Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Nzụkọ gọọmentị etiti na ASUU amịtabeghi mkpụrụ

    Ụmụ akwụkwọ Mahadum

    Akụkọ na-ekwu na gọọmentị etiti ekweela ịmapụta ego ruru ijderi irii atọ iiji kwụ ndị nkuzi mahadum ụgwọ.

    E kwukwara na gọọmentị etiti kwere nkwa ịmefu ego ruru ijeri iri abụo n'iwulite ngalaba agụmakwụkwọ na Naịjirịa.

    Nke a pụtara ihe dịka gọọmentị etiti nakwa otu ndị nkụzị Mahadum nwechara nzụkọ imeụlọ.

    Onye ndụ ndị nkuzi bụ Biodun Ogunyemi kwuru na ọ ga-ebugara ndị otu ya nkwa ndị gọọmentị kwerela ka amara ma ọ masịrị ha tupu e nwee nkwekọrịta ọbụla.

    Adọtịkwuru nzụkọ ahụ rue ụbọchị iri abụọ na otu n'ọnwa Ọktoba.

  2. Twitter nwere nsogbu n'abali Tọzde: Lee ihe mere

    Ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa malitere iti mkpu na akara Twitter ha adịghị emekpe n'ọnụ ụtụtụ taa.

    Ndị mmadụ malitere ikwu na onwereike bụrụ na gọọmentị Naịjirịa agbachiela ya bụ ogige ịntanetị.

    Mana, ihe mere bụ na Twitter nwere nsogbu na tecknuzu ha ji arụ ọrụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ha si na ha na-agba mbọ ịhụ na mmadụ niile wetere ohere imepe akara Twitter ha na nsogbu adịghị.

    Ha kwukwara na ha ahụbị̄ghị ama na ọ bụ ndi mmadụ wakporo ha ma kpata ihe a mere.

    Ọ bụ site n'elekere iri nke abalị ka ụfọdụ ndi malitere kwuwe na ha anaghị abanwu akara Twityter ha NA naịjirịa.

    Mana ugbua, ọtụtụ sị na ọ gbapeela.

  3. Unu efoola chi?

    Anyị ji n'aka na unu tetara ọfụma!

    Dọnyerenu anyị taa maka akụkọ ndị dị ọkụ ka o si dị ọkụ.

  4. Ka chi bọọ

    I meela wee nọnyere anyị taa.

    Ka chi bọọ.

  5. Ndị kpuruisi mere ngagharịiwe n'Enugwu steeti

    Ndị kpuruisi emeela ngagharịiwe n’Enugwu steeti iji gwa gọọmentị na obi adịghị ha mma etu ha si gbaghapụ ha n'ihe gbasara ọdịmma ha na steeti ahụ.

    Ha mere emume taa bụ ụbọchị e ji echeta mkparaọcha nke na-eme ka ije dịrị ndị kpuru isi mfe.

  6. Naịjirịa bụ sọsọ mba n'Afrịka Amerịka gụpụrụ n'atụmatụ 'visa lottery nke 2022

    Ọkọrọtọ Amerịka

    Mba Amerịka amachiela ndị Naịjirịa isonye n'atụmatu eji anabata ndị mmadụ na mba ahụ a kpọrọ 'visa lottery nke 2022.

    Ọ bụ na webụsaịtị gọọmentị Amerịka ka e tinyere ya na Tọzde.

    Akwụkwọ ahụ dị peeji 19 Bekee kpọrọ "2022 diversity immigrant visa program (dv-2022)".

    Ọ sị: “N'Afrịka, ndị Naịjirịa etozughị insonye mee ịgba chaa chaa visa nke afọ a."

    Mana, ndị si mba Afrịka ndị ọzọ tozuru isonye n'atụmatụ a.

    Gọọmentị Donald Trump na-agbasi mbọ ike ịkwụsịtụ ndị mmadụ isi ofesi bata Naịjirịa.

  7. Gọvanọ Obiano achụọla James Nwafor n'ọrụ

    Gọvanọ Obiano

    Gọvanọ Willie Obiano bụ aka na-achị Anambara steeti achụọla James Nwafor bụbu onyeisi otu Special Anti-Robbery Squad (SARS) Awkwuzu n'ọrụ dịka onye enyemaka pụrụiche ya.

