Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Gọọmentị amịpụla naịra ise n'ego mmanụ ụgbọala
Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị Naịjirịa amịpụla naịra ise n'elu N168 a na-akwụbu maka mmanụ ụgbọala.
Ha kwuru na site n'ụbọchị 14 nke Disemba gawa n'ihu, na a ga na-akwụzị N162.44 n'elu otu lita mmanụ ụgbọala.
Mkpebi a bịara ka gọọmentị etiti na ndị ọrụ mechara nzukọ nke bidoro n'elekere itoolu nke abalị Mọnde ruo elekere otu nke isi ụtụtụ Tuzde.
Nwaanyị dị afọ 91 abụrụla onye mbụ natara ọgwụ mgbochi coronavirus n'ụwa
Ebe foto si, Reuters
Otu nwaanyị gbara afọ iri itoolu abụrụla onye mbụ a gbara ọgwụ mgbochi
maka Coronavirus na mba Briten.
Margaret Keenan, si n'obodo Enniskillen, natara ọgwụ mgbochi ya n'ụlọogwụ dị na Mahadum Coventry, n'ụbọchị Tuzde.
Ọ pụtara na mba ahụ amalitela iji ọgwụ mgbochi nke ụlọorụ Pfizer na
BioNTech egbochi ọrịa ahụ.
Otu SERAP akwadowela ịkpụpụ onyeisiala na ndị gọvanọ ụlọikpe
Otu na-ahụ maka ikike ruru mmadụ akpọrọ SERAP n’ịchafụ ekwuola na ha na-akwado ịkpụpụ onyeisiala nakwa gọvanọ steeti niile dị na Naịjirịa ụlọikpe.
Iwe ha bụ na atụmatụ nke ewepụtara iji gbazite ego n’ime ụgwọ ezumike ndị mmadụ abụghị nke iwu kwadoro nke mere na ha chọrọ ịkwụsị ya.
Ha kpọrọ oku ka ndị ọzọ chọrọ ịsonye na ya bụ akwụkwọ ha na-akwado ịgba n'izuụka abụọ zitere ha ozi
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Unu abọọla chi?
Nnọọnụ na peeji anyị taa.
Ihe niile dị mkpa mere na Naịjirịa ka unu ga-achọta ebe a.
Udo!
A ga-anwuchi onye ọbụla na-anakọ ego n'ụzọ Anambra steeti.
Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị Anambra steeti ekwuola na ha ga-anwuchi onye ọbụla ejidere na-anara ndị na-eme njem ego n'ụzọ na steeti ahụ.
Ọ bụ n'akwụkwọ ozi nke kọmịshọna mgbasa ozi steeti ahụ bụ Don Adinuba ka ha kwuru nke a.
Ha kọwara enwetela akụkọ na e nwere ndị na-anakọ ndị na-eme njem na steeti ahụ ego.
Ebe ndị a gụnyere Onịcha, Obosi,Nnewi, Amasea, Ogidi, Nkpọ dgz.
Gọọmwentị steeti a kwuru na omume ndị omekome a megidere iwu steeti ahụ ma kọwaa kwa na ego ndị a na-anata anaghị erute gọọmentị steeti ahụ aka.
Akwụkwọ ozi ha kwuru ka ndị madụ mee mkpesa mgbe ọbụla ha hụru onye dị etu a na-anakọ ego n'ụzọ.
Ha kwuru na ọ bụ iwu na ọdịmma ka e ji achị Anambra steeti ma nye ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha hụ na ehiwere ma mezuo iwu a.
Gọvanọ Benue Steeti ekpeziela onye ntaakụkọ Channels na nwunye ya
Ebe foto si, Jimin Geoffrey/Facebook
Gọvanọ Benue steeti bụ Samuel Orthom ekpeziela onye ntaakụkọ Channels bụ Pius Angbo na nwunye ya bụ Dọkinta Ifeyinwa Angbo.
Cheta na Ifeyinwa Angbo mere ihe onyonyo ebe o gosiri ihu ya dịka dị ya bụ Pius Angbo tiri ya ihe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ebe foto si, Jimin Geoffrey/Facebook
Kama Mazị Angbo arịọla nwunye ya na ụmụnwaanyị niile mgbaghara ma kwuo na ọ gaghị akpa ụdịrị agwa ahụ ọzọ.
