Unu asaala chi!
Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

Ebe foto si, Screengrab
Taa ka e duru Gọvanọ Godwin Obaseki n'iyi ọrụ ka ọ malite ọchịchị agba nke abụọ ya dị gọvanọ Edo steeti.
Mana dịka ya bụ emume na-aga n'ihu, ajụ buturu onye uweojii na-akwụ Obaseki n'azụ nke Bekee na-akpọ 'Aide de-camp' (ADC).
Ọ bụ oge Obaseki na-agụpụta ozi ekele ya ka onye uweojii ahụ malitere ịsọ ganịganị ma gharịpụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mana ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ nọ nso ebe ahụ gbataara ya ọsọ enyemaka ma were nwayọọ dọba ya ọdụ n'oche.
Dịka ụlọorụ ntaakụkọ Premium Times si kwuo, Patrick Okundia, onye bụbu Kọmishọna ahụike n'Edo steeti, bịakwara nyere nwoke ahụ aka tupu a kpọrọ ya gaa n'ụgbọala ahụike dị nso ebe ahụ.
Otu onye welitere isi na ndị uweojii Edo steeti mechara gwa ndị ntaakụkọ na nwoke ahụ adịla nnọọ mma.
Ọ kọwara na o nwere ike ịbụ ike ọgwụgwụ mere nwoke ahụ ji gharịpụ.

Ebe foto si, Tokemakinwa/Instagram
Ụlọikpe ukwu dị na Legọs asịla onye ọrụ mgbasaozi na Redio bụ Omotoke Makinwa ka ọ kwụọ onye bụbu di ya Maje Ayida otu nde naịra maka imetọ aha ya.
N'ụlọikpe a, ọkaikpe Olukayode Ogunjobi sị na Makinwa na onye bipụtaara ya akwụkwọ a kpọrọ "On Becoming" bụ ebe ọ metọrọ aha Ayida, ga-akwụ puku narị naịra ise n'otu n'otu.
Ọkaikpe a sị Makinwa na ụlọọrụ Kachifo kwụọ ego a n'aka ụlọọrụ na-enyere ndị mmadụ aka nke Ayida chọrọ.
O nyere ha otu ọnwa ịkwụ ụgwọ a malite ụbọchị o kpere ikpe a ma wepu ebe ahụ o metọrọ aha Ayida n'ime akwụkwọ "On Becoming".
Ọkaikpe sị na nke a nọ peegi 54, akara 11 ruo 16 nakwa peegi 83 akara 1 n'ime akwụkwọ a.
Mkpebi ikpe a na-abịa n'ime afọ atọ Ayida kpụpụchara Makinwa na ụlọọrụ Kachifo n'ụlọikpe.
Gere nkeji coronavirus nke BBC Igbo.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ekperima amaghị ndị ha bụ egbuola Kingsley Obasi, bụ onye enyemaka osote onyeisi ndị omeiwu Ebonyi steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Loveth Odah gwara BBC na ya bụ ihe mere na mgbede abalị ụbọchị Wenezde.
Odah kwuru na ya bụ nwa amadi eruwela nso na be ya oge ụmụokorobịa abụọ nọ n'elu ọgbatumtum wakporo ya, nara ya akpa ya ma gbaa ya egbe.
Oge a kpọtụụrụ ndị uweojii nọ nso ebe ahụ, ha gbatara ma buru ya gawa ụlọọgwụ ụlọọgwụ 'Federal Teaching Hospital' dị n'Abakiliki, ebe dọkịta gwara ha na ọ nwụọla.
Onye uweojii ahụ kwuru na ụdị ihe a anaghị emekarị oge ọbụla n'ihi na Ebonyi steeti bụ ebe dara jụụ.
O kwukwara na onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ enyela iwu ka amalite nnyocha miri emi iji chọta ma nwụchie ndị kpara ya bụ arụ.

