Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Babajide Sanwo-Olu edopula onwe ya iche maka Covid-19

    Babajide Sanwo-olu

    Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu edopula onwe ya iche dịka otu onye ọrụ ya butere ọrịa coronavirus.

    Dịka ọ dị ugbua, amabeghi ma ya na onwe ya ebutere ya bụ ọrịa.

    Akụkọ ka na-abịa

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  2. 'Ihe mere n'Akure abụghị ọgụ ndị Igbo na ndị Yoruba dịka ndị mmadụ si kwuo' - Ohanaeze Akure

    Innocent Chukwudum Ezechiefo

    Onyeisi Ohaneze Ndị Igbo n’Ondo steeti bụ Innocent Chukwudum Ezechiefo, agwala BBC na ọ bụghị ọgụ n’etiti ndị Igbo na ndị Yoroba bụ ihe dapụtara n’Akure kemgbe ụbọchị ụka bụ 6 nke Disemba.

    Ọ kọwara na ọ bụ nghọtaghie n’etiti nwata Kalaba na nwata Yoroba nke ha na-agba mbọ ikpezi ugbua, butere ya bụ nsogbu.

    Ezechiefo kwuru na ya bụ nsogbu selitere isi mgbe otu onye Yoroba na-ese anwụrụ (onye agboro) bịara malite ikposasị ahịa ndị Igbo, ka o kwuru na e nwere ebe a lụrụ ọgụ.

    Mana dịka e si chọpụta, ebe a lụrụ ọgụ dị iche n'ebe ndị Igbo na-akpọsa ahịa ha, bụ ebe a bịara kposasịa.

    Ha chọpụtakwara na onye lụrụ ọgụ a a na-ekwu okwu ya bụ otu nwa Kalaba a na-akpọ Asuquo, bụ onye na-eche nche n'ebe a na-akpọ Obaile Housing Estate.

    Asuquo gara ebe ọ gara ịhụ enyi ya nwaanyị wee zute ndị na-anakọ ndị ọgbatumtum ego ụtụ nọchichara ụzọ. Ka a na-ekwu nke a na-ekwu, a mara nwa Kalaba ahụ karama mere ka ọ jụọ ha ihe o mere ha ji wee mee ya ụdịrị ihe a.

    Ndị uweojii kwuru na nghọtaghie ahụ abịala na njedebe ma kọwaa na ọ bụ aghọtaghị iwu ala bu ihe butere ya bụ okwu.

    N'agbanyeghi na ụfọdụ ndị kwuru na mmadụ atọ nwụrụ, ndị uweojii steeti ahụ gwara BBC na e nweghi onye nwụrụ.

    O kwuru sị "mmadụ abụọ merụrụ ahụ na ya bụ nsogbu mana ihe niile adịla mma ugbua".

    Ihe okwu a butere:

    Nsogbu a emeela ka gọọmentị Ondo steeti tinye mmachi ngagharị ruru awa iri abụọ na anọ (24) na mpaghara Ode na Isingbo dị na steeti ahụ.

    Donald Ojogo bụ kọmishọna Mgbasaozi na steeti ahụ, kwuru na ha agwala ndị nchekwa ka ha gbaa mbọ hụ na ndị mmadụ rubere iwu e tinyere isi ma nọrọ n'ụlọ.

    Gọvanọ steeti ahụ bụ Oluwarotimi Akeredolu enyekwuola iwu ka a chọta ma nwụchie ndị mere mkpamkpa a.

  3. Etu coronavirus si akpọtụ na Naịjirịa

  4. Onye nnochiteanya Naijiria n'Amerịka anwụọla

    Jọstis sylvanus adiewere nsofor

    Onye na-anọchite anya Naijiria na mba Amerịka bụ Jọstịs Sylvanus Adiewere Nsofor alaala mmụọ ka ọ gbachara afọ 85.

    Ọ nwụrụ ụbọchị Tọzde n'ụlọọgwụ na ma Maryland na Amerịka.

