Bishop Alexander Ibezim akwụsịla akwụkwọ ọ gbara Primate ụka Anglican n'ụlọikpe

Ebe foto si, Archibishop Alexander Ibezim/Lawyer
Archibishop Alexander Ibezim bụ Archbishop ụlọụka Anglican nke mpaghara Niger nakwa Bishop nke Awka Diocese akwụsịla akwụkwọ ikpe ọ gbara onyeisi (Primate) ụlọụka Anglican na Nigeria bụ Most Rev. Henry Ndukuba n'ụloikpe.
Akwụkwọ ndị ọkaikpe na-anọchiteanya Archbishop Ibezim degara ụlọikpe n'ụbọchị Fraịde 13 Nọvemba 2026, kwuru na o kpebiri ịkwụsị ịga n'ihu n'ikpe ahụ iji nye ohere ka ha kpezie okwu ahụ n'onwe ha nke Bekee kpọrọ 'out-of-court resolution.
Cheta na Archbishop Ibezim kpụpụrụ Bishop Henry Ndukuba n'ụlọikpe n'ọnwa Ọktoba 2026 maka na ọ kwụsịrị ya ọrụ ma gwa ya gaa ezumike ọnwa isii n'ihi ebubo ndị e boro ya na nnyocha ndị na-aga n'ihu na Diocese ya.
Nke a dị n'akwụkwọ ozi ha wepụtara na 13 Ọktoba 2026 ebe Onyeisi Anglican kwuru na mkpebi ịkwụsị Archbishop Ibezimọrụ dị n'akwụkwọ mpụtara nnyocha nkọmitii e hiwere ka ha nyochaa n'ihe na-eme na Diocese ahụ.
Bishop Ndukuba họpụtara Bishop Samuel Ezeofor dịka Archbishop ga-anọchi Bishop Ibezim n'oge ezumike ya ahụ a gwara ya gaa.
Ọ bụ n'ihi nke a ka Archbishop Ibezim ji kpụpụ Bishop Ndukuba ụlọikpe Ukwu dị n'Awka isiobodo Anbara state ma kwuo na Bishop Ndukuba enweghị ikike ịkwụsị ya ọrụ.
Cheta na okwu a bụ nke kpaliri ọtụtụ nrụrịtaụka n'ebe dị iche iche banyere ihe mere Archbishop jiri kpụpụ onyeisi ụka Anglican na Nigeria.
Ebe ụfọdụ kwadoro ya, ndị ọzọ kwuru na nke a metọrọ iyi ha ṅụrụ dịka ndị ụkọchukwu n'ụka Anglica.
Esemokwu a mekwara ka ndị ụka Anglican nke Diocese Awka yie egwu na ha nwereike ịhapụ nzukọ Anglican nke Nigeria ma ọ bụrụ na mmaja na ntinye aka n'ihe gbasara ha akwụsịghị.
Ndịisi Diocese ahụ mere mkpebi ahụ na nzukọ ha mere na 16 Ọktoba 2026 n'Ifite Awka, Anambra State, ebe ha nyere Archbishop Ibezim nkwado.
Ha jụkwara nhọpụta Rt Rev Samuel C. Ezeofor ka ọ bụrụ onye ga-elekọta Diocese Awka na onye nhazi nke Province nke Niger.
Mana ka ọ dị ugbua, Archbishop Ibezim akwụsịla ikpe ahụ ma kwuo na ọ chọrọ ka e kpezie okwu nke Bekee kpọrọ 'out-of-court resolution'.




























