Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
E gbuola Osote Kọmịshọna ndị uweojii na Calabar
Ebe foto si, CrossRiverWatch
Ndị a na-amaghị gbukasịala osote kọmịshọna, ACP Egbe Eko Edum bụ onyeisi No.73 PMF Squadron,
Magumeri, Borno state na Calabar.
A wakporo ya taa bụ ụbọchị abụọ nke December 2,2020 n'elekere otu n'ụzụ ụtụtụ n'ụzọ Murtala Mohammed dị n'akụkụ ụlọọrụ Pepsi.
Ebe foto si, CrossRiverWatch
Osote kọmishọna Egbe Eko Edum na-aga Calabar ị ga leta ndị bee ya mgbe ụgbọala ya mebiri n'okporoụzọ.
Mgbe ọ na-achọzi ịkpọ ndị bee ya ka ha bia buru ya, a wakpo ya ma were ọgụike gburisie ya.
Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ ndị uweojii dị na Calabar bụ DSP Irene Ugbo gwara ndị ntaakụkọ na ya bụ ọdachị mere ma kwuo na ha na-enyocha ihe a merenu.
Afrịka ga-enwete ọgwụ HIV na-atọ ụtọ maka ụmụaka
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Nke a pụtara na agaghị na-agbari ọgwụ okenye iji nye nwatakịrị
Ụlọọrụ enyemaka ekwuola na a ga-ebubata ọgwụ na-atọ ụtọ na-agwọ ọrịa HIV maka ụmụaka n'Afrịka n'afọ ọzọ na-abịa abịa.
Ọ bụ ọgwụ paediatric mbụ dị ezi ọnụala ga-adị maka ụmụaka e ku n'aka.
Otu United Nations ekwuola na ụmụaka karịrị otu nde na ụma ise n'ụwa bu ọrịa coronavirus mana naanị ọkara n'ime ha na-enwete ọgwụgwọ.
otu n'ihe mere o ji raa ahụ ụmụaka ịṅụ ọgwụ mgbochi HIV nke ụmụaka bụ maka ilu ahụ ọ na-akụ ọgwụ ndị a na-akụ.
Ndị ọrụ ahụike sị a ga-enye ụmụaka ọgwụ ọnụ ụtọ a n'ụzọ ga-adị ụmụaka bu ọrịa HIV mma n'ahụ, nke pụtara na agaghị agbarizi ọgwụ okenye iji nye nwata.
Nsogbu ọzọ bụ oke ọnụahịa ọgwụ HIV na-ada, na-agbanyeghi na ọtụtụ ọgwụ a apụtala ihe.
N'ọnwa ole na ole na-abịa, ụmụaka bi na Benin, Kenya, Malawi, Naịjirịa na Zimbabwe na-anata ọgwụ ọhụrụ a.
Kama ọ ga-abụ narị dọla ise kwa afọ, ọ ga-abụzi otu narị dọla na iri abụọ.
Boko Haram ekwuola na ọ bụ gburu ndị ọrụ ugbo na Borno Steetị
Ebe foto si, Getty Images
Boko Haram ewepụtala ihe onyonyo ọhụrụ bụ ebe ha sị na aka ha dị n'ogbugbu ndị ọrụ ugbo osikapa karịrị iri anọ n'obobo Zabarmari nke Borno Steetị.
Otu a sị na ha gburu ndị ọrụ ugbo a maka na ha nwuchiri ndị otu ha ma nyefee ha n'aka ndịagha na mpaghara ahụ.
Mgbe e mechara ogbugbu ahụ, kepukepu pụtara na ọ bụ ndị Boko Haram kpara arụ a.
Nke a ejughi anya maka na ọ bụ ndị Boko Haram na-akpakaarị ụdị agwa a ọkachasị na mpaghara ahụ.
N'ụbọchị Satode ka ndị omekome wakporo ọrụ ugbo dị n'obodo Koshebe dị na mpaghara Zabarmari nke okpuruọchịchị Mafa ma gbuo mmadụ karịrị iri anọ.
Ọtụtụ n'ime ha bụ ndị ebepuru isi.
Ndị obodo ahụ gwara BBC na ndị a wakporo ndị ọrụ ugbo.
Forbes enyela Okonjo-Iweala nturu ugo onye kachasị n'Afrịka
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Okonjo-Iweala bụ nwa afọ Naịjirịa nke abụọ na-enweta nturuugo a n'ime afọ atọ e ji malite ya.
Onye nke mbụ bụ Akinwumi Adesina, bụbu mịnịsta na-ahụ maka nkọpụta nri na Naịjirịa.
