'Onye ga-atụpụrụ Nnamdi Kanu ọnụ maka 100 million o tinyere n'isi gọvanọ Wike?'

Ebe foto si, Getty Images
Kọmishọna mgbasa ozi gọvanọ Rivers State bụ Paulinus Nsirim ekwuola na gọọmenti Rivers State agaghị atụpụrụ onye ndu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ọnụ maka okwu naira nde 100 o tinyere n'isi gọvanọ Nyesom Wike.
Ọ kwuru na ọ ka na-agbagoju ya anya etu ndị ntaakụkọ si buru akụkọ ahụ na-efesa ma na-achọ ka ha nụ n'ọnụ gọọmenti Rivers State gbasara ya.
Cheta na Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivas Steetị enyela ndịisioche okpuruọchịchị dị na steetị ahụ iwu ka ha nwuchie ndị Ipob niile nọ n'okpuruọchịchị ha.
Nke a na-abia dịka nso nso a na ọgbaghara dapụtara n'Oyigbo dị na steetị ahụ n'etiti ndị Ipob na ndị ọrụ nchekwa ebe Ipob fere ọkọlọtọ ha.















