Igbo ndị ọma ka chi foo nu
Anyị na-ekele unu maka ịnọnyere anyị taa.
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Anyị na-ekele unu maka ịnọnyere anyị taa.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii Ajentina na-enyocha ụlọọgwụ na ụlọ onye dọkịta na-agwọ Maradona bụ Leopoldo Luque.
Ha sị na ha na-eme nke a iji maara ma o nwere etu dọkịta ahụ si leghara Maradona anya nke butere ọnwụ ya.
Nwamadị a ụkwụ na-aghọ nkọ na bọọlụ nwụrụ ka ọ gbara afọ iri isii site n'obi nkolopu n'ụlọ ya dị na Buenos Aires dị n'Ajentina.
Ụmụ Maradona ndị nwaanyị sị na chọrọ ịma ọgwụ a nọ na-enye nna ha.
A wara Maradona ụbụrụ maka nkpụkọta ọbara na mbido ọnwa Nọvemba bụ nke gara nke ọma, ebe a na-achọ ịgwọ ọrịa ịṅụ mmanya.
Ọ bụ onye ndu otu egwuregwu bọọlụ Ajentina mgbe ha mabutere Iko Mbaụwa n'afọ 1986, ebe o nyere goolu a kpọrọ "Hand of God" n'asọmpi ha ndị Ịngland gbara na-agba anọ nke ikpeazụ.

Ebe foto si, Borno State Government
Otu United Nations akatọọla ogbugbu e gburu ndị Boko Haram gburu ndị mmadụ ruru 110 na Borno Steetị ma merụọ ọtụtụ ahụ.
Onye nchịkọta otu a na Naịjirịa bụ Edward Kallon kwuru nke a n'ụbọchị Sọnde dịka ọ na-akatọ ogbugbu ma kpọọ oku ka a tọhapụ ọtụtụ ndị a tọọrọ ngwa ngwa.
"Anyị natara ozi na ọ dị ka a tọọrọ ọtụtụ ụmụnwaanyị. Ana m akpọ oku ka a tọhapụ ha ngwa ngwa." Ihe onye nchịkọta a kwuru.
"Nwakpo a bụ ihe ike kachasị ọjọọ a na-eme megide ndị mmadụ n'afọ a. Ana m akpọ oku ka a nwụchie ndị mere ihe ma taa ha ahụhụ."

Ebe foto si, United Nations/Facebook
Ọ sị na nwakpo na-egbu mmụọ na olileanya ndị mmadụ nwere isi n'ọnọdụ ọjọọ pụta bụ nke United Nations na-agba mbọ ya ịnapụta ha.
"Otu United Nations na ndị ọzọ na-arụ ọrụ enyemaka na Borno Steetị na-ewe iwe maka nwakpo a," Ihe o kwuru.
Cheta na akụkọ pụtaburu na ọ bụ ndị ọrụ ugbo mmadụ iri anọ na atọ ka e gburu n'ụtụtụ Satọde n'obodo Marrabati na Hammayya dị n'okpuruọchịchị Jere nke Steetị ahụ.
A wakporo ndị ọrụ ugbo a n'ọrụ ugbo osikapa ka ha na-aghọrọ osikapa. Ụfọdụ n'ime ha ka ndị ekperima a kpọọrọ pụọ.

Ebe foto si, Onyebuchi Ememanka/Facebook
Otu PDP nke Abịa Steetị ekwuola na o nweghi APC ọbụla Gọvanọ Okezie Ikpeazu ji azụ aga.
Onye odeakwụkwọ pati a bụ Fabian Nwankwo kwuru nke a iji katọọ ihe onye chiburu Abia bụ orji Uzor Kalu kwuru na gọvanọ Ikpeazu chọrọ ịbanye APC.
Kalu sị na gọvanọ Okezie kwetere ịgafeta n'APC dịka ọnọdụ o ji nwete mmeri n'ụlọikpe kachasị maka ntuliaka 2019.
Mana Nwankwo ebubo a bụ iji megharịa ndị mmadụ anya ka ha ghara ịhụta ọrụ ọma niile gọvanọ Ikpeazu na-arụ n'Abia Steet.
Ọ sị ikpe banyere ntuliaka n'ụlọikpe kachasị abụghị ihe a na-ekpe maka na onye ahụ chọrọ isi n'otu pati banye na nke ọzọ.
Nwankwo gara n'ihu rịọ ndị Abia ka ha ghara ịṅa ntị n'okwu a ma lekwa sị anya n'ịkwado Gọvanọ Ikpeazu iji nwete oke ruru ha n'ọchịchị onye kwuo uche ya.
Ozi kwukwara na PDP tụkwasịrị Gọvanọ Ikpeazu obi n'ọrụ ya ma kwuo na onweghi mgbe ọ na-atụle ịhapụ PDP.