    Don Adinuba bụ kọmishọna mgbasaozi nke Anambara steeti gwara BBC Igbo nke a n'ekwentị.

    Nke a na-eso okwu Gọvanọ Obiano gwara ndị bu ngagharịiwe maka nkwụsị SARS garuo n'obi gọọmentị n'ụtụtụ Tọzde bụ Ọktoba 15, na a ga-anapụ Nwafor ọrụ ya ma kwuo ka a gbaa ya akwụkwọ n'ụlọikpe.

    Obiano kwuru na ọ na-anụ maka mmegbu ndị SARS na-eme ndị ntorobịa na Naịjirịa, ma too Onyeisiala Muhammadu Buhari ike maka ikposa SARS dịka ndị ntorobịa si chọọ ma gee atụmatụ anọ ha wepụtara maka imezi ngalaba ndị uweojii.

    Obiano gara n'ihu kwuo na ọ ga-ehibe otu ga-elebanye anya n'ihe banyere akụkọ mmegide ndị SARS a megidere ndị mmadụ n'afọ ole na ole gara aga.

    Ọ họpụtara otu nke Ọkaikpe V.N Umeh nọ n'isi ya bụ ndị ọ sị ga-ekpokọta ihe ha chọpụtara n'afọ 30 na-abịa.

    Ndị ga-esonye na ya bụ ọgbakọ gụnyere:

    • Ndị na-anọchite anya otu ụmụakwụkwọ Anambara steeti
    • Ndị isi na-anọchite anya ndị ntorobia si na Sinetorial Zoonu atọ dị na steeti ahụ
    • Otu onye na-efe ala nna ya na steeti ahụ
    • Onye ga-anọchite anya ndị ntorobia nke Ohaneze Ndigbo
    • Onyeisioche ndị ụka Kraịst na steeti ahụ
    • Onye na-anọchite anya Achibishọpụ nke Katọlik Dayọsis Ọnịcha
    • Onye na-anọchite anya ndị ichie n'Anambara steeti

    WDGZ.

    O kwuru na otu a ga-enyocha ebubo oke ogbugbu a na-ebo James Nwafor oge ọ bụ onyeisi SARS n'Awkwuzu.

    O kwuru na ọ bụrụ na a chọpụta na ikpe mara ya, na a ga-akpụpụ ya ụlọikpe.

    Gọvanọ Obiano gakwara n'ihu gwa Kọmishọna uweojii steeti ahụ na ya nyochagharịa ndị niile ndị uweojii ji eji na steeti ahụ, iji hụ na ikike dịịrị onye ọbụla rutere ha oge ọbụla.

  8. Gịnị bụ Anonymous?

    Ndị otu na-awakpo ọdọ ịntaneti a kpọrọ Anonymous ekwuola na ha awakpoola ọtụtụ website gọọmentị Naịjirịa iji kwado ndị na-eme ngagharịiwe na mba ahụ.

    N'ozi ha tinyere n'akara Twitter ha, otu eji ụdịrị agwa mara n'ụwa dum si na ha na-akwado ngagharịiwe na Naịjirịa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Kedụ ndị bụ Anonymous

    Ndị otu a enweghi ihe maọbụ onyeisi.

    Mkpụru okwu ha ji aga bụ "anyị dị igwe", nke ha ji atụ aka na ọtụtụ mmadụ so n'otu ha.

    Dịka ha enweghị ndị ọchịchị, onye ọbụla nwereike sio na ya so n'otu a.

    Nke mekwara ka ndị so otu a nwee ebumnuche dị iche iche, nke mere ha enweghị olileanya otu.

    Mana, ha bụ ndị na-agba mbọ maka ndị ji aka ike achịgbụ ndị mmadụ.

    Ha na-eji ịnara ndị mmadụ ogige ịntanetị ha eme ihe a.

    Ọ bụ ihu nwoke a kpọrọ Guy Fawkes, bụ onye wuru ewu maka akwụkwọ Alan Moore dere a kpọrọ V for Ventetta.

    N'akwụkwọ ahụ, otu nwoke na-eyi ihu ahụ dịka ọ na-agba mbọ ịkwatu gọọmenti nrụrụaka karịrị na ya.

