Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
N'Afrịka, Ọchịagha mba Ethiopia bụ Gen Berhanu Jula ebola onyeisi WHO bụTedros Ghebreyesus ebubo ịdọnyere ndị agha nnupuisi ndị Tigray ukwu dịka agha dị na mba ahụ tarala isi ọtụtụ mmadụ.
'Ọ dịka gọọmentị achọghị ka ụmụakwụkwọ mahadum malite akwụkwọ n'afọ a' - ASUU
Otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadam bụ ASUU n'ịchafụ ekwuola na ọnụokwu gọọmentị egosila na o nweghị mgbe ha chọrọ ka ha mepee ụlọakwụkwọ mahadum n'afọ a.
Nke a bụ na nsahachi okwu Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige kwuru bụ ebe ọ sị na usoro akwụm ụgwọ ọnwa ha wetere bụ IPPIS agaghị akwusili mpụ na mahadum Naịjirịa.
Ihe Paul Okoye sara onye sị ka ya na ejima Peter mee udo
Ebe foto si, Paul Okoye
Paul Okoye akatọọla
otu onye ọ kpọrọ ‘Aunty’ maka inye ya na ejima ya Peter ozi ekele n’ụbọchị ncheta
ọmụmụ ha ma sị ha gbalịa mee udo.
Paul depụtara
nke a n’akara Instagram ya ma kwuo na onye ahụ ọ kpọrọ ‘Aunty’ na-aghọ ag hụghọ
na aka ya dị na-eseme okwu dị n’etiti ya na ejima ya.
Ọ sị na
kamgbe afọ anọ gara aga na ‘Aunty’ a kpọtụbeghi ya n’ekwentị kama n’ụbọchị 18 Nọvemba
afọ ọbụla ọ pụta na soshal midia na-ekele ha ka ndị mmadụ sị na ọ bụ onye ọma.
Mana ndị
mmadụ agaghị ama ihe ọjọọ ọ na-eme n’ime ụlọ, na ọ pụta n’ezi o mee ka onye mmụọ
ozi.
Paul sị na ọ
gaghị ata ya ụta maka na ọ bụ soshal midia nyere ya ohere ikwu ihe o kwuruna ọ gwa afọ ọzọ ọ bịa dee ihe ọzọ.
Ebe foto si, @kingrudy
N’agbanyeghi na Paul akpọghị onye bụ ‘Aunty’ a aha mana aka onye ọbụla na-arụ nwunye ejima bụ Lola Omotayo Okoye aka na ọ bụ ka Paul na-ekwu.
Nke a bụ maka na Lola ziteere Paul na di ya Peter ozi ekele ncheta ụbọchị ọmụmụ ha n'akara instagram ya ebe o zipụtara foto ha abụọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of Instagram post
BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n’ọnụ Peter Okoye site n’aka ọnụ na-ekwuru ya mana ọ zaghị mgbe a kpọrọ ya.
Cheta ejima abụọ a malitere iti egwu n’afọ 2003 ebe ha etiela ọtụtụ egwu wuru ewu na Naịjirịa nakwa ụwa.
Mana n’afọ 2017, akụkọ pụtara na ejima abụọ a agbasala n’ihi esemokwu dị n’ezinaụlọ.
Etu nabata David Umahi na APC si aga n'Abakiliki
David Umahi bụ aka na-achị Ebonyi steeti afeela pati o si n'aka ha bụrụ gọvanọ bụ Peoples Democratic Party (PDP) aka.
Emune eji anabata ya na-aga n'ihu n'Abakaliki ugbua.
Nkọwa foto, David Umahi sị na ọ bụ maka etu pati PDP si mee Ọwụwa Anyanwụ ka o ji pụọ na pati ahụ
Ihe anyị mere ndị Igbo kemgbe 1998 dị ọtụtụ- PDP
Ebe foto si, @OfficialPDP
Otu PDP agọola sị na ebubo Gọvanọ David Umahi nke Ebonyi steeti boro ha na ha megburu Igbo na agbanyeghị nkwado puru iche site na mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ.
