Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. 'Onye ga-atụpụrụ Nnamdi Kanu ọnụ maka 100 million o tinyere n'isi gọvanọ Wike?'

    Nnamdi Kanu na Ipob

    Kọmishọna mgbasa ozi gọvanọ Rivers State bụ Paulinus Nsirim ekwuola na gọọmenti Rivers State agaghị atụpụrụ onye ndu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ọnụ maka okwu naira nde 100 o tinyere n'isi gọvanọ Nyesom Wike.

    Ọ kwuru na ọ ka na-agbagoju ya anya etu ndị ntaakụkọ si buru akụkọ ahụ na-efesa ma na-achọ ka ha nụ n'ọnụ gọọmenti Rivers State gbasara ya.

    Cheta na Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivas Steetị enyela ndịisioche okpuruọchịchị dị na steetị ahụ iwu ka ha nwuchie ndị Ipob niile nọ n'okpuruọchịchị ha.

    Nke a na-abia dịka nso nso a na ọgbaghara dapụtara n'Oyigbo dị na steetị ahụ n'etiti ndị Ipob na ndị ọrụ nchekwa ebe Ipob fere ọkọlọtọ ha.

  2. Onye bụ Amy Coney Barett?, Ihe anyị maka Amy Coney Barett bụ ọkaikpe ọhụrụ nke ụlọikpe kachasị na mba Amerịka

    Amy Barett

    Ụlọomeiwu mba Amerịka ahọpụtala Amy Coney Barett dịka onye ga-anọchi n'ọkwa nke Ruth Bader Ginsburg hapụrụ mgbe ọ nwụrụ.

    Nke a mere n'ime naanị otu izuụka tupu e mee ntụliaka ọkwa onyeisiala na mba ahụ.

    Ndị otu Republican tụnyere vootu ihe pụtara 52-48 iji meri otu Democrats na-achọghị ka o rite ya bụ ọkwa.

    Onye bụ Amy Coney Barett?

    Amy Barrett
    • Amy Coney Barrett bụ onye ọkwaiwu
    • Ọ nwetara ọzụzụ ịbụ onye ọkaiwu na Mahadum Notre Dame
    • Ọ na-aka ụka katọlịk ma kwuo na ọ gaghị akwụsị ya ịrụ ọrụ ya ọfụma
    • O nwere ụmụ asaa, abụọ n'ime ha bụ ndị o si mba Haiti zụpụta.
    • Ya na di ya bi n'obodo South Bend Indiana.
    • O kwenyere na ị gụpụta iwu ala dịka e si dee ya n'agbanweghi ihe ọbụla iji sonye oge a nọ na ya.
  3. Gọvanọ Wike enyela iwu ka a chọpụta ndị Ipob niile nọ na Rivers Steetị

    Gọvanọ Nyesom Wike

    Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivas Steetị enyela ndịisioche okpuruọchịchị dị na steetị ahụ iwu ka ha nwuchie ndị Ipob niile nọ n'okpuruọchịchị ha.

    O dọrọ aka na ntị na onyeisioche ọbụla hapụrụ ndị Ipob ka fee ọkọlọtọ ha n'okpuruọchịchị ga-anata ntaramahụhụ.

    Wike kwuru nke a mgbe ya na ndịisioche okpuruọchịchị, ndịisi obodo, ndị ntoroọbịa na ndị obodo nwere mkparịtaụka na Pọtakọtụ na Mọnde.

    Ọ sị na Rivas Steetị bụ obodo udo na-anabata onye ọbụla na-agbanyeghi agbụrụ onye ahụ si pụta na ha agaghị anabata ka Ipob mebie steetị ya.

    Gọvanọ Nyesom Wike

    "E nwere otu a sị na-eyi ndụ egwu a kpọrọ Ipob". Ọ bụghị m kpọrọ ha ndị oyi ndụ egwu, ọ bụ ụlọikpe kpọrọ otu na-eyi ndụ egwu.

    Wike nyekwara iwu sị ka a majakwala onye Igbo ọbụla na-aga mkpa ya n'ụzọ ziri ezi na-enweghi nsogbu ọbụla.

    Cheta na nso nso a na ọgbaghara dapụtara n'Oyigbo dị na steetị ahụ n'etiti ndị Ipob na ndị ọrụ nchekwa ebe Ipob fere ọkọlọtọ ha.

  4. Unu apụtala ụtụtụ?

    Ọ bụ ebe a ka anyị dopuru iche ịwetara unu akụkọ ndị dị mkpa taa.

    Jisinuike sonye anyị na-eleghi anya n'azụ.