  9. Ndị agha etinyela ọnụ n'okwu ngagharịiwe END SARS

    TY Buratai

    Ndị agha Naịjirịa adọọla ndị na-eme ngagharịiwe aka na ntị ma kwuo ha kwụsị ịme ngagharịiwe.

    Ha kwukwara na ha aghaghị ịchekwa ọchịchị onyekwuoucheya ma o rue na ya.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  10. Unu abọọla chi?

    Nnọọ nụ, soro anyị na peeji anyị taa maka akụkọ ndị dị mkpa n'ụwa niile.

  11. Ka chi foonụ

  12. Mmadụ itoolu anwụọla ka helịkọpta abụọ takọtara isi

    Helịkọpta

    Ihe ruru mmadụ itoolu anwụọla dịka helịkọpta abụọ bu ndịagha mba Afganịstan merụrụ ahụ, takọtara isi n’obodo Southern Helmandn'ụtụtụ Wenezde.

    Ụfọdụ n'ime ndị nwụrụ bụ ndị a zụrụ azụ n'agha ụgbọelu.

    Ka akụkọ si na mba ahụ si kwuo, ọ bụ nsogbu mmebi injin butere ihe mberede a.

    Mara na ọgụ na-ada aghara aghara n'etiti ndị Taliban na ndịagha gọọmentị na mpaghara ahụ kemgbe ụbọchị ole na ole.

  13. I meela wee bịakwute anyị taa

    Nọnyere anyị dịka anyị na-ewetara gị akụkọ ndị ga-amasị gị ịkọ taa niile.

    Tụọ ute gị.

    Ndeewo.

  14. Ihe i kwesịrị ịma maka otu SWAT ga-anọchi anya SARS

    Muhammed Adamu

    Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Muhammed Adamu ehiwela ngalaba uweojii ohụrụ ga-anọchi anya SARS e kposara ekposa.

    Otu a kpọrọ 'Special Weapons and Tactics' (SWAT) ga na-arụ ọrụ ndị SARS e kposara ekposa na-arụ.

    N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Frank Mba wepụtara, ọ sị na a ga-eme ndị otu ọhụrụ a nyocha ụbụrụ nakwa ahụike iji mara ma tozuru ịrụ ọrụ ọhụrụ a.

    Ha ga-amalite ọzụzụ n'ụlọ ọzụzụ ndị uweojii niile dị na Naịjịrịa ebe ndị nke si na mpaghara ọwụwanyanwụ na Ndịda ga-eme nke ha na Rivers Steetị.

    E be ndị uweojii si na mpaghara Ọdịdanyanwụ na ugwu ga-enwe ọzụzụ na Nasarawa nakwa Ila-Orangun.

    Gịnị ga-emezi ndị uweojii SARS ugbua?

    Ndị ngalaba SARS

    What about di disbanded SARS?

    Onyeisi ndị uweojii bụ Muhammed Adamu enyela iwu ka ndị ọrụ SARS niile e kposara ekposa wuchie n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Abuja maka ajụjụ, nyocha ụbụrụ nakwa nke ahụike.

    Ha ga-agabiga nyocha a tupu a zụgharịa ha ma nabatakwa ha n'ọrụ ndị uweojii.

    Adamu sị na nke a dị n'usoro iwu na-achịkwa ndị uwojii na Naịjirịa, isi 18 amokwu nke 10 nke afọ 2020.

    Ọ sị na ndị ngalaba uwojii a kpọrọ 'Couselling and Support Unit (PCSU) bụ ndị ahazi ọzụzụ ha a.

  15. E zipula ndịagha n'ebe e nwere ọgbaghaara na Tunisia

    E zipụla ndịagha mba Tunisia n’ọgbọ ebe ndị uweojii na ndị ngagharịiwe sọkatara isi na mpaghara ugwu mba ahụ.

    Ọgbaghara a malitere mgbe gọọmentị kuturu ụlọ ebe a na-ere anwụrụ sịga ma gbuo onye nwe ya.

    Praịm mịnịsta mba Tunisia bụ Hichem Mechichi achụọla gọvanọ na-achị nwaobere oge iji belata iwe na-ewe ndị obodo.

