwa 'candidate results'.
Itinyechaa ihe ndị a, nwetụ ndidi ka kọmputa buputa mpụtara ule gi
Bobby Charlton nwere ọrịa dementia
Ebe foto si, Getty Images
Ndị mmadụ na-ezitere Bobby Charlton ozi ekele dịka akụkọ pụtara na o
nwere ọrịa dementia.
Charlton gbaara mba England na otu Manchester United bọọlụ n’oge gboo.
Ọ gbara afọ iri asatọ na atọ (83).
Ọrịa 'dementia' bụ ọrịa na-emetụtakarị ndị okenye.
Cheta na onye tọrọ Bobby Charlton bụ Jack Charlton nwụrụ n'ọnwa Julaị afọ a, dịka ọ rịachakwara ọrịa 'dementia'.
Jack sokwa gbaara England n'asọmpi iko mba ụwa afọ 1966 ebe ha nọrọ turu ugo.
Ka chi foo
Rahụnụ jụụ.
Echi ga-efotere anyị iheọma. Iseee.
Arsenal apịgbuola Manchester United ka anwụ nta
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Pogba emetela penariti atọ kemgbe ọ malitere ịgba bọọlụ n'afọ ọhụrụ a karịa ndị ọzọ
Arsenal ji otu ọkpụ goolu a na-asaghị asa merie Manchester United ka ha zutere n'ọgbọegwuregwu Old Trafford.
Nke a bụ nke mbụ Arsenal na-emeri Man Utd na Old Trafford kamgbe af iri na anọ.
Goolu Pierre-Emerick Aubameyang ji penariti nye na nkeji 69 zuru ịsepụ Man Utd ara n'ọnụ n'abalị a.
N'agbanyeghi na ọ bụ n'azụ ụlọ ha, Man Utd ahụghị ohere malie elu maọbụ nwee aṅụrị dịka ndị Arsenal ji ha tie okwe.
Ndị dị ka Paul Pogba bụ ndị Man Utd na-eji aba, menyere ha ihere taa dịka Thomas Partey nke Arsenal fanyere ya n'akpa.
Nke a kpasuru ndị na-akwado Man Utd oke iwe. Lee ihe ha nwere ikwu gbasara ya:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 3
N'otu aka ahụ, e kelere Partey maka ịgbari bọọlụ taa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 5
Ihe mberede okporoụzọ ataala isi mmadụ 16 n'Ondo steeti
Ihe
ruru mmadụ iri na isii anwụọla n’ihe mberede okporoụzọ n’Akungba-Akoko dị
n'Ondo steeti.
Ahmed
Hassan bụ ọnụ na-ekwuru ndị FRSC n’ịchafụ na steeti ahụ, kwuru na ya bụ ihe
mere mgbe trailer enweghi brake febara n’ime ahịa ma merụkwaa ndị mmadụ ahụ.
Ala ọmajiji mere na mba Turkey egbuola ihe ruru mmadụ 58
Ebe foto si, Reuters
N’ofesi,
Ndị ọrụ gbatagbata ka na-achọ ọtụtụ ndị mmadụ ka ihe mberede ala ọmajijiji mere
n’obodo Izmir dị na mba Turkey kemgbe ụbọchị Fraịde.
Ihe
ruru mmadụ iri ise na asatọ anwụọla ebe a zọpụtara otu nwoke dị afọ iri asaa ụlọ
dagidere kemgbe awa iri atọ na atọ gara aga.
Fashola akpọkwala anyị aha - Ụlọomeiwu ukwu
Ebe foto si, Getty Images
Ụlọomeiwu
ukwu agwala Babatunde Fashola bụ minista ọrụ na ụlọ, ya gbara ọgwụ ya ṅụọ n’ihi
ụta ha sị na ọ tara ha maka ọnọdụ ụfọdụ okporoụzọ gọọmentị etiti na-elekọta dị
na Benue steeti.
N’ozi
ha si n’aka Ajibola Basiru kesaa n’ụbọchị Sọnde, ha kwuru na ọ bụghị ndị omeiwu
ka e kwesịrị ịta ụta maka ụzọ ọjọọ ọbụla dị na Naịjiria.
Ha kwuru sị na ọ bụ "ezigbote akụkọ ụgha", ma kwuo na Fashola na-achọ ịrakọ ndị omeiwu na ndị ọha site n'ibo ha ụdịrị ebubo a.
Basiru kwuru na Fashola kwuru okwu a n'ụlọọrụ ya n'Abuja, oge ndị larala ezumiike nka nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu si mpaghara Benue Saụt bịaara ya njem nleta.
Ha bịara ikpesara ya maka ụzọ ọjọọ ndị dị na mpaghara ha.
Mba Ọstralịa enweghị onye ọzọ butere ọrịa coronavirus
Mba Ọstralịa ekwuola na enweghị onye ọzọ buterela ọrịa coronavirus na mba ahụ.
Nke a bụ ụbọchị mbụ ha chọpụtara na enweghị ọnye ọzọ bu ya bụ ọrịa.
Ndị ọrụ ahụike ha na-ekwu na ha nwereike iwepụ ụfọdụ mmachị ha tinyere maka ọrịa coronavirus.
