Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Nkeji Coronavirus

  2. Amerịka ajụla ịkwado Ngozi Okonjo-Iweala maka ọkwa onyeisi WTO

    Ngozi Okonjo-Iweala

    Ọtụtụ akụkọ na-ekwu na a họpụtala Ngozi Okonjo-Iweala dịka onyeisi otu 'World Trade Organisation', nmana nke a abụchaghị eziokwu.

    Mba Amerịka ekweghị enye Okonjo-Iweala nkwado maka ya bụ ọkwa, kama ha kwadoro onye ya na ya na-azọ ya bụ Yoo Myung-hee onye Saut Korea.

    Dịka iwu WTO si dị, mba niile so n'otu ahụ ga-akwadorịrị otu onye tupu onye ahụ abụrụ onyeisi, ma ọ bụghị otu a, mara na a ga-emezi ntuliaka iji họpụta onyeisi.

    Ha dị mba otu narị na iri isii na anọ (164) mebere otu WTO, mana naanị Amerịka jụrụ ịkwado Okonjo-Iweala.

    Ọ bụrụ Okonjo-Iweala nwetara nkwado nke mba Amerịka taa, a gaara akpọpụta aha ya dịka onyeisi ọhụrụ nke WTO.

    Mana ka ọ dị ugbua, a ga-echezi ruo mgbe WTO ga-enwe ọgbakọ n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Nọvemba iji mara onye ga-emeri ntuliaka ahụ.

    Lee etu onye ntaakụkọ BBC bụ Andrew Walker si kọwaa ya:

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  3. Ọkụkọ egbuola onye uweojii ebe ọ na-ebụso ndị na-ehibe ọgụ ọkụkọ agha

    Ọgụ ọkụkọ na ọkụkọ

    Ọkụkọ atụgbuola onye uweojii nọ na mba Philippine ebe ọ na-alụso ndị na-ehibe ọgụ ọkụkọ na ọkụkọ n'obodo Samar.

    Ọkụkọ ahụ ji ihe dịka mma na-ebe ebe a na-amakwụye n'ụkwụ ọkụkọ na-anụ ọgụ wee chawa akwara ọbara dị na mpata ụkwụ uweojii Christine Bolok.

    Nke a mere ka ebuga ya ụlọọgwụ mana ọ nwụrụ tupu e ruo ụlọọgwụ.

    A machiri ọgụ ọkụkọ na ọkụkọ n'obodo ahụ kamgbe ọrịa coronavirus dapụtachara na mba ahụ.

    Tupu coronavirus adapụta, a na-ekwe ka ọgụ ọkụkọ gaa n'ihu na mba ahụ n'ikpo ọgụ iwu kwadoro ụbọchị ụka nakwa oge ezumike dịka ụlọọrụ mgbaza ozi "Philippine News Agency(PNA) si depụta.

    Onyeisi ndị uweojii n'obodo ahụ bụ Colonel Arnel Apud kwuru na nke a bụ oge mbụ n'ime ọrụ uweojii ruru ruo afọ 25 ọ na-ahụ udiri ajọ chi a ịdakwasa onye ọrụ ya.

    Ọgụ ọkụkọ na ọkụkọ
  4. Ka ụkọchukwu onye Anglican si bụrụ onyeisiala mba

    Ụkọchukwu Ramkalawan

    Ọ bụghịzi akụkọ na ụkọchukwu Wavel Ramkalawan meriri ntụliaka mba Seychelles nke afọ 2020.

    E duru ya n'ihi ọrụ oche onyeisiala n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Oktoba, 2020.

    Dịka onye ụkọchukwu ọ bụ, ozi onyeisiala Ramkalawan bụkarị maka udo, nnagide, na arịrịọ ka ndị mba Seychelles jịkọta aka ọnụ maka idi n'otu mba ahụ nakwa ịkwụsị adighị n'otu esemokwu were ọtụ afọ ndọrọndọrọ ọchịchị butere.

    Mmeri ụkọchukwu a tụrụ n'anya makana ọ bụ otu pati na-achị mba ahụ kamgbe afọ 1977.

