Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ọ bụghị anyị gburu onye nwụrụ na ngagharịiwe n'Ogbomoso - Ndị uweojii

    Mohammed Abubakar
    Nkọwa foto, Onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Abubakar

    Ndị uweojii n'Oyo steeti ekwuola na ọbụghị ha gburu nwata nwoke ahụ nwụrụ na ngagharịiwe n'Ogbomosho.

    Cheta na Gọvanọ steeti ahụ kwuru na ọ bụ mgbọ tụgburu nwata nwoke a aha ya bụ Jimoh Isiaq.

    Mana onụ na-ekwuru ndị uweojii na Oyo steeti bụ Olugbenga Fadeyi kwuru na ndị otu ya nọ mgbe ihe na-eme kwuru na ha agbapụghị kama otu ọnụ egbe.

    Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ News Agency of Nigeria si kwuo, Fadeyi kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o nyere ndị ntaakụkọ.

    O kwuru sị: "Ndị uweojii nọ ya mgbe ngagharịiwe a na-eme kwuru na ha agbapụghị kama otu ọnụ egbe."

    "Anyị hapụrụ ndị ahụ na-eme ngagharịiwe ruo ihe karịrị otu awa, mana ụfọdụ n'ime ha chọziri ịwakpo ụlọọrụ anyị."

    "Ọ bụ oge ahụ ka ndị uweojii ji gbaa anwụrụ ose (tear gas) iji chụsaa ha, mana anyị agbaghị egbe ọbụla.

    Otu dị icheiche, tinyere Amnestry International kwuru na ọnwụ Jimoh Isiaq dị ndị uweojii n'isi.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  2. Mgbọ ndị uweojii atụgbuola otu onye na ngagharịiwe n'Oyo steeti

    Ndị uweojii
    Nkọwa foto, Ọ bụghị ndị nọ na onyonyo a ka akụkọ a na-ekwu maka ya

    Otu onye aha ya bụ Jimoh Isiaka alaala mmụọ dịka mgbọ ndị uweojii tụrụ ya oge a na-eme ngagharịiwe n'obodo Ogbomoso dị n'Oyo steeti.

    Gọvanọ steeti ahụ bụ Seyi Makinde kwupụtara nke a n'akara Twitter ya na mgbede Satọde.

    O kwuru na aka ike nakwa mmekpa ahụ ndị uweojii na-emeka ụmụ mmadụ na Naịjirịa bụ nnukwu ihe mwute.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Makinde kwukwara na mmadụ asaa ọzọ merụkwara ahụ na ngagharịiwe ahụ; aha abụọ n'ime ha bụ Abdulrasaq Olawale na Oluwadamilare Gbolohunmi.

    O kwuru sị: "Ngagharịiwe a egosila na ndị iwu Naịjirịa nyere ikike ichekwa ụmụ mmadụ anaghị eme nke a."

    "O gosikwala mkpa ajụjụ anyị na-ajụ kamgbe dị, nke bụ ihe kpatara na ndị gọvanọ enweghị ike ịchịkọta ndị uweojii nọ na steeti ha."

    Makinde gara n'ihu kpọọ oku ka ndị ntorobịa steeti ahụ wetuo obi maka ihe a merenụ n'ihi na ọ gwala onyeisi ndị uweojii Oyo steeti bụ Nwachukwu Enwonwu, na ndị isi ọrụ nchekwa ndị ọzọ ka ha bịa kọwaara ya ihe kpatara ọnwụ nwata nwoke ahụ.

    Ihe onyonyo ndị mmadụ tinyere na Twitter gosiri na e liela ya bụ nwata nwoke dịka usoro okpukperechi ndị alakụba si dị.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  3. Ngagharịiwe maka SARS eruola mba Canada

    Ndị na-eme ngagharịiwe

    Ụmụ Naịjirịa bi na mba Canada sonyekwara ndị nọ na Naịjirịa na-eme ngagharị iwe ma na-akpọ oku ka gọọmentị mechie ngalaba ndị uweojii a kpọrọ Sars.

    Ihe onyonyo e tinyere na Twitter gosiri ebe ha jicha ọkọlọtọ Naịjirịa ma na-ekwe ukwe njirimara Naịjirịa bụ 'National Anthem'.

