Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Umahi ebola Egwu, Anyim ebubo iji Ipob ekposa Ebonyi Steeti

    Dave Umahi

    Umahi ebola Anyim, Egwu ebubo iji Ipob ekposa Ebonyi steeti

    Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti ebola Sam Egwu chịburu steeti ahụ nakwa Anyim Pius Anyim bụbu odeakwụkwọ gọọmentị etiti ahụ ebubo iji otu na-achọ nnwereonwe Biafra bụ Ipob n’ịchafụ ekposa udo steeti ahụ.

    Ụmahi kwuru nke a ka ọ na-enye ndị igwe atọ ọfọ ọchịchị n’Abakaliki ụbọchị Fraide dịka ọ kpọkukwara ndị ọrụ nchekwa ka ha gbaa mbọ hụ na mkposa udo a abịaghị na mmezu.

    Ọ sị: `Achọrọ m ka ndị ntaakụkọ mata na m nyere mkpesa maka ụfọdụ ndị Ebonyi ji ndị otu nzuzo nakwa ụfọdụ ndị Ipob chọọ igbusi ndị mmadụ nakwa ibute ọgbaghara n'Ebonyi steeti n'ụdị ibuso gọomentị Ebọnyị na gọvanọ agha."

    "Onye ndu ha bụ Sen.Anyim Pius Anyim, ebe ndị otu bụ Sen.Sam Egwu,Sen.Obinna Ogba na Ali Odefa na ndị ọzọ."

    Ụmahi, onye kpọkuru ha ka ha sepụ aka enwe n'ofe, gara n'ihu kwuo na o nweghị onye karịrị idobe iwu obodo.

  2. United Nations: Naijiria etoola nhọpụta a họpụtara Linda Thomas-Greenfield maka ịnnochite Amerịka

    Gọọmenti Naijiria anabatala nhọpụta ahọpụtara Ambassador @LindaT_Gdịka onye nnọchite anya mba Amerịka n' otu United Nations..

    N' ozi gọọmenti etiti wepụtara n'akara 'Twitter' ha,Thomas-Greenfield,nnọchịteanya mba Amerịka n'Afrịka nakwa Osote Odeakwụkwọ steeti maka ihe ndị metụtara Afrịka bụ " ezigbo enyi Naijiria nakwa Afrịka" dịka o nyere aka inwetara Afrịka nkwado n'aka mba Amerịka.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

  3. Egwu bọọlụ Naịjiria akụọla n'ala na ngụkọ FIFA

    Naịjiria esila n’ogogo iri atọ na abụọ daruo ogogo iri atọ na ise na ngụkọ egwuregwu mbaụwa ndị FIFA wepụtara n’ọnwa Nọvemba.

    Ha sikwa n’ogogo atọ gbadaruo anọ na ngụkọ nke Afrịka.

  4. Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa

  5. E gbuola 'nuclear scientist' ọkwa ya gbagotere na mba Iran

    Mohsen Fakhrizadeh
    Nkọwa foto, Mohsen Fakhrizadeh bụbu onyeisi nnyocha na nnchọpụta nke ministrị nchekwa na mba ahụ

    E gbuola Mohsen Fakhrizadeh bụ onye bekee kpọrọ nuclear scientist nke ọkwa ya gbagotere, na mba Iran.

    Mohammed Javad Zarif bụ minista mmekọrịta mba Ịran na mba ndị ọzọ katọrọ ogbugbu a ma kwuo na ọ bụ ogbugbu na-eyi egwu.

    Mịnịstrị nchekwa mba ahụ zisara ozi kwuru na "ndị oyi ndụ egwu bu ngwaagha wakporo ụgbọala bu Mohsen Fakhrizadeh, onyeisi nnyocha na nnchọpụta nke ministrị nchekwa na mba ahụ.

    "Ka ndị nchekwa ya na ndị oyi ndụ egwu a kwakọrịtachara, e merụrụ Fakhrizadeh ahụ ma buga ya ụlọọgwụ, mana mbọ niile a gbara ịzọ ya ndụ enweghi isi, mere ka ọ nwụọ."