  16. Akeredolu enwetela asambodo mmeri ya n'aka Inec

    Gọvanọ Rotimi Akeredolu

    Gọvanọ Ondo Steetị bụ Rotimi Akeredolu na osote ya a họpụtara bụ Lucky Ayedatiwa anatala asambodo mmeri ha na ntuliaka ọkwa gọvanọ Steetị ahụ site n'aka ụlọọrụ Inec.

    Akeredolu natara nke a n'aka kọmishọna Inec n'Ondo Steetị bụ Rufus Akeju n'idi ụlọọrụ a dị n'Akure, isi obodo Ondo.

    Gọvanọ kelere ụlọọrụ INEC maka ịhazi ntuliaka a n'ụdọ nakwa n'ụzọ dị mma n'ụbọchị Satọde.

    O kelekwara ndị ọrụ nchekwa maka ọrụ ọma niile ha rụrụ ịhụ na ntuliaka a gara n'udo.

  17. Etu e si gbuo Alexander Nwogu na mba Amerịka

    Alexander Nwogu

    Dịka o ji ọkara gafee elekere mbụ nke isi ụtụtụ n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọktoba ka ndị uweojii mba Amerịka gbatara inyere Alexander Nwogu aka, mana isi ya apụtaghị.

    Ndị uweojii obodo Washington DC bụ ebe nwaamadi a zutere ọnwụ ya, kọwara na ha hụrụ Nwogu ka ọ tọgbọrọ ka a gbachara ya egbe n'otu ọdọ mmanụ-ụgbọala, mgbe ha rutere.

    Dịka ha si kwuo, ndị ọrụ gbatagbata chọpụtara na ndụ apụọla ya n'ahụ.

    Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii obodo ahụ ewepụtala puku dọla iri abụọ na ise ($25,000) ha ga-akwụ onye ọbụla nwere ozi ga-enyere ha aka ịchọta ma nwụchie onye maọbụ ndị kpara arụ a.

    Nwogu dị afọ 23 mgbe ọ nwụrụ, ka nwetara ọrụ n'ụlọọrụ Ernst & Young, ebe o kwesịrị ibido ọrụ n'izu a.

    Ọ bụ onye Mbaise dị n'Imo steeti.

    Ndị mahadum ebe Nwogu ka gụchara akwụkwọ n'ọnwa Mee nke afọ 2020 a bụ Virginia Tech, dere ozi iti aka n'obi n'ihi ọnwụ ya n'elu Twitter ha.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  18. Buhari ahọpụtala Lauretta Onochie dịka kọmishọna INEC

    Lauretta Onochie

    Onyeisiala Muhammadu Buhari ezigala aha Lauretta Onochie bụ onye enyemaka ya pụrụ iche n'ihe gbasara soshal midia, n'aha ndị ọ chọrọ ka e mee kọmishọna ndị Independent National Electoral Commission (Inec).

    Onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Sinetọ Ahmad Lawan gụpụtara aha Onochie na mmadụ atọ ndị ọzọ dịka ndị onyeisiala Buhari denyere aha ha n'ozi o ziputara.

    O wepụtara aha Onochie dịka onye ọ chọrọ ka ọ na-achịkọta Inec na Delta steeti.

    Ndị ụlọomeiwu ukwu ga-enyocha ha mara ma ha etozuru ya bụ ọkwa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  19. Super Eagles na Carthage Eagles ga-akwata ya taa

    Ndị otu Super Eagles nke Naịjirịa na Carthage Eagles nke Tunisia ga-ezute n’asọmpi enyi na enyi taa.

    Egwuregwu a a ga-agba na mba Austria ga-amalite dịka o ji ọkara gafee elekere asaa nke abalị.

    Cheta na Ọljiria ji otu goolu asaghị asa merie Naịjirịa n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Nọvemba a.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  20. Ị bọọla chi?

    Ọfọ anyị na-agọrọ gị n'ụtụtụ a bụ na ị ga-ebi ogologo ndụ n'ahụ isi ike.

    Iseee!

    Nọnyere anyị dịka anyị na-ewetara gị akụkọ ndị ga-amasị gị ịkọ taa niile.