    ọtụtụ n'ime ha na-etikwa mkpu ka gọọmentị mechie SARS n'egbughị oge.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  4. SARS: Mba Sweden etinyela ọnụ katọọ aka ike ndị uweojii na Naịjirịa

    Carl Michael Gräns
    Nkọwa foto, Carl Michael Gräns bụ onye na-anọchite anya mba Sweden na Naịjirịa, Ghana nakwa Cameroun

    Mba Sweden ekwuola na ha anaghị akwado mmekpa ahụ ndị uweojii na-emekpa mmadụ na Naịjirịa.

    Ha kwuru nke a dịka ihe onyonyo na-apụta na soshal midi etu ndị uweojii si eji aka ike achụsasị ndị na-eme ngagharịiwe.

    N'ozi ha zipụrụ n'akara Twitter ha, ụlọ nnọchite anya mba Sweden na Naịjirịa kwuru na ha agaghị akwado mkpagbu ikike dịịrị ndị mmadụ ine ngagharịiwe ma kwuo uche ha.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Nke a na-abịa dịka akụkọ na-ekwu na ndị uweojii gbagburu otu onye aha ya bụ Jimoh Isiaq n'obodo Ogbomosho nke dị n'Oyo steeti.

    Ụlọọrụ na-ahụkwa maka ikike dịịrị onye bụ Amnesty International, tinyekwara ọnụ ma kwuo na ọ bụ ndị uweojii gburu onye ahụ.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    BBC achọpụtachabeghị ihe merenụ kpọmkwem, mana ya bụ akụkọ ka ga-abịa.

    Ndị uweojii ekwubeghịkwa ihe ọbụla gbasara ya.

  5. Ezenwaanyị Elizabeth etunyela Rashford ugo pụrụ iche

    Marcus Rashford
    Nkọwa foto, Marcus Rashford

    Ezenwaanyị Eliza etunyela ọgba bọọlụ ndị Manchester United bụ Marcus Rashford ugo pụrụ iche maka mbọ ọ gbara inye ụmụaka onweghị ka ọ ha ha nri, n’oge a kpọchiri obodo maka ọrịa covid-19.

    Nturu ugo bụ nke Bekee kpọrọ ‘Member of the Order of the British Empire’ (MBE).

    Rashford tinyere ego ya ma kpọkwaa oku ka ndị mmadụ tụkọta ego iji na-enye ụmụntakịrị nri.

    Dịka a malitere ịgbape obodo obere obere, Rashfor gakwara n'ihu n'atụmatụ ahụ ma rịọkwaa gọọmentị ka ha tinye aka.

    Oge Rashford malitere atụmatụ a, o bu n'obi na ndị mmadụ ga-etinye aka tụkọta otu narị puku paụnd (£100,000), mana ka ọ dị ugbua, ego a tụkọtara agafeela nde paụnd iri abụọ (£20 million).

  6. Burna Boy etinyela ọnụ n'okwu maka ịkwụsị SARS

    Burna Boy

    Otiegwu aha ya na-ewu n'ụwa niile bụ Burna Boy etinyela ọnụ ya n'okwu gbasara mmekpa ahụ ndị uweojii na-emekpa ndị mmadụ na Naịjirịa.

    Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ya maka ịgbachị nkịtị kamgbe ngagharịiwe malitere ịrị ibe ya elu maka nke a.

    O kwuru na ya agaghị agbachị nkịtị gbasara nke a n'ihi na ya bụ ihe jọgburu onwe ya.

    Burna Boy gara n'ihu kwuo sị: "Ihe kacha m mkpa ugbua bụ ka ndị ka e mechie ngalaba ndị uweojii a bụ SARS."

    "O doro m anya na ihe a na-emebu na mbụ bụ ịgbanwe aha ha, nye ha aha ọhụrụ, mana ugbua, ihe anyị chọrọ bụ ka e mechie ya kpamkpam."

    Burna boy kelere ndị niile sonyere na ngagharịiwe na-aga n'ihu na steeti dị icheiche na Naịjirịa ugbua.

    O kwukwara na ya ga-ewepụta ego iji nyere onye ọbụla merụrụ ahụ na ngagharịiwe a aka.

    Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya ga-emepe ngalaba ga-enye aka ịkuziri ndị na-eto eto maka ntọala Naịjirịa nakwa Afrịka.

