Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. A machiela ịpịa ụmụaka ụtalị na Saụt Afrịka

  2. Ndị uweojii na Yuganda anwụchiela otiegwu OmahLay

    OmahLay otiegwu

    Ndị Uweojii na Yuganda anwụchiela otiegwu OmahLay na mmadụ abụọ ndị ọzọ maka ịda iwu covid-19.

    Ha kwuputara nke a n'ozi ha ziputere n'ụbọchị Sọnde.

    "Anyị nwuchiri mmadụ atọ maka mmemme egwu ha mere n'ogige Ddungu n'isi obodo mba ahụ bụ Kampal" ka ha kwuru.

    Ndị ọzọ anwụchikwuru bụ: Ivan Ddungu na-elekọta ogige ebe ọ bịara ti egwu nakwa Prim Kasana hibere ya bụ mmemme.

  3. Seun Kuti akọwaala ihe mere o ji mịpụta egbe n'abalị ụnyaahụ

    Seun Kuti

    Seun Anikulapo Kuti bụ otiegwu a ma ama na Naịjiria ekwetala na a gbapụrụ mgbọ egbe mgbe ọgbaghara dapụtara mgbe eji ụgbọala dochie ihu be ya n’abalị Satọde.

    Mana o kwughi maọbụ ya gbapụrụ ya bụ egbe dịka ebubo mmadụ boro ya n’elu soshal midia si kwuo.

    N'ihe onyonyo dị na peeji instagram ya, o kwetara sị "eeee agbapụrụ egbe na ya bụ ihe... ị chọrọ ị me nzuzu ma chee na agaghị a nụ ụda egbe?"

    Okwu a malitere mgbe otu onye bụ Temitayo Ayetoto kọwara etu Kuti si malite iwe iwe mgbe e ji ụgbọala nọchie ihu be ya n'Allen Avenue, Ikeja dị na Legọs.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Skip Instagram post
    Hapụ Instagram ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of Instagram post

  4. Onyeisiala Buhari kpọpụtara Effiong Okon Akwa dịka onyeisi ọhụrụ NDDC

    Onyeisiala Buhari

    Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwetela ka ahọpụta onyeisi ọhụrụ nwa mgbe nta ngalaba Niger Delta Development Commission (NDDC) aha ya bụ Effiong Okon Akwa.

    Effiong Okon Akwa bụ onyeisi ndewe ego NDDC ga-ewere ọkwa onyeisi ngalaba ahụ ruo mgbe e mechara nyocha ebubo nrụrụaka na mpụ eboro ndị na-achịbu ngalaba ahụ.

  5. Mba Amerịka ga-ebido inye ọgwụ mgbochi Pfizer coronavirus bido na mọnde

    Nwoke na-agba nwaanyị ọgwụ

    Ndị mba US ga-ebido ịnata ọgwụ mgbochi Pfizer/BioNTech maka coronavirus bido na mọnde bụ December iri na anọ dịka e kpebichara ị ji ya rụọ ọrụ.

    Ihe ruru ọgwụ mgbochị a nde atọ ka a ga-eburu kesaa na steeti niile dị na mba Amerịka na ngwụcha izu ụka a dịka Gustave Perna na-ahụ maka nkesa ya si kwu.

  6. Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

    Anthony Joshua na Kubrat Pulev

    Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ 'Unified world heavyweight champion' ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

    Ọkụ ọkpọ onye mba Britein a emeghịri mwa amadị a ebere dịka ọ na-akụ Pulev ji ihu ọchị a nara ọkpọ niile Joshua na-ebi ya.

    Ndị nso nso ruru otu puku bata n'ọgbọ egwuregwu Wembley Arena hụr u ka Joshua si jiri akọ n'uche na ọkpọ na-abịagbu mmadụ wee merie egwuregwu ahụ nke mere ka na-eto ya.

    Ọkpọ Joshua kụrụ Pulev n'agba itoolu n'ime agba iri na otu ha kụrụ ọkpọ bụ ihe mere ka Joshua ka jide ọkwa WBA, IBF, IBO na WBO n'ọgbọ egwuregwu Wembley n'ụbọchị satọde bụ Disemba iri na atọ(13,2020).

    AJ meriri ọkwa anọ a n'afọ 2016 ma mechaa gbajọọ atọ n'ime ọkwa oge Andy Ruiz Jr meriri ya mana o mechara ritekwa ha anọ n'ọnwa Jun nke afọ 2019.

  7. Igbo ndị oma anyị ekele ụnụ!

    Soro anyị taa ka ịmata nke ekwe n'akụ gbasara akụkọ ụwa dị ọkụ.

  8. Ka ọ dị echi

    Rahụkwanụ nke ọma ma nọnyere anyị n'utụtụ.

