Festus Oshabah Ferotox: Gọvanọ Peter Mbah na dị ọzọ atụọla arịrị maka ọnwụ ọrụụzọ a nihe mberede okporoụzọ

Festus Oshabah
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Arịrị na eye mmiri ejula ọtụtụ ụmụafọ Nigeria ọkachasị ndị ọwụwa anyanwụ dịka otu onwe nwere agba mabụụkwa onye nwe ụlọọrụ na-arụ okporoụzọ akpọrọ Ferotex Constructions.

Ichie Festus Oshaba-Onuh,nwụrụ ụbọchị Tọzde, abalị 19 nke ọnwa Novemba na ihe mberede okporoụzọ mere n'okporoụzọ si Enugu -gawa Port-Harcourt, dịka gọvanọ Enugu State bụ state ya si kwuo n'ozi o wepụtara n'akara ọbaozi ya na X a mabụ dịka Twitter n'ụt utụ Fraide.

Ozi ahụ sịrị,"Ọ bụ na nnukwu obi mwute ka m ji nweta ozi mgbawaobi maka ọnwụ nwanne anyị nwoke bụ Ichie Chief Festus Oshaba-Onuh n'ihe mberede okporoụzo n'okporoụzọ wara awara si Enugu gawa Prota-Harcourt."

Gọvanọ Mbah gara n'ihu kọwaa Oshaba dịka, "onye na-emere ọha ọgọ, onye hụrụ ala na ya naya nakwa onye nwere mmasị n'ọganihu nke Enugu State site na inye aka na mwulike ewumewu na-enyere ndụaka na state anyị"