N'ozi nke ha wepụtara nke odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ Kola Ologbondiyan binyere aka, PDP kwuru na ihe ha mere ndị Igbo karịrị akarị.
Ebe foto si, Nnamani,Anyim,Wabara,Okadigbo
PDP, ndị jụrụ ihe APC merela ndị Igbo kwuru na ha nyere Igbo :
1. Ọkwa onyeisi Sineti ụgboro ise:nke Evans Enwerem, Chuba Okadigbo, Anyim Pius Anyim, Adolphus Wabara na Ken Nnamani jiri.
2. Ọkwa Osote Onyeisi Sineti nke Sen Ike Ekweremadu onye ji ọkwa ahụ afọ 12
3. Ọkwa Onyeisi Ụlọnnọchiteanyị nke Emeka Ihedioha jiri
4. Ọkwa onyeisioche pati nke Vincent Ogbulafor na Okwesilieze Nwodo jiri.
5. Ọkwa 'Chief of Army Staff' nke Lt. Gen. Azubuike Ihejirika jiri
6. Ọkwa Odeakwụkwọ Gọmmentị Etiti nke Anyịm Pius Anyim jiri
7. Ọkwa onyeisi Ụlọakụ Etiti (CBN) Dr. Charles Soludo jiri
8. Ọkwa Mịnịsta na-ahụ maka ego nke Ngozi Okonjo-Iweala jiri
9. Ọkwa onyeisioche Inec nke Maurice Iwu jiri
10. Dave Umahi jiri ọkwa Onyeisioche pati ha, Osote Govano nakwa ọkwa Gọvanọ ụgbọrọ abụọ.
'Jonathan rụrụ ezigbo ọrụ na Naijirịa' - Buhari
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Bihari ezigarala Goodluck Jonathan ozi ekela dịka ọ gbara afọ iri isii na atọ n'ụbọchị Frịde.
Ọ bụ onye ode akwụkwọ onyeisiala bụ Femi Adesina ka o zịgara ya ozi ogologo ndụ na ahụ isi ike.kwuru nkea.
Buhari kwuru na etu Jonathan siri chia wetara Naijirịa ọganiru na ugwu ziri ezi.
Buharị kelekwara Jonathan maka mbọ ọ na-agba dịka onye nnọchite anya na onyeisi ngalaba ECOWAS iweta udo na mba Mali.
Ọ fọrọ obere ka gọọmentị wepụta 'Finance Bill' nke afọ 2020
Ebe foto si, Presidency Nigeria/ Twitter
Ụlọọrụ onyeisiala Naijirịa ekwuola na ọ fọrọ obere ka gọọmentị wepụta iwu nkwado nke ga-enyere aka ị hụta na-emezuru ihe dị n'ime Bọjet 2021.
Ya bụ iwu gụnyere ụtụisi ndị ọzọ na atụmatụ nke ga-ebelata ahụhụ ndị Naijirịa na-ata maka etu onodụ akụnụba obodo dị.
Lee ụfọdụ ihe gbara okpụrụkpụ
1) Ibelata ụgwọ ụtụisi ndị na-ebubata ụgbọala eji akọ ugbo na nke ehi ebu ibu na ndị mmadụ na Naijirịa
2) Inye ohere ka ụlọọrụ ndị bere mpe hapụ ịkwụ ụtụisi nke TETFUND
NBA Draft 2020: Lee Ụmụafo Naịjirịa ahọpụtara isonye tụọ bọọlụ nkata NBA n'afọ a
Mmadụ atọ anwụọla maka ọgbaaghara sochiri nwụchi Bobi Wine
Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii mba Uganda ekwuola na mmadụ atọ anwụọla ebe ọtụtụ ndị ọzo merụrụ ahụ dịka ọgbaaghara dapụtara mgbe ndị mmadụ mere ngaghariiwe maka nwuchi a nwuchiri onye soro azọ ọkwa onyeisiala mba ahụ bụ Robert Kyagulani bụ onye eji Bobi wine mara oge ha na-eme emume achụmnta votu.
Akwụkwọ ozi ndị uweojii ekwughị etu mmadụ atọ a siri nwụọ.