    Yagazie.

  5. Ka chi bọọ nụ

    Igbo ndị ọma, ka anyị wụsa ọwa ebe a.

    Soro anyị echi maka akụkọ ga-amasị gị.

  6. Akụkọ ga-amasị gị gbasara ọnọdụ coronavirus n'Afrịka

  7. A kwụwala ndị Heartland FC ụgwọ ọnwa e ji ha

    Ndị egwu Heartland FC

    A malitela ịkwụ ndị otu Heartland FC ụgwọ ọnwa ndị e ji ha kemgbe ọnwa ole na ole gara aga.

    Solomon Onu bụ ọnụ na-ekwuru klọb ahụ gwara BBC Igbo n'ekwentị na a kwụọla ha ihe ruru ụgwọ ọnwa ọnwa anọ.

    O kwuru na e nwee ndị a ka ji ụgwọ ugbua, na ọ ga-abụ ndị ụlọakụ ha nwere otu nsogbu maọbụ abụọ, maọbụkwanụ ndị enwebeghi ike ịbata bịa denye aha ha maka ịnara ego ha, n'ihi na o so n'otu iwu e wepụtara tupu a kwụọ ya bụ ụgwọ (na onye ọbụla ga-ejiri aka ya denye aha ya nakwa ihe njirimara ndị ọzọ tupu a kwụọ ụgwọ a).

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  8. Aka akparala ndị Naịjiria zoro n'ụgbọmmiri na mba Briten

    Ụgbọmmiri tanka

    Ndị agha batara n'ụgbọmmiri e ji ebu mmanụ a na-enyo na ndị omekome jichiri, nwụchiri mmadụ asaa n'ebe a kpọrọ Isle of Wight na mba Briten, n'abalị Sọnde.

    E nyefere mmadụ asaa ahụ e che na ha bụ ndị Naịjirịa na-achọ ikike a na-enye ndị gbara ọsọ ndụ, n'aka ndị uweojii Hampshire.

    E nweghi ihe mere mmadụ 22 na-arụ na ya, dịka ụgbọmmiri ahụ mechara kwụsị njem na Southampton.

    Ndị nwe ụgbọmmiri ahụ bụ Navios Tanker Management, kwuru na ụjọ tụwara onye na-achịkọta ụgbọmmiri ahụ ka ọ hụrụ etu ndị ahụ si na Legọs zobata n'ụgbọmmiri ahụ si na-enye nsogbu.

    Nave Andromeda
    Nkọwa foto, A wakporo ebe ahụ n'abalị, n'ihe na-akarịghị nkeji itoolu
  9. Ụlọọrụ NECO akwụsịla ule SSCE

    Ndị na-ele ule klassị ịkpeazụ n'ụlọakwụkwọ sekọndrị

    Ụlọorụ na-ahụ maka ule SSCE nke na-aga ihu ugbua akwụsịla ule niile rue mgbe amabeghị n'ụbọchị ụka.

    Ọnụ na-agbasara ụlọọrụ ahụ ozi bụ Azeez Sanni kọwara na ha mere nke a n'ihi ọgbaghara na nsogbu nchekwa nke si na ngagharịiwe END SARS dapụta.

    Ha kwuru na ule a ga-amalite ọzọ mgbe o doro anya na ihe niile laghachiri etu o si dị mbụ.

  10. Lee Kun-hee bụ onyeisioche Samsung alakwurula ndị nna nna ya n'afọ 78

    Lee Kun-hee

    Lee Kun-hee bụ onyeisioche Samsung alakwurula ndị nna nna ya.

    Kun-hee dị afọ iri asaa na asatọ mgbe ọ nwụrụ, nyere aka ịzụlite obere azụmahịa nna ya nwere ruo ebe ọ nọ ugbua, mere ya ide kacha jide ego na mba Saụt Koriya.

    Ụlọọrụ Forbes depụtara ya dịka onye kacha nwe akụ na ụba na mba Saụtụ Korịa dịka ego ya na-chụ ogo pound 16 billion($21bn).

    Ndị ụlọọrụ Samsung kwuru na Lee nwụrụ taa bụ ụbọchị ụka October 25,2020 mana ha edepụtaghị ihe butere ọnwụ ya.

    Obi nkoropu o nwere kamgbe afọ 2014 mere ka ọ bụrụ onye a na-elekọta anya mgbe ọbụla.

    Ihe mere Lee ka ọ bụrụ onye ama ama bụ mgbe ọ gwara ndị ọrụ Samsung n'afọ 1993 ka ha gbanwe ihe niile belụsọ nwunye ha na ụmụ ha.