    Onye lara ezumike nka dịka ọkaikpe Ụlọikpe Mkpegharị, Nsofor bụ onye Onyeisiala Muhammadu Buhari họburu ọrụ n'afọ 2017 mana ndị Ụlọomeiwu Ukwu jụburu ịkwado nhọpụta Buhari họpụtara Nsofor dịka ọ jụrụ ịgụ abụ njirimara Naijiria(National Anthem). O kwuru oge ahụ na ihe gbasara internet abụghị maka ndị ọgbọ ya.

    Mana Buhari gbara isi akwara họpụtakwa ya ọzọ maka ọkwa ahụ, n'agbanyeghi na ndị omeiwu jụrụ ya.

    Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuru onyeisiala Buhari, kwuru sị:

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

  5. Arsenal ji ọkpụ goolu anọ asatara abụọ merie Dundalk n'asọmpị Europa League

    Arsenal vs Dundalk

    N'egwuregwu, na asọmpi Europe League agbara ụbọchị Tọzde, Asenal ji ọkpụ anọ asatara abụọ merie Dundalk na be ha.

    Tottenham jikwa ọkpụ abụọ asataghị ihe merie Royal Antwerp na be ha.

  6. Jonathan, Atiku nwere ohere ịzọ ọkwa onyeisisala n'aha PDP

    Uche Secondus bụ onyeisi pati PDP

    Otu Peoples Democratic Party agaghị akpachapụ onye chiburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan, na Atiku Abubakar bụbu osote onyeisiala Naịjirịa ịzọ ọkwa onyeisiala na 2023.

    Onyeisi pati a bụ Uche Secondus kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ nwere n'Abujan'ụbọchị Tọọzde n'emume ncheta afọ atọ ndịọrụ PDP.

    Mana ọ sị na pati ha na-eche ka akwụkwọ nyocha ntuliaka afọ 2019 e mere pụta tupu ha amara mpaghara ha ga-enye ọkọlọtọ PDP.

    "Amaara m na uche ndị ntaakụkọ dị n'ịchọpụta onye ga-efe ọkọlọtọ PDP na 2023 mana o nwere etu pati si eme ihe nke ha, anyị na-ehiwe kọmiti ga-enyocha etu ntuliaka gara iji chọpụta etu o si gaa."

    Ọ bụ site na nchọpụta ga ka anyị ga-eji mata ihe anyị ga-eme maka ntuliaka afọ 2023 na-abịa abịa.

    Mgbe ọị na-aza ajụjụ maka kepukepu na Goodluck Jonathan chiburu Naịjirịa nwereike ịlọghachị n'ọkwa, Secondus sị na onye otu ha ọbụla nwere ohere ịzọ ọkwa onyeisiala.

  7. Anwụchiela ndị agboro na-anakọ ndị mmadụ ụtụisi n'Ọnịcha

    Ndị Agboro n'Anambra steeti

    Aka ndị uweojii Anambra steeti anwuchiela ndị agboro mmadụ iri abụọ na amanye ndị mmadụ ana ha ụtụisi n'Ọnịcha.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Harụna Mohammed kwuru na ndị ahụ sara asịsa na ọ bụ ndị mmadụ dunyere ha nakọtawa ụtụisi.

    Onyeisi ndị ọrụ nchekwa ehiwere maka ịkpochapụ ndị ọjọọ n'ụzọ bụ ACP John Ogbuagbaka ṅụrụ iyi na ya ga-anwụchị ndị ọbụla na-enye ndị mmadụ nsogbu n'ụzọ anakọ ụtụisi.

    N'ụbọchị asaa nke ọnwa Disemba ka gọọmentị Anambra steeti tinyere iwu maka ịkpochapụ ndị niile jị aghụghọ anakọ ndị mmadụ ụtụisi n'ụzọ.

  8. Joe Biden na Kamala Harris bụ 'Ọkaibe afọ 2020' nke ụlọntaakụkọ Time

    Joe Biden na Kamala Harris

    Ụlọ ntaakụkọ Time emeela onye ahụpụtara dịka onyeisiala Amerịka bu Joe Biden na osote ya bụ Kamala Harris ihe ha na-akpọ "Mmadụ Afọ" nke 2020.