    N'etiti afọ 2010 ruo 2012, e gbufuru ndị ọrụ "nuclear scientist" anọ na mba Ịran, dịka Ịran na-ebo mba Izrel ebubo na aka ha dị na ya.

  6. A tụọla onye omeiwu nta Naịjiria nga

    A tụọla Victor Mela bụ onye nnọchiteanya n’ụlọomeiwu nta nga otu ọnwa maka ịtụ asị n’agbanyeghị na ọ ṅụrụ iyi ikwu eziokwu gbasara ntuliaka afọ 2019.

    E nyere Mela na-anọchite anya Biliri na Balanga dị na Gombe steeti ohere ịkwụ nha ma ọ bụrụ na ọ chọghị ịga nga.

  7. Ndị butere coronavirus na Naịjirịa na-akwado iru 67,000

    Ihe ruru mmadụ otu narị na iri isii na itoolu ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa n’ụbọchị Tọzde.

    Kaduna steeti bụkwa ebe ọnụọgụgụ ndị butere ya kachasị dị elu dịka ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa ahụ kemgbe ọnwa Febụwarị karịrị puku iri isii na isii.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  8. Ipob akagbuola ọkwa Osote Onyeisi dịka nsogbu di n'etiti ha na Uche Mefor na-abawanye

    Dịka okwu dị n'etiti Onyeisi otu "Indigenous People of Biafra" (Ipob) bụ Nnamdi Kanu na Osote ya bụ Uche Mefor na-abawanye, ogige otu ahụ a kpọrọ "Directorate of State" (DOS) apụtara kwuo na ha akagbuola ọkwa Osote Onyeisi na ya bụ otu.

    N'ime akwụkwọ Maazị Chika Edoziem - bụ onye zara aha ka onyeisi DOS - binyere aka, ha si na ha na-eme nke a makana "onweghi ebe ọbụla a na-eme nwereonwe a na-enwe osote onyeisi".

    Ha gakwara n'ihu kwuo ọtụtụ ihe ha sị Maaazị Mefor mere megide Ipob na onyeisi otu ahụ.

    Ebubo a gunyere ịgba mgba okpuru megide ndị Ipob na-achọ ịbata mba Briten maka ọsọ ndụ nakwa inupuru Nnamdi Kanu isi site na ịgbajọ iwu o tinyere.

    BBC gbara mbọ ịnụta n'ụnụ Maazị Mefor mana ọ saghị ozi eziri n'ekwentị ya.

    Mana Mefor dere n'akara Facebook ya ma kwuo na mgba okpuru niile ndi Ipob na-agba ya agaghị amịta mkpụrụ.

    Mefor kwukwara na ọ bụ onyeisi Ipob na ndị DOS na ebuso ya agha.

    Akwụkwọ ahụ kọwakwara na Ipob wepụrụ onye na-ahazi Mab Aemrịka bụ Obidi Obienu n'ọkwa maka nnupu isi.

  9. Etu ụmụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ si ata ahụhụ na LUTH

    Ndị mmadụ dina n'ala nkịtị n'ụlọọgwụ LUTH ahụ
    Nkọwa foto, Ndị mmadụ dina n'ala nkịtị n'ụlọọgwụ LUTH ahụ

    Nchọpụta BBC mere n'ụlọọgwụ gọọmentị etiti bụ Lagos University Teaching Hospital bụ LUTH gosiri na ndị enweghgi ego n'ata ahụhụ ebe ahụ.

    Ndị isi ụlọọgwụ ahụ na-anara ezinaụlọ ndị ahụ adịghị ihe si 300,000 rue 750,000 iji nye ha ohere be ha ga-ehi ụra ma hapụ ịnye ya ndị mụrụ nwa kwesiri ị nọ ebe ahụ.

    BBC gara ebe ahụ mgbe ihe onyonyo dapụtara na soshal midia gbasara ihe ndị mmadụ na-agabiga n'ebe ahụ.

