Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ị bọọla chi?

    Ọfọ anyị na-agọrọ gị n'ụtụtụ a bụ na ị ga-ebi ogologo ndụ n'ahụ isi ike.

    Iseee!

    Nọnyere anyị dịka anyị na-ewetara gị akụkọ ndị ga-amasị gị ịkọ taa niile.

  2. Amalitela ime Ọkaikpe Amy Coney Barrett nnyocha n'ulọomeiwu Amerịka

    Amy Cony Barrett

    Onye Onyeisiala Donald Trump họpụtara ịnọchịte anya Ruth Bader Ginsburg bụ Amy Coney Barrett si na obi di ya mma etu e si họpụta ya maka ọrụ a.

    O kwuru nke a dịka a malitere ikwu okwu banyere ọkwa ahụ onyeisiala Trump sị na ọ ga-arịgoro n'ụlọ Omeiwu ukwu nke Amerịka.

    Ndị Omeiwu nọ patị Demokrat achọghị ikwu okwu itinye mmadu n'oche ahụ dịka ha sị na ọ na-abịa n'oge ntuliaka iji họpụta onye ga-achị mba ahụ.

    Barrett dị afọ 48 si na ya ga-akwụwa aka ya ọtọ ma ya na-ekpe ikpe ya.

    O buru na Barrett rigoro n'oche ahụ dịka a na-atụ anya, ọ ga-eme ya onye nke isii bụ onye pati Repọblịkan nọ n'ụlọikpe kachasị n'Amerịka.

    Ndị pati Demokrat di mmadu atọ.

  3. 'Biko ụnụ ekwela ka ndị ajọ mmadụ were ohere ngagharịiwe a mebie ihe' - Sanwo-Olu

    Ndị ngagharịiwe na Legọs

    Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu arịọla ndị na-eme ngagharịiwe na Steeti ahụ ka iwe ha dị ọkụ dajụọ dịka ọ mere njem itiaka n'obi ebe ahụ. Sanwo-Olu sị na ọnwụ nwaamadị ahụ na Surulere ha ya bụ Ikechukwu Ilohamauzo gbara afọ iri ise na ise metutere ya ma na-arịọ igwemmadụ nọ ebe ahụ ka ha ghara ịpụta ngagharịiwe echi maka na Gọọmentị na-elebe anya n'iwe ha.

    Ọ gwara ha nwee ndịdị maka na ya na onyeisiala Muhammadu Buhari ga-ahụ echi itinye ọnụ n'okwu maka iwe ha.

    Ọ kwekwara ha nkwa na ndị ọrụ SARS niile gburu mmadụ maọbụ taa ndị mmadụ ahụhụ n'efu ga-anata ụgwọ ọrụ ha n'ụlọikpe.

    O kwuru na ọ kwụ ndị na-eme ngagharịiwe n'azụ maka na iwe ha ziiri ha mana ha biko doo doo doo kwusilata ya bụ ngagharịiwe echi dịka ana elebe anya ịma ụzọ ka mma iji gboo ya bụ ọgụ.

    Sanwo-Olu kwekere nkwa na-aga atọhapụ ndị niile ndị uweojii ji eji maka ngagharịiwe a n'abalị a.

  4. 'Onyeisi ndị uweojii enyela m ikike ihibe kọmiti ga-elebe anya na nhazi ọhụrụ ndị uweojii' - Davido

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Otiegwu bụ Davido na ndịisi ndị uweojii zutere na mkparịta ụka taa bụ ebe ha kwuru maka ngagharịiwe na-akpọtụ na Naịjirịa kemgbe abalị ise.

    Davido sị na ihe ha kpatara na ya bụ nzụkọ bụ na onyeisi ndị uweojii nyere ya ikike ka ọ ga hibe kọmiti nke ya iji nyochaa ma ya bụ nhazi ọhụrụ ha sị na ha ga-eme n'ọrụ ndị uweojii ọ dịka ka ha kwuru.

    Ụmụntorobịa Naịjirịa na-eme ngagharịiwe iji gosi obi ọjọọ ha nwere be ndị ọrụ uweojii, ọkachasị ndị otu SARS bụ ndị ha na-ebo na ha na-agbagbu ndị mmadụ aghara aghara, eleghị anya n'azụ.

