Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ihe bụ iwe ndị dọkịta Imo steeti mere ha ji gbaa abụbụ ọrụ

      • Onye dere ya, Jessica Nwankwo
      • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

    Ndị dọkịta n’Imo steeti nọ na-abụbụ ọrụ kemgbe ụbọchị Monde maka ọnọdụ ụgwọ ọnwa ha na steeti ahụ.

    Iwe ha dị ka onyeisioche ha bụ Okpara Chidiebere gwara BBC bụ na gọọmentị Imo steeti anaghị akwụlite ha ụgwọ ọnwa ọfụma.

    Okpara kwuru na ha bụ ndị dọkịta degaara gọọmentị akwụkwọ ozi ịgwa ha maka ihe ndị bụ mkpa ha mana o nweghi onye zaghachiri ha.

    Ihe ọzọ o kwuru bụ na ha nyere gọomentị izuụka iri abụọ iji mee ihe mana o nweghi ihe nwere isi nke mere na ha gbara abụbụ ọrụ.

    Ihe ndị ọ gụkọrọ dịka iwe ha gụnyere:

    • Akwụghị ụgwọ ọna ziri ezi
    • Ịgba ndị dọkịta nọọrọ onwe ha nnukwu ego maka ịnwe igwe okwu, igwe television n'ụlọọgwụ ha nakwa ụgwọ ndị ọzọ.
    • Ị napụ naanị otu ụlọakwụkwọ ahụike ha nwere na steeti ahụ ikike ịzụ ndị chọrọ ịbụ dọkịnta.
  2. Onyeisioche CAF ga-eme mkpesa maka mmachi FIFA machiri ya

    Ahmad Ahmad

    Onyeisi ngalaba bọolụ n’Afrịka bụ Ahmad Ahmad ekwuola na ọ ga-eme mkpesa gbasara mmachi nke ngalaba bọọlụ n’ụwa niile bụ FIFA machiri ya.

    Ngalaba ahụ machiri Ahmad afọ ise maka ịda iwu ha tinyere site n’afọ 2017 rue afọ 2019.

    Ahmad na-akwado ịzọ ọkwa ya ọzọ na ntuliaka otu CAF na-abịa n'ọnwa Maachị afọ 2021.

  3. Atụọla onye ndọrọndọrọ ọchịchị kpọrọ ndị ọkaipe 'ndị iberibe' na mkpọrọ

    Ụlọikpe ukwu na mba Uganda atụọla otu onye sobu azọ ọkwa onyeisila nga makana ọ ji ha mee akaja site n'ịkpọ ha "ndị iberibe".

    Ivan Samuels Ssebadduka gara mkpọrọ afọ atọ maka imegide ụlọikpe, dịka ndị ntaakụkọ na mba ahụ siri kwuo.

    Maazị Ssebadduka dere mkpesa nye Ụlọikpe Ukwu mba ahụ iji kwụsị atumatu mere ka ndị na-azọ ọchịchị onyeisiala na mba ahụ ịnata ikike n'aka ndị mmadụ site n'ibinye aka tupu ha etinye akwụkwọ.

    Ọ chọkwara na ụlọikpe ahụ chabie atụmatụ mmachị ngagharị ngalaba na-ahụ maka ahụike tinyere n'ogige ndọrọndọrọ ọchịchị maka igbochi coronavirus

    O kwuru ajọ okwu a oge ọ na-eme mkpesa ya n'ihu ụlọikpe a.

    Ọkaikpe Ukwu Alfonso Owinyi-Dollo sị na onye ọbụla chọrọ ikwu maka ndị ọkaikpe kwuo nke mere n'eziokwu.

  4. Ndị uweojii agbaala ulọ ndina Bobi Wine okirikiri

    Ndị uweojii n'Uganda gbara ụlọ ndina ebe onye na-azọ ọchịchị Robert Kyagulanyi e ji Bobi Wine mara okirikiri.

    Ihe a mere n'obodo Hoima di na ọdịda anyanwụ mba ahụ.

    Bobi Wine dere n'akara Twitter ya na ya jiri ụzọ tere aka ga ya bụ obodo dịka ndị agha gbochiri ya.

    Ọ sị, "ha so anyị gawa ụlọ ndina anyị ma gbaa ya okirikiri."

    Ụlọ ntaakụkọ NTV nke Uganda dekwara n'akara Twitter ha "amabeghị ebumnuche ndị uweojii a.

    Bobi Wine kere foto ndị uweojii no n'ihu ụlọ ndina ahụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  5. Onyeisiala Donald Trump agbagharala Michael Flynn bụbu onye ndụmọdụ nchekwa ya

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Michael Flynn bụbu onye ndụmọdụ gbasara okwu nchekwa onyeisiala Donald Trump eritela mgbaghara zuruoke n'aka ya.