    Ndeewo

  9. Tinyenu gbatagbata maka ọnọdụ ihuigwe - UN

    Guterres

    Ngalaba mbaụwa bụ United Nations akpọọla oku ka mba niile tinye ọnọdụ gbatagbata maka ihe gbasara ọnọdụ ihuigwe.

    António Guterres bụ onyeisi ngalaba a kpọrọ oku a n’ụbọchị Satọde ka a na-eme nzukọ gbasara nkwekọrịta a kpọrọ 'Paris climate agreement' nke afọ ise.

    O kwuru na mba 38 etinyela ya bụ ọnọdụ gbatagbata, mana ọ na-akpọku mba ndị ọzọ ka ha sonye ibe ha mee ya bụ ihe.

    Ndị otu ọgbakọ niile ọdịmma mbara eligwe na-amasị n’ụwa niile na-eti mkpu n’arịọ ka gọọmentị mejuputa ya bụ nkwekọrịta nke enwere na Paris bụ nke ha kpọrọ “Paris Agreement”.

    Ndị a bụ nne na nna, ụmụaka nakwa ndị ajọọ ọnọdụ mbara elụgwe na-ewute maka ọdịmma ọdịnihu ụwa site na otu okpomọkụ sị adị.

    Onyeisi ndị otu na-abụghị nke ndị gọọmentị bụ ndị ọnọdụ mbara eligwe na-anụ ọkụ n’obi bụ Amuche Nnabueze bụkwa onye nkuzi na mahadun Nịjirịa na Nsukka sị na “Nkwekọrịta nke Paris bụ olileanya nke mmadụ nwere maka ịme ka okpomọkụ beleta bụ nke na-ebute oke ntaramahụhụ n’ụwa”.

    Nnabueze bụkwa onyeisi ndị Parents for Futuresị na ya bụ okpomọkụ egosiwala n’ọrụ ugbo ugbua nke nwereike ibute ụkọ nrị.

    Nnabụeze riọkwara nne na nna na ndị ọnụ na-erụ n’okwu ka ha soro ndị mbaụwa ndị ọzọ tinye ọnụ rịọwa ndị ọchịchị ka ha tinye ya bụ nkwekọrịta nke Paris n’ọrụ.

    Ọ sị na ọ bụ oke na ọrụ ndị obodo ịkwanye ndị ọchịchị ọkụ n’ike ka ha mejuputa ya bụ mkwa maka ọ dị mma ọdịnaihu anyị.

  10. 'Abanyela m ekpere ugbua' - Nne otu n'ime ụmụakwụkwọ 600 a tọrọla na Katsịna

    Zainab Isa
    Nkọwa foto, Foto Zainab Isa ebe ọ na-ebe akwa nwa ya

    Zainab Isa bụ nne otu n’ime ọtụtụ ụmụakwụkwọ Government Science sekọndịrị atọrọla n’obodo Kankara dị na Katsina steeti, agwala BBC na ọ bụ naanị ekpere ka ọ na-ekpe ugbua.

    Zainab kwuru na ikpeazụ ọ hụrụ Kabir nwa ya bụ n’ụbọchị ụka gara aga mgbe ya na ụfọdụ ndị ezinaụlọ ya gara leta ya na ụmụnne ya ndị nwoke abụọ n’ụlọakwụkwọ.

    "Ikpeazụ m hụrụ Kabir bụ n'ụbọchị ụka mgbe anyị gara leta ya na ụmụnne ya abụọ nọkwa n'ụlọakwụkwọ ahụ. Nkata ikpeazụ anyị kpara ka anyị na-achọ ịla bụ arịrịọ ọ na-arịọ m na ọ chọrọ ịlọta na ngwụcha izu a ka o nwee ike gaa otu agbamakwụkwọ."

    Ndị nne na nna ụmụakwụkwọ ahụ agbakọọla
    Nkọwa foto, Ndị nne na nna ụmụakwụkwọ ahụ agbakọọla

    "Ụmụnne ya abụọ ndị ọzọ a na-atọrọghị alọtala n'ụlọ ugbua, mana ezigbo ekpere ka anyị na-ekpezi n'isi Kabir, na-arịọ Chukwu ka ọ lọghachịta n'udo."

    Zainab kwuru na ndị si n'obodo ndị dị nso ụlọakwụkwọ ahụ gwara ha na ha nụrụ mgbe ndị oji egbe ahụ na-edubanye ụmụakwụkwọ ahụ n'ime ọhịa.

    Cheta na BBC na Gambo Isah bụ onye uweojii na Katsịna steeti kwuru, ebe ọ sị na a na-ama imi n'ala ịmata ihe merenu dịka ndị bi nso ebe ahụ na-akọwa na ọtụtụ ụmụakwụkwụ na-efu.

