O nweghi mgbe m ji rituru Uzodimma - Samuel "Samdaddy" Anyanwu

Ebe foto si, Senator Samuel Nnaemeka Anyanwu/Facebook
Onye na-azọ ọkwa Gọvanọ n'Imo steeti n'aha otu PDP bụ Samuel Nnaemeka Anyanwu ekwuola na o nweghi mgbe o ji riruru Hope Uzodimma bụ Gọvanọ n'ịzọ ọkwa ahụ.
O kwuru na ihe onyonyo na-efegharị na-ekwu na o mere nke a bụ adigboroja.
N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Ikenna Onuoha wepụtara, ọ sị "anyị anụla ma hụ otu ihe onyonyo na-efegharị na soshal midi na-ekwu na Samuel Anyanwu a ma dịka Samdaddy akwụsịla ọsọ ịnweta oche Gọvanọ. Ihe onyonyo a bụ adigboroja bu okwu asị na-achọkwa ịkwahie uche ndị mmadụ ma bụrụkwa ihe enweghi isi ."
Ha tụkwara Gọvanọ Hope Uzodimma aka na ọ ma anya onyonyo ahụ na-efegharị ma na-ekwu na o si ya n'aka.
"I lee onyonyo ahụ anya ọfụma, ị ga ahụ na ọ bụ aghụghọ rụrụ ya arụ iji mee uche Hope Uzodimma" bụkwa ihe ọzọ ha kwuru.
O kwuru na Anyanwu kwụsị ike maka ntuliaka ahụ ga-eme n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba ma kwuo na o nweghi mgbe echiche ịwepu onwe ya n'ọsọ oche Gọvanọ ji bata ya uche.
Anyị na-agba mbọ ịnụrụ olu Hope Uzodimma nakwa otu ya bụ APC gbasara akụkọ a.