Ebe foto si, Isiala Ngwa South LGA/Facebook
Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na isiụlọọrụ okpuruọchịchị ime obodo Isiala Ngwa Saụt dị n'Omoba, Abia Steetị agbaala ọkụ.
Onye na-arụ ọrụ n'ebe ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya sị na ọkụ a malitere n'isi ụtụtụ ụbọchị Tọsde.
O kwuru na a mabeghị ihe kpatara ọkụ a ji malite n'isiụlọọrụ ahụ.
Mana gọọmentị Abia Steeti akatọọla ọkụ a gbara isiụlọọrụ a ma nye ndị ọrụ nchekwa iwu ka e nyocha, nwuchie ma taa ndị kpara arụ a ahụhụ.
Nke a dị n'ozi odeakwụkwọ gọọmentị a bụ Chris Ezem wepụtara.

Ebe foto si, Isiala Ngwa South LGA/Facebook
Akụkọ gaara n'ihu kwuo na onyeisi ọrụ Gọvanọ Abia Steetị bụ ACB Agbazuoere abịala ebe ahụ ma hụ ka ọkụ a si gbaa na ihe ndị ọzọ o mebiri.
Agbazuere si n'okpuruọchịchị a ma bụrụkwa onyeisioche ya n'afọ ole na ole gara aga.

Ebe foto si, The Governor of Borno state/Facebook
Ndị agha Naijirịa na-ekwu na Abubakar Shekau,Maman Al-Barnawi bụ ndị isi otu oyiegwu na mmadụ iri asatọ na anọ ọzọ abụrụla ndị ha chọrọ ịnwuchi nke taa nke echi.
Ọ bụ gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum na onyeisi ndịagha Naijirịa bụ Tukur Buratai kpughere aha ndịa.

Ebe foto si, Governor Borno/Twitter
Ha mere nkea dịka ha na na-edu ndị agha nkiti bụ Civilian Joint Task Force n'iyi ọrụ.
N'aka nke ọzọ, onyeisi ode akwụkwọ mba Amerịka bụ Michael Pompeo ekelela mba dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka ọkachasị Naijirịa maka nzụkọ ha nwere maka imeri otu oyi egwu bụ ISIS na mpaghara ọdịda anywanwụ Afrịka.

Ebe foto si, The Governor of Borno state/Facebook

Ebe foto si, NCDC
Ngalaba NCDC edepụtala na mmadụ otu narị na iri asatọ ọzọ anwụọla site n'ọrịa coronavirus na Naijirịa.
Ọnụ ọgụgụ ha gosikwara na mmadụ narị anọ na anọ esila n'aka ya bụ rọia gbakee ebe mmadụ abụọ ọzọ anwụọla site na ya.
Ha gosiri na mmadụ anọ n'ime ha si Rivas steeti ebe abụọ sị Crossriver.
Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị
Hie ma teta ụra nke ọma.

Ebe foto si, Ikedi Ohakim/Facebook
A kpụla aka chịbụrụ Imo steeti bụ Ikedi Ohakim Ụlọikpe Ukwu dị n' Abuja ụbọchị Wenezde maka ebubo ịnye ndị uweojii ozi asị megide otu nwaanyị a kpọrọ Chinyere Amuchienwa.
N'akwụkwọ ahụ nke ọ bụ onyeisi ndị uweojii Naijiria gbara, a na-ebo Ohakim ebubo ịghara ndị uweojii ụgha na Chinyere Amuchienwa ji egbe were maja ya.
E bokwara ya ebubo ikwu na ya nwere ala ya chọrọ ire na Legọs nke bụ Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Babatunde Fashola nwe ya.
Mana Ohakim kwuru na aka ya dị ọcha n'ebubo ndị a.
Dịka ụlọakụkọ Nation siri kwuo, Ọkaiwu Ohakim bụ Ken Njemanze rịọrọ ka a tọhapụ Ohakim n'ogige ndị uweojii, ebe ọkaiwu wetara ikpe ahụ bụ Stanley Nwodo,jụrụ si na a hapụ Ohakim na ọ ga-enye dịka ndị uweojii kpọrọla ya oku ọtụtụ oge mana ọ zaghị ya.
Na mkpebi ya, ọkaikpe kpere ya bụ ikpe bụ Jọstịs Samira Bature gwara Ohakim ka ọ kwụọ nde naira iri ma kpọtakwa onye ga-ana ya n'akaebe ga-abụ onye nwere agba ma birikwa n'Abuja.
E higharịrị ikpe ahụ buga ya n'abalị 25 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2021.
Gere akụkọ banyere coronavirus n'Afrịka taa.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị butere coronavirus n’Amerịka n’ụbọchị Tusde dị puku narị na puku iri atọ na otu bụ ọnụọgụgụ kachasị kwa ụbọchị.
Ọrị a gbukwara mmadụ ruru otu puku, narị atọ na iri anọ na asaa n’ime otu ụbọchị ahụ, nke kachasị kamgbe ọnwa Ọgọstụ.
Nke a mere ka ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa na mba Amerịka kamgbe ọ batara karịa nde iri na ụma abụọ, ebe ndị nwụrụla dị puku abụọ narị abụọ na puku iri atọ na itoolu, narị isii na iri asatọ na atọ.
Nke a dị n'ozi nyocha ngalaba ahụike mahadum John Hopkins wepụtara.