    Onyeisiala Muhammadu Buhari apụtakwala kwuo na-ekposaala ndị otu ahụ ma kwekwa nkwa ịhazigharị ya bụ otu mgbe na-abịa n'ihu.

    Mana nke ahụ emeghị ka ya bụ ngagharịiwe beleta.

    Kama agbagburu otu onye na Surulere, Legọs, gbajie onye ọzọ ukwu ka ya bụ ngagharịiwe na-aga n'ihu na mpaghara ahụ.

  5. Ndị na-eme ngagharịiwe na Lekki egeghi Gọvanọ Sanwo-Olu ntị

    Sanwo-olu

    Aka na-achị Legọs steetị bụ Babajide Sanwo-Olu gara ebe ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe na mpaghara Lekki dị na Legọs dịka atụmatu ahu gbara ụbọchị isii.

    Ka oruru ebe ahụ, Sanwo-olu mere ka ọ kwuo okwu mana ndị nọ ebe ahụ ekweghi ịnụta ihe ọ na-ekwu.

    Ha malitere ịkwa ya emo na-asị ya "ihere, ihere, ihere".

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Sanwo-olu mechara kwuo okwu ma sị na ha na-eme ihe ndị na-eme ngagharịiwe chọrọ ka ha mee.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  6. Ụlọomeiwu Edo steeti achụpụla onyeisi ha

    Francis Okiye

    Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ndị ụlọomeiwu nke Edo steeti achụpụla onyeisi ha bụ Francis Okiye n'oche ọchịchị.

    Nchụpụ ya na-abịa dịka onyeisi pati kacha n'ụlọomeiwu ahụ bụ Henry Okhurobo kwulitere okwu ka a chụpụ ya n'ihi ihe ọ kpọrọ "aka ike n'etu o si achị".

    Ndị omeiwu itoolu n'ime iri nọ mgbe e mere nzukọ a binyere aka n'akwụkwọ ka a chụpụ ya.

    Ha gakwara n'ihu duo Marcus Onobun na-anọchite anya ndị Esan West n'ụlọomeiwu steeti n'iyi ọrụ dịka onyeisi ọhụrụ.

  7. Ndị nkuzi achụpụla ụmụakwụkwọ n'Abuja

    Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ndị nkuzi achụpụla ụmụakwụkwọ praịmarị na klaasị n’Abuja.

    Otu ndị nkuzi bụ Nigeria Union of Teachers nke Abuja, bụ ndị chụpụrụ ụmụaka a, dịka ha kwuru sị na ha mere nke a n’ihi na ndị isioche mpaghara ahụ ajụla ịkwụ ha ụgwọọnwa opekatampe nakwa ụgwọ ndị e jibu ha.

    A hapụrụ ka ụmụ sekọndrị nke nta nọrọ n'ụlọakwụkwọ, n'ihi na gọọmentị Abuja akwụọla ndị nkuzi nke ha ụgwọ.

    Cheta na Stephen Knabayi bụ onyeisi otu ndị nkuzi a gwara ndị otu ya ka ha ghara ịlaghachị n'ụlọakwụkwọ mgbe ọbụla gọọmentị nyere iwu ka ụlọakwụkwọ mepee.

    O kwuru na ebe Federal Capital Territory Administration (FCTA) maliterela ịkwụ ụgwọ opekatampe a, mpaghara isii ndị ọzọ nọ n'okpuru Abuja ajụla ịkwụ ụgwọ a.

    Mara na FCTA site n'ọnụ Minista ndị FCT bụ Malam Muhammad Musa Bello, kwuru ka ụlọakwụkwọ mepee taa bụ ụbọchị 12 nke ọnwa Ọktoba, mana ha kwuputere na ha akagbuola agba nke atọ nke Bekee kpọrọ "Third term", ma dọkwaa ndị ụlọakwụkwọ abụghị nke gọọmentị aka na ntị ka ha ghara ịna ndị mmadụ ego ụgwọ akwụkwọ maka agba nke a kagburu.