Ebe foto si, FACEBOOK/GOVERNOR ZULUM
Gọvanọ Borno Steetị Babagana Zulum du ndịisi obodo na ndị ọzọ gaa n'olili ndị ọrụ ugbo dị mmadụ 43 ahụ e chere na ndị Boko Haram gburu ụnyaahụ.
Gọvanọ Zulum sị na ọ bụ ihe obi mgbawa na e gburu ndị a n'ime ọrụ ugbo ka ha na-arụ ọrụ.
"Ndị anyị nọ n'ọnọdụ ọjọọ, ha nọ n'akụkụ abụọ dị njo, ha nọrọ n'ụlọ agụụ egbuo ha mana ha gaa n'ugbo ndị ekperima nwereike gbuo ha."

Ebe foto si, FACEBOOK/GOVERNOR ZULUM
"Ọ dị mwute na anyị na-arịọ ka gọọmentị etiti tinye ndị ntoroọbịa na ndị dinta n'ọrụ nchekwa iji chekwaa ndị ọrụ ugbo anyị."
Ha gwara Gọvanọ na nyocha ka na-aga n'ihu ịchọpụta kpọkwem mmadụ ole nwụrụ na mwakpo a.
Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla mwakpo a site n'ọnụ onye enyemaka pụrụiche ya bụ Garba Shehu ma tie ezinaụlọ ndị e gburu aka n'obi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, Getty Images
Praịm mịnista Ethiopia bụ Abiy Ahmed ekwuola na ndị agha gọọmenti ya ewegharala ogbe Mekelle bụ isi obodo ugwu Tigray.
O kwuru na ndị agha banyere ogbe ahụ n’agba nke ikpeazụ ọgụ ha na Tigray People's Liberation Front- mana a mabeghị akụkọ so okwu a makana ụzọ nkwụkọrịta ụka n’ogbe ahụ mechiri emechi ugbua.
Mana otu Tigray People's Liberation Front kwuru na ha ga-alụgide ọgu iji zọọ isi ha ma kwụsị mwakpo ndị agha gọọmenti Ethiopia.
Agha dapụtara n'etiti gọọmenti Ethiopia nakwa Tigray People's Liberation Front atala isi mmadụ narị kwụrụ narị.

Ndị uweojii nọ na Rivers steeti anwụchiela mmmadụ a na-eche na ha gbapụrụ ogbunigwe n’ụlọụka nna gọvanọ Nyeson Wike, Christian Universal Church International dị na streeti Azikiwe, Mile 2 Diobu area, Port Harcourt.
Mgbe BBC gara ebe ahụ , ndị ọrụ nchekwa na-emenyu ogbunigwe nọ n’ụlọụka ahụ nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ juru ebe ahụ.
Akụkọ kwuru na ya bụ ihe mere n’ụbọchị satọde, Nọvemba 28,2020 nke mere ka ndị ụlọụka ahụ gbapụ na-emerughị ahụ.
Ọ bụ ndị ntoroọbịa bi n’ogbe ahụ nwụchiri ndị ntoroọbịa abụọ ha chere tụrụ ya bụ ogbunigwe tupu ndị uweojii awuchie.
Ndị ọrụ nchekwa agbachiela ụzọ ebe ihe a mere nke bụ na ụgbọala maọbụ ndị ji ụkwụ aga anaghị esi ebe ahụ aga ugbua.


Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari egosila nwute ya maka etu ndị omekome si gbu ndị ọrụ ugbo osikapa n’ugbo ha dị na Zabarmari, dị n’okpuruọchịchị Jere dị na Borno Steeti.
O tikwara ndị bee ha aka n’obi ma na-ekwu na Naịjirịa enyela ndị agha ikike ka ha chetakwa ụmụ Naịjirịa nakwa ogige ha.
Ọnụ na-ekwuru onyeisiala Buhari nke ukwu bụ Garba Shehu depụtara ozi a n'akara twitter ya.
Akụkọ pụtara na ndị a na-eche na ha bụ Boko Haram gburu ndị ọrụ ugbo osikapa karịrị iri anọ n’ugbo ha.
Kedụ ka ọdachị a si mee?
Ndị ime obodo kwuru na ndị ọrụ ugbo ahụ egburu biara iwere ọsikapa ha karalanụ mgbe a wakporo ha.
Akụkọ ahụ kwukwara na ndị wakporo ndị ọrụ ugbo a kere ha eriri ma na-ebepu ha isi n'ime ugbo dị na Maiduguri, isi obodo Borno.
O nwebeghị otu poụtarala kwuo na ọ bụ ha mere mkpa mkpa a.
Onye ntaakụkọ BBC kwuru na ndị Boko Haram na-awakpo ndị ọrụ ugbo makana ha na-eche na ọ bụ ha na-agwa ndị agha maka ebe nzuzo ha.
N'ọnwa gara aga , Boko Haram gburu ndị ọrụ ugbo ruru iri abụọ na abụọ n'ugbo ha n'ebe abụọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Anyi na-anabata unu taa. Nke onye chiri ya zere ooo!

Ebe foto si, @HQNigerianArmy
Akụkọ si Borno Steetị na mpaghara ugwu Naịjirịa na-ekwu na ndị e che na ga bụ ndị Boko Haram awakpoola ogige ọrụ ugbo ma gbuo ihe karịrị mmadụ 40.
Nke a mere n'ụtụtụ Satọde na Kwashebe Zamarmari dị n'okpuruọchịchị Jere dịka ndị bi ebe ahụ gwara BBC.
Ha sị na ndị a wakporo ndị ụrọ ugbo ka ha na-aghọrọ osikapa ha kụrụ n'ugbo. Akụkọ sị na e kere ndị ọrụ ugbo a eriri ma gbusie ha.
O nwebeghi ihe ndịagha maọbụ ndị uweojii kwuru maka mwakpo a.
Otu Boko Haram na ogbo ha ISWAP na-aga n'ihu n'ịwakpo mpaghara ugwu nke Naịjirịa na-agbanyeghi ihe gọọmentị na ndị ọrụ nchekwa na-ekwu na ike agwụwala ha.

Ebe foto si, RIDWAN OYEWUMI
Nwanne nwata akwụkwọ Elihan dị n’ahịa Agric nke Ikorodu Legọs gwara BBC na o cheghi na nwanne ya nwụrụ ọnwụ chi ya.
Akụkọ sị na soshal midia sị na Boluwatife Omeleja dị afọ iri na anọ dara n’ụlọakwụkwọ ha ma nwụọ n’ụbọchị Tọsde.
Ridwan Oyewumi, gwara BBC na ọ bụ nwanne Bola sị na ebulatara ozu Boluwatife si n’ụlọakwụkwọ ha Elihans College, Ikorodu.
Mana o teghi aka e lie ya dịka okpukperechi ndị alakụba si dị.
Ridwan sị na nna ha kwuru na ọ gaghị ewepu okwu ọnwụ Bolu n’ụlọikpe mana ọ dị mkpa ka ha mara ihe gburu ya.
Kedụ etu Bolu si nwụọ?
Akụkọ sị na a kpọrọ nna Bolu kaọ bịa n’ụlọakwụkwọ na Bolu dara n’ala ma daa mba.
Dịka nna ya na-aga, ha hụrụ onye nkuzi na nwata akwụkwọ bu Bolu n’ụgbọala mana ọ naghị emegharị ahụ.
Mgbe ha bu ya gaa n’ụlọọgwụ, dọkịta kwuru na Bolu anwụọla
Mana ndịisi ụlọakwụkwọ sị na nwata ahụ dara n’ala nwụọ mgbe ọ na-aza ajụjụ.

