Minimum wage: Ndị gọvanọ agaghị ekpebiri anyị ụgwọọnwa ha ga-akwụ - NLC

Ebe foto si, NLC/X
Otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) akatọọla okwu ahụ a sị ndị gọvanọ kwuru na steeti ọbụla kwesịrị ikpebi ego ole ha ga-akwụ dịka ụgwọọnwa opekatampe na steeti ha dị iche iche.
Ndị otu ahụ kwupụtara nke a n’ụbọchị Fraịde 28 Juun 2024 n’ozi sitere n’aka onyeisi na-ahụ maka mgbasaozi ha bụ Benson Upah.
Dịka Benson Upah siri kwuo, ụdị mkpebi dị etu ahụ bụ nke na-agba ụkwụ megide ebumnoobi e ji nabata ụgwọọnwa opekatampe na Naịjirịa.
O kwukwara na ọ bụ ihe na-agba anyammiri na mgbe ụfọdụ gọọmenti na-ahụta ụgwọọnwa ndị ọrụ dịka ihe ọma a na-emere ha karịa ụgwọọrụ maka nrụsi ọrụ ike.
NLC gbara onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ume ka ọ hara ikwe ka ụfọdụ ndị gọvanọ na-ebughị ọdịmma Naịjirịa n’obi mee ya ka o chefuo ihe gbasara ụgwọọnwa obibi ndụ o kwere ndị ọrụ na nkwa.
Cheta na otu e hiwere maka iwepụta ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ kwupụtara puku naịra iri isii na abụọ (N62,000) dịka ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ebe ndị ọrụ gbara isi akwara sị na ha chọrọ narị puku naịra abụọ na iri ise (N250,000).









