Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ihe karịrị mmadụ narị atọ ka a hụrụ nje covid-19 n'ahụ ha n'ụbọchị Tọzde

    Ọnụọgụgụ coronavirus

    Ngalaba National Centrr for Disease Control kwuru na ọ bụ mmadụ narị atọ na iri anọ na atọ ka a chọpụtara nje coronavirus n'ahụ ha na Naịjirịa n'ụbọchị Tọzde.

    Nke a bụ ọnụọgụgụ kachasị kamgbe ọnwa Ọgọst, nke mere ka ha dọọ aka na ntị ka ndị mmadụ na-echekwasi onwe ha ike.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Gọọmentị etiti adọọla aka na ntị ugboro ugboro ka ndị mmadụ na-akpachapụ anya ka ọrịa coronavirus ghara ịmalitekwa ịrị elu ọzọ.

    Ha kwuru na ọnọdụ akụnụba Naịjirịa agaghị ebuli mmechi obodo ọzọ n'ihi ọrịa a.

  2. Mba Itali amachiela ndị mmadụ ime njem ekeresimesi n'ihi coronavirus

    Mba Itali

    Mba Itali ga-amachi ndị mmadụ ime njem ekeresimesi na mpaghara di iche iche nke mba ahụ malite n'ụbọchị 21 ọnwa Disemba maka coronavirus.

    A ga-etinyekwa ọnọdụ onye apụla n'ezi malite n'elekere iri nke abali ruo elekere ise nke ụtụtụ.

    Praịm minista ha bụ Guiseppe Conte gwara ndị ntaakụkọ na ha agaghị anọ na mmiri ncha abaa ha n'anya.

    Ụlọ ebe a na-ere nri ga na-emepe n'ụfọdụ ebe ruo elekere isii nke ehihie maka ndị na-azụrụ ala n'ụlọ ha.

    Ntuziaka ọhụrụ a na-abịa dịka mmadụ 993 nwụrụ n'ọrịa coronavirus bụ ọnụọgụgụ kachasị kwa ụbọchị.

    Joe Biden

    Joe Biden sị ndị Amerịka ga na-eyi mkpuchi ma ọ banye n'ọchịchị

    Onye a họpụtara dịka onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden ekwuola na ọ ga-asị ndị mba ahụ yiwe mkpuchi imi ruo ụbọchị otu narị ọ banyere n’ọchịchị.

    Biden mgbe ọ na-aza ajụjụ na CNN sị na o kwenyere na ọrịa a ga-agbatu ma ọ bụrụ ndị Amerịka yiwe ihe mkpuchi imi a.

    Ọ sị na ọ ga-enye iwu ka a na-enyi mkpuchi imi n'ụlọọrụ niile gọọmentị Amerịka nwe.

    Ugbua mba Amerịka enwetela mmadụ nde iri na anọ na ụma buterela coronavirus, mmadụ puku narị abụọ na puku iri asaa na puku isii anwụọla.

    Mana iwu mba Amerịka sị na onyeisiala ha enweghi ikike ịmagide ndị Amerịka iyi mkpuchi imi mana Biden sị ya na osote ya bụ Kamala Harris ga-eji onwe ha maa atụ site n'iyi mkpuchi imi.

  3. 'Ihe nwereike ime ka mba ofesi machie ndị Naịjirịa ịbata obodo ha'

    Ndị ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa

    Ndị Sịnetị adọọla aka na ntị na mba ndị ọzọ nwereike ịmachi ndị Naịjirịa ịbata n’obodo ha ma ọ bụrụ na gọọmentị agbaghị ndị mmadụ ọgwụ mgbochi coronavirus.

    Onyeisioche kọmitii ahụike bụ Ibrahim Oloriegbe sị na ọgwụ mgbochi ọrịa a nke kwere Naịjirịa na nkwa agaghị ezu.

    Cheta na otu a kpọrọ Global Alliance for Vaccine Initiative kwere nkwa inye Naịjirịa naanị pasenti iri abụọ n'ime ọgwụ mgbochi ọrịa coronavirus ha chọrọ.