  8. LA Lakers ebuliela Iko NBA nke ugboro 17

    Ndị Los Angeles Lakers bụ otu egwuregwu nkata na mba Amerịka ebuliela iko NBA nke ugboro iri na asaa.

    Lakers meriri Miami Heat 106-93 iji bulie ya bụ iko.

    Mara na Lakers nke Lebron James nyere aka bute iko a, chere afọ iri ọzọ tupu iko a erute ha aka ọzọ.

    Chetakwa na Kobe Bryant nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu helịkọpta n'ụbọchị Jenụwarị 26 nke afọ 2020 a, ka na-atụ bọolụ n'afọ 2010 bụ mgbe ikpeazụ aka ha metụrụ ya bụ iko.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    James na onwe ya ritekwara "ọkacha agba nke asọmpi"

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

    Ndị na-atụrụ Lakers bọọlụ kwuru na ha gbara mbọ ibute iko a ka ha nwee ike jiri ya kwanyere Bryant tụrụ otu ahụ bọọlụ afọ 20, ugwu.

    Skip X post, 4
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 4

    Skip X post, 5

    End of X post, 5

  9. Ị bọọla chi?

    Ka ụbọchị taa maara gị mma o! Iseee!

    Nọnyere anyị taa ka anyị wetara gị akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile.

  10. 'Achọrọ m iji egwuregwu 'gymnastics' gaa Olimpiks - Stephanie

  11. Ka chi fonụ

    Ụmụ Igbo, anyị ga-akwụsị ebe a taa.

    Ka ọ dị echi.

  12. Mmadụ anọ anwụọla n'ụlọ dara ada na Legọs

    Ụlọ dara ada
    Nkọwa foto, Mmadụ asatọ ka azọpụtara n'ime ụlọ a

    Mmadụ anọ, gụnyere ụmụnwoke atọ na otu nwaanyị, anwụọla n'ụlọelu ogogo atọ dara ada na mpaghara Obalende na Legọs steeti.

    Onyeisi ngalaba gbatagbata nke steeti ahụ bụ Nosa Okunbor kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o zigaara ndị ntaakụkọ.

    Nwoke a so n'otu n'ime ndị a zọpụtara
    Nkọwa foto, Nwoke a so n'otu n'ime ndị a zọpụtara

    O kwuru na ya bụ ihe mere oge ọ fọrọ nkeji iri abụọ ka ọ kụọ elekere isii nke mgbede ụbọchị Sọnde.

    Site n'enyemaka ndị mmadụ, a zọpụtara mmadụ asatọ n'ime ya bụ ụlọ, ma buru ha gawa ụlọọgwụ.

    Mmadụ asatọ bụcha ụmụnwoke.

  13. Gọvanọ Ganduje achụọla onye ọrụ ya maka ịkatọ Buhari

    Yakasai na Ganduje
    Nkọwa foto, Salihu Tanko Yakasai na Gọvanọ Abdullahi Umar Ganduje

    Gọvanọ Abdullahi Umar Ganduje nke Kano steeti achụọla onye ndụmọdụ ya bụ Salihu Tanko Yakasai maka ide ihe na soshal midia na-akatọ onyeisiala Muhammadu buhari.

    Kọmishọna mgbasa ozi nke Kano steeti, bụ Muhammad Garba, kwuru nke a n'akwụkwọ ozi nke o wepụtara n'ụbọchị Sọnde.

    Dịka ngagharịiwe maka mmekpa ahụ ndị uweojii na-aga n'ihu, Yakasai kwuru na ọ dị nnukwu mwute etu onyeisiala si agba nkịtị mgbe ndị mmadụ na-ekwupụta etu ihe si ara ha ahụ na Naịjirịa.

    O kwuru sị: "Ugboro ugboro, ị gaghị ewepụta naanị nkeji ise iji gwa ndị mmadụ ka ha wetuo obi. Ndị mmadụ i mere njem gaa steeti iri atọ n'isii na-arịọ ha ka ha tụnyere gi vootu. Ihe a na-agbawa obi."