Ebe foto si, Jimin Geoffrey/Facebook
Coronavirus Minutes
Ụgbọoloko ebidola ime njem site Oyo Steeti gawa Legọs steeti.
Ebe foto si, Presidency Nigeria/ Twitter
Gọọmentị Naijirịa ekwuola na ụgbọ oloko ebidola ime njem site Ibadan dị n'ọyọ steeti gawa Legọs steeti taa bụ ụbọchị asaa nke ọnwa Disemba afọ 2020.
Ụgbọoloko a nke na-agba kilomita iri atọ maọbụ anọ kwa awa ga-eji ihe dịka otu awa na ụma iri anọ eme ya bụ njem.
Ya bụ ụgbọ hapụrụ Ibadan n'elekere asatọ nke ụtụtụ ma rute Abeokuta n'elekere asatọ na ụma iri ise na asatọ ma hapụ Abeokuta were rute Legọs, Ebutte Metta n'elekere iri na ụma anọ nke ụtụtụ.
Dịka onye enyemaka pụrụiche nke onyeisiala Naijirịa aha ya bụ Tolu Ogunlesi depụtara n'akara Twitter ya were kọwa na ọsọ ya bụ ụgbọoloko na-agba ga-agbalite mgbe ha rụchara ihe ha kwesịrị ịrụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Channels TV ekwuola na ha ga-enyocha onye ọrụ ha eboro ebubo mwakpo nwunye ya
Ụlọ ntaakụkọ Channels TV ekwuola na ha na-enyocha ebubo eboro otu onye ọrụ
ha na o tiri nwunye ya ihe.
Nke a pụtara ihe dịka nwunye nwoke ahụ depụtara na
soshal midia ma gosi foto ebe o merụrụ ahụ na-ekwu na di ya tiri ya ihe.
Nwaanyị ahụ sị na aha ya bụ Ifeyinwa Angbo kpọrọ di ya aha ma kwuo na o tobeghi aka ọ mụchara nwa nke anọ ha tupu nwoke a etie ya ihe.
Ụlọọrụ ahụ kwuru na ha ga-ata nwoke ahụ ahụhụ maọbụrụ na ikpe mara ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Igbo enweela ọgbakọ n'Enugwu
Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị si ala Igbo enweela nzụkọ nke ukwu a kpọro 'Ime Obi Ohaneze NdịIgbo'.
Ogbakọ ahụ bụ nke e mere na Nike Lake dị n'Enuwgu.
Ndị bịara n'ọgbakọ ahụ gụnyere Ike Ekweremadu, Hope Uzodimma, Nnia Nwodo, Peter Obi, Uche Ogah, Chris Ngige, Rochas Okorocha na ndị ọzọ.
Dịka aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma si kwuo, ihe bụ isi okwu na ya bụ nzụkọ bụ mmekọrịta n'etiti ndị Igbo na mpaghara ndị ọzọ maka ọdịmma ndị Igbo na Naịjirịa.
Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook
Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook
Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook
Ndị oso chi egbu chọrọ imechu INEC ihu na ntuliaka a - Festus Okoye
Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec ekwuola na ụfọdụ ndị oso chi egbu chọrọ imebi mbọ niile ha gbara na mmeju ntuliaka a e mere n'ụbọchị ise nke ọnwa Disemba.
N'ozi onye kọmishọna ụlọọrụ a na-ahụ maka mgbasaozi bụ Festus Okoye wepụtara, ọ sị n'agbanyeghi na ntuliaka a gara nke ọma mana ụfọdụ ndị chọrọ imebi usoro a.
Okoye sị na a wakporo ụfọdụ ndị ọrụ ha n'oge ntuliaka ahụ.
"N'ụfọdụ ebe, a wakporo ndị ọrụ anyị ma mebisie ngwa ọrụ ha, ụfọdụ ndị mmadụ jụrụ ka e were igwe kaadị 'reader' nyocha a ha.
