Ị bọọla chi?
Udo dịrị gị.
Nọnyere anyị taa dịka anyị na-ewetara gị akụkọ ndị ga-amasị gị ịkọ taa.
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Udo dịrị gị.
Nọnyere anyị taa dịka anyị na-ewetara gị akụkọ ndị ga-amasị gị ịkọ taa.

Ebe foto si, Press Association
Asọmpi Premier League dị n'etiti Manchester United na West Ham United ebiela na 3 - 1 dịka Manchester United gbajiri West Ham aka na be ha n'abalị Satọde a.
Ya bụ okwu bidoro dịka West Ham ji goolu nke mbụ kwaara Manchester United ọbịa na be ha.
Mana ya bụ ọji atụghị Man. Utd ọnụ nke mere iwe jiri wee ha ka alọtachara ezumike, ha were kwopụta ka agụowuru were mee West Ham "many things" agbanyeghị na ha nọ be ha.
Pogba, Greenwood na Rashford zara aha ha n'aka nke ndị Man.Utd. iji gosi na onye a na-ekwu nwere ihe ọ na-eme, ebe Soucek gbaara isi onwe ya n'aka nke ndị West Ham.

Mmiri eriela ndị uweojii mmadụ atọ gara ọrụ nchekwa na ntuliaka mmeju e mere na Bayelsa steeti taa.
Ndị uweojii ahụ nọ n'ụgbọmmiri na-aga okpuruọchịchị ọdịda anyanwụ dị na Bayelsa Sentral District mgbe ụgbọ ha kpuru n'oke osimiri.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Bayelsa bụ Asinim Butswat bụ onye kwuru nke a.
A matabeghị ndị ndị uweoji ahụ dọ n'ozu bụ ka ọ dị ugbua.

Ebe foto si, Getty Images
N'Afrịka, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump enyela iwu ka ndị agha Amerịka nọ na Somalia kwara ngwongwo ha lata tupu ụbọchị iri na ise nke ọnwa Jenụwarị.
Ndị agha Amerịka nọ na mba ahụ enyere ndị agha ha aka ebuso ndị ọmekatara ihe pụọ ụjọ agha dị narị asaa (700).
Amerịka sị n'ụfọdụ n'ime ha ga-agafe mba agbata obi ha ndị ọzọ maka ịnye aka chekwaa okeala ha.
Cheta na nsonso a, na otu ahụ ka Trump sikwa kpọchite ndị agha Amerịka na-enyeaka na mba ndị ọzọ dịka Iraq na Afganistan.
Ọ bụghị taa ka Trump malitere ịkpọ oku ka ndị agha Amerịka nọ na mba ofesi lọta maka oke ego ha na-akwụfụ n'isi ihe ọ kpọrọ agha na-enweghị isi.
Iwu a onyere bụ nchigharị n'ihe ọchịagha ya nke puru n'ọnwa agara aga bụ Mark Esper nyeburu, ka ndị agha ahụ nọtụkwuo na Somalia.

Ebe foto si, Getty Images
Ezeobodo ndị Zabarmari na Brono steeti bụ Zanna Bukar ekwuola hoohaa na ọnweghị ụmụnwaanyị maọbụ ụmụagbọghọ ndị ọmekatara ihe pụọ ụjọọ bịara kpamkpa n'obodo ha izuụka gara aga jidere.
Ya bụ Ezeobodo mere ka o doo anya na ọ bụ ụmụokorobịa ndị ọrụ ngọ gara ọrụ ebe ahụ ka ha gburu.
N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ Punch, ụbọchị Fraịde, Bukar kwuru sị, "mbanụ, onweghị otu mkpuru nwaagbọghọ maọbụ nwaanyị na be anyị ha meturu aka. Ndị ya bụ ihe metutere bụ naanị ụmụ ntorobịa dị n'agbata afọ iri na atọ ruo iri atọ. Ụfọdụ n'ime ha nụrụ nwaanyị ọhụru, ebe ụfọdụ ka bụ ụmụakwụkwọ bụ ndị nọ n'ugbo ha kemgbe". Ụfọdụ n'ime ha bụkwa ndị ọrụ ngo bụ ndị na-akpata ihe ha na ezinụlọ ha ga-eri".
"Anyị nụru asịrị na-efegharị na ndị ajọọ mmadụ ahụ kpokooro ụmụnwaanyị, nke ahụ abụghị eziokwu", Bukar gwara ndị ntaakụkọ.