    Ihe Yakasai dere na Twitter
    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Yakasai gara n'ihu kwuo sị: "Ihe ọbụla ị na-eme na ndụ a, ekwekwala ka olu gi fuo. Kwusie okwu ike megide ihe ọjọọ, kwusie okwu ike banyere ihe i kwenyere na ya. Ekwekwala ka ọkwa ị nọ na ya nwa mgbe nta gbochie gi ịkwụnyere ndị nke gị."

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Dịka kọmishọna mgbasaozi nke Kano steeti si kwuo, Yakasai akọwaala na ihe o kwuru bụ uche aka ya, ọbụghị ihe gọvanọ Ganduje sị ya kwuo.

    Mana Muhammad Garba kwuru na "dịka onye na-ekwuchitere gọvanọ, ụfọdụ ndị mmadụ agaghị ama mgbe Yakasai na-ekwu uche ya maọbụ mgbe ọ na-ekwuru gọọmentị kano steeti."

  14. England emeriela Belgium n'asọmpi Uefa Nations League

    Rashford
    Nkọwa foto, Rashford ji penariti nye goolu n'asọmpi a

    Mba England ewerela ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie mba Belgium n'asọmpi Uefa Nations League.

    Marcus Rashford na Mason Mount bụ ndị nyere goolu abụọ England ji nwee mmeri, ebe Romelu Lukaku nyere otu goolu ndị Belgium.

    Ndị Belgium bụ uzọ nye goolu oge Eric Dier kwaturu Lukaku wee nweta Penariti.

    Mana England nwetakwara penariti nke ha, bụ nke Rashford gbakpuru, tupu Mason Mount enye goolu nke abụọ.

    Mmeri a mere ka England rigoro n'ọkwa nke mbụ n'otu E.

    Lee ka ihe si kwụrụ ugbua:

    Otu E nke Uefa Nations League
  15. Nadal emeriela French Open nke afọ 2020

    Rafael nadal
    Nkọwa foto, Nadal kụpịara Novok Djokovic iji bulie iko French Open nke afọ a

    Rafael Nadal emeriela Novak Djokovic iji turu ugo n'asọmpi tennis French Open nke afọ 2020.

    Nadal ji ọkpụ 0-6 2-6 5-7 wee mrie ya bụ asọmpi.

    Nke a bụ iko French Open nke iri na ise Nadal na-ebuli kamgbe afọ 2005

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    N'ihi mmeri a, Nadal achụkwutala Roger Federer dịka ndị kacha buo iko n'asọmpi Tennis.

    Federer ebuola iko iri abụọ, Nadal ebuola iri abụọ, ebe Djokovic buru iri na asaa.

    Ndị ọkaibe na Tennis
  16. Etu ihe mberede ụgbọloko na ụgbọala si taa isi mmadụ 18

    Mberede ụgbọloko na ụgbọala

    Ụgbọala Bus na ụgbọloko sọkọtara isi na Thailand, gbuo mmadụ ruru iri na asatọ ma merụọ ọtụtụ ndị ahụ.

    Ihe mberede a mere n’ụtụtụ ụbọchị Sọnde n’ebe ji kilomita iri ise dị nso na mpaghara ọwụwanyanwụ Bangkok.

    Ndị uweojii Thailand sị na ndị nọ n'ime ụgbọala a na-aga n'ụlọokpuruchi ịga mechie obubu ọnụ Buddhist.

    Foto si ebe ahụ na-egosi ka ụgbọala a sọgharịrị n'akụkụ ya dịka ọ kpọkasịchara n'okporo ụgbọloko ahụ.

    Ndị ọrụ gbata gbata sị na ha chọrọ iji ngwaọrụ 'crane' ebupụta ụgbọala ahụ.

    Mmadụ dị iri isii nọ n'ime ụgbọala ahụ na-eme njem mgbe ihe mberede a mere dịka gọvanọ mpaghara ahụ bụ Maitree Tritilanond si kwuo.

    Praịm minista mba Thailand bụ Prayut Chan-O-Chan ezigala ozi iti aka n'obi ma kpọọ oku ka e mee nyocha ọfụma.

    Ihe mberede ụkporoụzọ na-emekarị na mba, nke a abụghị mbụ.