Adesina bụzi onyeisi ụlọakụ 'African Development Bank' ugbua.
Onye ọzọkwa ritegoro ntuuruugo a bụ Paul Kagame, onyeisiala mba Rwanda, n'afọ 2018.
Ebe foto si, CNBC Africa
Nkọwa foto, Ngozi Okonjo Iweala
Ngozi Okonjo-Iweala ji ọtụtụ ọkwa na mba ụwa.
O so na ndị isioche otu Gavi, bụ ndị na-achịkọta nkesa ọgwụ mgbochi ọrịa n'ụwa.
Ọ nọkwa n'isi oche ụlọọrụ Twitter.
Okonjo-Iweala na-azọkwa ọkwa onyeisioche otu 'World Trade Organisation'.
Ndị omeiwu nta ekpebiela ịkpọ Onyeisiala Buhari oku maka nchekwa
Ebe foto si, Presidency/Twitter
Ndị omeiwu nta nke Naịjirịa ekpebiela na onyeisiala Muhammadu Buhari ga-awuchi n'ihu ha ịbịa kọwaara ha maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.
Ha mere mkpebi a n'ọgbakọ ha mere n'ụbọchị Tusde mgbe ndị otu ha na-anọchiteanya Borno Steeti butere okwu maka ndị ọrụ ugbo karịrị iri anọ Boko Haram gburu na Satọde.
Oku a ha kpọrọ butere esemokwu n'etiti ha mgbe onyeisi ha bụ Femi Gbajabiamila sị ka ọ dịghị mma ịkpọ onyeisiala ka ọ bịa n'etiti ha kọwaa ọnọdụ nchekwa. Ọ sị na ọ baghị uru.
Ụfọdụ n'ime ha jụrụ n'ihe onyeisi ha kwuru nke mere nrụrịtaụka ji dapụta, nke mere ndịisi ha ji banye mkparịtaụka imeụlọ iji mezie okwu a.
Mgbe ha kpachara nkata ime ụlọ a, otu onye omeiwu bụ Jaha ndị kwadoro ka ha kpọọ onyeisiala gara n'ihu sị ka onyeisiala wuchie n'ihu ha.
Ndị omeiwu gbakọtara aka ọnụ kwee ka a kpọọ onyeisiala Buhari ka ọ bịa n'ihu kọwaa maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.
Mana ha ekwubeghi kpọmkwem ụbọchị ọ bịa n'ihu ịza oku a.
Igbo ndị ọma anyị na-eke unu
Unu emeela n'isonyere anyị taa dịka anyị na-ewetere unu akụkọ banyere ndị Igbo, Naịjirịa na mbaụwa niile.
CAN arịọla udo n'okwu dị n'etiti Umahi, Egwu na Anyim
Ebe foto si, Enyinna Omoke
Ebe foto si, Enyinna Omoke
Otu jịkọrọ ndị ụka Kraisti bụ CAN n'ịchafụ, ngalaba nke Ebonyi steeti arịọla Gọvanọ steeti ahụ bụ Dave umahi ka ọ minye mma ya n'ọbọ n'esemokwu dabụtara n'etiti ya na ụfọdụ ụmụafọ steeti ahụ ka e were kpee udo.
Ọ bụ onye nnyemaka gọvanọ n'ihe gbasara okpukperechi bụ Rev Fr Abraham Nwali bụ onye du ndị ndụ CAN na steeti ahụ gaa ya bụ ije n'obi gọọmenti dị na Abakaliki ụbọchị Tuzde ebe ha nọrọ kpọọ ya bụ oku.
Ha kporo oku kee e kpee udo n'ihi na dịka ha siri kwuo, ebe tigbuo-zọgbuo dị, ọganihu anaghị adị ya.
Ebe foto si, Enyinna Omoke
Cheta na nsonso a, Umahi na ndị nwere agba n'Ebonyi steeti gụnyere Anyịm Pius Anyịm, Sam Egwu na Ali Odeifa bụ Osote Onyeisioche PDP na steeti ahụ malitere inwe nghọtahie dịka gọvanọ hapụchara otu PDP banye n'otu APC.
Nkeji Coronavirus
Mmadụ 145 ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa
Ebe foto si, NCDC Twitter
Mmadụ otu narị na iri anọ na ise ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa.
Ọ bụ ngalaba NCDC depụtara nkea n'akara Twitter ha were sị na ọ bụ Legọs steeti kachasị dịka mmadụ iri anọ na itolu n''ime ha butere ya bụ ọrịa.
E nweghị onye ọzọ nwụrụ n'aka ya bụ ọrịa ebe mmadụ narị abụọ na iri abụọ na asaa ọzọ esila na ya bụ ọrịa gbakee.
