Kedụ otu Mbappe ga-ahọrọ n’afọ ọzọ na-abịa?

Ebe foto si, Getty Images
Ọgba boolu ndị otu Paris Saint Germain bụ Kylian Mbappe dịka ọ chọzighị ịnọ n’otu ahụ ma nkwekọrịta ya na ha bịa na njedebe.
Mbappe, onye dị afọ iri abụọ na otu na-agbara mba Fransị bọọlụ, sonyere otu PSG kemgbe afọ 2017.
Mana dịka ọ dị ugbua, kepukepu na-ekwu na ọ bụ otu Liverpool na Real Madrid ka anya ha dị n’ahụ ya ịnwale ma ha a ga-azụta ya.
Amabeghị otu Mbappe ga-ahọrọ n’ime otu abụọ ndị a.

Ebe foto si, Getty Images
N’aka nke ọzọ otu Tottenham na-akwado ịtinyeso ego n’ụgwọ ọnwa ọgba bọọlụ ha bụ Son Heung-min iji me ka ọ dọtịkwuo oge ya n’otu ahu.

