    N'ọnwa Maachị afọ 2018, ihe karịrị mmadụ iri na asatọ nwụrụ ebe ọtụtụ merụrụ mgbe ụgbọala hapụrụ ụzọ ma sọnye isi n'osisi na mpaghara ọwụwanyanwụ Thailand.

  17. Ọtụtụ mmadụ etinyela aka n'akwụkwọ ka Amerịka machie ndị ọchịchị Naịjirịa ịbata mba ha

    Ndị na-eme ngagharịiwe maka mkposa SARS
    Nkọwa foto, Ndị na-eme ngagharịiwe maka mkposa SARS

    Mmadụ karịrị puku iri etinyela aka n’akwụkwọ mkpesa e degara mba Amerịka ka ha kwụsị ndị ọchịchị Naịjirịa ịbata Amerịka ma ọ bụrụ ha ekposaghị ngalaba uweojii SARS.

    Ntinyeaka n’akwụkwọ a malitere n’ụbọchị Fraịde dịka ọkpụkpọ oku ka e kposaa ngalaba uweojii na-arị elu.

    Onye malitere ya bụ onye ntaakụkọ Farida Adamu

    Cheta n’ọnwa gara aga na mba Amerịka kwuru na amachiela inye ụfọdụ ndị ịbata mba ha n’iyi agwa ha kpara na ntuliaka ọkwa gọvanọ Bayelsa na Kogi Steetị n’afọ 2019.

    N’otu aka ahụ ka ndị a kpọrọ oku ka gọọmentị mba Amerịka machikwuo ndị ọchịchị Naịjirịa ịbata Amerịka ruo mgbe ha ga-ekposa ngalaba uweojii SARS.

  18. Nwakpo n'ike bụ nsogbu kachasị emetụta nwata nwaanyị - FIDA

    Mwakpo ụmụaka ụmụnwaanyị

    Dịka taa bụ ụbọchị ncheta nwata nwaanyị n'ụwa a kpọrọ 'International Day of Girl Child' otu jikọtara ụmụnwaanyị ọkaiwu etinyela ọnụ na nsogbu ụmụnwaanyị na-agabiga ọkachasị ụmụaka.

    Otu a kpọọ 'International Federation of women lawyers sị na nsogbu kachasị emetụta nwata nwaanyị bụ idina ya n'ike (Rape) n'ime nsogbu ndị ọzọ.

    Ha kpọrọ oku ka steetị niile tinye iwu ga-enye aka belata ụdị arụ a a na-akpa megide ụmụnwaanyị n'obodo.

    Onyeisi otu a nke ngalaba Ebonyi Steetị bụ Grace Iheanacho Chima gwara ndị ntaakụkọ nke a n'Abakiliki, sị na a nwe ọtụtụ akụkọ banyere mwakpo ụmụaka nwaanyị dị n'ogogo ọnwa itoolu ruo afọ asaa kwa ụbọchị.

    Ọ sị na na-akpatakarị nke a bụ enweghi ezi ọzụzụ na nlekọta site na nne na nna mụrụ ụmụaka ndị a, na e kwesịrị ịkwụsị ya tupu obodo a laa n'iyi.

    Iheanacho sị ihe ọzọ a na-ema ụmụaka nwaanyị gụnyere; ịtụ ha mgbere, ịkpagbu ha, enyeghi ha ezi ọzụzụ n'ụlọakwụkwọ, ịnye ọrụ siri ike, ịlụnye ha di na nwata, ịkpasị ha oke na ije ndị ọzọ.

    Ọ kpọrọ oku ka gọọmentị lebara ụmụaka ụmụnwaanyịa anya n'ụzọ zuruoke iji kwụsị arụ ndị a a na-akpa megide ha.

  19. Igbo bụ Igbo, unu abọọla chi?

    I meela n'isonyere anyị n'ụbọchị gara aga.

    Anyị ji ụkpa ekele anabata unu n'ụbọchị taa.

  20. Ka chi fo nụ

    N'ebe a ka anyị ga-eweta mgbasaozi nke taa n'isi njedebe.

    Ka ọ dịnụ echi.