'Onye ọbụla zeere 'Christmas carol' nke afọ a maka coronavirus'
Ebe foto si, NCDC/Twitter
Ngalaba e hiwere maka mgbochi mfesa ọrịa Coronavirus na Naíjiría enyela ndụmọdụ di mkpa maka covid-19 na emume ekeresimesi.
Ndụmodụ a gụnyere ndị na-aga emume egwu ekeresimesi nke bụ 'Carol' n'okwu bekee, ha kwuru ka ndị na-aga ya kpachapụ anya.
Onyeisi ụlọorụ 'National Centre for Disease Control' bụ Chikwe Ihekweazu kwuru nke a n'ụbọchị Mọnde.
O kwuru na emume carol bụ otu ụzọ ya bụ ọrịa nwereike iji gbasaa karịa etu ọ di ugbua.
Boss Mustapha, ode akwụkwọ gọọmentị etiti nakwa onye na-achikọta otu na-egbochi coronavirus na Naijirịa tinyekwara ọnụ na ya bụ okwu.
Mustapha kwuru na ha na-eme nche ma nchekwa iji hụ na ọrịa agbasaghị.
O kwukwara sị ka ndị mmadụ hara ime njem ma ọ bụrụ na ọdịghị mkpa.
O kwukwara na ha na-agba mbọ iji hụ na ọgwụ mgbochi rutere Naịjirịa aka.
Mustapha gwara ndị Naijirịa nọ ofesi ka ha hapụ ịlọta n'ihi na ụfọdụ atụmatụ gọọmentị hiwere nwereike mee ka ha nọkarịa etu ha siri tụọ anya.
Joe Biden bụ onye ahọpụtara dịka onyeisiala mba Amerịka ahọpụtala nwaafọ Naijirịa bụ Adewale Adeyemo dịka osote onye ode akwụkwọ na-echekwa akụ bụ Deputy Treasury Secretary n'okwu bekee nke mba Amerịka.
Ọ ga-abụ osote onyeisi ode akwụkwọ maka akụ mba ahụ bụ Janet Yellen.
Adewale bụ onye amụrụ na Naijirịa ma zụọ na obodo Kalịfonịa gụrụ akwụkwọ dịka onye okaiwu na Mahadum iwu nke Yale.
Adewale rụkwara ọrụ dịka onyeisi mbụ nke Obama Foundation.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Unu asaala chi!
Anyị bu n'obi na ị rahụrụ nke ọma. Soro anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị taa
E gbuola mmadu abụọ n'Ebonyi n'ime esemokwu 'ndọrọndọrọ ọchịchị na otu nzuzo'
Ebe foto si, Nwablack Tallest
Nkọwa foto, A na-akọwa na Shedrak Chinedu Nwode na-akwado ịlụ nwaanyị tupu ọnwu ezute ha n'ike
Onye oji egbe gburu otu nwoke aha ya bụ Shedrak Chinedu Nwode bụ onye Umuezoka na otu nwaanyị a sị bụ enyi ya nwaanyị n'obodo Oriuzo dị n'okpuru ọchịchị Ezza Nọt nke Ebonyi steeti.
Ihe a mere n'ụbọchị ụka dịka okwu ndọrọndọrọ ọchịchị nan'otu nzuzo butere esemokwu.
Otu onye hụrụ oge ihe a mere gwara onye ntaakụkọ BBC na ọ bụ ha ma aha ya ka a na-eche na ọ bụ ya gbara egbe gburu Maazị Nwode na enyi ya nwaanyị.
Onye a nọ n'oge ihe a mere sị na nsogbu malitere oge Nwode Oriuzo ruru ebe otu Kancilọ si Ezza Nọt na-eme emume "thanksgiving" ndị mmadụ were na-eti "APC, APC" nke pụtara (All Progressive Congress).
Ọ sị: "Nwode sị na ya abụghị onye APC kama ya bụ onye PDP (Peoples Democratic Party), nke mere otu onye jiri si ya kwụsị ikwu etu ahụ."
Onye hụru ihe mere sị: "Nwode jụrụ ihe mere ya agaghị ekwu okwu e were malite ịgwọ ọnụ tupu Onyeisi okpuru ọchịchị Ezza pụtara ka ya na onye nwụrụ kpaa nkata ma mechaa see foto."
Ọ sị: "Ka nkeji iri gachara, nwode na enyi ya nwaanyị pụrụ. Dị ka ha na-apụ a nọchịrị ha ụzọ nwere gba ya egbe n'isi. Ọ bụ mgbọ egbe ahụ tụrụ enyi ya nwaanyị were gbukwaa ya."