    Edward Felsenthal bụ onyeisi Time sị na Biden na Harris ritere ntụrụugo a maka etu ha jiri "gbanwe akụkọ Amerịka, ma gosi na inwe obi ebere ka ịkpa oke".

    Felsenthal na-akọwa na nke bụ mbụ ha na itinye Osote Onyeisiala ọbụla na atụmatụ a.

    Ndị ọzọ Time nnyochara maka ntụrụ ugo a bụ Onyeisila Donald Trump, Dọkịta Anthony Fauci nakwa ndị na-agba mbọ maka ịhụ na oke agbụrụ kwụsịrị.

    Na Tọzde ahụ, Time tụrụ otu oti egwu BTS ugo dịka "entertainer of the year", ma nye LeBron James "athlete of the year".

  9. E gbuola onye mbụ a mara ikpe ọnwụ site na ntuziaka Onyeisiala Trump

    Brandon Bernard

    E gbuola Brandon Bernard bụ onye a mara ikpe ọnwụ n'Indiana dịka ụlọikpe kachasị jụrụ ị nabata arịrịọ ikpeazụ ọ rịọrọ.

    Bernard dị afọ iri anọ ka a mara ikpe maka igbu di na nwunye n'afọ 1999 mgbe ọ ka na-eto okoroọbịa, ọ bụ onye kachasị obere gọọmentị ga-egbu kamgbe afọ 70 gara aga.

    Bernard rịọrọ ezinaụlọ di na nwunye ahụ o gburu mgbaghara tupu e were ọgwụ gbagbuo ya n'ụbọchị Tọọzde.

    Okwu ikpeazụ Bernard kwuru tupu ọnwụ ya bụ "Ndo nu, gbaghara m. Ọ gwụla okwu m nwereike ikwu ga-akọwa etu obi dị m ugbua."

    A na-atụ anya na gọọmentị Amerịka ga-egbu mmadụ anọ ọzọ a mara ikpe ọnwụ tupu Donald Trump arituo n'ọkwa onyeisiala.

    Ọ bụrụ na nke a mee, Trump ga-abụ onyeisiala kachasị gbuo ndị a mara ikpe kamgbe ọtụtụ afọ.

  10. Igbo ndị ọma unu abọọla chi?

    Anyị ji obiọma na-anabata unu n'ụtụtụ a.

  11. Ka chi fo!

    Ndị Igbo anyị abịala na njedebe akụkọ nke taa.

    Gbaanụ mbo soro anyị echi.

  12. Akwamozu Arthur Nwankwo kpọtụrụ taa n'Anambara steeti

    Arthur Nwankwo lara mmụọ
    Nkọwa foto, Arthur Nwankwo lara mmụọ bụ onye ama maka ide akwụkwọ karịrị 20 gụnyere ‘Biafra: The Making of a Nation’

    Ndị nwere agba gụnyere aka chịburu Anambara steeti bụ Peter Obi, onye bubu Minista njem Ụgbọelu bụ Osita Chidoka, otu na ndị ndu otu APGA bụ Victor Ume nakwa onye Ụlọnnochiteanya bụ Obinna Chidoka bụ ndị zochiri n'akwamozu, Arthur Nwankwo n'Ajali dị n'Orumba-South, Anambrara steeti taa bụ Tọzde.

    Arthur Nwankwo bụ onye na-ede akwụkwọ a ma ama mabụkwa onye nwe ụlọrụ mbipụta akwụkwọ ' Fourth Dimesnsion' dị n'Enugwu.

    Onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onye, Nwankwo bụ Osote onyeisioche otu 'National Democratic Coalition' (NADECO) bụ otu lụrụ ọgụ 'June 12'.