    Onyeisi uweojii Naịjiria bụ Mohammed Adamu tinyekwara ọnụ n'okwu ma nye iwu ka a maa ya bụ imi n'ala.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  11. Iran egbuola onye ntaakụkọ Ruhollah Zam

    Ruhollah Zam

    Mba Iran egbuola onye ntaakụkọ Ruholla Zam maka ebubo na ọ na-eji igwe mgbasa ozi dịka Telegram agbasa ozi na-ebute nnupu isi ebe gọọmentị mba ahụ nọ.

    E gburu Ruhollah Zam n'ụbọchị satụde dịka ụlọikpe kwadoro ikpe ọnwụ a mara ya na mbụ.

    Odoghị anya etu Zam onye bi na mba FRansị ebe ọ gbara ọsụ siri bata n;aka ndị gọọmentị mba Iran.Akụkọ na-ekwu na anwụchiri ya na mba Iraq afọ gara aga.

    Zam bụ onye nwa Websaịt akpọrọ Amadnews nke na-ekwu megide gọọmentị mba Iran.

    Gọọmentị Iran boro Zam ebubo na o ji websait ya kpalie ma bido ngagharịiwe zuru mba ahụ ọnụ site n'afọ 2017 ruo afọ 2018.

    Ngalaba Na-ahụ maka ikike dịrị onye aha ya bụ Amnesty International kwuru sị, "Ike e ekpere zam abụghị ikpe ziri ezi n'ihi na ọtụtụ ndị gbara ama abụghị obi ha ka ha jiri gbaa ama".

  12. Akukọ ụwa ụtụtụ n'otu nkeji

  13. Gọvanọ El-Rufai abaala n'ọnọdụ nkwụcha dịka ndị nọ ya nso butere corona virus

    Aka na-achị Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai nọzị n'ọnọdụ nkwụcha nke abụọ ya dịka ọ sị na otu onye ezinaụlọ ya nakwa onye ọrụ gọọmentị ya butere nje corona virus.

    Ọ sị na ya ga-eme nnyocha n'ụbọchị ụka iji mara ma ọrịa ahụ efesara ya.

    Cheta na El-Rufai butere coronavirus n'ọnwa Maachị.

    Na nke yiri ya, Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu nke Legọs banyere ịnọdụ iche ụnyaahụ dịka otu onye nọ ya nso butere coronavirus.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  14. Na Akpọtụ Ugbu A, Ndị oji egbe 'atọrọla ọtụtụ ụmụakwụkwọ' na Katsina

    Akụkọ si Katsina state na Naịjirịa apụta na-ekwu na ndi oji egbe wakporo ụlọakwụkwọ Sekọnderị dị na Kankara ma tọrọ ọtụtụ ụmụakwụkwọ.

    Ndi uweojii gwara BBC na awakporo obodo ahụ n'ụbọchị Fraịde mana ha sị na ha amaghị maka ọtụtọ ụmụakwụkwọ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ DSP Gambo Isa gwara BBC na ihere ruru ụmụakwụkwọ 200 gbabara ọhịa oge ndị oji egbe a bịara apụtara.

    Ọ sịkwa na ndị uweojii na ndị oji egbe a kwara mgbọ nke mere ka mgbọ tụọ otu onye uweojii ma merụọ ya ahụ.

    DSP Isa gara n'ihu kwuo na ezipula ndị uweojii ka ha soro azụmụkwụ ndị oji egbe a ma nwuchie ha.

    Ọ sịkwa na a ka na-agụ umụakwụkwọ si ọhịa pụta na ndị nọ n'ime ụlọakwụkwọ ahụ ka ama mmadụ ole ha dị iji mata ma onwere onye a na-achọ achọ.

    Mana otu onye ji anya hu ihe a mere gwara BBC na-atọrọ ọtụtụ umụakwụkwo na mwakpo ahụ.

    Nwoke ahụ achọghị ka e dee aha ya sị: "N'ihu m ka ndi oji egbe si gafee ma malite ịgba egbe. Ha bara ụlọakwụkwọ ahụ ga kpụrụ ọtụtụ ụmụakwụkwọ nọ n'ime ya. Ọ bu kemgbe mgbede anyị nụrụ na ha ga-abịa. Anyị gwara ndị ọrụ nchekwa mana onweghị ihe ha mere."

  15. Anthony Joshua na Kubrat Pulev ga-ezute onwe ha taa ịmata mbe abụọ nke bụ oke

    Joshua na Pulev

    Onye bụ ọkaibe n'ịpịa ọkpọ n'ụwa dum ugbua bụ Anthony Joshua ga-ezute Kubrat Pulev n'ụbọchị Satọde bu ụbọchị 12 nke ọnwa Desemba n'ama egwuregwu Wembly.

