Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Tanka bụ mmanụ ụgbọala adachiela ụzọ

    Otụ ụgbọala tanka adachiela ụzọ n'akwa mmiri Festac.

    Ndị ọrụ nchekwa ụzọ ekwuola na otu tanka bụ mmanụ ụgbọala adachiela ụzọ na Festac.

    Ha kwuru na ha agbachiela ụzọ ebe ahụ ma nye ndị mmadụ ndụmọdụ ịkee nkwụcha.

    N'ozi ahụ ha kwukwara na agwaala ndị ọrụ mmenyụọkụ na ndị ọrụ gbatagbata maka ọnọdụ ahụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  2. Unu apụtala ụtụtụ?

    Onye meriri ntụliaka ọkwa onyeisiala na mba Amerịka?

    Asịsa ya na akụkọ ndị ọzọ dị mkpa ka anyị nwere ịwetara unu taa.

    Jisinu ike.

  3. Daalụ dịka i nọnyere anyị taa, ka ọ dị echi

    Ka chi foo

  4. Sheffield a ga-ahụkwa ụzọ laa be ha? Chelsea akụnyela ha ajụ n'anya

    Chelsea na ndị Sheffield

    Ndị otu Chelsea ezila na ebe onye bi ka ọ na-awachiri dịka ha ji ọkpụ goolu anọ asatara nanị otu were mee ndị otu Sheffield United ọbia na be ha.

    Ọ bụ na nkeji itolu ka ndị otu Sheffield gbalịrị nye otu goolu nke mere ka ndị mmadụ chee na ndị Chelsea alaala na mgbuka.

    Ọ bụ David McGoldrick nyere ya bu goolu dịka a gbara kọna nke oji ụkwụ ya gbakaa neti ndị otu Chelsea.

    David McGoldrick

    Na nkeji iri abụọ na ato ka Chelsea sara ya bu goolu site n'aka Tammy Abraham.

    Tammy Abraham

    Na nkeji iri atọ na anọ ka ndị chelsea gbara kọna nke Ben Chilwel were ohere onye na-agba azụ ndị Sheffield bụ Max Lowe nyere were nye goolu nke abụọ.

    Ben Chilwell

    N'agba nke abụọ na keji iri asaa na saa ka Thiago Silva mezuru ya atọ.

    Thiago Silva

    Max Lowe mekwara nghọtahe ọzọ nke nyere Timo Werner ohere ịnye goolu nke anọ na nkeji iri asatọ na ya bu asompi.

    Timo Werner
  5. ManUnited adọsịsịala ajị afụọnụ ndị Everton

    Bruno Fernades

    Manchester United ejirila ọkpụ goolu atọ asatra otu merie ndị otu Everton n'asọmpị Premier League n'ụbọchị Satụde.

    Ya bụ asọmpị bidoro nke ọma dịka Bernard nke Everton nyere goolu mbụ na nkeji iri na itolu ya bụ asompi bidoro.

    Bernard

    Kama na nkeji iri abụọ na ise ka Bruno Fernades ji isi takaa netị ndị Everton nke mere ka ha jiri ọtụ goolu otu goolu.

    Bruno Fernandes

    Fernandes gosiri na ọ naghị achị dịka ọ chọkwara iji Freekick nye golu ọzo kama ochee bọolụ ndị Everton fooro ntụntu taa na ya bụ bọọlụ agaghị abanye na neeti ha.

    Mbọ Bruno Fernandes mụtara mkpụru dịka o nyere goolu ọzọ na nkeji iri atọ na abụọ nke mere ka manunited jiri otu goolu karịa ndị Everton.

    Manunited na ndi Everton

    Dịka ọ fọrọ nkeji ole na ole ga-egbuchie ya bụ asọmpị ka Edinson Cavani onye ewebatara n'agba nke abụọ gosiri na agadi nwanyị anaghị aka nka n'egwu ọ maara agba dịka ọ nyere goolu mbụ ya kamgbe o bidoro ị gbara ndị Manunited,

    Nke a mere ka ọ bụrụ goolu atọ ka manunited jiri si ndị Everton...Ka ọ dị mbọsị ọzọ.

  6. 'Ọ bụ Yellow Fever na-egbu ndị mmadụ n'Enugwu steeti' - Gọọmentị Enugwu steeti

    Anwụnta

    Gọọmentị Enugwu steeti ekwuola na ọrịa ahụ gbara ndị mmadụ gharị nke na-egbu ndị mmadụ nsonso a na steeti ahụ bụ ọrịa Yellow Fever.