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja akwadola otu ọkaiwu a kpọrọ Oladimeji Ekengba ka ọ kpụpụ onyeisiala Buhari n'ụlọikpe maka ọjụjụ ọ jụrụ idu ndị ọkaikpe mmadụ iri atọ na atọ n'iyi ọrụ na-agbanyeghi na ọ bụ otu jikọtara ndị ọkaiwu họpụtara ha.
Akwụkwọ ọkaiwu a gbara nke a kpọrọ 'order of mandamus' ga-amagide onyeisiala n'ike ka o duo ndị ọkaikpe a n'iyi dịka ndị otu NJC si họpụta ha.
Onyeisiala adịla na mbụ nye mmadụ iri na otu so ndị NJC họpụtara ọrụ ma hapụ mmadụ iri abụọ na otu ndị ọzọ.
N'ikpe ọ chabiri n'ụbọchị Wenesde, ọkaikpe Inyang Ekwo sị na ọkaiwu Ekengba wepụtara akwụkwọ zuru oke n'ihu ụlọikpe nke mere e ji nye ya ikike a.
Kama ọ sị na inye ya ọkaiwu a ikike ịgba onyeisiala akwụkwọ apụtaghị na o meriela n'ikpe ahụ.
Ndị ọ gbara akwụkwọ gụnyere Onyeisiala na ọkaiwu gọọmentị etiti.
Cheta na ọkaikpe Ekwo na Sepụtemba chabiri ikpe ọzọ na Onyeisiala ji dara iwu site n'iziga aha mmadụ iri na otu ahụ n'ụlọomeiwu maka nyocha.
Ọkaikpe a sị na ọ bụ naanị nhọpụta onyeisi ọkaikpe ka a na-enye ndị omeiwu ka ha nyochaa.

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba nchekwa Naijirịa bụ State Services akpọpụla Kabiru Mohammed ụlọikpe maka ebubo na ọ wepụrụ ihe onyonyo adigboroja gosiri agbamakwụkwọ onyeisiala Naijirịa na Sadiya Umar Farouq bụ mịnista na-ahụ maka ọdịmma ụmụ Naịjirịa.
Ngalaba a nwuchiri kabiru kamgbe ọnwa Jenuarị kwukwara na Mohammed ejirila ọnụ ya kweta na ọ bụ ya wepụtara ihe onyonyo adigboroja ahụ.
Ụlọikpe nụrụ na ya bụ ihe onyonyo metọrọ ndị nọ na ya ma bute nsogbu n'etiti ha na ndị ezinụlọ ha.
Ngalaba a gwara ụlọikpe ka ha hapụ inye Kabiru ohere ịpụta n'aka ndị uweojii ka ha nwee ike mecha nyocha ha nke ọma .
Kama ụloikpe tọhapụru ya n'aka ndị uweojii dịka ọkaiwu ya kwuru na ihe ọ mere nyere ohere n'iwu ka atọhapụ ya n'aka ndị uweojii.
Eyiharịrị ya bụ ikpe n'ụbọchi ise nke ọnwa febụarị afọ 2021.