Kama ihe onyonyo na-agagharị na Soshal Midia gosiri ndị mmadụ ọbara juru ahụ ebe ụfọdụ n'ime ha tọgbọrọ ka ndị nwụrụ anwụ.
A nwụchiri Bobi Wine na mpaghara Luuka dịka ndị uweojii boro ya ebubo na o hiwere nzụkọ nke nupuru isi n'usoro nchekwa ọrịa coronavirus gọọmentị hiwere.
A nwuchikwara onye ọzọ sọ azọ ọkwa onyeisiala mba ahụ aha ya bụ Patrick Amuriat Oboi.
Mba Uganda ga-eme ntuliaka maka ọkwa onyeisiala ha n'ọnwa Jenuarị nke mere na ndị uweojii na-amachi nzụkọ ọbụla maka nchekwa ọrịa coronavirus.
O nwere gọvanọ PDP ọzọ ga-aba APC - Wike
Gọvanọ na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike ekwuola na o nwere gọvanọ ọzọ no na pati Peoples Democratic Party (PDP) ga-esoro gọvanọ na-achị Ebonyi Steeti bụ David Umahi gawa pati All Progressive Congress (APC).
Wike kwuru nke a dịka ọ na-eme mkaprịta ụka na Channels TV ụnyaahụ bụ Wenesde.
Ọ sị na ya agaghị akpọ ahọ́ gọvanọ ahụ dịka ọ na-ekwu na ihe Umahi sị mere ya jiri pụọ na PDP esighi ezi.
"Umahi bụbụ onyeisi PDP n'Ebonyi, bụrụ osote gọvanọ tupu ọ bụru gọvanọ. Kedụ ihe mere mamdụ dị ka ya ga-asị na o nweghị ihe o ritere n'aka PDP?" bụ ajuju Wike jụrụ.
Onye bụbụ Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Osita Chidoka sokwa tinye ọnu n'okwu banyere ọpụpụ Umahi site n'ịtu ilu maka nwoke chọrọ ịdịna nwunye nna ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ka o si kwuru ugbua, David Umahi na APC na steeti ya ga-eme emume nnabata taa bụ Tụzde n'Abakiliki bụ isi obodo Ebonyi.
'ASUU na gọọmentị etinyela ndụ anyị na nsogbu' - Ụmụ akwụkwọ mahadum
Ebe foto si, Getty Images
Ụmụ akwụkwọ mahadum na Naijirịa ekwuola na ọ bụ ha na-ata ahụhụ dịka ngalaba jịkorọ ndị nkuzi mahadum na Naijirịa bụ ASUU na-agba abụbọ ọrụ maka nghọtahe ha na gọọmentị nwere maka akwụm ụgwọ.
Nkea na-eme dịka ndị ASUU na-agwa ụmụ akwụkwọ na ndị nne na nna ka ha hapụ ịtụ anya na mahadum ga-ebido akwụkwọ nsonso a.
Abụbọ ọrụ ndị ASUU hiwere isi n'ebubo na gọọmentị Naijirịa achọghị ọdịmma ha ma jụ kwa ịkwụ ha ụgwọ ọnwa asatọ.
Otu nwata akwụkwọ kwuru sị " Unu mere anyị bụ ụmu ndị o na-enweghị etu ọha ha ebere, anyị anọọla n'ụlọ ọnwa asatọ na nkịtị".
Ndị ngalaba ASUU na ndị gọọmentị ka na-achọ ụzọ iji hụ na ha kpeziri.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 8
Ndị agha Naịjirịa sị na ha ejirila ogbunigwe gbuo ọtụtụ ndi oji egbe awakpo mmadụ
Ebe foto si, Belgian military
Ndị agha Naịjirịa kwuru n'ụbọchị Wenesde na ha gburu ọtụtụ ndị omekome ji egbe aga dịka ha malitere iji ogbunigwe e bu n'ụgbọelu awakpo ha na mpaghara ugwu mba ahụ.
Nke a na-abịa dịka ntọrị mmadụ na mwakpo na-akawanye njọ na mpaghara ahụ.
Ndị omekome atọrọla ọtụtụ mmadụ -- ma gbuo ọtụtụ -- n'ime izu ụka gara aga n'ụzọ si Abuja gawa Kaduna.