    Ya bụ ọrịa wakporo obodo Ette Uno na Umuopu nke dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Eze North na steeti ahụ.

    Ọ bụ kọmịshọna ahụike steeti ahụ bụ Emmanuel Ikechukwu Obi kwuru nkea n'akwụkwo ọ depụtara.

    O kwuru na Yellow Fever abụghị ọrịa ọhụrụ ma kọwaa na njirimara ya bụ ọrịa gụnyere anya ịcha mmemme na ahụọkụ.

    Obị kwuru na ngalaba gọọmentị Enugwu steeti na-ahụ maka ọrịa na ngalaba Nigerian Centre for Disease Control na ngalaba ndị ọzọ enweela nzụkọ n'ụtụtụ Satụde n'elekere iri iji mara ụzọ ha ga-esi chụọ ya bụ ọria ọsọ kpamkpam n'okpuru ọchịchi Igboeze.

    Ọ mara ọkwa ka mmadụ niile rubere iwu ịdị ọchọa nke so ọrịa coronavirus ma tinye kwa neti iji gbochie anwụnta ịbata n'ụlo.

    O kwukwara ka ndị mmadụ debe mbara ha ọcha, kpochapụ akwa mmiri ha, ma na-eyi kwa uwe na-egbochi anwụnta ịta mmadụ.

    Obị kwukwara na onye ọbụla hụtara njirimara ya bụ ọrịa n'ahụ ya maọbụ n'ahụ onye ọzọ, ka ha were ọsọ gaa n'ụlọọgwụ.

  7. Gọvanọ Ikpeazu akwala arịrị maka okporoụzọ Abia steeti

    Aka na-achị Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu akwaala arịrị n'akara Twitter ya maka ọnọdụ okporoụzọ gọọmentị etiti dị n'Abia steeti.

    O kwuru na o nwere ọtụtụ ụzọ dị na steeti ahụ bụ nke gọọmentị etiti mana n'ihi ọnọdụ ha, ndị Abia steeti ji ya eme njem azụ ahịa na-ata ahụhụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ụzọ ndị ọ metụtara gụnyere pkporouzo Aba - PH, Aba - Ikot Ekpene, Umahia - Ikot Ekpene, Umahia-Ohafia-Arochukwu.

  8. Unu abọọla chi?

    Akụkọ kachasị dị mkpa n'ụwa niile bụ ihe ndị anyị ga-ewetara unu taa.

    Jisinu ike sonye anyị na Facebook nakwa Instagram anyị maka omenala Igbo n'uju ya.

  9. E bugharịala ụbọchị e kwesịrị ịhọpụta onyeisi WTO

    Ngozi Okonjo-Iweala

    Onyeisi nzụkọ na-ahụ maka nhopụta onyeisi otu ' World Trade Organisation' ekwuola na ha ebugharịala ụbọchi e kwesiri ịhọpụta onyeisi ngalaba ahụ nke Ngozi Okonjo-Iweala nke Naijirịa na Yoo Myung-Hee nke mba Saụt Kọrịa na-azọ.

    E kwesịrị ịme ya bụ nhọputa n'abalị itoolu nke ọnwa Nọvemba afọ 2020 kama e higharịrị ya mana ha ekwughi ụbọchi ọzọ a ga-eme ya bụ nhọpụta.

    Ha kwuru na e tinyebeghị ụbọchi ọzọ maka ya bụ nhọpụta ma sịkwa na ọ bu maka etu ọnọdụ ihe siri dị na etu ahụike mba ụwa dị mere ha ji higharịa ya bụ nhọpụta.

    Ọ bụ naanị mba Amerịka kwadoro Mung-Hee ebe mba ndị ọzọ kwadoro Okonjo-Iweala.

    Ọ bụkwa ọnodu a mere ka ehiyarịa ya bụ nhopụta.

  10. Nwoke gara ije ogologo ụbọchị iji kwado Buhari na 2015 na-arịọzi enyemaka ụmụ Naịjirịa

    Dahiru Buba
    Nkọwa foto, Dahiru Buba ji abalị iri na ise were ụkwụ si Gombe gaa Abuja iji ṅụrịa maka mmeri onyeisiala Buharị meriri na ntuliaka 2015

    Dahiru Buba, nwoke ahụ ji ụkwụ si Gombe gaa Abuja iji ṅụrịa maka mmeri onyeisiala Muhammadu Buhari n'afọ 2015, na-arịọzi enyemaka ugbua dịka ụkwụ mgbu ekweghị ya ṅụrụ mmiri tọgbọ iko.