    Ọchịchị Sani Abacha nwuchiri ya ma tuba ya na mkpọrọ maka mbọ o soro agba n' inwetara MKO Abiola oke zuru ya dịka onye meriri na ntuliaka 1993.

    Ọ bụ ọchịchị Abdulsalami Abubakar tọhapụrụ ya oge Abacha nwụchara.

    Akpati ozu Arthur Eze
    Arthur Nwankwo Jr na Osita Chidoka
    Victor Umeh na Osita Chidoka
    Peter Obi
  13. Ndị uweojii anwụchiela ndị ntọ abụọ

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ si Sokoto steeti bụ ndị ntọ tọọrọ onye mba Amerịka n’ugbo ya dị na mba Niger.

    Ha kwuru na anwụchiri ndị ahụ dịka ha na-akwado ịbọgwara ọnwụ ndị otu ha ruru mmadụ isii nke egburu dịka ndị uweojii na-azọpụta ndị ọzọ ha tọọrọ.

  14. 'Anyị ga-achụ onye uweojii gbagburu onye Keke n'ọrụ ,kpụpụ ya ụlọikpe'

    Ogige ndị uweojii

    Kọmishọna ndị uweojii na Rivas steeti bụ Joseph Mukan ekwuola na ha ga-achụ onye otu ha gbagburu otu onye Keke na Pọtakọt n'ụtụtụ Tọzde ma kpụpụ ya ụlọikpe.

    N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Nnamdi Omoni binyere aka, Mukan kwuru na ihe 'inpector' ahụ mere 'dị nnukwu njọ' ma gaa n'ihu kwuo na a malitela ikpe ya ikpe ime ụlọ nke ọ ga-abụ ekpecha, a chụọ ya n'ọrụ ma kpụpụ ya ụlọikpe.

    Ọgara n'ihu tiei ezinaụlọ nwa amadị ahụ nakwa otu jịkọrọ ndị Keke na steeti ahụ aka n'obi.

    Akụkọ kwuru na e gburu nwata nwokorobia ahụ a kpọrọ 'Okechukwu' n'ụzọ ụtụtụ Tọzde n'ihi na ọ jụrụ inye onye uweojii otu nari naira ego aka azụ.

  15. Ndiagha ebiela ọgbakọ n'ike dika onye otu ha butere coronavirus

    Njirimara ndịagha Naijiria

    Ndị agha welitere isi ebiela ọgbakọ ọzụzụ ha na-enwe kwa afọ nke na-aga n'ihu n'Abuja n'ike dịka otu onye n'ime nwụrụ site n'ọrịa coronavirus.

    A na-atụ uche na Generalụ nwere ike ọ bụrụ na o bufeela ndị ọzọ gara ọgbakọ ahụ nke mere ka ha nye iwu ka ndị sonyere na ọgbakọ ahụ dopu onwe ha iche.

    Dịka ọnụ na-ekwuru ndịagha,Brigadier General Sagir Musa, si kwuo n'ozi o wepụtara, e nyela ndị niile sonyere n'ọgbakọ ahụ gụnyere ya onwe ntuziaka ka ha dopu onwe ha iche dịka iwu gọọmenti etiti nyere maka COVID-19.

  16. Ụlọomeiwu Imo amalitela inyocha 'Speaker' a chụdara n'ọkwa

    Collins Chiji
    Nkọwa foto, Collins Chiji, na anọchite mpaghara Isiala Mbanao n'Ụlọomeiwu Imo banyere ọkwa onyeisi ha n'afọ 2019

    Ụlọomeiwu Imo steeti amalitere ịnyocha ọnwa iri na asaa Onyeisi ha a chụturu na nsonso a bụ Collins Chiji nọrọ n'ọchịchị.

    Ha nyeburu Chiji ọsọ n'ọnwa Novemba afọ 2020 maka ebubo nrụrụaka, ọchịchị aka ike na ihe ndị ọzọ.

    Omeiwu Ekene Nnodimele, bụ onye na-anọchite anya mpaghara Orsu bụ onye kpalitere okwu site na ịkpọ oku ka enyocha Chiji.

