Ọ bụghị anyị gburu onye nwụrụ na ngagharịiwe n'Ogbomoso - Ndị uweojii

Ebe foto si, Ndị uweojii Naịjirịa
Ndị uweojii n'Oyo steeti ekwuola na ọbụghị ha gburu nwata nwoke ahụ nwụrụ na ngagharịiwe n'Ogbomosho.
Cheta na Gọvanọ steeti ahụ kwuru na ọ bụ mgbọ tụgburu nwata nwoke a aha ya bụ Jimoh Isiaq.
Mana onụ na-ekwuru ndị uweojii na Oyo steeti bụ Olugbenga Fadeyi kwuru na ndị otu ya nọ mgbe ihe na-eme kwuru na ha agbapụghị kama otu ọnụ egbe.
Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ News Agency of Nigeria si kwuo, Fadeyi kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o nyere ndị ntaakụkọ.
O kwuru sị: "Ndị uweojii nọ ya mgbe ngagharịiwe a na-eme kwuru na ha agbapụghị kama otu ọnụ egbe."
"Anyị hapụrụ ndị ahụ na-eme ngagharịiwe ruo ihe karịrị otu awa, mana ụfọdụ n'ime ha chọziri ịwakpo ụlọọrụ anyị."
"Ọ bụ oge ahụ ka ndị uweojii ji gbaa anwụrụ ose (tear gas) iji chụsaa ha, mana anyị agbaghị egbe ọbụla.
Otu dị icheiche, tinyere Amnestry International kwuru na ọnwụ Jimoh Isiaq dị ndị uweojii n'isi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post