    Mbande Ukwu IBF, WBA, WBO na IBO nọ Joshua n'aka bụ ihe a ga-erite ma akpịchaa ọkpọ a.

    Joshua enwerela mmerị 23 kemgbe ọ malitere ịkpịa ọkpọ. O ji nkurisi merie 21 n'ime asọmpị ndị a. E meriri ya otu.

    Pulev enwerela mmeri 28 kemgbe ọ malitere ịkpịa ọkpọ. O ji nkurisi merie 14 n'ime ha. E meriri ya otu kwa.

    Joshua meriri Andy Ruiz Jr na Saụdị Arebịya n'ọnwa Desimba nke 2019.

    Ọ bụ n'afọ 2017 mana mmerụ ahụ mere ka ọ gbajọọ ya.

  16. Ụlọikpe Ukwu Amerịka agbafuola mkpesa Trump na steeti Texas maka mmeri Biden

    Ụlọikpe Ukwu Amerịka

    Atụmatụ Onyeisiala Amerịka, Steeti Texas and iri na asatọ ndi ọzọ nwere iji gbanwee mpụtara ntuliaka mba ahụ apụọla afọ n’ala

    Ụlọikpe Ukwu nke mba ahụ gbajọrọ mkpesa Trump, steeti iri na itoolu nakwa ndị omeiwu otu narị na isii wetere n’ihu ha.

    Mkpesa a hụ chọrọ ka akagbuo vootu atụru na steeti Georgia, Michigan, Pennsylvania na Wisconsin.

    Joe Biden meriri ntuliaka e mere na steeti ndi ahụ.

    Mana Ụlọikpe Ukwu Amerịka kwuru na Texas enweghi ikike iwete ikpe ahụ ma ncha.

    Ọ bụ na Monde ka ndị "Electoral College" ga-atụ vootu a ga-eji họpụta onyeisiala site n'onye meriri steeti ha na-anọchite anya.

    Trump na-eti mkpe kemgbe na mpụ na nrụrụaka dị na ya bụ ntuliaka nke mere o jiri daa, mana onwebeghị akaebe o gosiri.

  17. Unu asaala chị?

    Taa bụ Satọde

    Anyi na-ewetere unu akuko si ụwa dum apụta.

    Ya gazie!

  18. Ka chi fo!

    Daalụ nụ maka ịnonyere anyị taa.

  19. 'Kwụsịnụ ịkụ mkpụrụ ọjọọ n'etiti ndị gọvanọ - Gọvanọ Wike na-agwa PDP

    Gọvanọ Nyesom Wike bụ aka na-achị Rivas steeti adọọla ndị ọtu ọrụ imeụlọ pati ya bụ Peoples Democratic Party (PDP) aka na ntị ka ha kwụsị ịkụ mkpụrụ ọjọọ n'etiti ndị gọvanọ nọ n'okpuru ha.

    Wike kwuru na nke a ga-etinye ọgbatauhie n'ohere pati a nwere iji zọta ọkwa onyeisiala n'afọ 2023.

    O kwuru na kama ịgbadosi ụkwụ ike n'elu ọchịchị "na-ezighi ezi nke All Progressives Congress (APC) na-achị kemgbe afọ ise, PDP ejirila aka ha na-adọsasị etiti pati ha".

    Wike gara n'ihu kwuo na ịkwesị ntụkwasị ebe Onyeisiala Muhammadu Buhari nọ, ga-enwe 'rịkọm' ma ọ bụrụ na ọ ghara ịza oku ndị ụlọomeiwu nta na-akpọ ya gbasara ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.

  20. ICC ga-enyocha ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa maka mmegbu ndị mmadụ

    Onye na-ekpe ikpe n'ụlọikpe ụwa bụ Fatou Bensouda ekwuola na ha achọpụtala ihe ruru iji nyocha ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa maka mmegbu mmadụ.

    Nke a pụtara ihe dịka o depụtara akwụkwọ ozi bụ mpụtara nyocha ha mere gbasara agwa ndị ọrụ nchekwa kpara na mpaghara uwgu Naịjirịa.

    Ihe ọzọ akwụkwọ mpụtara ahụ gosiri bụ na otu Boko Haram na otu ndị ọzọ yiri ya megidiere ikike ruru mmadụ site na: mwakpo, ogbugbu, ọlụlụ n'ike, ndina n'ike, mmegbu dị ukwu, mmegide ugwu mmadụ na ihe ndị ọzọ.

    Fatou Bensoudda