Ụlọikpe na Pọtakọt atụọla ndị ofesi isii nga afọ asaa maka ohi mmanụ agbịdị
Ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) ekwuola na ọkaikpe J.K. Omotosho atụọla mmadụ asaa bụ ndị mba ofesi nga afọ asaa maka ori mmanụ agbịdị.
N'ime ndị a: mmadụ abụọ - Mohammed Ejaz, Nasser Khan - bu ndị Pakistan; Abuọ bu ndị Yụkraịn -Oleksandr Nazarenko na Oleksandr Kashernvi.
Otu onye Gana, aha ya bụ Romeo Annang sokwa n'ime ha.
Onye ọzọ bụ Fredrik Fatin Omenu bụ inye Indonesia.
Otu onye Naịjirịa aha ya bụ David Otuohi sowka rite nga afọ asaa.
Ụlọ ikpe ahụ tụghapụrụ mmadụ atọ ọzọ si ofesi Victor Mikpayi (onye Bini), Francis Ahorlu na Kwesi Attah (bụ ndị Gana), nakwa Victor Azebiri (Onye Naịjirịa).
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post