Ebe foto si, FACEBOOK / OMELAJA BOLUWATIFE TAOFEEK
Kedụ ihe mgbagwoju anya dị n’ọnwụ Bolu?
BBC hụrụ ozi Ridwan depụtara na twitter na-ebo otu onye nkuzi a kpọrọ Emmanuel ebubo ikugbu nwanne ya Bolu.
Ọ sị na nwanne Bolu ọzọ nọ n’ụlọakwụkwọ a bụ Lateef sị na ọ bụ Emmanuel kụrụ Bolu mere o ji daa na-amaghịzi onwe ya.
Nwanne Bolu chọọrọ onye nkuzi Emmanuel gaa n’ụlọ ya ugboro abụọ mana ahụghị ya.
BBC Igbo kpọrọ akara ekwentị Oduwole G.A bụ onye ezinaụlọ nyere akara ekwentị ya.
Ọ sị na ọ nọ n’ụlọọrụ ndị uweojii na ọ gaghị azali ekwentị ya ugbua.

Ebe foto si, ELIHANSCHOOLS.COM
Kedụ ihe ndị uweojii kwuru?
BBC Yoruba kpọrọ onyeisi ndị uweojii n’Ikorodu mana ọ sị na ọ maghị ihe banyere akụkọa a.
Ugbua amabeghi ihe gburu Bolu kpọmkwem, ọ ga-adị mma isi imi n’ala chọpụta.
O nweghi ebe a hụrụ onye nkuzi Emmanuel a na-ebo ebubo ka ọ bịa zara ọnụ ya n’ọnwụ Bolu.
Dịka ọ na-ekwu ka ndị ntoroọbịa na steeti ya malite itinye anya n'ọrụ ugbo, Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo steeti akwalitela ndị ntoroọbịa 250 oke oyibo n'ogige Bekee kpọrọ Naitional Agricultural Land Development Authority (NALDA).

Ebe foto si, Hope Uzodinma

Otu onye welitere isi na pati PDP, bụ Nwoba Chika Nwoba, ekwuola na Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi bụ onye nkwado ọgbaaghara.
Nwoba kwuru nke a iji zaghachi ebubo Umahi boro ụfọdụ ndị welitere isi na pati PDP n'Ebonyi steeti, na-ekwu na ọ bụ ha na-akwado ndị otu IPOB nakwa ndị otu nzuzo ndị ọzọ ka ha na-emebisi ihe na steeti ahụ.
N'ebubo ya, Umahi kpọrọ aha Sam Egwu onye bụbu aka chịburu Ebonyi steeti bụ; Anyim Pius Anyi, onye bụbu ode akwụkwọ gọọmentị etiti, Obinna Ogba na ụfọdụ ndị ọzọ.
Mana Nwoba kwuru na ọ bụ Umahi bụ onye na-akwado ndị Fulani ọchị ehi na-awakpo Ebonyi steeti kwa mgbe kwa mgbe.
Nwoba kwukwara na Umahi bụ nna ukwu ndị Miyetti Ala, nke bụ otu jikọrọ ndị na-achị ehi na Naịjirịa.
Cheta na Nwoba nọbu na pati APC tupu o si ebe ahụ bata na PDP.
Kamgbe Umahi hapụrụ PDP banye APC, ọtụtụ okwu esila na ya bụ ihe pụta.
Umahi kwuru na ọ bụ maka mmegbu ndị PDP na-emegbu ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kpatara o ji pụọ, mana ọtụtụ na-ekwu na nke a abụghị eziokwu.
Ha kwuru na Umahi na-achọ ka ndị APC nye ya ọkwa na ntuliaka afọ 2023.