    Nke a bụkwa ugboro isii ọ na-pụta azọ ọkwa onyeisiala, ije ọ malitere kamgbe afọ 1998.

    Gọọmenti di iche iche akatọọla ya maka ụfọdụ ihe ọ na-ekwu n'ebe o na-enye okwuchukwu n'ụlọụka ya.

    N'agbanyeghị ihe ndị a niile, ụkọchukwu Ramkalawan kwuru na otu ihe na-edu ya n'ugboro ise o na-enweteghị oche onyeisiala bụ okwu Nelson Mandela(onye na-ekwuchitere ndị mmadụ ọnụ ha) nwụrụlanụ, " Onye mmeri bụ onye na-arọ nrọ na anaghịọ awụsa ọwa ya."

    Wavel Ramkalawan ji pasenti 54.9% merie Danny Faure nwetere vootu 43.5%
  5. Juventus na Barcelona ga-akwata ya n'abalịa

    Ronaldo
    Nkọwa foto, Ronaldo gbaara Juventus ikpeazụ n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke Septemba bụ ebe o nyere Roma goolu abụọ bụ nke ha sachara

    N’egwuregwu, Juventus na Barcelona ga-ama okaibe na asọmpi nke Champions League na-elekere asatọ nke abalịa.

  6. Etu ndị amaghị ama si gbuo nwaanyị dị ime n'Ezinifite ka o si ahịa na-alọta.

    Ụmụada Uga dị n'Anambra Steetị eburula ngagharịiwe na mkpesa gaa n'Ezinifite maka ada nwaanyị dị ime e gburu ka o si ahịa na-alọta.

    A sị na nke a mere na Satọde ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Ọktoba, 2020.

    Nwaanyị a bụ onye Uga, a lụrụ n'Ezinifite dị ime ọnwa atọ mgbe ndị a maghị ndị ga bụ gburu ya.

    Nke a mere ndị ada ibe ya ji si n'Uga bịa mgbaru n'Ezinifte ebe a lụrụ ya.

    Mbọ BBC Igbo gbara inwete ozi n'aka ndị uweojii banyere nke a amịtaghị mkpụrụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra bụ Haruna Mohammed azaghị ekwentị ya.

  7. A na-achọ nwaanyi tufuru nwa ya n'ọdọugbọelu dị na Qatar

    Ọdọụgbọelu Qatar

    N’ofesi, gọọmenti mba Qatar sị na ha ga-etinye anya na ya bụ nyocha emere ịchọpụta nwaanyị tufuru nwaọhụrụ ya n’ikpo ahịhịa n’odougboelu dị na Doha ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọktoba.

    Dịka ọtụtụ na-agbarụ ihu maka ya bụ nyocha, ndị ọrụ ọdọugboelu ahụ sị na-ebumnaobi ha bụ ka ha chọpụta nwaanyị kpara ya bụ arụ.

    Ha kpọbara ụmụnwaanyị niile nọ na ụgbọelụ iri n'otu ebe ịme nyocha ka ha mara onye mụrụ ya bụ nwa.

    Ndị ọrụ ahụ rịọkwara mgbaghara maka ya bụ ihe ha mere mana na-ekwu na ha ebughị n'obi ịkpasụ ndị mmadụ iwe.

    Ndị gọọmentị ha sị na ha ga-eme nyocha ịmata ka ndị ahụ siri mee ya bụ nyocha.

    Ụgbọelụ ahụ si Qatar aga Australia.

  8. Mpụtara ule Waec agaghịzị apụta taa

    Ndị uleakwụkwọ

    Ndị ọrụ West African Examinations Council ekwuola na ya bụ mpụtara ụleakwụkwọ kwesiri ịpụta taa agaghịzị apụta maka ọgbatauhie so ngagharịiwe emere na Naịjirịa.

    Waec sị na ọ bụzị n’izuụka na-abịanụ ka ya bụ mpụtara ga-apụzi.