    Mana Oloriegbe kwara arịrị sị na gọọmentị kwesịrị ịchọ ụzọ ọzọ ha ga-enwete, kesaa ma gbaa ndị Naịjirịa ọgwụ a ebe o zuruoke.

    Ọ sị na iji gbanarị mmachị n'ụwa niile, na Naịjirịa kwesịrị ịmawapụta ego banyere nke n'akwụkwọ mkpata na mmefu.

    Sịnetọ gakwara n'ihu sị na ndị mmadụ anaghizi idosa iwu na-achịkwa mgbochi mfesasị coronavirus nke gụnyere ịsa aka, ikpuchi imi nakwa ịnọsa anọsa.

  4. Igbo ndị ọma unu abọọla chi?

    Obi ọma ka anyị na-anabata unu n'ọgbakọ nke taa.

  5. Daalụ dịka ị nọnyere anyị taa

    Ka chi foo

  6. Gịnị na-eme n'ụlọọrụ ụgbọelu Arik Air?

    Kepukepu si n'ọdọụgbọelu apụta na-akọwa na ndị njem gbatara akwụkwọ ikike iji ụgbọelu Arik mee njem atọkịrịla ebe ahụ.

    Akụkọ kwuru na gawa agawa adịghị mma, lawa alawa adịghị mma n'ihi na ndị ụlọọrụ a gbara abụbụọrụ.

    Otu a kpọrọ National Union of Air Transport Employees, nọ na-egosi iwe ha n'ihi ihe ha kpọrọ mmegbu ndị ụlọọrụ Arik na-emegbu ha bụ ndị na-arụrụ ha ọrụ.

    Ha kwukwara na e ji ụfọdụ n'ime ha ụgwọ gụnyere ụgwọ ezumiike nka, ma gbaa ndị ọzọ arụkwaghịm.

    Ihe nkiri si n'ụlọntakụkọ HipTv gosiri ebe ụfọdụ ndị ọrụ a na-eme ya bụ ngagharịiwe.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Ụfọdụ ndị na-eme njem gara na soshal midia na-egosi iwe ha maka etu abụbụọrụ a si metụta ha na njem ha.

    Lee ụfọdụ ihe ha kwuru:

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

    Skip X post, 4
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 4

    Skip X post, 5
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 5

  7. Onye ntaakụkọ Naijiria eritela nzere 'Kurt Schork Awards'

    Fisayo Soyombo

    Otu onye ntakụkọ Naijiria bụ Fisayo Soyombo eritela nturuugo "Kurt Schork Awards' maka akụkọ nnyocha o mere maka nrụrụaka dị n' ikpe ikpe na Naijiria.

    Soyombo dere akụkọ gbara n'anwụ mpụ na aghụghọ dị na inweta ikpenkkwụmọtọ na Naijiria.

    Iji mee ya bụ akụkọ, Soyombo danyere n'aka ndị uweojii ebe ọ nọrọ abali ise ma nọkwaa na mkpọrọ Ikoyi abali asato ebe o mere nchọpụta etu nrụrụaka si eweghachi aka elekere azụ na inweta ikpemkwụmọtọ na Naijiria.

    Na ịnwụrị maka nrịte ahụ o nwetara Soyombo kwuru na akara Twitter ya na nke a bụ ya afọ isii ọ gbaliwara irite nzere ahụ ma bụụkwa nke ugboro ise o tinyere akwụkwọ maka nzere ahụ, ebe aha ya soro na ndị a kpọpụtara ugboro atọ tupu ya enweta nke afọ a.

  8. Nkeji Coronavirus

  9. A kpọlatala Maina na Naijiria

    A kpọlatala onye bụbu Onyeisioche ụlọọrụ na-ahụ maka ego ndị lara ezumike a kpọrọ bụ Abdulrasheed Maina na Naijiria.

    Ndị uweojii Nijie nwụchiburu Maina na mba ha maka inyefe ya n'aka ndị ogbo ha na Naijiria abali ole na ole gara aga.