    Onyeisi ọhụrụ bụ Paul Emeziem na ọtụtụ ndị omeiwu kwadoro ka e mee nnyocha ahụ nke e mechara gụọ ya onyeisi oche kọmiti ga-eme nnyocha ahụ.

    Ndị ọzọ nọ na kọmiti ahụ gunyere Frank Ugboma, Uche Ogbuagu, Eddy Obinna, Dominic Ezerioha, Emeka Nduka na Johnson Duru.

  17. Gọọmenti egbubiela ọnụahịa a na-ere 'data'

    Njirimara Nigerian Communications commission(NCC)

    Gọọmenti etiti agbaala ama na e jirila pasent 50 kpụdaa ego ole a na-ere 'data' dịka ha nyere ngalaba na-ahụ maka 'Nigerian Communications commission'( NCC) ntuziaka ka ha tinye n'ọrụ usoro imezu nke a.

    Ọ bụ Mịnịsta na-ahụ maka nkwụrịtaụka bụ Isa Ibrahim Pantami bụ onye kwuru nke a n'akwụkwọ mgbasaozi nke ụlọrụ ya wepụtara ụbọchị Tọzde n'Abuja.

    Dịka o si dị ugbua, otu GB 'data e sila na otu puku naira( N1000 naira) gbatuo rue narị naira anọ iri asatọ na asaa(N487) kemgbe Novemba afọ gara aga.

  18. Aka akparala onye uweojii gbagburu onye 'keke' na Rivas Steetị

    Ngagharịiwe na Pọtakọt

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Rivas Steetị bụ Nnamdi Omoni sị na ha anwụchiela onye otu ha gburu onye na-akwọ ụgbọala keke na Rukpokwu/Rumuodumaya, Rivas Steetị.

    Ọ sị na ha a na-apụla ya egbe ma bido ikpe ya ikpe ime ụlọ na a ga-akpụpụ ya n'ụlọikpe n'ime ụbọchị abụọ.

    Ọ gara n'ihu sị na ndị uweojii ga-agba mbọ ime ka udo chịa na mpaghara Rukpokwu/Rumuodumaya ma chọọ ụzọ ga-ahụ ezinaụlọ onye keke ahụ.

    Nke a mere ngaghatịiwe kpụ ọkụ n'ọnụ ji na-eme n'ebe ahụ.

    Akụkọ sị na nsogbu a dapụtara mgbe onye keke ahụ jụrụ inye onye uweojii otu narị 100.

    Nke a mere onye uwoeojii ahụ ji wepụta egbe ma gbagbuo onye keke ahụ nwunye ya ka mụrụ nwa ọhụrụ

    Onye hụrụ mgbe ihe a mere gwara BBC Pidgin na ndị ngagharịwe a buru ozu nwamadị a gawa ụlọọrụ ndị uweojii na Rumuokoro.

    Akụkọ ka na-abịa...

  19. Abdulrasheed Maina adaala n'ụlọ ikpe

    Onye bụbu onyeisi ngalaba na-ahụ maka ego ezumike nka na Naịjirịa bụ Maazị Abdulrasheed Maina adaala n'ụlọ ikpe dịka a na-ekpe ya ikpe banyere ebubo nrụrụaka.

    Akụkọ ka na-abịa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  20. Ndị na-agba aja egbuola udele karịrị 2,000

    Udele

    Nnyocha e mere na Guines-Bissau achọpụtala na aka ndị na-agba aja dị n'ọnwụ udele karịrị 2,000.

    Mohammed Henriques, gwala RFI na eji isi, ụkwa na mbọ udele achụ aja na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka.

    Ọ sị na udele ndị a hụrụ ozu ha kemgbe Febụwarị enweghi isi.

    Henriques gwara RFI na; "Ndị na-achu aja na-eche na isi udele na-eme ka mmadụ baa ụba".

    A chọpụtara na ọtụtụ udele riri nsi a na-akpọ methiocarb, bụ ihe a machiri na Yurope.