    Dịka ụlọntaakụkọ Daily Trust si depụta, nwoke a na-ebegara gọvanọ Gombe steeti akwa maka enyemaka.

    Nwoke a kwuru na naanị ihe o ritere kamgbe ọ gara ije ahụ tụrụ Naịjirịa niile n'anya bụ naanị asambodo.

    O were Buba abalị iri na ise iji si Gombe bịaruo Abuja n'oge ahụ, mana ugbua, agwọ na ihe o loro atọgbọrọla.

    O kwuru sị: “Kamgbe m gachara ije ahụ, ụkwụ mgbu a na-akawanye njọ kwa ụbọchị."

    "Ana m arịọ gọvanọ m bụ Inuwa Yahaya nke Gombe Steeti nakwa ndị isi pati anyị ka ha gbatara m ọsọ enyemaka ka m wee nwee ike inweta ezigbo ọgwụgwọ."

    Buba gara n'ihu kwuo na ahụ ụfụ akarịala ya ahụ n'ihi ụdị ụfụ njikọ ọkpụkpụ ya na-afụ ya.

    Nke ka njọ bụ na o nwezighị ike ịkwụnwu ụgwọ akwụkwọ ụmụ ya.

  11. Imo North Senatorial seat: Ụlọikpe enyela Ararume mmeri n'ikpe onye ga-anọchị Uwajumogu

    Ifeanyi Ararume na Frank Ibezim

    Ụlọikpe akagbuola mmeri Frank Ibezim merịri na ntuliaka imeụlọ otu APC ma nye Ifeanyị Ararume ikike ịnọchite pati ahụ na ntuilaka maka ọkwa onye na-anọchite mpaghara Imo-North n' Ụlọomeiwu Ukwu.

    Ọkwa ahụ ghere oghe kemgbe Senetọ Benjamin Uwajumogu bụ onye nọbu n'ọkwa ahụ nwụrụ n'afọ 2019.

    Jọstịs Garba Ringim, onye nyere mkpebi ahụ ụbọchị Fraide kwuru Ibezi esonyeghị na ntuliaka otu APC mere n'abalị atọ nke ọnwa Septemba afọ 2020 dịka kọmiti nyochara ndị tinyere akwụkwọ ịzọ ọkwa ahụ gụpụrụ Ibezim na mmadụ ise ndị ọzọ sị na ha etozughị.

    Ringim ,onye kwupụtara na ọkwa onye ga-efe ọkọlọtọ APC na ntuliaka ahụ bụ nke Ararume, gara n'ihu nye Inec iwu ka ha were aha Ararume tichie nke Ibezim ozigbo.

  12. 'Enweghị mgbe m jiri kwuo ka ndị FRSC buwe egbe' - Omeiwu Samuel Akinfolarin

    Ndị FRSC

    Samuel Akinfolarin, bụ onye omeiwu nta ma bụrụkwa onyeisi ngalaba omeiwu na-ahụ maka ndị ọrụ okporoụzọ bụ Federal Road Safety Corps (FRSC), ekwuola na onweghị mgbe o ji kwuo ka e nye ndị ọrụ FRSC egbe ka ha were na-echekwa onwe ha.

    Akinfolarin gwara BBC Igbo na ihe ọ rụtụru aka bụ na iwu hiwere ndị ọrụ nchekwa n'afọ 2007 nyere ha ikike iji egbe chekwa onwe ha.

    O kwukwara sị "Dịka ngaghariiwe End SARS na-ewu, o nweghị onye isi dị mma ga-ebido ikwu okwu maka inye ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ egbe".

    SAMUEL AKINFOLARIN
    Nkọwa foto, Samuel Akinfolarin bụ onyeisi ngalaba ụlọ omeiwu nta na-ahụ maka ndịọrụ FRSC

    Akinfolarin kwuru na ndị nzụkọ ụlọomeiwu na ndị otu FRSC nwere nzụko ebe ndị FRSC kwuru na ndị mmadụ na-awakpo ndị otu ha ọtụtụ oge n'ụzọ ebe ha na-arụ ọrụ ha.

