Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. A na-eme Hunter nwa Joe Biden nnyocha maka ụtụisi

    Joe na Hunter Biden

    Nwa onye ga-abụ Onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden aha ya bụ Hunter ekwuola na a na-eme ya nnyocha banyere ụtụisi ya.

    Ọ bụ ndị ọrụ gọọmentị Amerịka nọ na Delware na-eme nnyocha a.

    Hunter Biden sị na ya na-ewe nnyocha dịka ihe mkpa ma ọ na-eche na "nyocha kwụ ọtọ" ga-egosi na ha kpara agwa "n'ụzọ emegideghi iwu":

    Ndị na-arụrụ Biden ọrụ sị na Onyeisiala-a-na-ache Biden na-ahụ nwa ya nwoke dịka onye na-enye ya ọṅụ.

    Ha sịkwa na ;"Hunter agabigala atamahụhụ, nke gunyere iji ha mee akaja n'ime ọnwa ole ma ole gara ga, ma pụtakwa dịka onye ụkwụ ya siri ike n'ala".

    Hunter Biden sị na a na-enyocha ya n'ụbọchị Tuzde. O kwughi ihe ọzọ banyere ya.

    Nwoke a dị afọ 50 bụ onye ndị Pati Repọblịkan dịka a na-eme achụmta vootu nke ndọrọndọrọ ọchịchị 2020 site n'itinye uche na eji ego achụ ego nke o mere na Yukraine oge nna ya bụ Osote Onyeisiala Amerịka.

    Ndị Omeiwu Obele ji maka okwu Yukrene a chụọ Trump n'ọrụ na Decemba 2019 mana ndi Omeiwu Ukwu kachapụrụ atụmatụ ahụ.

  2. Anyị na gọọmentị enweghi nkwekọrịta ịlaghachị ụlọakwụkwọ na Disemba 9 - ASUU

    Nzukọ gọọmentị na ndị nkuzi mahadum

    Onyeisi otu jikọtara ndị nkuzi Mahadum bụ Biodun Ogunyemi sị na onweghi mgbe ha na gọọmentị nwere nkwekọrịta ka ha laghachị n'ụlọakwụkwọ na Disemba 9.

    Ogunyemi kwuru na minista na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Chris Ngige tụrụ asị mgbe ọ gwara mbaụwa na ndị nkuzi ga-alachị n'ụlọakwụkwọ ma ọ bụghị ya na gọọmentị agaghị akwụ ha ụgwọ.

    Ọ sị na mkpebi ha nwere bụ ha ga-eji ihe gọọmentị gwara ha gosi ndị otu ha ka a mara ma aga-ekwe n'ihe gọọmentị kwuru.

    Ogunyemi sị na gọọmentị kwere nkwa ịkwụ ha ụgwọ ndị e ji ha na Disemba 9 ebe ha kwere nkwa izute ndị otu ha ka e kwuo etu esi akwụsị abụbụọrụ a.

    Minista ndị ọrụ bụ Chris Ngige kwuburu na gọọmentị na ndị nkuzi nwere nkwekọrịta na ha ga-alaghachị n'ụlọakwụkwọ na Disemba 9, ebe o kwere nkwa na ọ ga-eme ka onyeisiala kwụọ ọnwa ha ji ndị ọrụ.

  3. Paolo Rossi ejewala ihe ka ọ gbara afọ 64

    Paolo Rossi

    Onye egwu nyeere ndị mba Italy aka mabụte iko egwuregwu mba ụwa na 1982 bụ Paolo Rossi anwụọla ka ọ gbara afọ iri isii na anọ (64).

    Nwunye ya bụ Federica Cappelletti bụ onye kwuru nke a na ọbaozi Instagram ya mana okwughị ihe gburu ya, agbanyeghị na akwụkwọ akụkọ na-ekwu na ọteela ọ rịawara ọrịa.

    Rossi pụtara na uju egwubọolụ ya mgbe ọ gbara asọmpị iko mbaụwa ha gbara na Spain bụ ebe ọ nọ nye Brazịl gọọlụ atọ n'otu ahịrị.

    Ọfọrọ nwantakịrị ka ọ gbajọọ ya bụ egwụbọọlụ maka mmachị amachịrị ya Ịgbabọọlụ site na ebubo na ọ tinyere ka na nrụrụaka egwubọọlụ.

