Etu otu nwada nọọsụ si nwụọ n’ụlọ enyi ya nwoke n’Imo steeti.

Otu onye nọọsụ aha ya bụ Ginikachukwu Judith Okoro anwụọla n’ụlọ enyi ya nwoke n’Owerri Imo steeti.
Ozi anyị nwetara na-ekwu na Gịnịkachukwu gbara afọ 23 bụụrụ onye nọọsụ n’ụlọọgwụ Edoziem Clinic dị n’Awaka okpuruọchịchị Owerri North nke Imo steeti tupu ọnwụ ya.
N’oge BBC Igbo garuru n’ezinaụlọ Gịnịkachukwu dị n’okporoụzọ Road Safety, Amawire Egbu n’okpuruọchịchị Owerri North nke Imo steeti, nne ya bụ Caroline Iheji kwuru na ọyị nwa ya nwaanyị bụ Charles Chidiebere Ndukwu jiiri ọsọ bịa n’ụlọ ya mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere 2 nke ime abalị gwa ya na nwa ya nwaanyị dara ma nwụọ.
Dịka o siri kwuo, oge ọ garuru n’ụlọọgwụ e bugara nwa ya, ọ chọpụtara ihe mmerụahụ dị iche iche n’ihu ya nakwa n’azụ isi ya.
O kwuru na mgbe a jụrụ ya etu nwa ya siri nweta ihe mmerụahụ ndị ahụ, Charles kwuru na ọ bụ n’ihi ihe o tiri ya mgbe ọ na-agba mbọ ịkpọlite ya.
Caroline Iheji kọwara na Charles Chidiebere Ndukwu, nwaafọ Nkwerre dị n’Imo steeti bụ onye ndị uweojii ji eji ugbua dịka ọ na-akpọ oku ikpe nkwụmọọtọ maka nwa ya nwaanyị nwụrụ anwụ.
Ka o siladị, n’oge onye ntaakụkọ BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye, ọ zaghị oku ekwenti ya.