Ebe foto si, Omeiwu Shehu Sani
Abdulkadir Balarabe Musa, onye rụburu ọrụ dịka gọvanọ mbụ Kaduna Steeti dịka onye nkịtị anwụọla. Ọ nwụrụ na Kaduna steeti dịka ọ dị afọ iri asatọ na anọ.
Ọ nwụru dịka o rịara ọrịa.
Musa bụ gọvanọ Kaduna steeti n'afọ 1979 kama emechara wepụ ya n'ọrụ.
O soro na ndị gbara mbọ ka-ewepụ ndị agha n'ọchịchi na Naijirịa.
Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ ya
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2

End of X post, 3

End of X post, 4

End of X post, 5

End of X post, 6

End of X post, 7

Ebe foto si, Nigerian Air Force/Twitter
Ndị aghaelu Naijirịa enwetela ụgbọelu agha mmadụ anaghị anọ n'ime ya abụọ.
Ya bụ ụgbọelu agha aha ya bụ WingLoong 11 Unmanned Combat Aerial Vehicle (UCAV).
Ya bụ ụgbọelu agha nwereike ị nọ n'elu awa iri atọ na otu ma ọ bụrụ na ọ na-eme nchọpụta ma nwee ike ịnọ n'elu awa iri abụọ na isii ma ọ bụrụ na ọ na-alụ ọgụ.
Ọnụ na-ekwuchitere ndịagha elu bụ Ibikunle Daramola depụtara n'akwụkwọ ozi na ya bụ ụgbọleu agha ga-enyere aka lusuo ndị oyiegbu na ndị omekome ọzọ agha na Naijirịa.
Daramola kwukwara na Naijirịa enwetela ụgbọele iri abụọ na abụo ma na-atụanya ịnweta iri na itolu ọzọ n'ọnwa Jun afọ 2021.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

Ebe foto si, Presidency Nigeria/Twitter
Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buharị ebidola atụmatụ nke ga-akwado ma nye ndị ntoroọbịa ohere i banye ọrụ ugbo.
Atụmatụ a nke ngalaba National Agricultural Land Development Authority (NALDA) bu n'isi nke ha kpọrọ National Young Farmers Scheme ga-enye ndị ntoroọbịa otu puku n'ime okpuru ọchịchị narị asaa na iri asaa na anọ dị na Naijirịa nkwado ọrụ ugbo kwa afọ.
Ya bụ atụmatụ ga-ebido n'okpuru ọchịchị atọ n'ime steeti iri na isii n'otu n'otu.
Ha na-atụanya na ọ bụ mmadụ puku anọ na narị asatọ ga ha ga-eji tulee ya bụ atụmatụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, NCDC
Ngalaba NCDC edepụtala na mmadụ otu narị na iri ise na abụọ ọzo ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa, ebe mmadụ abụọ ọzọ anwụọla site n'aka ya bu ọrịa.
Ọnụ ọgụgu ha gosiri na mmadụ narị abụọ na iri isii na anọ esila na ya bụ ọrịa gbakee.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, BBC Sport
Ọnụ na-ekwuchitere onyisiala Naijirịa na soshal Midịa bụ Bashir Ahmed ekwuola na-enwere mmanụ ụgbọala karịrị lita ijeri abụọ na ụma gọọmentị dopụrụ iche na Naijirịa.
O kwuru na ọ bụ onyeisi ụlọọrụ Nigerian National Petroluem Corporation bụ Mele Kyari kwuru nke a .
Bashir depụtara na akara Twitter ya na Kyari kọwara na abụbọ ọrụ ndị otu Petroluem and Natural Gas Senior Staff Association na-agba agaghị eme ka mmanụ ụgbọala kọọ n'oge mmemme.