    Burna Boy kpọpụtara aha ụfọdụ ndị akụkọ kwuru na ha nwụrụ n'aka ndị uwe ojii ma kwuo na agaghị echefu aha ha.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  7. Ndị uweojii ejirila egbe kụsasịa ndị na-eme ngagharịiwe na Ogbomosho

    Ihe onyonyo pụtara na soshal midia na-akọwa na ndị uweojii ji mgbọ egbe chụsasịa ndị na-eme ngagharịiwe maka mkagbụ ha na-ebo ndi uweojii SARS n'Ogbomosho di n'Oyo steeti.

    Otu onye nọ oge ihe mere gwara BBC na mgbo egbe tụrụ otu onye mana ya akpọrọla ya gaa ụlọ ọgwụ.

    Onye ahụ zitere BBC ihe onyonyo gosiri ebe a ba-acho ịzọ onye bu akpa yiri nke mgbọ egbe.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ọnu na-ekwuru ndị uweojii n'Oyo steeti Fadeyi Olugbenga gwara BBC na onweghi onye ọbụla ha gbara egbe, ma kwụọ na ọ bụ anwụrụ anya mmiri ka ha jiri kụsasịa ndị a na-eme ngagharịiwe.

  8. Emebiela ọtụtu ihe dịka ọgbaghara dara n'etiti ndị Awụsa na Yoroba n'Ikorodu dị na Legọs

    Mpaghaara obodo Igbo-Olomu dị n'Isawo-Agric nke di n'okpuru ọchịchị Ikorodu, na Legọs steeti chiobi ha n'aka dịka ọgbaghara dara n'ebe ahụ ụbọchị Fraịde.

    Onye ntaakụkọ BBC bi n'ogige ihe a na-me kwuru na ebe niile juru oyi ugbua dịka ndi mmadụ nọ na-ezere isi ha n'ime ụlọ ha.

    Akụkọ na-ekwu na nsogbu a malitere n'ụbọchi Monde dịka ikorobia ụfọdụ si agbụrụ abụọ a lụsịrị onwe ya ọgụ n'ebe ahụ.

    Ugbua, ọkụ ndị a na-ese okwu mụnyere agbaala ọtụtụ ọdọ ahịa.

    Ikorodu
    Nkọwa foto, Ndi mmadụ nọcha n'ime ulọ ha eze isi ha maka ọgbaghara a dara na Fraịde
    Nsogbu Ikorodu
    Nkọwa foto, Onye ntaakụkọ BBC si na ebe niile di juo ugbua

    Ihe onyonyo ndi mmadụ tinyere na soshal midia na-egosi oge ọgbaghara ka dị ọkụ, dịka nke a etinyere na Twitter n'ụbọchị Tọzde.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  9. Algeria adụnyela Naịjirịa otu ọnụ akara n'asọmpi enyi na enyi

    Super Eagles nke Naịjirịa

    Otu egwuregwu bọọlụ mba Ọjerịa ji otu ọkpụ goolu anasataghị merie ndị Super Eagles nke Naịjirịa n'asọmpi enyi na enyi ha gbara na Fraịde.

    Goolu a bịara n'ime nkeji isii a malitere asọmpi a site n'aka Ramy Bensebaini nke Ọjerịa.

    Naịjirịa nwara ike ha ịsa goolu a mana ndị Ọjerịa fooro ntụtụ taa sị na nke a agaghị eme, ebe na Naịjirịa kwechikwara nke ga.

    Nke a bụ asọmpi mbụ oche goolu ndị Naịjirịa bụ Maduka Okoye na-amalite.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  10. Agwaala onyeisi ndi uweojii ka ọ mee ihe maka SARS - Buhari

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwuru na ya na onyeisi ndi uweojii bụ Muhammed Adamu zutere n'obi gọọmentị n'Abuja maka okwu ngalaba uweojii a na-akpọ SARS.

    Buhari sị na ya agwaala maazị Adamu ka ọ gbaa mbọ lebanye anya n'okwu ndị ntoroọbịa na-eme ngagharịiwe na-eme banyere mmekpa ahụ ha na-ebe ndị ọrụ uweojii SARS.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Buhari sị na ya enyela iwu ka anwụchie onye uweojii ọbụla aka ya dị n'ajọ ihe ndị a na-ebo ndị SARS.

    Ọ rịrịọ arịrịọ ya ndi mmadụ nwee ume ala dịka ha na-eme ngagharịiwe n'udo.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  11. Unu asaala chi?

    Anyị na-enye unu ekene pụrụ iche dịka unu na-esonye anyị taa.

