Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. DSS ekwuola ọ bụ onye otu ha gburu Ifeanyi Okereke n'Abuja

    Ngalaba nchekwa Bekee kpọrọ "Department of State Service" (DSS) ekwuola aha onye otu ha gbagburu ore akwụkwọ akụkọ Ifeanyi Okereke n'Abuja n'ụbọchị Tụụzde n'Abuja.

    Ọnụ na-ekwuru DSS bụ Peter Afunanya si na onye mere ihe bụ onye ọrụ ha no ọrụ nchekwa n'ogige Onyeisi Ndị Omeiwu Obele nke Naịjirịa.

    Maazị Afunanya sị na ha amalitela inyocha ihe mere dịka ha ji ya bụ nwoke.

    DSS gawa n'ihu kwee nkwa na ha ga-eme nyocha n'ụzọ kwụ ọtọ ma gbaa ihe niile n'anwụ.

    Ha gara n'ihu tie ezinaulọ Okereke aka n'obi ma sị ka ha diwe ihe mere.

  2. Donald Trump Jr ebutela coronavirus

    Donald Trump Jr

    Ọkpara onyeisiala Amerịka Donald Trump ebutela coronavirus, dịka ọnụ na-ekwuru ya siri kwuo.

    Ọ sị na nyocha chọpụtara na Donald Trump Jr, dị afọ 42, butere coronavirus na mbido izu ụka ma banye ịnọdụ iche na ulọ nta ya kemgbe ahụ.

    N'ime akwụkwọ ozi o wepụtara, ọ sị : "O nweghi ama ọrịa ọbụla dịka ọ na-eso usoro ndị ọrụ ahụike wepụtara maka ọrịa a."

    Don Jr bụ onye abuọ n'ụmụ onyeisala Amerịka butere ọrịa a.

    Barron Trump, dị afọ 14, butere ọrịa a n'ime ọnwa gara aga, mana ọ gbakere ọsịsọ.

    Don Jr sọ na ndi ọnụ na-eru n'okwu banyere ndọrọndọrọ ọchịchị nna ya nọ n'ime ya.

    A na-echekwe na Don Jr n'onwe ya nwere ebumnuche ịzọ oche onyeisiala Amerịka, mana ọ na-ekwuda ya bụ atụmatụ.

    Enyi nwaanyi Don Jr bụ Kimberly Guilfoyle, bụbu onye ntaakụkọ na Fox News, butere coronavirus na Jụlaị ma gbakee.

    Don Jr ebuteghi ya n'oge ahụ.

  3. Ndị ohi ịntanet wakporo tekịnụzụ otu Manchester United

    Ọgbọegwuregwu Old Trafford ndị Manchester United

    Otu egwuregwu bọọlụ Manchester United ekwuola na ndị omekome wakporo ngwa tekịnụzụ ha.

    Otu a kwuru na ndị ọkachamara n’ihe banyere ịntanetị ewerela ọnọdụ ma sị na o nweghi ihe ha ọbụla e mebiri.

    Ha sị na ngwa tekịnụzụ ha dịka websaịt, soshal midia na appụ ka kwụ chịm na o nweghi ihe mere ha.

    Manchester United na-akwado ịnabata Westbrom n'asọmpi Premier League n'ọgbọegwuregwu Old Trafford n'ụbọchị Satọde.

    Ha sị na mwakpo agaghị emetụtaghị asọmpi ahụ.

  4. Biko ka a gbatara ndị ọgụ na-ada na Tigray, Ethiopia metụtara ọsọ enyemaka - Guiterres

    Antonio Guiterres, onyeisi otu United Nation

    Onyeisi otu United Nations bụ Antonio Guterres arịọla ka e mepee ọnụụzọ enyemaka iji nyere ndị mmadụ ọgụ na-eme na mpaghara Tigray nke Ethiopia metụtara aka.

    Guterres bụ onye kwuru nke a na New York sị na gọọmentị mba Ethiopia ajụla ịnabata arịrịọ ka e mee udo nke mere ọgụ e gburula ọtụtụ mmadụ ka ji na-aga n’ihu.

    Otu United Nations na-akwado ịnabata ndị gbara ọsọ ndụ ruru puku narị abụọ na mba dị ha n'akụkọ bụ Sudan n'ime ọnwa ndị na-abịa - mmadụ puku iri atọ abatalarịị.