    Ụfọdụ ndị ku nwa n'aka n'ebe ahụ kwuru na n'ezie na ọ bụ n'ala nkịtị ka ha hiri ụra n'abalị foro ụbọchị ahụ.

    Wasiu Adeyemo bụ onyeisi komiti maka ndụmọdụ ahụike gwara BBC na ndị dọkịnta na ndị nọrsụ na-eleta ndị ahụ adịghị nke pụtara na o nweghi ihe ezinaụlọ ndị ahụ kwesiiri ị na-achọ ebe ahụ.

    Mgbe a jụrụ ya ma o nwere ndị ọrụ ahụike zuru ịleta mmadụ niile nọ ebe ahụ ọ sara sị "ebe a bụ Naịjirịa, anyị enweghi ihe niile"

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ebe ndị mmadụ hiri ụra na LUTH
    Nkọwa foto, Ebe ndị mmadụ hiri ụra na LUTH
  10. Donald Trump ekwerela na ya ga-apụ na obi gọọmentị Amerịka na Jenụwarị

    Donald Trump

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ekwerela na ya dị njikere ịhapụ obi gọọmentị Amerịka eji "White House" mara ma ya bụrụ na esuru kpọm na ọ bụ Joe Biden meriri ntuliaka Amerịka nke 2020.

    Trump kwuru nke a n'ịza ajụjụ onye ntaakụkọ jụrụ ya.

    Onye ntaakụkọ jụrụ: "Ya bụrụ na ndị tụrụ vootu kpebiri na Onyeisiala nọ na-eche bụ Joe Biden ga-emeri, ọ bụ na ị gaghị ahapụ White House?"

    Trump zara sị: "Ị ma...A ga m apụ, a ga m apụ dịka i makwa. Mana a na m eche na-enwere ọtụtụ ihe ga-eme site ugbua rue ụbọchị 20 nke Jenụwarị."

    Okwu dịka ụdịrị okwu Trump na-ekwu kemgbe e meriri ya na ntuliaka.

    O kwuola na mpụ ndi na ya bụ ntuliaka mana o weteghi akaebe ga-egosi na okwu ya kwụ ọtọ.

    Maazị Trump gakwara n'ihu kwuo na ọ ga-arị ya ahụ ikwu na-emeriri ya, ma gbajọọ ịza ajụjụ ma ọ ga-azọ ọchịchị ọzọ.

  11. Ndị oji egbe egbuola eze obodo n'Ondo steeti

    Ndị oji egbe gburu otu eze obodo n'Ondo steeti dịka ọ na-ala obi ya.

    Dịka ndị ntaakụkọ siri kwuo, Oba Adegoke Adeusi nọ n'ime ụgbọala ala ya oge ndị oji egbe wakporo ha ma gbanye egbe n'ime ugboala ahụ.

    Oba Adeusi merụrụ ezigbote ahụ ma nwụọ ka ebutere ya n'ụlọ "Federal Medical Centre" di n'Owo.

    Ezinaụlọ Ọba Adeusi na-akọwa na ọ bụ ndi eziri ezi kpara ike a dịka onweghi ihe e zuru n'ime ụgbọala ya.

    Eze si nzukọ ndị eze na-ala ogbe mwakpo a mere.

    Otutu ogbugbu na ịtọrị mmadụ emeela n'ụzọ ahụ.

  12. Tanka bu mmanụ ụgbọala agbaala ọkụ n'ụzọ Agulu, Anambra steeti

    Tanka bu mmanụ ụgbọala gbara ọkụ n'Agulu

    Otu tanka bu mmanụ ụgbọala agbaala ọkụ n'okporụzọ si Awka gawa Agulu n'Anmabra steeti.

    Nchọpụta nke BBC Igbo mere gosiri na 'brake' ụgbọala ahụ kwụsịrị ịrụ ọrụ nke mere ka ọ kụọ osisi ọkụ latrik bụ 'Transformer' dị nso n'ebe ahụ tupu ha enwuru ọkụ.

    Ọkụ ahụ malitere ịgba mechara gba ọdọ ahịa ndị mmadụ dị n'akụkụ ụzọ.