Onye ọzọ ma maka ihe gwara BBC na ọ bụ esemokwu dị n'etiti ndị otu nzozu a kpọrọ Baggers na Aye butere ihe a.
Onye an-akọwa na Nwode na-akwado ịlụ nwaanyị tupu ihe a eme.
Onye ntaakụkọ BBC gbara mbọ ịnụta n'ọnụ ndi uweojii n'Ebonyi maka okwu a mana Ọnụ na-ekwuru ha na steeti ahụ bụ Loveth Odah sị na ya enwetebeghi ozi banyere ya bụ okwu.
Agbanyeghị nke a, kepu kepu BBC na-anụ bụ na anwụchiela otu onye maka ogbugbu Maazị Nwode.
Ndị
agha Naịjirịa enyebeghi ikike ọrụ ugbo ma kwuo na Boko Haram anọghị na mpaghara ndị omekome wakporo ma gbuo ndị ọrụ
ugbo karịrị iri anọ na atọ.
Garba Shehu
bụ ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garba Shehu gwara BBC na ụfọdụ mpahara ugwu
Naịjirịa ka nọ n’aka Boko Haram.
Ọ sị na na ndị nwụru ka nwere ike rịa karịa mmadụ ole ama maka ya ugbua.
Ọ bụ ụbọchị Sọnde ka elili ndị a nwụrụ.
Garba Shehu sị: "Ihe a mere na-agbawa gọọmentị obi ... akụkọ ihe a mere ga-agbanwe dịka a na-achọpụta maka ya."
Ọ sị na a na-achọ ndị kpara ike a ugbua. Ọ sịkwa na a na-eche na ndị a bụ omekome ofufe alakụba.
He said there was an operation underway to pursue the attackers, suspected to be militant Islamists.
Etu ndị ekperima si bata gbuo ndị be anyị - Onye hụrụ ihe merenụ
Ebe foto si, Borno state government
Nkọwa foto, Gọvanọ Borno Steeti bụ Babagana Zulum, gara olili mmadụ iri anọ na atọ ahụ ndị omekome gburu
Okwu a kpụ n'ọnụ n'ụbọchị Sọnde bụ ogbugbu ndị ọrụ ubi karịrị mmadụ iri anọ na atọ na Borno Steeti.
Otu onye aha ya bụ Usman Ismail, onye hụrụ etu ya bụ ihe si mee, kọọrọ ndị ntaakụkọ ihe merenụ.
Ismail kwuru na ndị Boko Haram na-abata n'obodo ha kwa mgbe kwa mgbe na-amanye ndị mmadụ amanye inyere ha aka.
O kwuru sị: "Ọtụtụ oge ka ha na-abịa amanye anyị ka anyị buru ibu ha si n'ebe a baa n'ime ọhịa ebe ha bi."
"Onweghi ihe anyị ga-emenwu n'ihi na ha bucha egbe, mana ha na-ekwu na onwghị ihe ọbụla ha ga-eme anyị."
"Ọtụtụ oge, anyị na-arahụ n'ubi anyị n'ime ọhịa n'ihi na onweghị ihe ha na-eme anyị. Ọ bụladị n'abalị ụnyaahụ (Satọde), anyị rahụkwara n'ubi anyị."
Ebe foto si, Youtube screengrab/Channels TV
Nkọwa foto, Ojisi ike ka Usman Ismail na ụfọdụ ndị ọzọ ji gbalahụ ọnwụ
"Oge anyị hụrụ ha ka ha na-akpọkọ ndị mmadụ, anyị chekwa na ọ bụ ka anyị nyere ha aka etu anyị si emebu na mbụ."
"Ha malitere ịkpọrọ ụfọdụ baa n'ime ọhịa mana ndị ahụ agaghị eso ha apụta. Ha akpọrọkwa ndị ọzọ baa n'ọhịa, ndị ahụ agaghị eso ha pụta."
"Oge ahụ ka ụfọdụ n'ime anyị ji malite ịtụ egwu wee chọwa ụzọ ịmịpụ ma gbaghachi azụ n'obodo."
Oge ndị ntaakụkọ jụrụ Ismail ihe kpatara na ha akpọghị ndịagha oge ha hụrụ ndị ekperima ahụ, o kwuru sị:
"Anyị anaghị eji ekwentị anyị aga ọrụ n'ihi na ha ga-anara gị ya. Ọ bụrụ na ha nara gị ekwentị gị, gịnị ka ị ga-eme?"
