Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Mmadụ abụọ anwụọla dịka ndị oji egbe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'Ebonyi steeti

  2. 'Nna m pịara m ụtalị maka ịgba bọọlụ'

  3. Leicester City anapụla Chelsea iko FA ma bunye ha iko anya mmiri

  4. Kedụ etu Kelechi Iheanacho si bụrụ ụkwụ na-aghọ nkọ?

  5. E liela ndịagha Naịjirịa 12 ahụ e gburu na Benue Steetị

  6. West Brom emeela Chelsea tụtụrụ fụchaa, gbaa ha ọtọ ka ụwa hụ

  7. Onye bụdị Ugo Ugochukwu na-ewu na soshal midia?

  8. Security: Ndị Gọvanọ ọdịda anyanwụ ekwuola o zuola bụ na o zuola

  9. Kamaru Usman rere akpụ na Naịjirịa mana ugbua ọ bụ ọkaibe na UFC

  10. Akụkọ kachasị n'abalị a: Ọrụ agaghị akwụsị n'akwa Niger nke abụọ

  11. 'Ana m agbaburu egwuregwu ọsọ, mana ejirila m ya ritere Naịjiria ọlaedo' - Lauritta Onye

  12. Exercises: Ị ma na o nwere mgbe 'exercise' nwereike idula gị mmụọ?

  13. Etu m si bụrụ ọkaibe n'ịlụ ọgụ 'Martial art' ka awụchara m 'acid' - Lovethpatra Young

  14. "Ị chọrọ ime ọfụma dịka onye na-agba bọọlụ, mee ihe ndị a" - Henry Onyekuru

  15. Man City agwọọla Chelsea ka nkwọbi e ji tụọrọ afọ ọhụrụ aja

  16. Onye dọkịnta nwụrụ n'ime mmiri na họtelụ dị n'Abakaliki

    Onye na-egwu mmiri

    Ebe foto si, European Pressphoto Agency

    Nwa Dọkịnta ka si n'ụlọakwụkwọ pụta na-eme ọzụzụ aka isiike n'ọrụ Bekee kpọrọ Housemanship n Alex Ekwueme Federal University Teaching Hospital, Abakaliki, Ebonyi StEETI anwụọla ebe ọ gara igwu mmiri n'ụlọ oriri na nkwarị dị n'Abakaliki.

    ThankGod Odo bụ onye Okpuruọchịchị Ohaukwu dị n'Ebonyi steeti gara ịnwete onwe ya ya na ndị otu ya mgbe ya bụ ụgbatauhie dakwasara ya ụbọchị Tọzde.

    Onyeisi ya bụ ụlọ oriri na nkwarị achọghị ka a kpọọ aha ya ịs na "mgbe anyị kpọrọ ihe onyonyo nchekwa dị na-ebe ahụ, anyị chọpụtara na ya bụ nwaamadị tukwu na nkọ olulu mmiri ahụ, nọkete mikpuo n'ala mmiri ebe ndị ibe ya chere na ọ bụ mmiri ka ọ na-egwu".

    Akụkọ anyị nụrụ bụ na ọ na-akuziri ibe ya ka esị egwu mmiri ụbọchị ya bụ ihe mere ya. Mgbe anyị jụrụ onyenchịkọta ụlọ nkwarị ahụ ma ya bụ nwaaadị ọ ṅụrụ mmanya, ọ sị na "ọnweghị mmanya ọ ṅụrụ, kama ya na ndị otu ya bụkwa dọkịnta so bịa igwu mmiri mgbe ya bụ ihe mere" Ọ sị na ha ha dekwara ya mado n'ahụ aja ebe ahụ ka onye obula ṅụrụ mmanya ghara igwu mmiri.

    Ndị otu ya ahụ gbalịkwara ịzọ ya ndụ mana achọpụtara n'ọnwụrụ mgbe ha luru ụlọọgwụ.

    O bụ onyeisi kọmiti ndụmọdụ nke ụlọọgwụ ahụ bụ Dọkịnta Ewa Richard bụ onye kpebiri na ya bụ nwaamadị ahapụla.

    Richard sị na "Odo bụ ezigbo nwa maara ọrụ nke ọma, bụ onye kwesiri ịmeche "Housemanship" ya ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Disemba 2020".

  17. A machiela ịpịa ụmụaka ụtalị na Saụt Afrịka

  18. Ndị uweojii na Yuganda anwụchiela otiegwu OmahLay

    OmahLay otiegwu

    Ebe foto si, Twitter/OmahLay

    Ndị Uweojii na Yuganda anwụchiela otiegwu OmahLay na mmadụ abụọ ndị ọzọ maka ịda iwu covid-19.

    Ha kwuputara nke a n'ozi ha ziputere n'ụbọchị Sọnde.

    "Anyị nwuchiri mmadụ atọ maka mmemme egwu ha mere n'ogige Ddungu n'isi obodo mba ahụ bụ Kampal" ka ha kwuru.

    Ndị ọzọ anwụchikwuru bụ: Ivan Ddungu na-elekọta ogige ebe ọ bịara ti egwu nakwa Prim Kasana hibere ya bụ mmemme.

  19. Seun Kuti akọwaala ihe mere o ji mịpụta egbe n'abalị ụnyaahụ

    Seun Kuti

    Ebe foto si, BBC/Seun Kuti

    Seun Anikulapo Kuti bụ otiegwu a ma ama na Naịjiria ekwetala na a gbapụrụ mgbọ egbe mgbe ọgbaghara dapụtara mgbe eji ụgbọala dochie ihu be ya n’abalị Satọde.

    Mana o kwughi maọbụ ya gbapụrụ ya bụ egbe dịka ebubo mmadụ boro ya n’elu soshal midia si kwuo.

    N'ihe onyonyo dị na peeji instagram ya, o kwetara sị "eeee agbapụrụ egbe na ya bụ ihe... ị chọrọ ị me nzuzu ma chee na agaghị a nụ ụda egbe?"

    Okwu a malitere mgbe otu onye bụ Temitayo Ayetoto kọwara etu Kuti si malite iwe iwe mgbe e ji ụgbọala nọchie ihu be ya n'Allen Avenue, Ikeja dị na Legọs.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Skip Instagram post
    Hapụ Instagram ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of Instagram post

  20. Onyeisiala Buhari kpọpụtara Effiong Okon Akwa dịka onyeisi ọhụrụ NDDC

    Onyeisiala Buhari

    Ebe foto si, Twitter Page/Bashir Ahmad

    Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwetela ka ahọpụta onyeisi ọhụrụ nwa mgbe nta ngalaba Niger Delta Development Commission (NDDC) aha ya bụ Effiong Okon Akwa.

    Effiong Okon Akwa bụ onyeisi ndewe ego NDDC ga-ewere ọkwa onyeisi ngalaba ahụ ruo mgbe e mechara nyocha ebubo nrụrụaka na mpụ eboro ndị na-achịbu ngalaba ahụ.