Ihe karịrị mmadụ narị atọ ka a hụrụ nje covid-19 n'ahụ ha n'ụbọchị Tọzde

Ebe foto si, NCDC
Ngalaba National Centrr for Disease Control kwuru na ọ bụ mmadụ narị atọ na iri anọ na atọ ka a chọpụtara nje coronavirus n'ahụ ha na Naịjirịa n'ụbọchị Tọzde.
Nke a bụ ọnụọgụgụ kachasị kamgbe ọnwa Ọgọst, nke mere ka ha dọọ aka na ntị ka ndị mmadụ na-echekwasi onwe ha ike.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Gọọmentị etiti adọọla aka na ntị ugboro ugboro ka ndị mmadụ na-akpachapụ anya ka ọrịa coronavirus ghara ịmalitekwa ịrị elu ọzọ.
Ha kwuru na ọnọdụ akụnụba Naịjirịa agaghị ebuli mmechi obodo ọzọ n'ihi ọrịa a.


















