Umahi ebola Egwu, Anyim ebubo iji Ipob ekposa Ebonyi Steeti

Ebe foto si, Dave Umahi/Facebook
Umahi ebola Anyim, Egwu ebubo iji Ipob ekposa Ebonyi steeti
Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti ebola Sam Egwu chịburu steeti ahụ nakwa Anyim Pius Anyim bụbu odeakwụkwọ gọọmentị etiti ahụ ebubo iji otu na-achọ nnwereonwe Biafra bụ Ipob n’ịchafụ ekposa udo steeti ahụ.
Ụmahi kwuru nke a ka ọ na-enye ndị igwe atọ ọfọ ọchịchị n’Abakaliki ụbọchị Fraide dịka ọ kpọkukwara ndị ọrụ nchekwa ka ha gbaa mbọ hụ na mkposa udo a abịaghị na mmezu.
Ọ sị: `Achọrọ m ka ndị ntaakụkọ mata na m nyere mkpesa maka ụfọdụ ndị Ebonyi ji ndị otu nzuzo nakwa ụfọdụ ndị Ipob chọọ igbusi ndị mmadụ nakwa ibute ọgbaghara n'Ebonyi steeti n'ụdị ibuso gọomentị Ebọnyị na gọvanọ agha."
"Onye ndu ha bụ Sen.Anyim Pius Anyim, ebe ndị otu bụ Sen.Sam Egwu,Sen.Obinna Ogba na Ali Odefa na ndị ọzọ."
Ụmahi, onye kpọkuru ha ka ha sepụ aka enwe n'ofe, gara n'ihu kwuo na o nweghị onye karịrị idobe iwu obodo.