    Nke a pụtara ihe dịka Trump depụtara ya n'akara Twitter ya n'abalị ụbọchị Wenzde.

    N'ozi ahụ, o kwuru na o nwere olileanya na na Flynna na ezinaụlọ ya ga-enwe ezumike 'Thanksgiving' magburu onwe ya.

    Cheta na Flynn so na ndị enyemaka Donald Trump amara ikpe n'afọ 2017 maka ị tụrụ ngalaba FBI asị mgbe a na-enyocha mmekọrịta ha na ndị mba Rọshịa.

  6. Nnọọnụ na peeji anyị taa

    Anyị ji n'aka na unu tetara ọfụma.

    Ebe a bụ ebe akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ na-akpọtụ.

    Jisinu ike sonye anyị.

  7. Foto Diego Maradona: Nlereanya maka ndụ dike a bụ ọkaibe na bọọlụ

  8. Diego Maradona alaala mmụọ

    Diego Maradona

    Ọgba bọọlụ a ma ama bụ Diego Maradona alaala mmụọ.

    Maradona nwụrụ n'ehihe Wenezde dịka o nwechara obi mgbawa nke Bekee kpọrọ 'Heart Attack'.

    Ọ nọ n'ụlọọgwụ ebe a wara ya ụbụrụ na mbido ọnwa Nọvemba iji wepụ ọbara kpụkọrọ ya n'ụbụrụ.

    Maradona bụ onye ndu ndị otu bọọlụ mba Argentina oge ha buru iko mba ụwa n'afọ 1966.

    Maradona
    Nkọwa foto, Maradona duuru ndị Argentina bute iko mba ụwa n'afọ 1986

    Maradona gbaara otu egwuregwu Barcelona nke mba Spen na Napoli nke mba Itali.

    Ugboro iri itoolu na otu (91) ọ gbaara mba Ajentịna, o nyetere goolu iri atọ na otu (31).

    E mechara chọpụta na Maradona na-agba anwụrụ ike, nke a mere e ji kwụsịtụ ya ịgba bọọlụ n'afọ 1991.

    Mana n'afọ 1997 ka Maradona wụsara ọwa n'ịgba bọọlụ, wee malite ịkuzi akụzi.

    Maradona

    E mere ya onye nkuzi bọọlụ ndị Argentịna n'afọ 2008, mana ọ pụrụ n'afọ 2010 oge mba Jamani meriri ha n'asọmpi iko mba ụwa nke afọ ahụ.

    Ọ kụzikwara bọọlụ na mba United Arab Emirates nakwa Mexico tupu ọ laghachi n'Ajentina.

    Lee ihe ọtụtụ na-ekwu banyere ya:

    Zatarra kwuru na agaghị echefu Maradona echefu:

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Kanu Nwankwo kpọrọ ya Odogwu:

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  9. A ga-emepe okeala Naịjirịa n'oge adịghị anya - Zainab Ahmed

    Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed ekwuola na gọọmentị Naịjirịaga-emepe okeala Naịjirịa na mba ndị gbara ya gburugburu n’oge adịghị anya.

    Ahmed kwuru nke a oge ndị ntaakụkọ na-agba ya ajụjụ ọnụ n'Abuja n'ụbọchị Wenezde.

    O kwuru na kọmiti na-eleba ya bụ okwu anya ekwetala ka e mepee okeala ahụ ọzọ, ha ezigala akwụkwọ ozi ha na nke onyeisiala Muhammadu Buhari, mana ọ bụzi onyeisiala ga-ekwu kpọmkwem ụbọchị a ga-emepe ya.

    Cheta na gọọmentị mechiri okeala Naịjirịa kamgbe ọnwa Ọgọstụ afọ 2019, n'ihi na ha sị na ọtụtụ na-esi ebe ahụ ebubata ọtụtụ ngwaahịa adigboroja, ọgwụ ike nakwa ngwa ọgụ dị icheiche.

  10. Mba Scotland ga-amalite ịnye ụmụnwaanyị ngwa nsọ n'efu

    Ngwa nsọ nwaanyị dị oke ọnụ na mba dị icheiche.

    Mba scotland abụrụla mba mbụ ga-amalite ịnye ngwa nsọ nwaanyị na-efu.

    Ndị ụlọomeiwu mba ahụ kpebiri nke a na nzụkọ ha nwere n’ụbọchị Tuzde ma kwuo na ọ bụ okpuruọchịchị niile na mba ahụ ka ọ dịrị ịhụ na nke a bịara na mmezu.

    Iwu a bụ nke ha malitere ịkpa maka ya kemgbe afọ 2016 mana ọ bụ ugbua ka ndị omeiwu niile nwere nkwekọrịta maka ya.