  4. Ihe mere Buhari agaghị eji zaa oku Ndị Omeiwu - Abubakar Malami

    Abubakar Malami

    Ọkaiwu Ukwu Naịjirịa bụ Abubakar Malami ekwuola na Ndị Omeiwu Naijirịa enweghị ikike ịkpọ Onyeisiala Muhammadu Buhari oku dịka ha si ka ọ bịa zara ọnu ya banyere ihe na-eme na Naịjirịa ugbua.

    Nke a na-abịa dịka ndị Boko Haram kwenyere na ọ bụ ha gburu ndị ọrụ ugbo 43 na Zabarmari di na Borno Steeti.

    Ndị Omeiwu sibu ka Onyeisiala Buhari zute ha nke Buhari n'onwe ya kwenyere na ya ga-eme etu a.

    Mana Malami, site n'akawụkwọ mgbasaozi o binyere aka n'aya n'ụbọchị Tuzde, sị na Ndị Omeiwu enweghi ikike ịkpọ Onyeisiala.

    Ọ sị na ọ bụ "na mmasị Onyeisiala Naịjirịa" ka ọ dịrị ị bịa n'ihu Ndị Omeiwu.

    Ọ sị site n'iwu Naịjirịa, onweghi ebe ọbụla e dere na ndị omeiwu nwere ikike ịkpọ Onyeisiala oku.

    Malami gara n'ihu kwuo na gọọmentị Buhari agbaala nnukwu mbọ ịhụ na oke mwakpo nakwa ogbugbu mmadụ na-eme na Naịjirịa ebelatala.

    Ọ gakwara n'ihu kwuo na atụmatụ Onyeisiala Buhari ji arụ ọrụ nchekwa abụghị ihe a ga-abịa na-ekwu n'ihu ọha.

    Ọ sị na agaghị agbagha na ọ bụ n'ọchịchị Buhari ka anapụrụ Boko Haram okpuru ọchịchi ime obodo 14 nọ ha n'aka.

  5. Wizkid na Burna Boy eturula ugo na MOBO Awards 2020

    Wizkid na Burna Boy

    Ụmụ Naịjirịa na-eti egwu dịka Wizkid na Burna Boy azakọrọla nturuugo a kpọrọ 'Music of Black Origin Award' (MOBO) nke afọ 2020.

    N'emume ndị otiegwu a ma ama dịka Davido na Tiwa gụrụ egwu ha ndị gbapụtara ihe n'afọ 2020, Davido gụrụ 'Fem' nke si n'ọbaegwu ọhụrụ ya ebe Tiwa Savage gụrụ 'Koroba' na 'Dangerous Love' nke si kwa n'ọbaegwu ọhụrụ ya.

    Lee aha ndị turuugo n'emume MOBO Awards nke afọ 2020

    Nwoke kacha agụ egwu n'ụwa - Headie one

    Nwaanyị kacha agụ egwu n'ụwa - Mahalia

    Ọbaegwu kacha mma n'afọ 2020 - Nines (Crabs in a bucket)

    Egwu kachasị ụtọ n'ụwa n'afọ 2020 - Young T & Budsey Feat. Headie One (Don't rush)

    Oti egwu ọgbara ọhụrụ kacha mma - Aitch

    Ihe onyonyo egwu kachas mma n'afọ 2020 - NSG (Lupita)

    Egwu RnB kacha mma - Mahalia

    Egwu Hip Hop kacha mma - Nine

    Ọkacha agụ n'egwu Grime - JME

    Ọkacha agụ na mbaụwa gbaa gburu gburu - Burna Boy

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Ọkacha agụ n'emume ihe onyonyo - Micheal Wardas Marco (Blue story)

    Ọkacha n'ọrụ mgbasaozi - Chunkz

    Ọbaegwu kacha mma site n'afọ 2017 ruo 2019 - Ella Mai

    Ọkacha agụ egwu n'Afrịka - Wizkid

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Ọkacha agụ n'egwu Raggae - Buju Banton

    Ọkacha agụ n'egwu ụka - Calledout Music

    Ọkacha agụ n'egwu Jazz - Ego Ella May

    Ọkacha emepụta egwu - Jae 5

    Nturuugo mkpalite mmụọ - Steve Mcqueen

    Cheta na Davido ritere nturuugo ọkacha agụ n'Afrịka nke afọ 2017 bụ nke Wizkid ritere n'afọ a.’.

  6. Unu asaala chí?

    Anyị na-ekele unu dịka chi bọrọ taa.

    N'ogige a ka anyị ga-esi wetere unu akụkọ si ụwa dum.

    Daalụ nụ!

  7. Ka chi fo!

    Soro nụ anyị ụbọchị ọzọ maka akụkọ ndị dị mkpa n'ogbe gị.