Ntuliaka ebirila ọkụ na mpaghara dị iche iche na Legọs steeti dịka ndị mmadụ pụtara isonye na ya bụ ntuliaka mmeju.
Na mpaghara Legọs gụnyere Shomolu, Ibeju/Lekki, Kosofe, ndị mmadụ pụtara ịtụ vootu ha.

Ma ndị bịara ịtụ vootu ma ndị na-ahazi ya bụ atụmvootu jikere ọfụma igbochi mfesa ọrịa ozuruụwaọnụ covid-19.
Foto setere ebe ụfọdụ n'ime ha yi mkpuchi imi ma nọsapụkwa anọsapụ.
Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjiria bụ Inec n'ịchafụ gosiri etu ntuliaka si aga na Shomolu:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ka o si aga na mpaghara Ibeju/Lekki:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
N'Imo steeti nakwa Enugwu steeti, ntuliaka na-agakwa dịka e si tụ anya.
Lee etu o si aga n'Eha-Amufu dị n'Enugwu steeti
A malitela ịtụ vootu na mpaghara Eha Amufu dị n’Isi Uzo n’Enugwu steeti, dịka a na-eme ntuliaka mmeju ebe ahụ.
Mara na otu ndọrọndọrọ ọchịchị itoolu gụnyere APC na PDP so na ndị na-azọ ọkwa na ntuliaka Isi-Uzo State Constituency Bye-Election.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
N'Imo steeti:
Ndị na-ahazi ntuliaka yicha mkpuchi imi dịka ha na-ahazi ihe e ji eme ntuliaka n'Isiala Mbano.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

Ebe foto si, Getty Images
Joe Biden bụ onye a họpụtara dịka onyeisiala mba Amerịka ekwuola na a gaghị amanye ndị mba ya ịnara ọgwụ mgbochi Coronavirus mgbe a ga-amalite ikesa ya.
Nke a na-abịa dịka ngalaba CDC n’ịchafụ bụ nke na-ahụ maka mgbochi mfesa ọrịa na mba ahụ na-arịọ ndị mmadụ ka ha gbaa mbọ na-eyi mkpuchi imi maka etu ọrịa a si efesa na mba ahụ.

Ebe foto si, AFP
Kepukepu na-akọwa na ndị PSG na-atụharị uche ịma ma ha a ga-azụtanwu onye egwu Lionel Messi n’afọ na-abịa.
Nke a na-abịa dịka Neymar ya na ya gbakọrọ bọọlụ na Barcelona gwara ndị isi PSG na ọ ga-amasị ya ma ọ bụrụ na Messi bịa sonye ya ọzọ.
Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjiria bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ewepụtakwuola ọnụọgụgụ mmadụ 324 bụ ndị butere covid-19 ọhụrụ na Naịjiria.
Nke a gụnyere mmadụ 115 butere ya na Legọs na 110 na mpaghara Abuja.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ngalaba na-ahụ maka ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) ekwuola na ọrịa ịba ọcha n'anya egbuola ihe karịrị mmadụ 172 na Naịjiria kemgbe o selitere isi ọzọ n’ọnwa Nọvemba 2020.
Ha kwuru na nke a ewetakwuola ọgbatauhie dịka Naịjiria ka na-ebuso Covid-19 na ọrịa ndị ọzọ agha nakwa nsogbu gbatagbata dị na mpaghara Ugwu Naịjiria.
Tarik Jasarevic bụ ọnụ na-ekwuchitere ngalaba WHO ọnụ gwara ndị ntaakụkọ na Geneva, na Naịjiria na-ebuso mwakapụta ọrịa a agha kemgbe 2017.
O kwuru na a e nyochaaala mmadụ 530 nwereike ibu ya, ebe 48 n'ime ha ebutela ya bụ ọrịa na Delta, Enugwu, Bauchi, Benue na Ebonyi steeti kemgbe ahụ.
"Mmadụ 172 anwụọla n'ime mmadụ mmadụ 530 ahụ a na-enyo na ha bu ya." ka Jasarevic kwuru.
Pasentị ndị a gbarala ọgwụ mgbochi maka ọrịa a n'Afrịka ka pere mpe, n'agbanyeghi na ọgwụ mgbochi ya na-arụ ọrụ ya ọfụma ma dị mfe inweta.
E nweghi ọgwụ e ji agwọ ya bụ ọrịa ịba ọcha n'anya bụ nke anwụnta na-ebute.
Dịka a ga-eme ntuliaka ịhọpụta onye ga-anọchite anya ndị Imo Nọt n'ụlọomeiwu ukwu taa, ụlọọrụ na-ahụ maka nhazi ntuliaka na Naịjiria bụ Independent National Electoral Commission (Inec) ewepụtala aha ikpeazụ bụ ndị ga-eso zọọ ya bụ oche.
Inec wepụtara aha mmadụ 14 dịka ndị ga-eme ya bụ ntuliaka, mana anya niile na-ele ihe ga-eme dịka ụlọikpe abụọ dị iche iche kpọpụtara mmadụ abụọ bụ Ifeanyi Araraume na Frank Ibezim dịka ndị ga-efe ọkọlọtọ pati APC (All Progressives Congress).
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
I meela nke ọma wee sonye anyị n'ụtụtụ a.
Ka ụbọchị taa maara gị mma.
Isee!
Rahụ nụ duu