    Mba Saụt Afrịka bụ ndịisi otu jikọtara mba Afrịka (African Union) sị na ọ na-ezipu ndị okpe udo mmadụ atọ na mpaghara ahụ.

    Praịm mịnịsta mba Ethiopia bụ Abiy Ahmed malitere iji ndịagha awakpo Tigray n'izuụka abụọ gara aga iji chutuo pati nọ n'ọchịchị, nke ọ sị na-enupuru gọọmentị etiti isi.

  5. ASỤỤ Strike: Gọọmenti ekwetala ịgwụ ASUU ijeri naira 65

    Chris Ngige

    Gọọmenti Etiti ekwetala inye otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadum a kpọrọ ASUU n'ịchafụ ijeri Naira 65 maka ụgwọ e ji ha eji nakwa ịhazigharị ọnọdụ agụmakwụwọ.

    Nke a so na nkwekọrịta ha nwere na ọgbakọ ASUU na Gọọmenti nwere ụbọchị Fraide.

    Nkwa na na-abịa dịka ụmụakwụkwọ mahadum mere ngagharịịwe maka mmechi e mechiri ụlọakwụkwọ mahadum nke gọọmenti na Naijiria kemgbe ọnwa asatọ n'ihi nghọtahịe dapụtara n'etiti ndị nkuzi ha na gọọmenti etiti n'ihe gbasara ọdịmma ndị nkuzi nakwa agụmakwụkwọ.

    Gọọmenti kwetakwara iji usoro 'Integrated Financial Management Information System' ganye mgbe a kwadochara usoro nke ASUU chọrọ bụ 'University Transparency and Accountability Solution' (UTAS ).

  6. Guardiola na-eme na ọgbasaghị ya ma Messi nọrọ na Barcelona laa ezumike

    Pep Guardiola

    N'egwuregwu, onye nkuzi Manchester City bụ Pep Guardiola ekwuola na ya enweghị nsogbu ma Lionel Messi nọrọ na Barcelona laa ezumike nka.

    Messi gbara afọ iri atọ na atọ chọbụrụ ịbanye Man. City n'Ọgụstụ, mana onyeisi ha na Barcelona kpachiri ya.

  7. Ndị uweojii achụsaala ndị ngagharịiwe na Saụt Afrịka

    Ndị Ngagharịiwe

    N'Afrịka, ndị uweojii Saụt Afrịka achụsalaa ndị na-eme ngagharịiwe ụbọchị Fraide maka ịkpaoke agbụrụ ha na-ekwu na ndị ọcha mere n'otu ụlọakwụkwọ ebe ha na-eme oriri maka ụmụakwụkwọ na-apụ apụ n'ọnwa Oktoba.

    Ndị uweojii sị na ọ bụ naanị mmadụ otu narị ka ha ga-ahapụ ịba na ya bụ ụlọakwụkwọ ga kọwaa iwe ha.

  8. WHO ekwuola na Remdesivir abụghị ekwu eme na ọkwụkwọ coronavirus

    Tedros Adhanom Ghebreyesus

    WHO adọọla aka na ntị naọgwụ a kpọrọ Remdesivir ewepụtara maka ịgwọ nje coronavirus abụghị ekwueme.

    Otu ahụike mbaụwa a kwuru na nchọpụta ha mere gosiri na ya bụ ọgwụ anaghị eme ihe o turu ọnụ na ya ga-eme.

  9. Nkeji Coronavirus

  10. Isi gbara m 'pop-corn' mgbe nwa m nwaanyị gwara na ọ bụ 'lesbian' - Charly Boy, Na nwa gị bụ gay apụtaghị na ịdaala n'ọrụ gị dịka

    Charly Boy na nwa ya nwaanyị

    Charles Oputa a ma dịka Charly Boy ekwuola ka Naijiria siri dị ya ka Gana oge nwa ya nwaanyị bụ Dewy gbuwara ya akụoyibo Nsugbe na ya bụ nwanwaanyị ihe naanị nwaanyị na-amasị nke Bekee kpọrọ 'Lesbian'.

    N'ozi o wepụtara n'akara ya na soshal midia, Charly Boy sị na " Amaghị m ka ọbị m adị."