  8. Lee ebe coronavirus kwụ n'Afrịka taa

  9. Buhari eduola Mahmood Yakubu iyiọrụ maka agba nke abụọ

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari eduola Mahmood Yakubu n'iyi ọrụ dịka onyeisi Ịnec.

    Nke a mere n'ụbọchị Wenzde n'obi gọọmentị dị n' Abuja.

    Cheta na Ụlọomeiwu Ukwu Naịjirịa nyeburu nkwado ka onyeisi ngalaba INEC bụ Mahmood Yakubu ka ọ laghachite nke ugboro abụọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  10. Gọọmentị etiti akwụsịla orure 'SIM' ekwentị

    Ngalaba na-elekọta ozi na mkparịtaụka n'etiti ndị mmadụ bụ NCC enyela iwu ka akwụsị ọrụre SIM eji agbanye ekwentị.

    Nke a na-abịa dịka a na-enyocha ndekọ aha ndị niile tinyere aha maka ịnweta SIM eji agbanye ekwentị.

    Ikechukwu Adinde bụ onye na-ekwuchitere ngalaba ahụ kwuru na ọ ga-adị etu a rue mgbe emechara ya bụ nyocha.

    O kwuru na ọ bụ Minista na-ahụ maka Mkparịtaụka na akụnaụba nke ịnatentị nyere iwu ka e mee nke a.

    O kwukwara na a ga-anapụ ụlọọrụ mkparịtaụka ọbụla edebeghi iwu a ikike ọrụ ha.

  11. Praịm Mịnịsta mba Etiopia agbaala ụkwụ na mba Kenya maka njem abalịa abụọ

    Abiy Ahmed

    Onyeisiala mba Ethiopia bụ Abiy Ahmed agbaala ụkwụ na mba Kenya maka njem abalị abụọ kemgbe okwuru na agha ndị npuisi na Tigray ebiela.

    Onyeisi mba Kenya bụ Uhuru Kenyatta nabatara ya na ya bụ nje ha ga-etinye ọnụ n'okwu gbasara ịwete udo na mba abụọ ahụ.

  12. 'Onweghị mgbe anyị ji kwe nkwa ịkwụcha ndị ọrụ ụgwọ tupu ha ebido ọrụ' - Ngige

    Chris Ngige

    Mịnịsta okwu ọrụ dị n'aka bụ Chris Ngige ekwusiela ike na onweghị mgbe ha jiri kweta ndị ọrụ na ha ga-akwụcha ha ụgwọ e ji ha tupu ha amalite ọrụ.

    Akwụkwọ akụkọ Guardian kwuru na Ngige sị na ọ bụ akụkọ ụgha na ya kwetere ịkwụcha ụgwọ ndị ọrụ gọọmentị jichiri tupu ha amalite ọrụ,

    Ngige kwuru ụbọchị Tuzde n'Abuja na "nkwekọrịta nwoke na ibe ya ka anyị kwekọrịtara mgbe anyị gwara ASUU n'ọgbakọ ịkpeazụ anyị nwer, bụ ebe anyị nọ sị ndị ASUU ha jisike kwusi ya bụ abụbụ ọrụ tupu ụbọchị itoolu nke ọnwa Disemba 2020, ka anyị were nwe ike ịrịọ onyeisiala ka ọ kwụọ ha ụkwọ ọnwa ya gọọmentị jichiri".

    Ngige sị na ya na Minista agụmakwụkwọ akpaala maka ịwezụga ya bụ iwu 'onye rụọ orlie' ha ji nọdo ụgwọọnwa ndị nkuzi n'elu maka ya bụ abụbụ ọrụ ha na-agba.

    Cheta na ndị nkuzi mahadum malitere abụbụ ọrụ na uju ya na ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Maachị dịka ha mechere nke ịdọ aka na ntọ n'ụbọchị itoolu nke otu ọnwa ahụ.

  13. Ihere emegbuola Manchester United ebe RB Leipzig kwopuru ha nkụ na Champions League

    Manchester United vs RB Leipzig

    N'egwuregwu, RB Leipzig ji ọkpụ goola atọ asatara abụọ gbaara Manchester United ụgbọ nwamkpị n'asọmpị Champions League.

    Ihe Manchester United chọrọ iji gaa n'ihu bụ ọnọdụ onye nawa onye nawa mana nke ahụ enweghị isi maka ya bụ njọ ahịa RB Leipzig mere ha.

    Paul Pogba na Bruno Fernandes ji otu ọkpụ otụ ọkpụ gbara isi onwe ha na ya bụ asọmpị.