    Akụkọ pụrụiche ga-esi ebe ruo unu aka.

    Ya gazie.

  12. Ka chi fo

    Ụmụ Igbo, anyị ga-akwụsị ebe a taa.

    Ka chi fo nụ.

  13. Ndi amakaekwu agbabuola onye omeiwu na mba Gana

    Ekow Quansah Hayford

    Na Ghana akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ndị omekome gbagburu otu onye omeiwu mba ahụ.

    Ndị ajọ mmadụ a gbagburu Ekow Quansah Hayford n'ụzọ ebe o sị emume ịchụnta votu patị ha alọta n'isiututu Fraịde.

    Akụkọ kwuru na ndị amakaekwu mmadụ isii ji egbe nwakporo ya bụ nwaamadị na-anọchị anya ndị Mfantseman ka ọ na-alọta ebe elekere nke mbụ ụtụtụ Fraịde.

    Ọbaozi ntaakụkọ ndị Joy Online si na ya bụ nwaamadị kọwaara ha onwe ya tupu ha agbaa ya ọnụ egbe abụọ sị ya na ọ bụ ya bụtere nsogbu dị na Gana.

    Redio Citi Fm kwukwara na ha gbakwara draịva ya egbe, mana ọ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua. Onweghị ihe metutara mmadụ atọ ndị ọzọ so ha.

    Cheta na ntuliaka ndị Gana na-abịa n'ụbọchị asaa nke ọnwa Disemba.

  14. Ụmụnwaanyị emeela ngagharịiwe na Malawi

    Ụmụnwaanyị na-eme ngagharịiwe

    Ọzọ dịka ibe ya, n'Afrịka, bụ na ndị mmadụ emeela ngagharịiwe maka ihe ha kpọrọ ịkpaoke ụmụnwaanyị n'owuweọrụ na gọọmentị Malawi.

    Ndị mere ya bu ngaghịiwe sị na onyeisiala ha bụ Lazarus Chakera eweghị ụmụnwaanyị n'ọrụ dịka iwu kwesiri.

    Iwu be ha kwuru na ọnweghị ụmụnwoke maọbụ ụmụnwaanyị ga-akarị pasent iri isii n'ọchịchị ebe ha si na ụmụnwaanyị nọ n'ọchịchị erughị pasent iri atọ.

    Ndị kpokobara ya bụ ngaghrịiwe bụ ndị Women’s Manifesto Movement sị na onyeisiala ha anaghị eme ihe ha turu anya.

    Nke a mere ka onyeisiala ha si njem abali atọ o mere na Tazania gbalata na mberede.

  15. Ụlọikpe na Port Harcourt amaala onye mgbuisi, Gracious David-West, ikpe ọnwụ

    Gracious David-West

    Ụlọikpe na Port Harcourt, River steeti, ekpebiela ikwugbu ya bụ nwaamadị na-egbu ụmụagbọghọ na họtelụ n'Igweọcha, River steeti.

    E kpere David-West ikpe ọchụ n'isi ụmụnwaanyị itoolu ya na ịkpankata igbu onye ọzọ.

    Onye okaikpe kpebiri ya bụ ikpe bụ Jọstis Adolphus Enebeli kpebiri na ọ bụ Graciuos David-West gbara afọ iri anọ gburu Maureen Ewuru, Jennifer Nwokocha, Blessing Effiong Linda Warifa Samuel, Dorcas Francis, Kelechi Bridget, Onuoha Rose, Samuel Anthonia Ibe ma kpakwaa nkata igbu Benita Etim.

    Ikpe David-West malitere na Pọtakọtụ kemgbe ọktoba 2019 mgbe ndị uweojii kpaara ya aka n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa ahụ.

    Onweghị onye gosiri onwe ya maka ịgwado David-West maọbụ ndị o gburu kemgbe ya bụ ikpe malitere.

    Onweghịkwa ndị bịara iburu ozu ụmụnwaanyị ndị ahụ n'ụlọ ndowe ozu.

  16. Ndị uweojii na-achọ onye otu ha gbara nwaanyị egbe n'ọnụ na Legọs

    Ndị uweojii na Legọs ekwuola na onye gbara nwaada Joy Eze egbe n'ọnụ na Legọs bụ onye otu ha anaọghị n'ọrụ oge ọ kpara mkpa mkpa a.