    "Ọtụtụ ihe gbatara m n'uche:'Kedụ ihe mere mejọọ?' 'Nwa m m che na m ma ma ahụnanya anọghịzịkwa ya',' ọ bụ na ndị mmadụ agaghị ebido kpapụwa nwa m?' ' Ọ bụ na nwa agaghị ebi n'ọkụ ala mụọ?'.

    O kwuru na dịka echiche ndị a na-aga njem n'ime obi ya, ya nọ na-atụ onwe ya mbọiji jide onwe ya aka.

    O kwuru na ihe a bịara ya dịka ọnwụwa n'ihi na onwe ole na ole tupu nwa ya a kpọrọ okwu aha, na ya na-ekwuchitere ndị mmasị ha bụ nwoke maọbụ nwaanyị ibe ha.

    O kwuru na ịnabata ọnọdụ nwa ya bụụ ya "ịnabata eziokwu dịka ịwa afọ., Ọ na-afụ ụfụ mana ọ na-agwọ ọrịa. Asị dịka ọgwụ ahụ mkpu, ịṅụ ya, ei nweta onwe gị ozigbo mana ihe so ya na-adigide."

    Charly Boy na nwa ya nwaanyị
  11. Belatanụ ndị uweojii nọ na EFCC - Ọkaikpe Salami

    Ayo Salami na Muhammadu Buhari
    Nkọwa foto, Ọkaikpe Salami na-enye onyeisiala Muhammadu Buhari mpụtara nnyocha ha nyochara onyeisi EFCC bụ Ibrahim Magu

    Ọkaikpe Ayo Salami enyela onyeisiala Muhammadu Buhari ndụmọdụ ka o belata ndị uweojii so ndị ngalaba mgbochi nrụrụaka bụ EFCC arụ ọrụ.

    Salami kwukwara ka Buhari si n'otu ọrụ nchekwa ọzọ na-abụghị ndị uweojii wee họpụta onye isi ọzọ ga-achị EFCC.

    Cheta na Ọkaikpe Salami bụ onyeisi otu Buhari hibere ka ha nyochaa Ibrahim Magu bụbu onyeisi EFCC maka ebubo nrụrụaka e boro ya.

    Ọkaikpe ahụ kwuru nke a n'ụbọchị Fraịde n'Abuja, oge kọmiti ya hafere onyeisiala Buhari mpụtara nnyocha ahu ha mere gbasara Ibrahim Magu.

    Salami gwara Buhari sị: "Mmadụ anọ bụrụla ndị isi EFCC n'oge gara aga bụcha ndị uweojii."

    "Ya mere, ọ bụrụ na ị chọọ ịhọpụta onyeisi ọzọ maka EFCC, ọ ga-adị mma ma i lee anya n'otu ọrụ nchekwa ndị ọzọ dịka iwu hibere EFCC si kwadoo."

    Salami kwuru na ọtụtụ ndị uweojii nọ na EFCC na-akpata nghọtahie n'etiti ndị ọrụ EFCC na ndị uweojii.

    Gbasara ebubo e boro Ibrahim Magu, Salami kwuru na ha gbara Magu nakwa ndị akaebe ruru otu narị na iri na atọ ajụjụọnụ.

    N'okwu ya, Buhari sị na ọ bụ ihe mwute na nrụrụaka karịrị akarị na Naịjirịa ọkachasị n'ime ọchịchị.

    N'akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Femi Adesina, onyeisiala gara n'ihu kwuo na ebumnobi ya bụ ime ka Naịjirịa bụrụ mba a ma ama na-anaghị anabata nrụrụaka.

    Buhari kwuru sị: "Ọ dị mkpa ka onye ọbụla mata na agha anyị na-ebuso mpụ na nrụrụaka anaghị ele anya n'ihu. Onweghị otu onye karịrị Naịjirịa niile."

  12. Enyefela m onye nche m gbagburu Ifeanyị Okeke n'aka ndị uweojii - Gbajabiamila

    Femi Gbajabiamila

    Onyeisi Ụlọnnọchiteanya bụ Femi Gbajabiamila ekwuola na ya enyefela Abdullahi Hassan bụ onye DSS na-eche ya nche e boro ebubo ịgbagbu onye na-ere akwụkwọ akụkọ n'aka ndị ọrụ nchekwa maka nnyocha nakwa ịkpụpụ ụlọikpe.