Mba a nwere mmadụ puku iri abụọ na asaa, na narị ise buterela ya bu ọrịa ebe mmadụ nari itolu anwụọla n'aka ya.
Otu nwoke ejirila mma agha gbuo mmadụ abụọ
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ọ bụ na akụkụ ụlọomeiwu ka ya bụ ihe mere
Otu nwoke ji mma agha ma yiri efe ndị agha mgbe ochie gburu mmadụ abụọ n'obodo Quebec dị na Kanada. Nwoke a merụrụ mmadụ ise ọzọ ahụ kama aka ndị uweojii akparala ya n'ime awa atọ ọ kpara mkpamkpa a.
Ndị uweojii enyela ndị mmadụ ndụmọdụ ka ha nọrọ n'ụlọ dịka ha na-eme nyocha ha.
Unu abọọla chi
Soro anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị
Daalụ maka ịnọnyere anyị taa
Ụbọchị nta ka anyị chụọ n'Owere nchị.
Udo dịrị gị.
Mba Briten ga-abanye 'lockdown' ọzọ n'ụbọchị Tọzde - Johnson
Ebe foto si, Getty Images
Boris Johnson bụ praịm minista mba Briten ekwuola na ha ga-abanye mmechi obodo ọzọ bido n'ụbọchị Tọzde bụ ụbọchị ise nke ọnwa Nọvemba.
O kwuru nke a n'ihi na ọrịa coronavirus anyụwakwala ha anya ebe ọ dị ọjọọ ọzọ n'Ịngland.
O kwuru sị na "ugbua bụ oge ịkpa ike n'ihi na enweghizi ihe ọzọ anyị ga-eme."
Johnson kwuru na ndị mmadụ ejila ọsọ gbapụ gaa na-abụ nri ha ga-azụkọ, n'ihi na ụlọahịa ebe a na-ere ihe ndị dị mkpa agaghị emechi.
O kwukwara na ụlọọrụ ebe ndị mmadụ enweghi ike isi n'ụlọ na-arụ ọrụ agaghị emechikwa.
Site n'ihe o kwuru, ndị mmadụ ga-esinwu n'ụlọ pụọ maka ihe gụnyere:
Ịga akwụkwọ
Ịga ọrụ ma ọ bụru na ị gaghị anọnwu n'ụlọ rụọ ọrụ
Ịga gbatịa ahụ
Ịga ụlọọgwụ
Ịga zụọ ihe oriri nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa
Ilekọta ndị ọzọ chọrọ nlekọta
O kwuru na mmechi obodo a ga-adịgịde ruo ụbọchị abụọ nke ọnwa Disemba, mgbe ha ga-amalitekwa imepe obere obere site na mpụtara ha ga na-ahụ na mpaghara dị iche iche.
Mba Amerịka atọghapụla onye otu ha a tọrọla na Niger
Mba
Amerịka ekeleela gọọmentị Naịjiria maka ịdọnyere ha ukwu ka ha gbara mbọ tọghapụ
onye mba ha e ji eji nso okeala Niger, n’ime abalị chi fotere Satọdee bụ abalị 31 nke ọnwa Ọktoba.
Ha
kelere ndị agha mba ha tọghapụrụ nwoke ahụ bụ Philip Walton dị afọ 27, ma kwuo na Amerịka enweghi ike ịgbaghapụ
onye mba ha ọbụla a tọrọla.
A tọrọla Walton n'abalị Mọnde n'obodo Massalata, dị nso okeala Naịjiria na mba Niger.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 1
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kelekwara ndị agha bụ ndị ọ kpọrọ dike.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 2
James Bond: Sean Connery anwụọla!
Ebe foto si, Ronald Grant
Sean Connery, onye mbụ mere ihe ejije James Bond anwụọla dịka ọ gbara afọ iri itoolu.
Connery mere ihe ejije ọtụtụ afọ ma rite nturuugo Oscar, Bafta abụọ na nke Golden Globe atọ.
Ihe ejije ndị ọzọ ọ mere gụnyere 'The Hunt for Red October', 'Indiana Jones' na 'The Rock'.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụta ya dịka onye mbụ mere ejije dịka James Bond.
Ezenwaanyị mba Briten chiri ya ọchịagha nke bụ Knight n'okwu Bekee n'afọ 2000.
Connery mere emume ncheta ọmụmu ya n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2020.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma maka ya:
A mụrụ ya na mba Skọtlandị n'ụbọchị 25 nke ọnwa Ọgọstụ 1930
O mere ejije James Bond asaa n'etiti afọ 1962 ruo afọ 1983
Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ejije James Bond 007 ka e ji mara ya, mana ọ malitere ịrụ ọrụ n'ihe gbasara ịkpa obi aṅụrị kemgbe ebe afọ 1950, oge ọ na-arụ dịka ihe a na-akpọ "backstage boy"
Ejije James Bond niile o mere dabachara ma mee ọfụma, mere ka American Film Institute họrọ ya dịka onye atọ kachasị bụrụ dike n'ihe gbasara ejije kemgbe ụwa