    Ihe ahụụfụ kacha mme Man Utd bụ na onye onyere ha goolu mbụ nakwa onye nyere aka na nke abụọ bụ Angelino si Manchester City gaa mbibi na Jamani ebe ọ na-agbara Leipzig.

  14. 'Ahụhụ m tara n'ịgba bọọlụ dịka nwaanyị mere m ji malite ikuziri ụmụaka egwuregwu'

  15. Ndị ọmekatara ihe pụọ ụjọ. ISWAP egbuola ndị agha iri ma kpara otu laa.

    Ndị agha Naịjirịa

    N'ọgbaaghara dapụtara n'etiti ndị ọmekatara ihe pụọ ụjọ bụ Islamic State West Africa Province (ISWAP) na ndị agha Naịjirịa na obodo Alagarno n'ime Distrikti Damboa dị na Borno steeti ataala isi ndị agha Naịjirịa iri ebe ha ji otu onye gbalaga.

    Mmadụ abụọ gbaara AFP izu sị na ya bụ ọgbaaghara dara ụbọchị Mọnde mgbe ndị agha Naịjirịa wakporo ogige ha n'obodo ahụ.

    Otu onye agha takwụnyere AFP ya bụ ihe na ntị kwuru na " agbagburu mmadụ iri ndị otu anyị ebe ha ji otu onye eji".

    Otu onye ahụ ha jidere na-agba ọsọ ndụ ya mgbe ya bụ ogụ karịrị ha aka.

    Onye nke ọzọ kwuru na "ya bụ ọgụ abụghị ogụ ụmụazị. Anyị nyụkwara ndị omekome ahụ anya, mana ha mechere lọghachita kpawazịa ike".

    Ndị omekatara ihe pụọ ụjọ a mechere jide ụgbọala ndị agha anọ dịka ndị ahụ kwuru.

  16. Igbo bụ Igbo ụnụ asaala chie! Ndụ mmiri, ndụ azụ. Mmiri atala, ma azụ anwụla.

  17. Ka chi fo!

    I mere nke ọma wee nọnyere anyị taa.

    Chọtakwa anyị n'ụtụtụ ka anyị wetara gị akụkọ ndị ga-amasị gị.

  18. Oha na eze na ndị na-azọ ọkwa onyeisi Ohaneze ga-enwe nzukọ

    Njirimara Ohaneze

    Otu Igbo dị iche iche ga-agbakọ ụbọchịụka maka nzuko ọha na ndị na-azọ ọkwa onyeisi otu Ohaneze Ndigbo.

    Dịka ndị na-ahazị ọgbakọ ahụ si kwuo, ọgbakọ ahụ nke a ga-eme n'elekere anọ nke ehihie n'igwe okwu 'Zoom' bụ oge mmadụ anọ ndị na-azọ ọkwa ahụ nke bụ oke Imo steeti ga-agwa ndị mmadụ okwu maka ebunobi ha.

    Ndị a gụnyere Chidi Osuagwu, Joe Nwaorgu, Chris Asoluka, Goddy Uwazurike na George Obiozor.

    N'ọnwa Jenụwary afọ 2021 ka a ga-enwe ntuliaka otu ahụ jikọrọ ndị Igbosi na steeti asaa ebe a na-asụ Igbo ;Abia, Anambara, Delta(Anioma), Ebonyi, Enugu, Imo na Rivers(Ikwerre).

  19. Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa

  20. 'Ọnụọgụgụ ndị Naijirịa eruola ihe dịka mmadụ 206,000,000' - NPC

    National Population Commission

    Ngalaba na-ahụ maka ọnụọgụgụ mmadụ na Naịjiria bụ Nigerian Population Commission bụ NPC n’ịchafụ ekwuola na ọnụọgụgụ ụmụ Naịjiria esila n’otu nde narị na iri itoolu na asatọ ruo nde narị abụọ na isii ugbua.

    Onyeisi ngalaba a bụ Nasir Kwarra kwuru n'ọgbakọ ya na ndị ntaakụkọ n'Abuja n'ụbọchị Tuzde kwuru na dịka Naijirịa agụbeghị ndị Naijirịa n'isi n'isi kamgbe afọ iri na anọ, na ọ ga-esi ike ịmata ọnụ ọgụgụ mmadụ ole kpọmkwem.

    O kwuru sị, "Ọ bụ onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari ga-ekwu mgbe ọzọ a ga-eme ọnụọgụgu mmadụ na Naijirịa".