Ndị agha sị dịka ha nwetere ama, ndị agha nọ n'ala nakwa ndị nke elu wakporo ọdọ ndị omekome a dị nso n'okporo ụzọ.
Ha kwuru na ha gburu ọtụtụ ndị omekome, ma ha ekwughi mmadụ ole ọ bụ.
Ọnu na-ekwuru ndị agha Naịjirịa bụ John Eneche si na ọ bụ n'ọnụ ụtụtụ ka ndị agha malitere ịkwa mgbọ n'ụlọ ha che bụ nke onyeisi ndị omekome a e ji "Major" mara.
Ndị omekome na-eru narị kwa narị na-enye nsogbu n'ime obodo dị na mpaghara ugwu Naịjirịa n'ime afọ ole ma ole gara aga. Ha na-ezu ehi ma na-atọrị mmadụ.
Ọ bụ ego ka ndi na-eji akpa ike a mana ndị ọkachamara n'ihe banyere nchekwa sị na ndị ofufe Alakụba chọrọ ka ndị mmadụ soro ofufe ha n'ike na-esonye ha n'ike n'ike.
Mmadụ 250,000 anwụọla site na coronavirus na mba Amerịka
Ọrịa coronavirus ka na-akwanye njọ dịka ọ pụtara ihe na ihe karịrị mmadụ puku narị abụo na iri ise anwụọla site na ya na mba Amerịka.
Ọ bụ Mahadum John Hopkins na-agụkọ mpụtara nakwa ọnụọgụgụ gbasara ọrịa a kemgbe o selitere isi bụ ndị gbara ama a.
N'otu aka ahụ ihe ruru mmadụ otu nde na otu puku narị bụ ndị buterela ya bụ ọrịa na mba ahụ.
Nke a ga-eme ka mba Amerịka bụrụ mba ebe ọrịa ahụ kachasị gbu ndị mmadụ na mba ụwa niile.
Dịka o dị ugbua, steeti New York bụ ebe ọ kachasị metụta agbachiela ụlọ akwụkwọ dịka ọnụọgụgụ ka jisike arị elu.
Unu abọọla chi
Soro anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị taa
Anwụchiela ndị ọrụ ahụike mmadụ atọ ana enyo enyo maka ịre ụmụaka na mba kenya
N'Afrịka, a kpụla mmadụ atọ a na-enyo enyo ụlọikpe mba kenya maka ebubo ịtọrọ ma ree ụmụaka dịka nnyocha "BBC Africa Eye" gbara n'anwụ n'eme n'ụlọọgwụ gọọmentị na Nairobi n'akụkọ ha wepụtara na nsonso a.
"Ụlọ anyị kuturu abụghị ụlọọgwụ kama ọ bụ ụlọ a gbahapụrụ ndị omekaome bizi"
Ebe foto si, Rochas Okorocha/Hope Uzodinma/Facebook
Odeakwụkwọ mgbasaozi Gọvanọ Hope Uzodinma bụ Ogwuwike Nwachukwu gwara BBC na ihe ha kuturu bụ ụlọ alawaaghara ndị omekome were mere ebe ozuzo ha.
Ọ sị na o nweghi ụlọọgwụ ọbụla Okorocha rụrụ nke gọọmentị Uzodinma ha kuturu kama na ọ bụ ụlọ a na-arụchabeghi n'ọdọahịa Ekeukwu ọ kụturu wee na-arụ.
Ogwubike sị na gọọmentị Uzodinma chọrọ iweghachite ahịa Ekeukwu n'ebe ahụ ọ nọ tupu Okorocha akụtuo ya.
Mgbe a jụrụ ya maka okporoụzọ ọjọọ dị n'Imo Steetị, ọ sị na ọ bụ maka gọọmentị na-eche ka udummiri laa, ka ha nwee ike malite ọrụ n'ọkọchị.
Na dị ka ọ na-ekwu ugbua, na ọrụ amalitela n'ọtụtụ okporoụzọ dị n'Imo Steetị ugbua.