Ebe foto si, Gọọmentị Borno steeti
Nkọwa foto, Gọvanọ Babagana Zulum
Ismail kwuru na mwakpo ahụ malitere n'elekere asaa nke ụtụtụ, mana ọ bụ n'elekere iri na otu ka ha nwetara ohere ịmịpụ ma gbaa ọsọ. Tupu ha erute n'obodo ha, ọ kụọla elekere atọ nke ehihie.
Ọ gara n'ihu kwuo na osikapa ha kọrọ mere nnọọ nke ọma n'afọ a, mana ha amaghịzi etu ha ga-esi gaghachi n'ubi ha bute ya.
Gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum kwuru na ha ga elebagharị anya n'usoro ha ji ebuso ndị ekperima Boko Haram agha.
Mmadụ 82 ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa
Ebe foto si, NCDC Twitter
Ngalaba NCDC edepụtala na mmadụ iri asatọ na abụọ ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa.
Legọs kacha dịka mmadụ iri anọ na asatọ butere ya na steeti ahụ ebe mmadụ asatọ si Rivers state.
Ọnụ ọgụgụ ha gosiri na mmadụ abụọ ọzo anwụọla ebe mmadụ narị abụọ na iri atọ na isii agbakeela n'aka ya bụ ọrịa.
Onye tiri ndị ọrụ mmenyụ ọkụ Legọs steeti isi aba okpu?
Ebe foto si, The Lagos State Govt/Twitter
Akụkọ na-ekwu na ndị omekome tiri mmadụ atọ bụ ndị ọrụ mmenyu ọku nke Legọs steeti ihe ma mebie ụgbọala ha ji arụ ọrụ dịka ha gara ịmenyụ ọkụ n'ụbọchị Sụnde.
Onyeisi ha kwuru na ọ bụ ndị uweojii nke Alabo Police division zọpụtara ndịa.
Dịka ọ dị ugbu a, mmadụ ato a na-anata ọgwụgwọ n'Agege General Hospital ebe ebidola nyocha maka ihe butere ya bụ mkpamkpa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
'Ndị Naijirịa nde iri abụọ na ise ga-erite igwe ọkụ solar' - Gọọmentị Naijirịa
Ebe foto si, Science Photo Library
Gọọmentị Naijirịa ekwuola na mmadụ nde iri abụọ na ise ga-akwụ naira puku anọ kwa ọnwa n'ime afọ atọ iji nweta igwe ji ike anyanwụ emepụta ọkụ latrik n'ụlọ ha.
Ọ bụ onye ndụmọdụ osote onyeisiala maka mgbasa ozi bụ Laolu Akande kwuru nkea n'ụbọchị sụnde ma sị na gọọmentị ga-ebido itinye igwe ọkụ a n'izuụka na-abịa.
Atụmatụ a ha kpọrọ Solar Power Naija ga-ebido n'ọnwa Disemba nke afọ 2020.
'Restructuring' abụghị ihe kacha mkpa ugbua - Chibuike Amaechi
Ebe foto si, Youtube Screengrab/Channels TV
Nkọwa foto, Chibuike Amaechi
Mịnịsta njem bụ Rotimi Amaechi, ekwuola na ịhazigharị ọchịchị obodo Naịjirịa, nke a kpọrọ 'Restructuring' na Bekee, abụghị ya kacha mkpa ugbua.
Amaechi kwuru nke a na mkparịtaụka ya ndị Channels TV n'abalị Sọnde.
O kwuru na ihe kacha mkpa ugbua bụ iwulite ọnọdụ nchekwa site n'inye ndị mmadụ ọrụ nakwa ịkwụsị agụụ.
"Ihe ka onyeisiala Muhammadu Buhari mkpa ugbua bụ etu ọ ga-esi kwụsị ọnọdụ enweghị ezi nchekwa dị na Naịjirịa."
"Ihe na-akpata enweghị ezi nchekwa bụ maka na agụụ na-agụ ndị mmadụ n'ihi enweghị ọrụ."
"Ọ bụ nke a kacha mkpa ugbua, ọ bụghị 'restructuring."
Amaechi jụrụ ajụjụ ihe kpatara ndị mmadụ ji ekwu okwu nhazigharị ọchịchị naanị mgbe onye ugwu nọ n'ọchịchị.
O jụrụ sị: "Obasanjọ chịrị Naịjirịa afọ asatọ, Goodluck Jonathan chịrị Naịjirịa afọ isii, gịnị mere na ha ahazigharịghị ọchịchị Naịjirịa? Gịnị kpatara o ji abụkarị mgbe onye ugwu nọ n'ọchịchị ka a na-ekwu okwu 'restructuring'?"
Unu asaala chi!
Taa bụ ụbọchị ọma, soro anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị