Ihe anyị mere ndị Igbo kemgbe 1998 dị ọtụtụ- PDP

Ebe foto si, @OfficialPDP
Otu PDP agọola sị na ebubo Gọvanọ David Umahi nke Ebonyi steeti boro ha na ha megburu Igbo na agbanyeghị nkwado puru iche site na mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ.
N'ozi nke ha wepụtara nke odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ Kola Ologbondiyan binyere aka, PDP kwuru na ihe ha mere ndị Igbo karịrị akarị.

Ebe foto si, Nnamani,Anyim,Wabara,Okadigbo
PDP, ndị jụrụ ihe APC merela ndị Igbo kwuru na ha nyere Igbo :
1. Ọkwa onyeisi Sineti ụgboro ise:nke Evans Enwerem, Chuba Okadigbo, Anyim Pius Anyim, Adolphus Wabara na Ken Nnamani jiri.
2. Ọkwa Osote Onyeisi Sineti nke Sen Ike Ekweremadu onye ji ọkwa ahụ afọ 12
3. Ọkwa Onyeisi Ụlọnnọchiteanyị nke Emeka Ihedioha jiri
4. Ọkwa onyeisioche pati nke Vincent Ogbulafor na Okwesilieze Nwodo jiri.
5. Ọkwa 'Chief of Army Staff' nke Lt. Gen. Azubuike Ihejirika jiri
6. Ọkwa Odeakwụkwọ Gọmmentị Etiti nke Anyịm Pius Anyim jiri
7. Ọkwa onyeisi Ụlọakụ Etiti (CBN) Dr. Charles Soludo jiri
8. Ọkwa Mịnịsta na-ahụ maka ego nke Ngozi Okonjo-Iweala jiri
9. Ọkwa onyeisioche Inec nke Maurice Iwu jiri
10. Dave Umahi jiri ọkwa Onyeisioche pati ha, Osote Govano nakwa ọkwa Gọvanọ ụgbọrọ abụọ.

