    Dịka akụkọ siri kwuo, ụgbọelu bubatara Maina feturu n'ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja n'Elekere 2:30 nke ehihie.

    Cheta na e jichiburu Senetọ Ali Ndume bụ onye bụ onye akaebe Maina n'ihi na Maina gbara ọsọ mana e mechara tọhapụ ya.

    Abdulrasheed Maina
  10. 'Ndị otu oyi egwu nwereike ịnọ Naijirịa ruo afo iri abụọ' - Tukur Yusuf Buratai

    Tukur Yusuf Buratai

    Onyeisi ndị agha Naijirịa ekwuola na mkpamkpa ndị otu oyi egwu nwereike ịnọgide na Naijirịa ruo afọ iri abụọ.

    Ọ bụ na Facebook ka ọ depụtara nke a dịkka ndị omekome gburu mmadụ iri anọ na atọ ndị na-akọ osikapa na Borno steeti n'ụbọchị satụde.

    Mkpamkpa a mere ka ndị Gọvanọ ugwu kwuo ka a chụọ Buratai n'ọrụ ma kpọta ndi agha na abụghi ndi Naijirịa a na-akwụ ụgwọ ka ha lụso ndị oyiegwu a ọgụ.

    Mana Buratai na-ekwu na ndị mmadụ ahọtaghị ihe gbasara ndị otu oyi egwu.

    O kwuru sị " Ka mmadụ niile tịkọọ aka ọnụ maka enweghị nchekwa na Naijirịa. Ka ọ bụrụ ọrụ dịịrị mmadụ niile"

  11. Fransi na-eru uju ọnwụ Giscard d'Estaing

    Valéry Giscard d'Estaing
    Nkọwa foto, Valéry Giscard d'Estaing chịrị Fransi site n'afọ 1974 rue 1981

    Ndị Fransi nọ n'iru ujụ dịka aka chịbụrụ mba ahụ site n'afọ 1974 rue afọ 1981 bụ Valéry Giscard d'Estaing, lara mụọ ka ọ gbachara afọ 94.

    Ọ bụ ọrịa coronavirus gburu ya n'ụlọ ya na mba ahụ.

    A ma Giscard d'Estaing dịka onye gbapere ụzọ dịka o si metụta iwu maka ikposa alụmdinanwunye, iwepụ ime na ọgwụ mgbochi ịtụ ime n'afọ asaa ọ nọrọ n'ọchịchị.

    N'okwu ya, onyeisiala mba Fransi bụ Emmanuel Macron kwuru na ọchịchị Giscard d'Estaing gbanwere mba ahụ ma ka na-edu mba ahụ .

    "Ọ bụ odibo ala anyị, onye na-adọm ndọrọndọrọ ọganihu na nnwereonwe. Ọnwụ ya etinyela Fransi n'iru uju."

    Ndị Ezinaụlọ Giscard d'Estaing kwuru na akwamozu ya ka bụ 'kpomkpem maka naanị ndị imeụlọ ha.

  12. 'Onyeisiala a daala iwu ma ọ chụghị ndị isi ọrụ ya n'ọrụ' - Omeiwu Shekarau

    Shekarau

    Omeiwu Ibrahim Shekarau ekwuola na onyeisiala Naijirịa dara iwu obodo ma ọ bụrụ na ọ chụghị ndị isi ọrụ ya n'ọrụ.

    Shekarau kwuru nke a dịka ya na ndị ntaakụko Channels nwere mkparịta ụka taa bụ ụbọchi Tụzde.

    Ọ kọwara na iwu Naijirịa kwuru na onye ọrụ gọọmentị ruru afọ iri isii ekwesịla ịpụta n'ọrụ.

    Shekarau kọwara na onye rụgoro ọrụ afọ iri atọ na ise ekwesịla ịkwụsi ọrụ.

  13. 'O nweghi onye NYSC ọbụla bu coronavirus n'ogige ha n'Abia Steetị'

    Ndị ji otu afọ efe ala nna ha

    Gọọmentị Abia Steetị ekwuola na o nweghi onye ọbụla butere coronavirus n'ogige ndị ji oru afọ efe ala nna ha na steetị ahụ dịka akụkọ si kwuo n'ụbọchị ole na ole gara aga.