    O mebikwara ya bụ osisi ọkụ latrik bụ nke na-ebutere ndị obodo ahụ ọkụ ma gbaa ọtụtụ waya ọkụ n'ebe ahụ.

    Otu onye ọkụ gbara ọdọ ahịa ya aha ya bụ Chukwukerue Ezeani kwuru na ngwa ahịa ruru nde naira iri funarịrị ya n'ọkụ ahụ gbara.

    'Transformer' ahụ gbara ọkụ
  13. Nnọnụ na peeji anyị taa

    Kedụ nke na-akpọtụ n'ogbe gị?

    BBC Igbo ga-aza gị ajụjụ ahụ site n'akụkọ ndị anyị ga-ewetara unu taa.

    Jisinu ike sonye anyị.

  14. Onweghị etu Biden si nweta vootu nde 80 na ntuliaka a - Donald Trump

    Donald Trump

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ka na-ekwusi ike na nrụrụaka dị nke ukwuu na ntuliaka ọkwa onyeisiala mba ahụ.

    Joe Biden, onye pati 'Democrats' meriri na ntuliaka ahụ, mana Trump ekwetebeghị na e meriela ya.

    N'uhuruchị ụbọchị Tọzde ka Trump kwuru na ọ bụ nrụrụ aka ka Biden ji nweta vootu nde iri asatọ (80 million) o ji nweta mmeri.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ugboro ugboro ka Trump na-ekwu na nrụrụaka buru ibu na ntuliaka nke afọ a, mana onwebeghị ihe akaebe ya na ndị otu ya gosiri iji kwado ebubo a.

    Trump mechara kweta ka ndịọrụ ya gaa n'ihu ka ha na ndọrụ Joe Biden rụkọọ ọrụ maka ịhafe ọchịchị n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021, mana ọ kpọbọghị Biden kelee ya dịka ndị isiala Amerịka n'oge gara aga si eme.

  15. Gọọmentị Imo steeti akagbuola akwụkwọ ikike ala ndị Rochas nyeburu

    Gọọmentị Imo steeti akagbuola akwụkwọ ikike ala niile bụ nke ha kwuru na ọchịchị Rochas Okorocha nyere ndị mmadụ n’ụzọ adabaghị n’iwu.

    Ha kwuru na ọ bụ ọchịchị Emeka Ihedioha hibere kọmiti lebara okwu a anya, mana ọchịchị Hope Uzodimma nabatara mkpebi ha n’ihi na ọ bụ mkpebi ziri ezi.

  16. Jiri otu nkeji gere akụkọ coronavirus dịka ọ dị n'Afrịka ugbua

  17. Ozo Big Brother esonyerela otu egwu bọọlụ Juventus

    Ozo

    Ozo, onye so n'egwuregwu Big Brother Naija nke afọ 2020 esonyerela otu egwuregwu bọọlụ Juventus nke mba Itali

    Nwaokorobịa a ezigbo aha ya bụ Ozoemena Chukwu kwupụtara nke a n'akara soshal midia ya dị iche iche.

    Ọzọ kwuru na ahọrọla ya dịka onye nlekọta azụmahịa (Brand Manager) nke ụlọakwụkwọ ebe ndị Juventus na-azụpụta ndị na-agbara ha bọọlụ na Naịjirịa, nke a kpọrọ Juventus Academy na Bekee.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Kamgbe o sicha n'ụlọ Big Brother Naija pụta, ọnwa Ozo na-etisi nnọọ ike.

    Ụlọọrụ izizi ya na ha nwere nkwekọrịta bụ ụlọọrụ ntaakụkọ egwuregwu bụ Super Sports.

    Ya na ụlọọrụ ekwentị bụ Tecno nwekwara nkwekọrịta azụmahịa.

    Nke ya na Juventus ugbua bụ nke onye ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua.