Ebe foto si, Arik Air Instagram
Ndị ụlọọrụ Arịk Air edepụtala akwụkwọ ozi na ha achụọla ndị ọrụ ha mmadụ narị atọ n'ọrụ dịka ihe isiike dakwasịrị ha maka mmachi ngagharị sitere n'ọrịa coronavirus.
Ọ bụ n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Adebanji Ola depụtara n'ụbọchị Frịde ka ha kwuru nke a ma kọwaa na ọ ibu iruzi ụgbọelu ha, akpataghị ego na ịkwụ ndị ọrụ ha ụgwọ butere ya.
Ha kwukwara na ha akpọọla ndị isi otu ọrụ ha nzụkọ ka ha kwekọrịta maka ego ha ga-akwụ ndị a na-anọghịzị n'ọrụ.
Akwụkwọ ozi ha kwuru na ndị ọrụ ha passenti iri ise n'ime mmadụ otu puku na narị isii anatabeghị ụgwọ ọnwa kamgbe ọnwa isii.
Mata kwa na ndị ụlọọrụ Arik Air gbara abụbọ ọrụ were mechie ụlọọrụ ha n'ụbọchị Tụzde nke ha sị na iwe ha bụ akwụghị ha ụgwọ ọnwa na ọnọdụ ọjọọ ha nọ na ya were na arụ ọrụ ha.
N'otu aka ahụ ka Adebanji depụtara akwụkwọ ozi ọzo were gwa ohaneze na ha ebidola ọrụ ọzọ dịka ndị ọrụ mechiri ụlọọrụ ha n'ụbọchị Tụzde.
Ha kwuru na ha na otu National Association of Air Transport Employees enweela nghọta ma gwa ndị mmadụ na-eme njem abụbọ ọrụ a metụtara ka iwe ha hara ịdị ọkụ.
Ma sị na ndị na-emeghị njem maka ya bụ abụbọ ọrụ nwereike ịgbanwe tiketị ha were ya mee njem oge ọzọ.
Generalụ Dọmkat Bali bụ Mịnịsta Onyeisiala Muhammadu Buhari oge ọchịchị ya dịka onyeagha(1984 -1985), anwụọla.
Bali, onye Langtang dị na Plateau steeti, nwụrụ taa bụ Fraide ka ọ gbachara afọ 80.
Bali bụkwa Mịnịsta nchekwa n'ọge ọchchị Ịbrahim Babangida.
Tupu o tinye akwụkwọ arụkwaghịm dịka onye agha n'afọ 1990Ọ jiri ọtụtụ nnukwu ọkwa n'amịị gụnyere GOC nke First Infantry Division, Kaduna," Commandant" kọleji ndị agha "Nigerian Armed Forces Command and Staff College" malite n'afọ 1981 rue 1983.
Onyeisiala Muhammadu Buhari etiela ezinaụlọ Bali na steeti ya aka n'obi maka ọnwụ ya.
N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu binyere aka, Buhari kwuru na ike Bali kpara ndịka onye agha nakwa ịhụnanya o nwere na ANaijiria ga na-aga n'ihu ịkpalite ndị agha ndị ka na-etolite etolite.
N'ozi iti aka n'obi nke Atiku Abubakar zigara ezinaụlọ ya na Twitter, o kwuru na nnukwu onye agha kajara akaja furu Naijiria ma kpee ekpere ka mkpụrụobi ya zuru ike na ndokwa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, Ifeanyi Araraume/Facebook
Ụlọikpe Mkpegharị dị n’Owere nọrọ n’ehihie Fraide kụpụ aha Senetọ Ifeanyị Araraume dịka onye ga-efe ọkọlọtọ APC na ntuliaka mmeju a ga-eme ụbọchị Satọde maka ọkwa onye ga-anọchite Imo-North(Okigwe Zone) n' Ụlọomeiwu Ukwu.
Jọstis Uchechukwu Onyemenamma bụ ọkaikpe kpere ya bụ ikpe kpọpụtara aha Frank Ibezim dịka onye a ga-eji dochie Araraume.
Nke a na-eme dịka Ụlọikpe Ukwu dị n’Abuja kagburu aha Frank Ibezim sị na o tozughị ịzọ ọkwa ọchịchị n’aha APC.
Jọstịs Inyang Ekwo bụ ọkaikpe nyere mkpebi ahụ kwuru na asambodo na ihe akaebe nke Ibezim nyere pati APC nakwa Inec bụ akwụkwọ ụgha na asambodo adigboroja.
Ekwo kwuru na aha Ibezim zara dị iche, ebe o wetara asambodo ule Waec atọ bụ adịgboroja.
Ihe ndị a niile na-abịa dịka ọ fọrọ naanị otu abalị tupu e mee ya bụ ntuliaka iji họpụta onye ga-anọchị ọkwa Senetọ Benjamin Uwajumogu nọ na ya tupu ọ nwụọ n'afọ 2019.