Ebe foto si, @samuelaruwan
Gọọmentị Kaduna ekwuola na ndị agha nọ n'ogige "Operation Thunder Strike" chabịrị nkata ndị ntọrị kpara ịwakpo ụzọ si Abuja gawa Kaduna n'ụbọchị Fraide.
Ọ bụ Kọmịshọna na-ahụ maka nchekwa na ihe banyere obodo bụ Samuel Aruwan binyere aka n'akwụkwọ mgbasa ozi akụkọ a dị n'ime ya.
Dịka o siri kọwaa, ndị omekome a gbachiri ụzọ di na mpaghara Kasarami n'okpuru ọchịchị Chikun n'amali elekere asaa na ọkara nke mgbede.
Ozi ahụ sị na ndị agha meriri ndị ntọrị, dịka ọtụtụ n'ime ha bu mgbọ n'ahụ gbaa ọsọ.
Ihe a mere butere ịkwụ n'ahịrị n'ụzọ ahụ n'oge ihe a na-eme. Ọ bụ nke kpatara gọọmentị steeti ahụ jiri riọ ndị nọ njem arịrịọ.
Ụzọ ahụ si Kaduna gawa Abuja bu ebe ndị ntọrị na-anọkarị ma na-akpa ike gunyere igbu na ịtọrị ndị mmadụ.
N'izuụka abụo gara aga, ụmụakwụkwọ mahadum Ahmadu Bello itoolu na-aga Legọs zutere ndị ntọrị a kpụrụ ha banye ọhịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ihe ruru mmadụ iri abụọ na abụọ anwụola site n'ọgụ dapụtara n'etiti ndị Arab na-achi ehi nakwa ndị ọrụ ugbo na mpaghara ndịda Chad a kpọrọ Kabbia.
A na-eche na esemokwu a malitere site n'ebubo ohi ehi ndi agbụrụ abụọ a na-ebo onwe ha.
Minista na-ahụ maka mgbasa ozi na Chad bụ Cherif Mahamat gwara ụlọ ntaakụkọ AFP na a mụnyere ọtụtụ obodo ọkụ n'ọgbaghara dara na Mọnde na Tuzde.
A nwụchiri mmadụ 66 dịka mmachị ngagharị na-aga n'ihu na mpaghara ahụ.
Ọgbaghara na-ada n'etiti agbụrụ abụọ a mpaghara Sahel kemgbe ọgụ afọ na ụma.
Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa Bekee kpọrọ Nigerian Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na mmadụ 246 butere coronavirus ọhụrụ na Naịjirịa.
Nke a butere ndị ọrịa a fesarala na Naịjirịa 67,220 kemgbe ọ malitere.
N'ime ndị a mmadụ 62,686 agbakeela ma laa be ha abe mmadụ 1,171 rara mmụo site na ya bụ ọrịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, Reuters
Mba Iran aṅụọla iyi na ha ga-abọ ọbọ maka ogbugbu e gburu onye ọkachamara na sayensị nuclear, bụ Mohsen Fakhrizadeh.
Iran na-ebo ebubo na ọ bụ mba Israel gburu nwa amadị ahụ, mana Israel ekwubeghị ihe ọbụla gbasara ya.
Mana otu a kpọrọ Hezbollah kwuru na aka mba Amerịka dịkwa na ya bụ ogbugbu.
Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta mba Iran na mba ndị ọzọ bụ Mohammad Javad Zarif kwuru na ọ bụ ndị na-eyi ndụ egwu gburu nwanne ha.
Zarif kpọkwara oku ka mba ụwa dị icheiche tinye okwu a ọnụ ma katọọ ya bụ omume ọjọọ.
Mana onyeisiala mba Iran bụ Ayatollah Ali Khamenei kwuru na ha ga-abọrịrị ọbọ.
"Anyị ga-agba ha ka egbeigwe," bụ ihe Khamenei kwuru.

Onyeisi Ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele ekwuola na akụnaụba Naịjirịa ga-eji pacentị abụọ ria elu n'ime afọ 2021.
Nke a na-abịa dịka Naịjịrịa banyere n'ọnọdụ ọtanisi dịka kpamkpa covid-19 na-enye mba ụwa nsogbu.
Mana, Maazị Emefiele kwuru na o cheghị na ọtanisi nke a ga-anọte aka.
Ọ sị na ya na-ele anya na ego tinyere n'ihe niile na Naịjirịa ga-ebelata na mbido afọ 2021.
Emefiele gbadokwara ụkwụ na atụmatụ ha ji ahazie ego ofesi na Naịjirịa bụ nke ọ sị na-enye ohere ka gọọmentị jiri nwayọ hapụ naịra ka ọ zọwa isi onwe ya.
Naira ejirila pacentị 28 daa n'afọ, mana ndi ọkachamara sị na etu Emefiele si agbajọo ọnu ego ofesi na-ada n'ụzọ na-eme ka ụfọdụ na-eche na-ọkwadoghị ka ka naịra zụo etu ahịa siri chọọ.
Ụkọ dọla n'ahịa okporo ụzo mere ka o tinye ego ruo naịra 500 ịzụ otu dọla n'ụbọchị Fraịde.
Anyị na-enye unu nnuku ekele dịka anyị na-amalite iwetere unu akụkọ si ụwa dum.
Ya gaziere onye ọbụla.
Rahụ ’ọfụma