    Ọ bụ onye omeiwu otu Labour bụ Monica Lennon bụ onye tụrụ atụmatụ a dịka ọ na-achọ ka "ngwa nsọ rute mmadụ niile aka".

  11. Onye bụ 'Chika' ritere nhọpụta Grammy?

    Chika Jane Oranika

    Ọ bụ n'ụbọchị Tuuzde ka ewepụtara aha ndị ahọpụtara nwereike ịrịte ntụrụugo 'Grammy' n'afọ 2021 na-abịa.

    Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa nọ na aha ndị ahụ agụpụtara mana okwu ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ma na-ajụ onye ọ bụ bụ Chika.

    Chika Oranika na nne ya na nna ya

    Onye bụ Chika?

    - Chika Jane Oranika bụ nwa ada Igbo nne na nna ya bụ ndị Naịjirịa mụrụ n'obodo Alabama mba Amerịka.

    - Ọ dị afọ 23

    - Ọ bụ onye hụrụ egwu n'anya dịka ọ gbahapụrụ Mahadum South Alabama ka o nweike tinye uchu n'ihe gbasara egwu.

    - O bụ ọdụdụ nwa n'etiti ụmụ nwaanyị atọ nne na nna ya mụrụ.

    - Chika bụkwa onye na-eyi akwa ịgosi ndị mmadụ nke bụ 'Model' na Bekee

  12. Nnọnụ na peeji anyị taa.

    Unu abọọla chi?

    Chebiri anyị maka akụkọ ndị dị mkpa si na mba ụwa niile apụta taa.

  13. Ihe ị maghị maka Yakubu Gowon ọchịagha kachasị obere chịrị Naịjirịa

    Yakubu Gowon
    Nkọwa foto, Ọchịchị ya kachasị tee aka na ndị ọchịagha niile chịrị Naịjirịa

    Otu omeiwu na mba UK boro ọchịagha chịburu Naịjirịa bụ Yakubu Gowon ebubo maka npụ ego.

    O kwuru nke a mgbe ndị omeiwu UK na-enyoba anya n'ihe mere n'oge ngagharịiwe EndSARS na Naịjirịa ma sị na ha kwesịrị ịta gọọmentị Naịjirịa ahụhụ maka agwa ha kpara.

    Nke a mere aha Gowon ji na-ewu ndị mmadụ a na-ajụ kedụ etu o si bie ndụ n'oge ọ na-achị.

    Ihe I kwesịrị ịma maka Yakubu Gowon

    Yakuku Gowon bụ onye ndu kachasị obere chịrị Naịjirịa ma ndị ọchịchị nkịtị na ndịagha.

    Ọ dị afọ 31 mgbe ọ chịrị Naịjirịa dịka ọchịagha site n'afọ 1966 ruo n'afọ 1975 mgbe ndịagha nara ọchịchị n'ike nke gburu Abubakar Tafawa Balewa, praịm minista Naịjirịa, Ahmadu Bello, Sardauna nke Sokoto na primia nke Ugwu, Samuel Akintola, Premia ndị ọdịdanyanwụ, Arthur Unegbe na ndị ọzọ.

    Aka Gowon dị na nchutu n'ọchịchị ahụ dịka ọ ka si mba UK ebe ọ gara ọzụzụ n'ụlọakwụkwọ Junior staff college lọta.

    Dịka e gbuchara ọchịagha Aguiyi Ironsi bụ onye were ọchịchị mgbe ha napụrụ ndị nkịtị ọchịchị n'ike, Gowon bụ onyeisi ọrụ mgbe ahụ weziri ọkwa ọchịagha Naịjirịa.

    Gowon chịrị afọ itoolu tupu a chụpụ n'ọkwa mgbe ọ gara ọgbakọ ndị OAU na Kampala, ndị ahụ were ọchịchị nye Murtala Muhammad dịka ọchịagha ọhụrụ ebe Olusegun Obasanjo bụ osote ya.

    A lụrụ agha Biafra nke a kpọrọ 'Nigerian civil war' oge Gowon na-achị mgbe mpaghara Ọwụwanyanwụ chọrọ ikewapụ zawa Biafra n'ihi mkpagbu na ihe ndị ọzọ.

    A lụrụ agha Biafra ọnwa iri atọ ruo ụbọchị 13 nke ọnwa Jenụwarị Obasanjo nabatara nchili aka elu ndịagha Biafra.

    Gowon gbara ọsọ gbaga mba United Kingdom, mgbe a chutuchara ya n'ọchịchị n'afọ 1975, ebe ahụ ka ọ nọ nwete agụmakwụkwọ Phd na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mahadum Warwick.