    O kwuru na a ga-enwe nzụko n'etiti ndị omeiwu, ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ na ngalaba ndị ọzọ okwu nchekwa ndị ọrụ FRSC metụtara ka ha mara etu ha ga-esi chekwa ha mgbe ha na-arụ ọrụ ha.

    Nke a na-eme dịka ndị mmadụ na-egosipụta iwe ha dịka akụkọ pụtara n'ụfọdụ akwụkwọ mgbasa ozi na-ekwu na ndị ọrụ FRSC ga-ebido buwe egbe.

    Boboye Oyeyemi
    Nkọwa foto, Boboye Oyeyemi bụ onyeisi ndị FRSC na Naịjirịa

    N'aka nke ọzọ, ndị ọrụ FRSC nke onye kwuchitere ha bụ Bisi Kazeem kwuru na ọ bụ nghọtahie.

    Kazeem kọwara na Akinfolarin kwuru sị "Ọ bụrụ na ndị FRSC na-ebu egbe, mwakpo a na-awakpo ha agaghị adị nke ukwu".

    Kazeem kwuru na ndị otu FRSC ga-eme ihe ọbụla gọọmentị si ha mee ma kwukwaa sị: "Anyị kpọtụrụ ndi ọrụ nchekwa ndị ọzọ, ha na-agbatara anyị ọsọ enyemaka ndi dịka ndị uweojii, ndị 'Civil Defense' maọbụ ụfọdu mgbe ndịagha".

    O kwuru na e nwere ọtụtu ihe ha ga-etinye uche ma ọ bụru na a chọrọ inye ha egbe, nke gụnyere iwepụta ego maka ya, ikuziri ha maka egbe na ihe ndị ọzọ.

    Kazeem kwuru na onweghị mgbe onye omeiwu jiri kwuo ka ndị FRSC buwe egbe kama ọ rụtụru aka na e nwere iwu nke nyere ndị ọrụ ha ikike ibu egbe maka nchekwa ha.

    Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya na soshal Midịa

    N'aka nke ọzọ ọtụtu ndi Naijirịa apụtala katọọ atụmatụ ọbụla nke ga-enye ndị ọru nchekwa okporoụzọ ikike ibu egbe.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

  13. E duola ndị ọkaikpe Ụlọikpe Kachasị mmadụ asatọ

    Jọstịs Tanko Mohammed

    Ọkaikpe Kachasị nke Naijiria bụ Jọstịs Tanko Mohammed eduola ndị ọkaikpe Ụlọikpe Kachasị mmadụ asatọ iyi ọrụ taa bụ abalị isii nke ọnwa Novemba, afọ 2020.

    Nke a welitere ọnụọgụgụ ndị ọkaikpe nke Ụlọikpe Kachasị site na iri na abụọ ha dịbu ruo iri abụọ.

    Ndị e duru na ya bụ iyi ọrụ gụnyere Emmanuel Agim, onye 'South-South', Samuel Oseji, onye 'South-South',Helen Ogunwumiju, onye 'South-West' na Tijani Abubakar, onye 'North- East'.

    Ndị ọzọ bụ Abdu Aboki, onye 'North West', M. M. Saulawa, onye 'North West' na Adamu Jauro, onye 'North East'.

    Ha ṅụrụ iyi ịkwado Iwu ala Naijiria.

  14. Buhari agaghịzị aga ụlọọgwụ mba ofesi ọzọ

    Onyeisiala Mohammadu Buhari agaghịkwa aga ụlọọgwụ na mba ofesị ọzọ ma eme uche ndị ụlọomeiwu sineti.

    Onye nkwuru nke a bụ Sinatọ Danjuma La'ah mgbe ndị ọrụ ụlọọgwụ dị n'obi onyeisiala bịara ịkọwa maka ego ha tinyere na bọjet nke afọ 2021.

    Ndị ụlọọgwụ ahụ wetere ego dị ijere Naịra iri na itoolu (N19Bn) nke otu ijeri na ụma atọ (N1.3bn) n'ime ya bụ maka idozi ụlọọgwụ ahụ.

    Ndị omeiwu ahụ gwara ha na ha ga-anabata ya bụ ọkpụrụkpụ ego mana ha kee nkwụcha ịrụ ọrụ ya na ya so.

    H akwuru na ha agaghị akwụfucha ụdị ụgwọ ahụ ma hapụ ka onyeisiala na-aga ụlọọgwụ na mba ofesi.

