Off Cycle elections 2023: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya
Ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi, Bayelsa na Imo steeti ka o si aga.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Chimezie UcheAgbo, Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo
Rotimi Akeredolu: Etu ụka olili ya na njem ikpeazụ ya si aga
"Onye Igbo ọbụla esonyekwala na ngagharị iwe ọbụla" - Ohaneze
Cost of living: Lee ụfọdụ ụzọ ndị mmadụ si ebighari ndụ ugbua maka ihe isi ike na Naịjirịa
Electoral Fraud: Kedụ ụdị wuruwuru dị iche iche a na-eme na ntuliaka? Kedụ ka a ga-esi kwụsị ha?
Ahụhụ Naịjirịa na-ata ugbua sitere n'iwu ọjọọ ndị e mere n'oge gara aga - Benjamin Kalu
Hage Geingob bụ onyeisiala mba Namibia anwụọla ka ọ gbachara afọ 82
Igwe Neni's suspension: Ihe mere Soludo ji kpọghachi Igwe Damian Ezeani
Insecurity: Ntọrị ụmụaka isii, ogbugbu ndị Eze na ihe ndị na-egosi na nchekwa gba ọtọ na Naịjirịa
Etu ndị ojiegbe si zuo ndị POS ohi aghara aghara ma gbuo ufọdụ n’Imo Steeti
Nnamdi Kanu a chụrụ Mike Ozekhome, Ifeanyi Ejiofor na ndị Okaiwu ya ndị ọzọ? - Lee ihe anyị ma
'Aga m enweta nnwereonwe m' - Nnamdi Kanu
COP28: Gịnị mere okwu ọnụọgụgụ ndị nọchite anya Naijiria n'ọgbakọ mgbanwe ihu igwe ji akpọtụ?
Etu ndị ojiegbe si gbuo mmadụ aghara aghara n’Imo steeti n’ime izuụka abụọ
A kwụsịtụla ikutu ụlọ ndị mmadụ n'Abule Ado Legọs ma malite inyocha akwụkwọ ha
Hope Uzodimma anatala asambodo mmeri ya

Ebe foto si, TVC news/Screenshot
Gọvanọ na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma anatala asambodo mmeri ya n'aka Inec taa bụ ụbọchị Fraịde n'Owere bụ isi obodo steeti ahụ.
Uzodimma n'okwu nnabata ya kwuru na ihe Inec mere egosila ndị mmadụ na ha nwereike ịnwe ntụkwasiobi na vootu ha ga-enwe isi.
O ji ohere ahụ kelee ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ Inec maka ịhazi ntuliaka ọ sị bụ nke kachasị "nwe udo ma nye ohere ma bụrụ nke ziri ezi"
O kelekwara ndị ọrụ nchekwa maka nkwado ha nyere atụmatụ ntuliaka n'ụbọchị ahụ.
Cheta na Inec kpọpụtara aha ya dịka onye meriri ntuliaka ọkwa Gọvanọ Imo steeti e mere n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba afọ 2023.
Ọ ga-achị afọ anọ ọzọ dịka iwu Naịjirịa si nye.
Ọ bụ eziokwu na a hụrụ ozu mmadụ 322 n’otu ili n’Anambra Steeti? Lee ihe anyị ma
Off-cycle elections: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya

Ebe foto si, Douye Diri/Facebook
Aka na-achị Bayelsa Steeti bụ Douye Diri ekelela Chineke na ndị Bayelsa maka mmeri ya na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Bayelsa Steeti e mere n'abalị 11 nke ọnwa Novemba afọ 2023.
Diri Nke PDP ji vootu dị 175196 merie Timipre Sylva nke APC, onye nwetara vootu dị 110108, ebe Udengs Eradiri nke Labour Party nwetara vootu dị 905.
N'ozi nke Diri o wepụtara n'akara ọbaọzi ya n'X, ọ sịrị,"Ndị Abịa, ekele m ụnụ."
Ọ gara n'ihu kwuo sị, Mmeri a a bụ site n'ike nke Chukwu nakwa nkwado ụnụ nyere m iji gbara ụnụ odibo afọ anọ abụọ."
" Aga m aga n'ihu n'ịbụ gọvanọ mmadụ nile."
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Diri emeriela na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Bayelsa steeti

Ebe foto si, Douye Diri/Facebook
Aka na-achi Bayelsa steeti bụ Douye Diri nke PDP emeriela na ntuliaka ọkwa Gọvanọ afọ 2023 nke e mere ụbọchị Satode,abalị 11, nke ọnwa Novemba, afọ 2023, dịka ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka bụ Inec si kpọpụta ya taa bụ Monde.
Gọvanọ Diri, onwe meriri n’Okpuru Ọchịchị isii n’ime asatọ dị na Bayelsa steeti nwetara vootu dị 175196, ebe Timipre Sylva nke APC nwetara vootu dị 110108, ebe Udengs Eradiri nke Labour Party nwetara vootu dị 905.
Lee ihe ngụkọ na-ekwu

Ndị debanyere aha: 1056862
Ndị nwere ikike ịtụ vootu: 372090
Vootu a tụrụ dị mma: 287554
Vootu ndị agbajọrọ: 3658
Vootu nnile a tụrụ: 291212
A malitela ngụkọ mpụtara ntuliaka Gọvanọ Bayelsa ọzọ

Ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naijiria bụ Inec n'ịchafụ amalitela mkpọpụta mpụtara ntuliaka e mere na Bayelsa steeti ụbọchị Satode.
Inec kwụsiburu mkpọpụta mpụtara si okpuru ọchịchị dị na steeti ahụ Ụbọchịụka dịka ha hiwere nke fọrọ taa bụ Monde abalị 13, nke ọnwa Novemba afọ 2023.