    Kọmishịona mgbasaozi bụ John Okiyi mere ka ndị ntaakụkọ mata nke a n'Umuahia ma kwuo na o bi gọọmentị Abia ụtọ etu ndị ọrụ NYSC si chekwaa ogige ọzụzụ ha dị n'Igbere.

    Okiyi sị na ndị NYSC nille nakwa ndị bịara ha nleta n'ogige ahụ gabigara nyocha ahụ maka coronavirus nakwa iwu na usoro niile na-echekwa ya.

    Ọ sị n'ime mmadụ isii e nyochara ahụ gosituru njirimara ọrịa coronavirus, na mmadụ ise bu ya n'ezi ya mana edopụla ha iche ebe anọ n'ime e nwerela onwe ha.

    John Okiyi

    Ọ sị na o nweghi mgbe mmadụ isii ọbụla bu ọrịa a ji banye n'ime ogige ndị ji otu afọ efe ala nna ha.

    Okiyi sị na ndị e nyochara ahụ dị otu puku na otu narị na iri na asatọ, mmadụ isii n'ime gosiri njirimara coronavirus ebe ise bu ya kpọmkwem.

    Ọ gara n'ihu kwuo na obi dị gọọmentị Abia Steetị ụtọ etu ndịisi NYSC si rụọ ọrụ iji chekwaa na ọrịa agbasaghị ebe niile.

    Onyeisi NYSC na ngalaba Abia Steetị bụ Bona Fashakin sị na o nweghi ọrịa coronavirus ọbụla nọ n'ogige ha.

  14. Atọhapụla ụkọchukwu ndị ntọ tọọrọ n'Abuja

    Ụkọchukwu Mathew Dajo
    Nkọwa foto, Ụkọchukwu Mathew Dajo

    Ụkọchukwu ụka Katọlik dị n'Abuja aha ya bụ Mathew Dajo, enwerela onwe ya n'aka ndị ntọ.

    Ndị ntọ wakporo ụlọụka ... n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Nọvemba ma tọrọ ụkọchukwu ahụ.

    Mana ọ bụ n'abalị ụbọchị Wenezde, abalị abụọ nke ọnwa Disemba ka a tọhapụrụ ya.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ka ọ dị ugbua, o dochabeghị anya etu e si tọhapụ ụkọchukwu a, amabeghị ma a kwụrụ ndị ntọrị ahụ ụgwọ tupu ha atọhapụ ya.

    Mana iwu ndị ụka Katọlik na Naịjirịa machibidoro ịkwụ ụgwọ ma a tọrọ onye ụkọchukwu ha.

    Otu 'Catholic Bishops Conference of Nigeria' kọwara na iwu a bụ iji gbochie ntọrọ ndị ụkọchukwu ha, maka na ha kwụọ ụgwọ iji gbapụta otu onye ụkọchukwu, ndị ntọ ga-amalite ịtọrọ ha kwa mgbe kwa mgbe.

  15. Ndị okenye mpaghara ugwu asịla Onyeisiala Buhari rituo n'ọkwa

    Onyeisiala Muhammadu Buhari

    Ndị okenye ọnụ na-eru n'okwu na mpaghara ugwu nke Naịjirịa akpọọla oku ka Onyeisiala Muhammadu Buhari rituo n'ọkwa ya maka na o nweghi ike ichekwa ndị Naịjirịa.

    Ha kwuru nke a n'ụbọchị Wenesde n'ozi odeakwụkwọ ha bụ Hakeem Baba-Ahmed wepụtara.

    Otu a kpọrọ oku a dịka ndị otu Boko Haram wakporo obodo Zabarmari dị na Borno Steetị ma gbuo ndị ọrụ ugbo osikapa karịrị iri anọ.

    E liri ndị a n'ụbọchị Sọnde dịka ndị obdod na-ekwu na ha ka na-achọ ọtụtụ ndị achọ.