    A gbagburu Ifeanyị Okereke bụ onye na-ere akwụkwọ akụkọ n'Abuja ụbọchị Tozde dịka Gbajabiamila kwụsịtụrụ ebe a na-ere akwụkwọ akụkọ.

    N' ozi Gbajabiamila wepụtara n'ehihie Friaide, o kwuru na ọnweụ Okereke n'aka otu n'ime ndị na-eche ya nche "gbawara m obi nke ukwu."

    Gbajabiamila onye kwuru na ya akasiela ezinaụlọ Okere okjke obi, gara n'ihu kwuo na ya na-ele anya na ezinaụlọ nwaamadi ga-enweta ikpemkwụmọtọ.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Nkọwa Gbajabiamila nyeburu maka ọdachi ahụ ụbọchị Tozde were ọtụtụ ụmụ Naijiria gụnyere ndị ọnụ na-eru n'okwu iwe.

    Ha katọrọ Gbajiamila maka ikwu na ọ bụ egbe a gbaliri elu iji chụsasị ndị a maghị bịara nochie ụgbọala ya bụ ihe tụrụ nwa amadị ahụ gbuo ya.

    Ndị na-ere akwụkwọ akụkọ mere ngagharịiwe maka ogbugbu onye otu ha.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  13. 'Ebum n'uche anyị bụ ka anyị mụta ejima yiri onwe ha ga-alụ ejima ọzọ dịka anyị'

    Ụmụejima nụrụ onwe ya

    Ụmụokorobia gbara afọ 33 bụ Hassan Sulaiman Indabawa na ejima ya bụ Hussain nụrụ ejima ụmụnwaanyị ọzọ Hassana Ado Ashir na Hussaina na Kano ụbọchị Fraịda, 20, Nọvemba, 2020.

    Ha gwara BBC na ịhe ha na-arịọ chukwu bụ ka ọ nye ha ejima ga-alụ ejima ọzọ.

    Hassan na onwe ya sị na ya na ejima ya na-emekọrịta ihe kemgbe ha bụ nwata, na ha na-echekwa na ọ ga-amagbu onwe ya ma ha lụọ ejima abụọ.

    "Mgbe anyị nọ n'ụlọakwụkwọ, anyị na eyi otu akwa, eri ofu nri, nọrọkwa n'otu klasị n'ụlọakwụkwọ ahụike ebe ọnụọgụ nwanne m bụ 010, nke nwanne m bụrụ 011". " Ọbụghị taa ka anyị chọwara ilu ejima. Oteelarị ndị be anyị chọwara ka anyị lụọ ejima abụọ".

    Ndị nke mbụ anyị nwetere adabaghị.

    Mana ugbua obi dị anyị ụtọ na-anye enwetela

  14. Ndị uweojii ndị ntọrị nwụchiri na Zamfara agbaala ọsọ

    Ndị uweojii Naịjirịa

    Akụkọ si Zamfara steeti na-ekwu na ndi uweojii ndi ntọrị nwụchiri n'ụzọ si Zamfara gawa Katsina agbapụla.

    Ndị ma maka ihe a gwara BBC Hausa na ndị ntọrị a tụghapụrụ mmadụ ise n'ime ndi uweojjii dịka mmadụ asatọ n'ime ha gbara ọsọ n'ebe e ji ha.

    Mmadụ ise ndi ntọrị ji aka ha tughapụ nọ n'ụlọ ọgwụ dị n'obodo Gusau anata ọgwụgwọ.

    Cheta na ndị ama gwara BBC Hausa na ndị ntọ ahụ nwụchiri ndi uweojii 12.

    Agbanyeghi na a na-ekwu na ndị uweojii akwụghị ụgwọ iji nwere onwe ha, otu onye ma maka ihe a mere kwuru na otu n'ime ndị uweojii ahụ sị na ha kwuru ụgwọ iji gbapụta onwe ya.

  15. Mba Chaịna agaghị ejichi akụ na ụba anyị - Mba Mozambique

    Onyeisiala mba Chaịna

    Mba Mozambique agbaahala akụkọ na-efegharị na-ekwu na mba China ga-ejichi ụfọdụ akụ na ụba ha maka ụwgọ ha ji.

    Minista ego nke mba ahụ bụ Adriano Maleiane kwuru na onweghi eziokwu dị na ya chaa chaa.

    O kwuru na nkwekọrịta dị n'etiti ha na mba Chaịna bụ nke ziri ezi.

  16. Naịjirịa ga-amalite ịzụ mmanụ agbịdị n'aka mba Niger

    Okporo mmanụ agbịdị

    Naịjirịa na Nije ebinyela aka n'akwụkwọ nkwekọrịta nke ga-ahụ na Naịjrịa ga na-ego mmanụ agbịdị site Nije.

    Timipre Sylva bụ minista na-ahu maka mmadụ agbịdị sị na Nije nwere ọtụtụ mmanụ ọ chọrọ ire ebe Naịjirịa nwere ahịa a ga-ere ya.

    Ha kwuru na ha malitere mkparịtaụka na nzụkọ gbasara atụmatụ a kemgbe afọ anọ gara aga tupu o nwee isi.

  17. Akpụpụla gọọmentị Tanzania ụlọikpe maka ịmachị ụmụakwukwọ tụrụ ime ịgụ akwụkwọ

    Ụmụ akwụkwọ ụmụ nwaanyị

    Otu na-ahụ maka ọdịmma ụmụwaanyị ak[ọrọ “Equity Now” akpụpụla gọọmentị Tanzania ụlọikpe na-ahụ maka mmekpa ahụ bụ “Africa Court on Human and People’s Rights” maka mmachị ọ machịrị ụmụakwụkwọ tụrụ ime.

    Ngalaba a kwuru na ha na-aga ụlọikpe a maka mgbọ niile ha gbara banyere ihe a amịtaghị mkpụrụ.

    Gọọmentị Tanzania etinyebeghị ọnụ n’okwu ikpe a.

    Iwu ha hibere n’afọ 2002 nyere ohere ka achụpụ ụmụakwụkwọ tụtara ime n’ụlọakwụkwọ.

    Iwu a sị na a ga-achụpụ-ụmụakwụkwọ a maka “mpụ” na “imegide alụmdị na nwunye”.

    Otu ọdịmma ụmụnwaanye na-arịọ gọọmentị kemgbe ka ọ gbanwe iwu a.

    Ihe ruru ụmụakwụkwọ 800 na-ahapụ ụlọakwụkwọ kwa afọ maka ịtụ ime, dịka otu Human Rights Watch siri kwuo.

    Equality Now sị na mmachị a na-emegide ụmụnwaanyị ma na-aranye ha na okirikiri ụkpa ma na-eme ka ha danye n’ihe dị ka ibi ugwu.

  18. Femi Gbajabiamila etiela ezinaụlọ nwoke nwụrụ n'Abuja aka n'obi

    Onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila

    Onyeisi ndị omeiwu obele na Naịjirịa bụ Femi Gbajabiamila ekwuola na ya achụọla onye uweojii na-arụrụ ya ọrụ maka ogbugbu onye na-are Newspaper.

    Gbajabiamila sị na ọ bụ oge ndị uweojii na-achekwa ya gbalịlị egbe elu iji chụsasịa ndị nọchịrịụgbọala ya ụzọ ka mgbọ tụrụ nwoke a gbuo ya.

    N'ozi o depụtara n'akara Twitter ya, o kwuru na ọnwụ nwoke ahụ wutere ya nke ukwu ma zigara ezinaụlọ nwoke ahụ ozi itiakanobi.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  19. Joe Biden emeriela ngụgharị vootu emere na Georgia

    Joe Biden

    Mmeri Joe Biden na ntụliaka onyeisiala mba Amerịka kwụ chị m ugbua dịka o meriri ngụgharị ntuliaka emere na steeti Georgia.

    N'otu aka ahụ mbọ niile Donald Trump na-agba ịgbagha ya bụ mmeri n'ụlọikpe enwebeghi isi dịka ụlọikpe steeti atọ tụpụrụ ya.

    Biden ji vootu ruru 12,284 were merie Trump nke ngụkọ iwu steeti ahụ hibere si gosi.

    A na-atụ anya na Biden ga-abanye n'ọkwa n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021 na-abịa.

  20. Unu apụtala ụtụtụ?

    Nnọọ nụ na peeji anyị taa.

    Akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ bụ ihe anyị ga na-ewetara unu taa.