Anwụchiela onye nwe ụlọ oriri maka ịtagbu otu nwaokorobịa n’ahụhụ n’Imo Steeti

Ebe foto si, IMO STATE POLICE
Ndị uweojii anwụchiela onye nwe ụlọ oriri ‘Our Guest House’ dị n’Umulogho n’okpuruọchịchị Obowo nke Imo Steeti bụ Maazị Ibe Obasi n’ihi ebubo igbu nwaokorobịa gbara afọ iri abụọ na ise maka izu ohi ekwentị.
Ibe Obasi gbara afọ iri atọ na asatọ bụ onye a na-ebo ebubo igbu Ebuka Udemba, onye Umuokpa dị n’okpuruọchịchị Obowo nke Imo Steeti.
N’oge BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye, ọ kọwara na nnyocha ndị uwojii mere gosiri na nwaokorobịa ahụ nwụrụ anwụ bụ onye akpọchiri n’imeụlọ igweọkụ ‘generator’ nke ụlọ oriri ‘Our Guest House’ bụ ebe anwụrụ ọkụ nọọrọ kugbuo ya.
Ọ gara n’ihu kwuo na “enyefeela nwaamadị ahụ a na-enyo enyo n’aka ngalaba ndị uweojii na-eme nnyocha banyere mpụ bụ ‘State Criminal Investigation Department (SCID)’ dị n’Owerri maka ime nnyocha miri emi n’okwu ahụ.’
O kwukwara na nwaadị ahụ enyela ndị uweojii ozi rijuru afọ nke ga-enyere ha aka inwuchi mmadụ ndị ọzọ aka ha dị n’okwu ahụ.
Okoye sịrị na kọmịshọna ndị uweojii n’Imo Steeti bụ Aboki Danjuma agwala osote onyeisi ya na-ahụ maka SCID ka o mee nnyocha rijuru afọ iji chọpụta ihe butere ọnwụ nwaokorobịa ahụ ma hụkwa na anwụchiri mmadụ niile aka ha dị n’ọnwụ ya.
N’ụbọchị Mọnde 8 Eprel 2024 ka anyị nwetara ozi na otu onye nwe ụlọ oriri jiiri anwụrụ ọkụ si n’igweọkụ 'generator' gbuo otu nwaokorobịa n’ihi ebubo izu ohi ekwentị.