    N'otu aka ahụ Sultan nke Sokoto bụ Sa'ad Abubakar bụ onye ndu Jama'atu Nasri Islam agwala gọọmentị etiti ka ha kwụsị ịgba egbe ọnụ n'okwu nchekwa na Naịjirịa.

    Ha kwuru na dịka ọ dị ugbua na Naịjirịa na o nweghizi ebe nchekwa dị.

  16. Ụlọikpe achụpụla Pondei, Joy Nunieh na ndị ọzọ dịka ndị isi NDDC

    Kemebradikumo Pondei

    Ụlọikpe Ukwu dị n'Abụja achụtuola Kemebradikumo Pondei,Joy Nunieh, Cairo Ojougboh na ndị ọzọ n'oche ụlọọrụ Niger Delta Development Commission, (NDDC).

    Dịka ụlọntakụkọ Daily Trust si kwuo, ọ bụ Jọstis Ahmed Mohammed bụ onye kpere ikpe ahụ nke otu otu na-abụghị nke gọọmenti a kpọrọ 'Forum for Accountability and Good Governance', wetara nyere iwu ka a kwụsị ịkpọ onwe ha ndị ndu NDDC.

    Cheta kpọrọkpọtọ gbara n'ihu ehi dịka a na-eme nnyocha ihe mere n'ụlọọrụ NDCC na nsonso a.

    Joy Nunieh
  17. 'Ka Buhari chụọ ndị ọrụ ime obi gọọmentị ya' - Rochas Okorocha

    Rochas Okorocha

    Ụlọ ntaakụkọ The Nation edepụtala na onye chịbụrụ dịka gọvanọ Imo steti bụ Rochas Okorocha agwala onyeisiala ka ọ chụọ ndị ime obi gọọmentị ya n'ihi na ha dara n'ọrụ ha.

    Ha dere na ọ bụ mgbe ọ gara mgbaru na nke Gọvanọ Nasarawa steeti bụ Abdullahi Sule n'obi gọọmentị steeti ahụ maka ọnwụ onyeisioche steeti ahụ bụ Philip Shekwo ndị ojiegbe gbagburu.

    O kwuru sị "ka onyeisiala Muhammadu Buhari chụsịa ndị niile na-arụrụ ya ọrụ n'ihi na ha anaghị arụ ọrụ ha dịka etu ọ kwesịrị".

    Ha dere na Okorocha kwuru ka onyeisiala Buhari tinye ndị ma ọrụ n'ọrụ ma kọwaa na ọtụtụ mba na-agabiga ihe Naijirịa na-agabiga tupu ha etoo dịka mba.

  18. Nkeji Coronavirus

  19. Buhari ekwetala ịza ndị ụlọ Nnochiteanya oku ha kpọrọ ya

    Muhammadu Buhari

    Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekwetala na ya na ndị Ụlọomeiwu Nta ga-enwe mkparịtaụka . Dịka Onyeisi Ụlọomeiwu Nta bụ Femi Gbajabiamila si gbara ndị ntaakụkọ ama ụbọchị Wednezde,e kwekọrịtala ụbọchị ọ ga-abụ nke a ga-agba n'anwụ n'oge na-adịghị anya.

    Gbajabiamila kwuru na ọnọdụ nchekwa ala Naijiria dị Buhari mkpa nke ukwu nke mere ọ ga-eji gwa ụmụ Naijiria okwu site na ndị nnọchiteanya.

    Femi Gbajabiamila
  20. 'A na m ekpere Naijirịa ekpere' - Pope Francis

    Pope Francis

    Onyeisi ụka katọlịk bụ Pope Francis etiela ndị Naijirịa aka n'obi maka ogbugbu ndị Boko Haram gburu ndị ọrụ ubi na Borno steeti. O kwuru sị " Ka Chukwu nabata mkpụrụ obi ha na ndukwa, kasie ezinụlo ha obi ma metụ ndị na-eme ihe dị etua na-emegide aha ya aka n'obi".

    Ọ bụ n'akara TWitter ya ka o kwuru nkea, magwakwa ndị Naijirịa na ọ na-ekpere ha ekpere.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post