    N'ọnwa Febụwarị 1976, onye agha bụ Buka Suka Dimka boro Gowon ebubo sị na aka ya dị n'ogbugbu ọchịagha Murtala Mohammed.

    Gọọmentị mechara mere ọchịagha Gowon ebere gbaghara ya tinyekwara onye bụbu onyeisiala Biafra bụ Emeka Ojukwu n'oge ndị nkịtị bara ọchịchị nke Shehu Shagari bụ onyeisiala.

    Na Nọveeba 2004, Gowon ritere nzere World Peace Prize site n'aka World Peace Prize Awarding Council maka ime ka udo chịa n'obodo na mwulite akụnaụba nakwa ịhazi ọgbakọ udo n'Afrịka.

  14. "Gbajọọ nụ ime njem n'oge ekeresime maka ibute coronavirus"

    Nyocha coronavirus

    Ndị ọrụ gọọmentị na-ahụ maka coronavirus adụọla ụmụ Naịjịrịa ndụmọdụ ka ha ghara ime njem n’oge ekeresime maka ọghọm ibute nje coronavirus.

    Otu ọtawaike onyeisiala n’ibuso coronavirus agha sị ka a gbahapụ ọgbakọ ọtụtụ mmadụ nwereike ikesasị ọrịa a.

    Onyeisioche otu a bụ Boss Mustagha sị na ọnụọgụgụ ndị butere coronavirus na Naịjirịa na-ahụ arị elu ugbua nke ọtụtụ ha si n'ebe e nwere ọgbakọ ọtụtụ mmadụ.

    O nyere ndụmọdụ ka ndị mmadụ gbajọọ ịla maka emume ekeresimesi ma kwuo na oge emume anaghị agwụ agwụ.

    N'ime izuụka ole na ole a, ndị butere coronavirus na Naịjirịa bịara na-agbago elu mana o rughi nke mba dịka Amerịka na Yurope.

  15. Nkeji Coronavirus

    Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa.

  16. Ụfọdụ mba Afrịka ga-amalite ịkwụ puku dọlla 15,000 iji mee njem

    Onyeisiala Donald Trump

    Onyeisiala Donald Trump etinyela iwu ọhụrụ kwuru na ndị si ụfọdụ mba Africa ga-egosi ihe ruru puku dọlla iri na isii maọbụrụ na ha chọọ ịme njem na mba Amerịka.

    Trump kwuru na ọ bụ n'ihi nnọfe oke ndị si mba ahụ na-afọ akwụkwọ ikike njem mere eji manye ya bụ iwu.

    Mana nchọpụta gosiri na Naịjirịa esoghi na mba ndị akpọrọ aha.

    Mba ndị ahụ gụnyere Angola, Burkina Faso, Chad, Democratic Republic of Congo, Djibouti, Eritrea, Gambia, Guinea-Bissau, Liberia, Libya, Mauritania, Sudan, Sao Tome and Principe, Cape Verde, Burundi.

  17. Gọọmentị etiti agbarụọla ihu dịka 39,070 gbahapụrụ iwu Covid-19

    Ndị a na-eme nyocha coronavirus

    Gọọmentị etiti agbarụọla ihu maka etu ndị na-eme njem abata Naịjirịa sị agbahapụ ịkwụ ụgwọ nakwa ịme nyocha ọrịa covid-19.

    Onyeisi ngalaba mgbochi coronavirus bụ Boss Mustapha kwuru na ha akwadowela ịda ndị mmadụ na-eme ihe ahụ nha.

    Ihe ọzọ o kwuru bụ na ndị mmadụ na-eji asambodo nyocha ọrịa ahụ nke adigboroja abata Naịjirịa.

  18. Naịjirịa ga-apụta n’ọtanisi n’agba mbụ nke afọ 2021

    Zainab Ahmed

    Mịnista na-ahụ maka ego, bọgeti na nhazi obodo bụ Zainab Ahmed ekwuola na Naịjirịa ga-apụta n’ọtanisi n’agba mbụ nke afọ 2021.

    O kwuru nke a n’emume iri abụọ na isii Nigerian Economic Summit nke Bigerian Economic Summit Group na ngalaba ya hibere.

    Naịjirịa banyere ọtanisi ya nke abụọ n’ime afọ ise n’agba nke atọ nke afọ 2020 dịka Gross Domestic Product (GDP) daturu ọzọ. Ahmed kwuru na ọtanisi a covid 19 butere bụ ihe metụtakwara mba ụwa ebe ọtụtụ mba banyerela ọtanisi.

  19. Ndewonu ndị bee anyị

    Anyị na anabata unu taa n'ikpa akụkọ ụwa anyị ka o si eme ugbua.

  20. Nkeji coronavirus

    Gee nkeji ihe mere n'Afrịka maka coronavirus taa.