  9. Josep Maria Bartomeu agbaala arụkwaghịm na Barcelona

    Josep Maria Bartomeu

    Onyeisi Barcelona bụ Josep Maria Bartemeu agbaala arụkwaghịm ka ndị nkwado ha kwanyere ya ọkụ n’ike ka ọ pụọ agbanyeghị na ọ nabatala isonye na European Super league.

    Oteela ndị nsonso Barcelona chọwara ka Bartomeu pụọrọ ha kemgbe ya na Lionel Messi malitere ịnwe nsogbu.

    Bartomeu banyere Barcelona kemgbe afọ 2014 dịka onyeisi ha ridara ụbọchị Tuzde ya na ndị isiọrụ ndị ọzọ.

    N'okwu ikpeazụ ya, Bartomeu sị na Barca amalitela ịkwado maka Super league tupu ọ pụọ bụ nke ọ sị na ọ ga-enyere ha aka ịkpata ego n'ọdị n'ihu.

    N'izu gara aga ka BBC kwuru na amụma na-aga n'ihu maka ịmalite Lig ọzọ akpọrọ Super League ndị otu egwubọolụ nwere agba n'Uropu ga-eso gbaa bụ nke a ga-etinye ijeri pound anọ na ụma isii.

    Cristiano Ronaldo agaghị eso Juventus gbasị Barcelona bọọlụ na Champions League taa makana ọ ka bu coronavirus.

  10. Ndị ekperima abanyela ọrụ izu ohi site na ngagharịiwe a na-eme na Philadelphia

    Ndị uweojii Steeti Philadelphia dị n'Amerịka ekwuola na ndị ekperịma abanyela ọrụ izụ ngwahịa ndị mmadụ nke abalị abụọ site na ogbugbu ndị otu ha gburu nwaokorobia onyeisi ojii.

    Ha sị na a agbagburu Walter Wallace maka na ọ jụrụ ịtọgbọ mma o ji n'aka mgbe ha bịara ijide ya.

    Ndị ụmụnna Wallece sị na isi adịchaghị ya bụ nwaadị gbara afọ iri abụọ na asaa mma.

    N'abalị Tuzde ka ndị uweojii dọrọ ndị ogbe Port Richmond aka na ntị ka ha chaa n'ụzọ maka ndị ekperima banyere ọrụ izu ngwaahịa ndị mmadụ.

    Ndị ọrụ gbata gbata dọkwara ndị mmadụ aka na ntị ka ha baa ụlọ maka ya bụ ọgbaaghara si ngagharịiwe banye ihe ọzọ.

    Ọrụaka ndị ekperima na ngagharịiwe Philadelphia
  11. Buhari ahọpụtagharịala Mahmood Yakubu dịka onyeisi INEC ruo afọ ise ọzọ

    Mahmood Yakubu onyeisi Inec

    Onyeisiala Muhammadu Buhari ahọpụtagharịala Mahmood Yakubu dịka onyeisi ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission (INEC) ruo afọ ise ọzọ.

    Onye ndụmọdụ pụrụiche Buhari na mgbasaozi bụ Femi Adesina wepụtara ozi a ma sị na nke a ga-abụ agba nke ikpeazụ Yakubu ga-eji ọkwa a n'ozi e zigara onyeisi ndị Sịnetị bụ Ahmad Lawan.

    Ọ sị na na nhọpụta a dị n'usoro iwu na-achị Naịjirịa nke afọ 1999 dịka a ghazigharịrị.

    Mana ọ sị na ọ dizi n'aka ndị ụlọomeiwu ukwu ịnabata nhọpụtagharị Yakubu.

    Onyeisiala Buhari họpụtara Yakubu n'ọkwa n'ọnwa Nọvemba afọ 2015, n'ime ọnwa isii o merichara ntulaiaka onyeisiala.

    Kamgbe Yakubu naara Attahiru Jega ọkwa onyeisi Inec, ọ haziela ọtụtụ ntuliaka na Naịjirịa gụnyere ntuliaka ukwu n'afọ 2019 e ji họpụtagharịa Onyeisiala Buhari.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  12. Unu abọọla chi eee!