    Nke a mere ka Samsung gbaa ekwenti ruru otu narị na iri ise(150,000) ọkụ.

  11. Igbo ndị ọma ndewonu!

    Nke onye chiri ya zere dịka anyị ga-ewetere ụnụ akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ na Naịjirịa na akụkụ ụwa niile.

    Soro anyị!

  12. Daalụ maka isonyere anyị taa...Ka ọ di echi

    Ya gaziere gị, Onye a hụrụ taa sị hụkwa ya echi...Isee!

  13. Ọnụọgụgụ ndị a na-ahụ coronavirus n'ahụ ha kwa ụbọchị n'Amerịka arịgoola karịa etu ọ na-eru mbụ

    Onye na-enyocha ọrịa

    Coronavirus agwọọla mba Amerịka oke ara, dịka a chọtara ya n'ahụ mmadụ puku iri asatọ na atọ na ụma n'ụbọchị Fraịde, nke bụ mbụ a na-achọta ya n'ahụ mmadụ ole a n'otu ụbọchị.

    Dkt Jerome Adam bụ ọwa ahụ gburugburu nke mba ahụ kwuru na ọ bụ eziokwu na ọnụọgụgụ ndị bu ya na-arị elu, mana ọnụọgụgụ ndị ọrịa a na-egbu kwa ụbọchị adaala n'ihi ụdịrị ọgwụgwụ a na-enye ha.

  14. Ubu asaala Chi?

    Ekele m unu ndị Igbo na ndị ji Igbo ekwu.

    Nnọọ nụ dịka anyị na-amalite iwetere unu akụkọ si mba ụwa nakwa Naịjirịa.

  15. Etu nrụrịtaụka ikpeazu Donald Trump na Joe Biden mere si gaa

    Donald Trum na Joe Biden
    Nkọwa foto, Donald Trum na Joe Biden

    Nrụrịta ikpeazụ tupu e mee ntuliaka onyeisiala mba Amerịka gara nnọọ nke ọma n'abalị Tọzde, dịka onyeisiala Donald Trump na onye na-ama ya aka bụ Joe Biden jiri nwayọọ kwuo okwu.

    Ọtụtụ mmadụ etoola nrụrịtaụka nke a n'ihi na ọ dịghị ka nke mbụ ha abụọ na-akpọrịta onwe ha iyi.

    Nke a bụ nrụrịtaụka nke ikpeazụ ha ga-enwe tupu e mee ntuliaka n'ọnwa Nọvemba.

    Gbasara okwu coronavirus, Joe Biden kwuru na ya ga-atule ịkpọchị obodo ọzọ ka ọrịa ahụ kwụsị ifesa, mana Trump sị na oge eruola iji kpọpee obodo kpam kpam ka ndị mmadụ malite ndụ ha.

    Trump bokwara Biden ebubo na ya na nwa ya na-azụ ahịa n'ụzọ iwu akwadoghi, mana Biden kwuru na nke a bụ asị ma kpọọ Trump ka o gosi ihe akaebe na ọ na-atụ ụtụisi (tax) ya.

    Ka ọ dị ugbua, ihe karịrị mmadụ nde iri anọ na asaa (47 million) atụọlarị vootu site n'usoro nzipu ozi bu 'mail' na Bekee.

    Mana ọnụọgụ a na-ele anya kwesịrị ịtụ vootu karịrị nde narị abụọ na iri atọ (230 million).

    Ọ bụ n'abalị atọ nkeọnwa Nọvemba ka ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Amerịka ga-abụ.

  16. Gịnị na-eme n'Oyigbo, Rivers State

    Nyesom Wike
    Nkọwa foto, Nyesom Wike, Gọvanọ Rivas steeti

    Oyigbo, otu obodo dị na Rivers Steeti bụ aha ọtụtụ mmadụ kpụ n'ọnụ na soshal midia n'isi ụtụtụ a.

    Ọtụtụ na-ekwu na ha na anụ ka ụda egbe na-ada aghara aghara kamgbe ime abalị.

    Ụfọdụ tinyere ihe nkiri ebe a na-anụ ka ụda egbe na-ada, ha wee na-ekwu na a na-awakpo ogbe ahụ.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

    Onwebeghị onye ma kpọmkwem ihe na-eme n'eziokwu mana ọtụtụ na-akpọ oku ka ndị ọrụ nchekwa gbagara ndị bi na mpaghara ahụ ọsọ enyemaka.

    Oyigbo bụ obodo dị n'oke ala Abia steeti na Rivers steeti.