"N'ebe ọzọ, ndị ekperima ekweghi ndị ọrụ Inec malite ọrụ ha, ndị a siri ọnwụ ka ndị ọrụ Inec kwụọ ha ụgwọ tupu ha amalite ọrụ.
"Ụdị agwa ndị a na-emebi aha obodo a ma na-egbukwa mmụọ ndị ọrụ anyị ji arụ ọrụ," dịka n'akwụkwọ ozi Okoye wepụtara.
Okoye sị na ọ bụ n'ihi nke a mere na-akpọpụtabeghi mpụtara ntuliaka nke mpaghara Bakura dị na Zamfara Steetị.
Ọ sị na ha mere ọgbakọ na Sọnde ma kpebie na ntuliaka ga-adị na Wenesde ụbọchị 9 nke ọnwa Disemba 2020.
Okoye gara n'ihu kwuo na e mechaala ntuliaka na mpaghara ndị ọzọ ma kpọpụta mpụtara ha.
Igbo ndị ọma anyị ekele ooo
Ọ bụ obiọma ka anyị ji anabata unu n'ụbochị taa.
Tottenham vs Arsenal: Tottenham echiela Arsenal ọnụ na 'korota' ụzọ Nsukka.
Ebe foto si, Getty Images
Tottenham egosila ndị otu Arsenal na nwoke na nwoke ibe ya ha bụ n'ọnụ.
Ọ bụ dịka ha zutere onwe ha taa n'asọmpị Premier League ka ikuku kuru were gosi ụwa niile otule Arsenal.
Ọ bụ na nkeji nke iri na atọ ka Son Heung-Min nke Tottenham gbanyere goolu n'elu aka ekpe ọnụ postu ndị Arsenal.
Ebe foto si, Getty Images
Goolu Son nyere dịka ọ kpalitere mụọ ndị otu ya.
Ebe mbọ niile Arsenal gbara ịsa ya bu goolu lara n'efu.
Dịka ọ nọ na nkeji iri anọ na ise kpọmkwem ka Giovani Lo Celso wetere bọọlụ, gbapụ ya ọso were nye Son Heung-Min onye nyere ya Harry Kane.
Harry Kane chiri onwe ya eze dịka ọ gbakara netị ndị Arsenal were mee ya goolu abụọ tupou egbochie agba nke mbụ.
Ebe foto si, Getty Images
Mbọ niile Arsenal nyere ịsa goolu abụọ gbara ọnyụpa dịka ndị Tottenham jiri ya mee ha oji n'ụlo ha.
Gọvanọ Abia steeti akwụsịla onyeisi ndị ọrụ ya ọrụ
Ebe foto si, BBC Pidgin
Akwụkwọ ozi gọọmentị Abia steeti depụtara na-ekwu na Gọvanọ Steeti ahụ bụ Okezie Ikpeazu enyela ikike ka achụọ onyeisi ndị ọrụ nke Gọvanọ steeti ahụ bụ Dr. ACB Agbazuere n'ọrụ.
Ọ bụ onye ode akwụkwọ steeti ahụ bụ Chris Nzem depụtara ya bụ ozi were sị na ọ bụ onye ode akwụkwọ nke obi gọọmentị steeti ahụ bụ Alozie Odoemelam ga na-arụ ọrụ onyeisi ode akwụkwọ dịka o siri dị.
Akwụkwọ ozi ha ekwughị ihe mere ha jiri chụọ ya n'ọrụ.
Ọ bụ n'ụbọchi ole gara aga ka ewepụtara ihe onyonyo gosiri ebe Dr. ACB Agbazuere na-abọ onye ụkọ chukwu eji Odumeje mara ego n'ụlọ ọrụ ya.
Lee ihe onyonyo ahụ ebe a.
NHS ga-amalite inye ndị Briten ọgwụ mgbochi na Tuzde
Ebe foto si, PUBLIC HEATH ENGLAND/PA WIRE
Nkọwa foto, Njụoyi ebe a na-etinye ọgwụ mgbochi karịrị puku 80 na UK
Ngalaba National Health Service (NHS) nke mba
Briten ga-amalite inye ndị mmadụ ọgwụ mgbochi coronavirus n’ụbọchị Tuzde.