    Anyị ụkpa ekele anabata unu n'ụtụtụ taa.

    Biko a hapụkwala isonye n'ọgbakọ anyị www.bbc.com/igbo maka akụkọ ndị hiri odo.

  13. Ụlọikpe na Legọs atọhapụla ụmụnwoke 47 eboro ebubo ịdịna onwe ha

    Ọkọlọtọ ndị na-edina onwe ha

    Ọkaikpe Rilwan Aikawa atụhapụla ikpe na-ebo ụmụ nwoke iri anọ na asaa ebubo na ha na-edina onwe ha.

    Aikawa kwuru na ndị gbara ha ya bụ ikpe esoghi usoro kwesiri ekwesị.

    Ndị gbara ha ikpe abịaghị ụlọukpi maka ya bu ikpe ma ha akpotaghị ndị aka ebe.

    Anwuchiri mmadụ iri anọ na asaa a maka ebubo na ha chọrọ ibanye otu ụmụ nwoke na-edina onwe ha kama ụmu nwoke a kwuru na ọ bu ihe mmemme ncheta ọmụmụ ka ha bịara.

  14. Ọ bụ ndị Ipob wakporo Ebonyi ụbọchị Monde- Umahi, Aga m eti ndị e mebiri ihe ha aka n'obi- Umahi

    Dave Umahi

    Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi eboola ndị otu Ipob na steeti ahụ ebubo ibute ọgbaghara mere na steeti ahụ ụbọchị Monde, abali 26 nke ọnwa Oktoba, afọ 2020.

    Umahi kwuru nke a n'ozi ọ gbasara n'ikuku ụbọchị Tuzde kwuru na ọ bụ ndị butere ọgbaghara n'Ebonyi si n'otu obodo dị n'otu otu okpuru ọchịchị dị na steeti ahụ n'aha ndị Ipob.

    "Na Monde,abalị 2o Oktoba , ndị wakporo Ebonyi mebie ihe si ebe ọzọ.

    "Ụnyahụ bụ Tuzde, 26 Oktoba, ndị bịara bụ ndị Ebonyi si otu obodo n'otu okpuru ọchịchị n'aha ndị Ipob."

    Ọ rịọrọ ndị Ebonyi mgbaghara maka mkpamkpa ndị omwekome na ndị agboro kpara na steeti ahụ ma tie ndị ọrụ nchekwa na nddị mmadụ tụnyere ndụ ha n'ọgbaghara ahụ.

    O kwere nkwa iti ezinaụlọ ndị agboro merụrụ ahụ maọbụ gbuo n'oge ọgbaghara so ngaghariiwe EndSARS na steeti ahụ.

  15. Gere akụkọ gbasara coronavirus n'Afrịka n'otu nkeji

  16. Anyị na-enye gọọmenti Imo abalị 14 ịkwụ anyị ụgwọọnwa - NLC Imo steeti

    Ngalaba na-achịkọta ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress (NLC) nke Imo steeti enyela gọọmentị steeti ahụ ụbọchị iri na anọ (14) imezu ihe ha chọrọ maọbụ chebiri ihe ga-adapụta na ya.

    N'ozi e binyere aka nke ha zipuru, ngalaba NLC depụtara ụzọ ihe atọ na ụma ha chọrọ ka gọọmentị mezuo, nke gụnyere:

    • Ịkwụzu ụgwọ ọnwa e ji ndị ọrụ Imo steeti kemgbe ọnwa Febrụwarị
    • Ịkwụzu ụgwọ e ji ndị larala ezumike nka kemgbe ọnwa Febrụwarị
    • Ịmalite ịkwụ ụgwọ opekatampe N30,000 gọomentị etiti kwuru ka a na-akwụ ndị ọrụ Naịjiria

    Ha kwuru na ha akwenyerela gọọmentị ugwu kemgbe ọnwa Febrụwarị, mana ihe ka dị etu ọ dị.

    Lee ihe ha kwuru n'uju.