    Ọgbaaghara dapụtaraburu ebe ahụ n'oge etechabeghị aka dịka akụkọ kwuru na a wakporo ogbe ebe ndị si mpaghara ugwu bi n'ebe ahụ.

    Anya na ntị BBC ka dị n'ihe a na-emenụ iji chọpụtachaa nke merenụ.

  17. O nweghị mgbe m nyere iwu ka e mebie akụnaụba ndị Yoroba- Nnamdi Kanu

    Nnamdi Kanu

    Onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ekwuola na ọ bụghị ya ziri ndị gara mebie ihe akụ na ihe enweenwe ndị Yoruba na Legọs steeti dịka ụfọdụ akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu.

    "E mere m mgbasaaozi ezie, mana ndị chabiri ya bụ ndị chọrọ itinye nghọtahie na'etiti ndị chọrọ nnwereonwe."

    O nweghị mgbe m kwuru ka ndị mmadụ gaa weghara ihe ndị Yoroba."

    "Ihe mere bụ iwe ihe mere na Lekki kụzuru ndị ntorobịaụ ha gawa mebiwe ihe."

    Kanu kwuru ọ bụ "ndị ozi gọọmenti etiti" bụ kpara ya bụ nkata.

    O rụkwara ahụ aka sị na ọ bụ ka butere ntisa n'etiti Nnamdi Azikiwe na Obafemi Awolowo ma na-achọka itisa ndị Igbo na ndị Yoroba ugbua.

    Kanu kwuru nke na 'ehihie Tozde na mkparịtaụka mberede nke Ụlọọrụakụkọ Njenje Media TV haziri n'igwe okwu 'Zoom' nke Femi Fani Kayode bụbbu Minista njem ụgbọelu nọkwa na ya.

    Kanu toro ndị ntorobịa Naijiria maka ịpụta mee ihe

  18. "Nwoke na nwoke ịlụ onwe ha adịghị njọ" - Pope Francis

    Pope Francis

    Onyeisi ndị ụka kathọlịk bụ pope Francis ekwuola na n'uche obi ya, na nwoke ịlụ nwoke ibe ya maọbụ nwaanyị ilụ nwaanyị ibe ya adịghị njọ.

    O kwuru na ndị dị etu a kwesịrị ịnwe ezịnụlo n'ihi na ha niile bu ụmụ Chinkeke.

    Na nkọwa ya ka o kwuru na ndị a kwesịrị ịgba akwụkwọ dịka iwu ikike dịrị onye siri dị.

    Ma kwuo na ekwesiri ịwepụta iwu kwadoro ha ịlụ onwe ha.

    Ọ bụ na ihe onyonyo Evgeny Afineevsky mere ka Pope Francis kwuputara nke a.

  19. Manchester United emekwaala ya ọzọ na Paris

    Rashford

    Ndị Manchester United ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie ndị Paris St Germain nke mba Fransị oge ha abụọ zutere n'asọmpi Uefa Champions League n'abalị Tuzde.

    Nke a echeterela ndị mmadụ etu Man Utd si merikwaa PSG na be ha n'asọmpi a afọ abụọ gara aga.

    Ọ bụ Man Utd bu ụzọ nyete goolu n'agba nke mbụ oge Bruno Fernandez gbakpu penariti e nyere ha.

    Anthony Martial ji aka ya nye onwe ha goolu iji saara PSG n'agba nke abụọ.

    Mana Marcus Rashford gosiri ihe o ji bụrụ odogwu oge o nyere goolu ọzọ oge ọ fọdụrụ nkeji olemole ka asọmpị ahụ bịa na njedebe.

    Man Utd bụzi ndị nke abụọ n'otu G nke asọmpi 'Champions League afọ a; RB Leipzig bụ ndị nke mbụ dịka ha jikwa ọkpụ goolu abụọ a saghị asa merie ndị otu Istanbul Basaksehir.

    Lee ka asọmpi 'Champions League' ndị ọzọ a gbara n'abalị Tuzde si gaa:

    Zenit St Petersburg 1 - 1 Club Bruges

    Dynamo Kyiv 0 - 2 Juventus

    Chelsea 0 - 0 Sevilla

    Rennes 1 - 1 FK Krasnoda

    Lazio 3 - 1 Borussia Dortmund

    Barcelena 5 - 1 Ferenvárosi

    RB Leipzig 2 - 0 Istanbul Basaksehir

  20. Ụnụ abọọla chi

    Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi.

    Ndewo dịka ị na-esonyere anyị taa.