Ha kwuru na ha
ga-esi na ndị agadi gaferela afọ iri asatọ nakwa ndị na-elekọta ha n’ụlọ ebe a
na-etinye ha, malite.
A nwụchịrị nọọsụ 12 na Delta steeti? Lekwa ihe anyị chọpụtara
Ebe foto si, Government of Delta steeti twitter page
Kọmịshọna na-ahụ maka ahụike na Delta steeti bụ dọkịta Mordi Ononye ekwuola na
onweghị ndị nọọsụ ndị uweojii nwụchịrị na steeti ahụ ụbọchị Fraide bụ December
4,2020.
O kwuru na ndị uweojii kpọpụrụ ndị nọọsụ batara ime ebe ndị nọọsụ ndị ọzọ nọ na-ele ule n'otu ụlọakwụkwọ mana ha anwụchịghị ha kama ha na ha gara inwe mkparịtaụka ka ha wee kwụsị ighasasi ule a na-ele ebe ahụ.
Mana odeakwụkwụ ndị otu nọọsụ na Delta steeti bụ Chukwuka Ezugwu
kwuru na ndị uweojii steeti ahụ nwụchịturu ma hapụkwa ndị otu ha mgbe ha gara
ile ma ndị ụlọakwụkwọ nọọsụ ndị ọzọ nọ na steeti ahụ esonyere na abụbụ ọrụ ha
kanyere ụbọchị Fraide ahụ.
Ezugwu kwuru na ndị otu nọọsụ steeti ahụ gbara arụkwaịm maka ihe ha kpọrọ nneni na mmaja gọọmenti na-eme ndị nke ha site n'iwere onye nọọsụ nọ n'obere ọkwa tinye n'ọnọdụ onye nọọsụ nke ukwu kwesiri nọ nakwa mkpa ndị ọzọ.
Kọmịshọna Ononye kwuru na gọọmenti hibere otu na-elebanya na mkpa ndị a nakwa e nyere ha ruo ngwụcha Jenụwarị iweta ogbugbo nye mkpa ndị ahụ.
Tokunbo Abiru nke APC azọtala oche sineti nke Legọs Ist
Tokunbo Abiru bụ onye fere ọkọlọtọ pati APC na ntuliaka mmeju onye ga-abụ onye nnọchiteanya ndị Legọs Ist n'ụlọomeiwu ukwu, emeriela.
Abiru nwetara vootu 89,204 iji zọta oche ahụ, ebe onye na-eso ya bụ Babatunde Gbadamosi nke PDP nwetara vootu 11,257.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Nkọwa foto, Ebe a na-agụkọ akwụkwọ vootu n'Ọnụimo dị n'Imo steeti
Ngalaba na-ahụ maka
ntuliaka na Naịjiria bụ Independent National Electoral Commission (Inec), akpọpụtala APC dịka pati meriri na
ntuliaka mmeju e mere iji họpụta onye ga-abụ Sinetọ n’Imo Nọt.
Hakeem Adikum bụ "Election Returning Officer" kwuru na APC nwetara vootu 36,811 ebe Emmanuel Okewulonu nke PDP nwetara 31,903.
Francis Ezeonu bụ kọmishọna
Inec nọ na steeti ahụ, gwara ndị ntaakụkọ na ọ kpọpụtara pati kama aha mmadụ n’ihi
na ọ bụ ụlọikpe ga-ekpebi okwu mmadụ abụọ na-azọ onye ga-efe ọkọlọtọ pati ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 2
Naịjiria enyela AU akwụkwọ nkwekọrịta AfCTA ha binyere aka
Ebe foto si, AFP
Naịjiria
enyela ngalaba jikọtara mba ndị dị n’Afrịka bụ African Union maọbụ AU n’ịchafụ, akwụkwọ nkwekọrịta
ha na African Continental Free Trade Area (AfCTA).
Nke
a bụ nkwekọrịta na mba ndị dị n’Afrịka ga na-azụkọrịta ahịa nke ga-enyere aka ịkwalite
azụmahịa Afrịka na mbaụwa.