    Muhammadu Buhari
  15. Unu asaala chi e! Ndụ mmiri, ndụ azụ. Nke onye chiri ya zere

  16. Buhari na ndị eze ọdinala na-eme nzukọ

    Buhari na ndị eze

    Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari na ụfọdụ ndị eze na Naijiria a pịị aka were họrọ gụnyere Ooni nke Ife bụ Oba Adeyeye Enitan Ogunwusi; na Sultan nke Sokoto mabụrụkwa onyeisi otu jikọrọ ndị Eze na Naijiria nakwa onyeisi Alakụka Alakụba bụ Muhammad Sa’ad Abubakar.

    Ndị eze ndị ọzọ nọ n'ọgbakọ ahụ nke e mere n'imeụlọ bụ onyeisi otu jikọrọ ndị Eze n'Imo steeti,Emir nke Kano, Emir nke Fika, Tor Tiv, na ndị ọzọ.

    A mabeghị isiokwu ọgbakọ ahụ.

    Ndị eze
    Ndị eze biara ọgbakọ ahụ
    Nkọwa foto, Ndị eze biara ọgbakọ ahụ
  17. Lee etu ọkụ si gbaa ọdọ mmanụ agbịdị n'Ijora Legọs

    Ọkụ gbara na Ijora

    Ndị ọrụ gbatgabata na Legọs ekwuola na ọkụ gbara na ọdọ mmanụ agbịdị dị na mpaghara Ijora na steeti ahụ.

    Ha kwuru na ha amalitela usoro iji kwụsịlata ya bụ ọkụ ka ọ ghara ịmetụta ihe ndị ọzọ n'iihi na ọ dị nso n'ebe ndị mmadụ bi.

    Ha jikwa ohere ahụ gwa ndị bi na Legọs ha enwela obi nkolopu n'ihi ihe a mere.

    Ijora fire
  18. Naịjirịa chọrọ ịma ka Chukwunonso Madueke aga ahapụ England gbawazịrị Super Eagles

    Chukwunonso Madueke

    N’egwuregwu, Naịjirịa malitela ịzụọkwe ịme ka Chukwunonso Madueke na-agbara England ọ ga-abịa isonyere ha na Super Eagles.

    Nwafọ Naịjirịa a amụrụ na Uk malitere ịgbara England mgbe ọ gbara afọ iri na isii ruo ụgbụa ọ dị afọ iri na asatọ.

  19. Olisa Agbakoba ekwuola ụzọ ka mfe iji hazigharịa Naịjirịa

    Okaikpe ukwu bụ Olisa Agbakọba ederela ndị isi Sinate akwụkwọ na-arịọ ka ha gbaa mbọ hazịgharịa ọchịchị obodo a n’ụdị ga-enye ndị steetị ikike karịrị nke gọọmentị etịtị.

    N’akwụkwọ ọ degaara Ahmed Lawan bụ onyeisi ndị Sineti, Agbakọba sị na ọ bụ naanị inye ndị steetị ikike ịlekọta onwe ha bụ ụzọ Naịjirịa ga-esị gaa n’ihu.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  20. Nkwekọrịta ASUU na gọọmentị esiela ike

    Biodun Ogunyemi onyeisi ndị ASUU

    Nzụkọ ndị ASUU na gọọmentị nwere maka usoro ịkwụ ụgwọ ọnwa ha nakwa ọdịmma agụmakwụkwọ akpụọla afọ n’ala ọzọ.

    Minista agụmakwụkwọ bụ Chris Ngige sị na gọomenti nwereike ịnye ndị nkuzi mahadum ijeri Naịrịa iri abụọ maka ịmezi ụlọakwụkwọ, karịa otu narị ijeri Naịrịa na ụma iri ndị ASUU na-ana ha.

    ASUU na gọọmentị nọ na dọndọkịrịdọ maka ịhe gbasara usoro akwụmụgwọ ọnwa ha a kpọrọ IPPIS bụ nke ASUU sị na ha achọghị.

    ASUU sị na usoro a ga-adọchịrị ha akaelekere azụ na ọ bụ nke ha mepụtere bụ University Transparency and Accountability Solution (UTAS) ka ha chọrọ iji.

    Gọọmentị ekwetebeghị nke a., tinyere na ha sị na ha ejighị ego niile ASUU na-ana ha.