    Akwụkwọ ozi ndị NLC
    Akwụkwọ ozi ndị NLC

    Austin Chilakpu bụ onyeisi ha gwara BBC na kemgbe ọnwa Febrụwarị ka ha na-enwere gọọmentị ndidi ka ha nwee ike ịkwụzu ndị ọrụ na ndị larala ezumike nka ụgwọ e ji ha.

  17. Ọtụtụ ndị Igbo ekwenyeghị n'oku ịkpa oke Nnamdi Kanu- Ohaneze

    Nnia Nwodo

    Onyeisi otu ọhaneze bụ Nnịa Nwodo ekwuola na ọtụtụ ndị Igbo akwadoghị okwu ịkpa oke maọbụ nkpusu iwe na ọnụma sị n'aka otu Ipob na onye ndu ha apụta.

    Nwodo onye kwuru nke a mkparịtaụka ya na ụlọakụkọ AIT nwere ụbọchị Monde sị na ejighi ibute ọgbaghara mara ndị Igbo.

    Ọ sị, “Anụghị ebe Ipob kpọrọ oku ka e mebie akụnaụba ndị Yoruba. Mana anụrụ m ihe Ipob kwuru na-akụsu iwe na ọnụma.

    "Achọrọ m ikwu hoohaa na ọtụtụ ndị Igbo akwụnyeghịrị Ipob n'ihe ha kwuru (maka EndSARS). Ọ bụghị omenala anyị."

    "Ọ dịka ihe ga-eme na onye Igbo nwere ihe akụ na ihe enwenwe na mpaghara Naijiria dị iche iche."

    "O kwuru na ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ ekwuola na ha akwadoghị okwu Ipob kwuru."

    N'okwu akụnaụba ndị e mebiri n'ọgbaghara so ngagharịiwe EndSARS, Nwodo kpọrọ oku ka gọọmenti gụkọ ndị e mebiri ihe ha ma gbatara ha ọsọ enyemaka.

    Ọ katọrọ etu gọọmenti ji jiri aka ike so ndị ntorobịa na-eme ngagharịiwe maka mkpagbu n'aka ndị uweojii.

  18. Legos agbapeela ahịa niile dị na steeti ahụ

    Babajide Sanwo-Olu

    Aka na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu, enyeela ntụziaka ka emepe mkapmkpam ahịa niile dị na steeti ahụ.

    N'akwụkwọ mgbasaozi nke Kọmishọna na-ahụ maka ihe na-eme n'ime obodo bụ Wale Ahmed wepụtara ụbọchị Tuzde, o kwuru na ahịa niile mama nke nri ma na ndị ọzọ enweela ohere impe kwa ụbọchị.

    Cheta na gọọment tinyeburu ụbọchị ahịa nri na-azụ iche ma tinyekwa ụbọchị ngwa ndị ọzọ na-abụghị nri na-azụ iji mgbochie nkesa ọrịa coronavirus.

  19. 'Dick Tiger tinyere ego ọ kụtara n'ọkpọ na nkwado Agha Biafra'

  20. 'Onye ga-atụpụrụ Nnamdi Kanu ọnụ maka 100 million o tinyere n'isi gọvanọ Wike?'

    Nnamdi Kanu na Ipob

    Kọmishọna mgbasa ozi gọvanọ Rivers State bụ Paulinus Nsirim ekwuola na gọọmenti Rivers State agaghị atụpụrụ onye ndu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ọnụ maka okwu naira nde 100 o tinyere n'isi gọvanọ Nyesom Wike.

    Ọ kwuru na ọ ka na-agbagoju ya anya etu ndị ntaakụkọ si buru akụkọ ahụ na-efesa ma na-achọ ka ha nụ n'ọnụ gọọmenti Rivers State gbasara ya.

    Cheta na Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivas Steetị enyela ndịisioche okpuruọchịchị dị na steetị ahụ iwu ka ha nwuchie ndị Ipob niile nọ n'okpuruọchịchị ha.

    Nke a na-abia dịka nso nso a na ọgbaghara dapụtara n'Oyigbo dị na steetị ahụ n'etiti ndị Ipob na ndị ọrụ nchekwa ebe Ipob fere ọkọlọtọ ha.