  18. Etu m si soro na ndị ọkaibe n'egwuregwu 'Basketball' - Zeke Nnaji

  19. Argentina niile ederela jim jim maka olili Diego Maradona

    Igbe ozu Maradona
    Nkọwa foto, Igbe ozu Diego Maradona dịka ndị mmadụ na-akwanyere ya ugwu ikpeazụ

    Puku kwuru puku mmadụ agbakọọla n'obi onyeisiala Argentina iji kwanyere Diego Maradona ugwu ikpeazụ.

    Ụbọchị Tọzde bụ mmalite abalị atọ nke gọọmentị Argentina wepoụtara iji ruo uju maka Maradona, onye nwụrụ n'ụbọchị Wenezde ka ọ dị afọ iri isii (60 years).

    Ọtụtụ na-ebe akwa, ndị ọzọ na-ekpe ekpere, ebe ụfọdụ ndị ọzọ na-efegharị akwa Maradona dịka ha na-agafe n'ebe a dọtara igbe ozu ya.

    E ji ọkọlọtọ mba Argentina kechie igbe ozu ahụ ma were akwa Maradona ji gbaa bọọlụ wụkwasị n'elu ya.

    A ga ekwe ka ndị mmadụ bịa kwanyere Maradona ugwu ikpeazụ ruo na mgbede Tọzde.

    Ama egwuregwu Napoli
    Nkọwa foto, Ama egwuregwu dị na Napoli ebe Maradona gbara bọọlụ oge ọ dị ndụ

    Ndị ezinụlọ Maradona na-eru ụjụ ọnwụ ya gụnyere ụmụ ya ise, na nwunye ya bụ Claudia Vilafane, onye ya na ya kewara n'afọ 2004 dịka ọ gachara afọ iri abụọ ha ji gbaa akwụkwọ.

    Maradona bụ onye ndu ndị otu bọọlụ Argentina buru iko mba ụwa n'afọ 1986.

    Oge Argentina zutere mba England n'agba nke osote ikpeazụ nke asọmpi iko mba ụwa afọ 1986, Maradona nyere goolu site n'iji aka ya kụkpuo bọọlụ na neetị, nke ọ kpọrọ 'Hand of God'.

    Maradona gbakwaara otu 'Napoli' na mba Italy, na otu Barcelona nke mba Spain.

    N'ụbọchị Tọzde, Napoli kwuru na ha ga-akpọzi ama egwuregwu ha aha Maradona.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  20. Mgba okpuru ndị isi Ipob na-agba m agaghị amịta mkpụrụ - Uche Mefor

    Uche Mefor

    Osote onyeisi otu 'Indigenous People of Biafra' bụ Uche Mefor ekwuola na ọtụtụ ndị isi otu ahụ na-agba ya mgba okpuru ma na-emetọkwa aha ya.

    Mefor kwuru nke a n'akara 'Facebook' ya n'ụbọchị Tọzde, ma kwuo na mgba okpuru niile ahụ agaghị amịta mkpụrụ ọbụla.

    O kwuru sị: "Ụnụ na-egbu onwe ụnụ oge. Ọtụtụ ihe onyonyo na mgbasaozi dị icheiche na-aga n'ihu ugbua iji metọọ aha m."

    "Ndị isi IPOB ma maka nke a ma gbachikwa nkịtị ka ọ na-aga n'ihu. Ọ bụghị taa ka ọ malitere."

    "Agaghị m agbachi nkịtị ka a na-atụgide m asị n'ọha, bịa na-arịọ m ka a nọrọ n'ime ụlọ kpaa ya."

    "Ikuku ọjọọ a na-eku ugbua nwere ndị o si n'aka."

    Mefor gara n'ihu kwuo na ụfọdụ na-egosi onwe ha dịka ndị ọma nakwa ndị ji ikike ọnwụ na ndụ, mana omume ha akwụghị ọtọ.

    Ọ bụ eziokwu na onweghị onye Mefor kpọrọ aha, kama ọtụtụ na-ekwu na o nwere ike ịbụ Nnamdi Kanu ka ọ na-ekwu maka ya.

    N'ọdị nso a, akụkọ na-ekwu na Mefor na ndị isi Ipob, ọkachasị onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu, na-enwe nsogbu.