    N'ozi ha tinyere n'akara Twitter ha, ndị uweojii Legọs sị na onye uweojii a aha ya bụ Eze Aiwansoba gbara Eze egbe n'ọnu ka ha na-ese okwu.

    Ndị Uweojii sị na mmadụ abụọ a nwere mmekọrịta.

    Joy Eze na-anata ọgwụgwọ n'ụlo ọgwụ ebe a na-achọ Maazị Aiwansoba achọ.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  17. Ǹdị uweojii ejirila anwụrụ anya mmiri chụsasịa ndị na-eme ngagharịiwe maka SARS n'Abuja

    Ndị na-eme ngagharị iwe maka ngalaba uweojii Bekee kpọrọ "Special Anti Robbery Squad" (SARS).

    N'akụkọ ha tinyere na soshal midia gosiri ebe e ji anwụrụ anya mmiri achụsasị ndị na-eme ngagharịiwe n'Abuja.

    Nke a na-abịa dịka ndị na-eme ngagharịiwe gburu otu onye uweojii n'Ughelli dị na Delta steeti, dịka ndị uweojii siri kwuo.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  18. FBI akụsaala otu chọrọ ịtọrọ Gọvanọ obodo Michigan

    Mmadụ isii kpara nkata ịtọro gọvanọ
    Nkọwa foto, Adam Fox, Brandon Caserta, Daniel Harris, Kaleb Franks, Ty Garbin, Eric Molitor, Michael Null na William Null.

    Ngalaba nchekwa na nyocha nke mba Amerịka bụ Federal Bureau of Investigation bụ FBI n'aha ịchafụ ya ekuwola na ha ejidela otu chọrọ ịtọrọ ma wepụ Gretchen Whitmer dịka Gọvanọ steeti Michigan.

    Whitmer na-akpasu ọtụtụ ndi mmadụ iwe bụ ndị na-ekwenyeghị na coronavirus dị, dịka o tinyere iwu ụfọdụ si siri ike maka nchekwa coronavirus.

    Ndị ọrụ gọọmentị sị na mmadụ isii a bụ ụmu nwoke kpara nkata ijide Whitmer ma kpee ya ikpe adịgboroja maka ebubo imegide mba Amerịka.

    Mmadụ isi a bụ Adam Fox, Barry Croft, Kaleb Franks, Daniel Harris, Brandon Casert na Ty Garbin bụ ndị agbara akwụkwọ n'ụloikpe maka ịbụ otu oyi egwu na iso na otu ọjụọ.

  19. Atụmatụ 'World Food Programme' eritela ntụrụgo Nobel Peace Prize nke afọ 2020

    WFP

    Kọmịtị na-ahụ maka ntụrụgo World Food Programme enyela atụmatụ akpọrọ 'World Food Programme' nturugo ahụ nke afọ 2020.

    Ha kwuru na atụmatụ ahaụ gbara mbọ ịkwụsị ndị mmadụ iji agụrụ ebute nkewa na agha n'eitit ndị mmadụ.

    Otu onye na-ekwuchitere otu ahụ kwuru na ọ bụ "oge afọ ojuju" dịrị ha.

    Echere na atụmatụ ahụ akpọrọ WFP na-enyere ihe ruru nde iri itoolu na asaa aka na mba ụwa ruru iri asatọ na asatọ n'ụwa.

    Nturugo ahụ pụtara Krona nde iri.

  20. Ndị na-eme ngagharịiwe egbuola otu onye ụweojii na Delta

    Ndị uweojii ebola ndị na-eme ngagharịiwe na Delta steeti ebubo ịgbu otu onye nke ha ma zurukwa otu egbe AK-47.

    Ha kwuputara nke a n'akara Twitter ha ma kpoo oku ka ọgbaghara na mwakpo si na ngagharịwe a mapụta kwụsị kpam kpam.

    Onyeisi ndị uweojii bụ M.A. Adamu katọkwara mwakpo na mmebi ngwa ọrụ ndị uweojii nke mere n'obodo Ughelli dị na steeti ahụ.

    Cheta na ọ bụ ihe onyonyo si n'Ughelli pụta n'ụbọchị satọde gosiri ebe ndị uweojii wakporo otu onye ntorọbịa ma buru ụgbọala ya gbapụ bụ ihe malitere ngagharịiwe na-eme ebe niile na Naịjirịa ugbua.