Ụlọọrụ Inec ga-ahazigharị ụfọdụ ntuliaka ndị ụlọomeiwu a kpọrọ by-election na mpaghara dị iche iche na Naịjirịa na Satọde ụbọchị ise nke ọnwa Disemba.
Ntuliaka a ga-abụ maka ndị ụlọomeiwu ukwu isii na ndị omeiwu nta itoolu na steetị iri na otu dị na Naịjirịa.
Ụfọdụ ebe ndị a gụnyere; Imo North, Legọs East, Bayelsa West na Central Disrict, Cross River North na Plateau South.
Mpaghara Nganzai na Bayo dị na Borno Steetị, Obudu nke Cross River Steetị, Bakura nke Zamfara na Ibaji nke Kogi Steetị na ndị ọzọ.

Ebe foto si, NPF
Ọkaiwu Okon Abang nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja asịla ka a tukpuo Abdulrasheed Maina na nga Kuje ruo mgbe ọzọ a ga-achabi ikpe ya.
O nyere iwu a ka ụlọọrụ na-ebuagha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ EFCC kpụpụgharịrị Maina bụbu onyeisi otu 'Pension Taskforce' n'ụlọikpe dị n'Abuja n'ụbọchị Fraịde.
Ọkaikpe Abang bugharịrị ụbọchị ikpe ya ruo abalị asatọ nke ọnwa Disemba, 2020.
Maina bụ onye a na-ekpe ikpe maka ebubo mpụ ego dị ijeri abụọ gbasara ọsọ ma gbaaga na mba Niger Repọblik mgbe ụlọikpe tọhapụrụ ya n'akaebe.
A nwuchiri ya ma kpọlata Naịjirịa n'ụbọchị Tọsde n'ime izuụka abụọ ụlọikpe kagbuchara ntọhapụ e nyere ma sị ka a nwuchie ya.
A gbara ya n'anwụ n'ụlọikpe dị n'Abuja n'elekere asatọ nke ụtụtụ Fraịde a.
Mgbe ikpeazụ Maina pụtara n'ụlọikpe bụ n'ọnwa Julaị dịka ọ gbajọọla ikpe ugboro isii kamgbe ụbọchị 29 ọnwa Sepụtemba.