Ọnụ na-ekwuru Rochas Okorocha bụ Sam onwuamaedo sị na obi adịghị Okorocha mma maka ụlọọgwụ Uzodinma kuturu chọrọ ịrụ ihe ọzọ.
Ọ sị na ọtụtụ ọrụ gọọmentị Okorocha ji ego ọhanaeze ndị Imo rụọ, gọọmentị ọzọ abata bịa na-akutusi ya.
Na o nweghi onye ọ ga-adị mma n'obi chaa chaa.
Onyeisi PDP n'Ebonyi steeti sị na ya agaghị ekwe ka akpapụ ya
Ọkaiwu Onyekachi Nwebonyi kwuru na ya ga-agbagha mkposa ndị isi PDP etiti kposara kọmịtị ndị isi pati ahụ dịka Gọvanọ Dave Umahi hapụrụ pati ha gawa APC n'ụlọikpe, sị na o megidere iwu.
Gọọmentị Imo steeti agọọla na ha kuturu ụlọgwụ Rochas Okorocha rụrụ n'Owere.
Ndị gọvanọ APC atọ zochiri Abakaliki maka ịnabata Umahi
Ebe foto si, Eze Collins
Ndị gọvanọ APC atọ awụchiela Abakaliki,isiobodo Ebonyi Steetị ịnabata Gọvanọ Dave Umahi n'ime otu.Nke a na-abịa dịka Umahi nakwado emume mwụfe ya site na PDP banye APC n'ụbọchị Tọsde 19 ọnwa Nọvemba, afọ 2020.
Ndị gọvanọ ahụ gụnyere Mai Mala Bala nke Yobe Steetị, Abubakar Atiku Bagudu nke Kebbi nakwa Mohammed Badaru nke Jigawa Steetị.Osote gọvanọ Ebonyi Steetị bụ Kelechi Igwe na onyisi ụlọomeiwu Ebonyi bụ Francis Nwifuru nabatara ndị a n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu.
A na-atụ anya na ndị gọvanọ abụọ ọzọ ka ga-awuchi n'Ebonyi maka emume a.
Ebe foto si, Eze Collins
PDP abaala ọgbakọ n'Abuja
Ebe foto si, @Official PDP
Ndị isi otu PDP abanyeela ọgbakọ.
A mabeghị ihe ha na-akpa na ya bụ nzuko mana ọgbakọ ahụ na-abịa ka ọ gachara otu abalị Dave Umahi bụ Gọvanọ Ebonyi steeti ma bụrụkwa onye isi ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ hapụrụ pati ha gawa otu APC.
Umahi gwara ndị ntaakụkọ na ihe mere ya pụọ bụ na ndị PDP na-emegbu ndị Igbo kemgbe afọ 1998 e hiwere pati ahụ na agbanyeghị ihe ndị Igbo tụnyerela iji kwado ya bụ pati.
Ebe foto si, @Official PDP
Ụlọọrụ Naịjirịa dị na mba Jamini achụọla otu nwoke dinara nwaanyị maka akwụkwọ njem
Ebe foto si, Screenshot/Twitter
Ụlọọrụ Nigerian Embassy dị na Germany akụsịtụla otu onye ọrụ ha ma kwe nkwa na ọ ga-agabiga ntaramahụhụ iwu nyere ma a chọpụta na ọ wakporo nwaanyị dịka ebubo kwuru.
Nke a na-eme dịka onyonyo fegharịrị n'elu soshal midia na-egosi nwoke ahụ ndị mmadụ na-akpọ (Chief Security Officer of Nigerian Embassy in Berlin Germany) na-arịọ ka ọ dịna nwaanyị tupu ọ rụọ ọrụ kwesiriịrụ.
Chief Security Officer nke German Nigeria Embassy abanyela ofeọkụ maka ebubo mwakpo nwaanyịỤlọọrụ German Nigerian Embassy akwụsịtụla onyeisi ọrụ nchekwa ha bụ Martins ọrụ maka ebubo na ọ kwasoro nwaanyị iko maka inye ya akwụkwọ ikike njem.
Dịka ọ dị ugbua, amalite nyocha banyere ihe mere na ya bụ onyonyo.