Onye bụ Nwabueze Buchi George ICPC kwuru nọ n'isi ụlọọrụ adịgboroja ọhụrụ ha chọpụtara?

Ebe foto si, Made in Nigeria Project/ Facebook
Ụlọọrụ Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission (ICPC) kwuru na ha nyochapụtara ụlọọrụ ọzọ a na-enyo enyo na ọ bụ adịgboroja, nke ha kwuru na ọ nọ n'okpuru ụlọọrụ odeakwụkwọ gọọmentị Naịjirịa.
ICPC kwuru n'ụbọchị Fraịde na ụlọọrụ ahụ a kpọrọ 'National Brands Development and Made in Nigeria Special Project Office', bụ otu n'ime ụlọọrụ ndị a na-enyo enyo na ha na-arụ ọrụ n'enweghị ikike gọọmentị.
Onyeisi ICPC bụ Musa Adamu Aliyu, kwuru na onye a chọpụtara dị ka onye nọ n'isi ụlọọrụ ahụ bụ Nwabueze Buchi George. Ọ gbakwụnyere na Onyeisi ala Bola Tinubu nyere iwu ka ejide ya ozugbo, na ndị odeakwụkwọ atọ e kwuru na ha nwere njikọ na okwu ahụ.
George na nzaghachị ebubo ihiwe ụlọọrụ adịgboroja nke ụlọọrụ ICPC boro ya, o wepụtara akwụkwọ e jiri nye ya ọrụ ahụ n'akara linkdIn ya nke gosiri ya akwụkwọ iwe n'ọrụ ahụ si n'ụlọọrụ Odeakwụkwọ Gọọmentị Naịjirịa.
Kedu onye bụ Nwabueze Buchi George?

Ebe foto si, Hon. Buchi George Nwabueze/ Facebook
Dịka ozi anyị hụrụ nke e bipụtara n'ọtụtụ akara sọshal midia ya, Nwabueze Buchi George kwuru na a mụrụ ya n'ụbọchị iri abụọ na asaa n'ọnwa Ọgọst n'afọ 1974 n'Urualla dị n'okpuruọchịchị Ideato-North n'Imo Steeti.
Ọ kọwara onwe ya dị ka onye achụntaego, onye ndu na onye na-enyere ndị mmadụ aka.
N'ọtụtụ ozi o bipụtara n'akara sọshal midia na websaịtị (website) ọ kpọrọ 'Made in Nigeria', George na-egosi onwe ya dịka onye nchịkọta nke 'National Brands Development and Made in Nigeria Special Project Office'.
N'otu ozi dị na Facebook ya nke e bipụtara na Septemba 10, 2025, o kwuru na ọ bụ ya na-achịkwa ụlọọrụ ahụ, nke o kwuru na ọ bụ atụmatụ gọọmentị n'okpuru ụlọọrụ odeakwụkwọ gọọmentị Naịjirịa.
Ozi ahụ kọwara ebumnuche ọrụ ahụ dịka ịkwalite ngwaahịa na ọrụ ndị a na-emepụta na Naịjirịa.
A hụkwara na ọtụtụ akara sọshal midia ya ihe ngosi dị iche iche na-egosi ya na ndị nọ n'ọrụ gọọmentị Naịjirịa nakwa ụfọdụ ndị ọbịa si mba ọzọ.
Gịnị jikọrọ Gọọmentị Anambra na ụlọọrụ adịgboroja a?

Ebe foto si, Chiamaka Nnake
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Okwu a metụtara Anambra Steeti mgbe a kpọrọ Onye Odeakwụkwọ Gọọmentị ha bụ Chiamaka Nnake, dịka otu n'ime ndị nnọchite anya ụlọọrụ 'Made-in-Nigeria' ahụ.
Na nzaghachi ya n'ozi o wepụtara n'akara Facebook ya n'ụbọchị Sọnde, Nnake gọnahụrụ kpamkpam na ya na ụlọọrụ adịgboroja ahụ nwere ihe jikọrọ ha.
Ọ kwuru na n'ọnwa Jenụwarị nke afọ 2026, ụlọọrụ ahụ ziteere gọọmentị Anambra Steeti akwụkwọ ma rịọ ka steeti ahụ họpụta onye ga-anọchiteanya ha a kpọrọ 'State Focal Person'.
Ọ kọwara na Gọọmenti Anambra nabatara arịrịọ ahụ, ma họpụta ya n'ọnwa Febụwarị 2026 ka ọ bụrụ onye na-ahụ maka ọrụ ahụ n'Anambra.
O kwuru na ndị a họpụtara dị ka 'Focal Persons' site na steeti iri atọ na isii nọ n'otu WhatsApp, ebe ha na-ezirita ozi gbasara ọrụ ụlọọrụ ahụ.
Nnake gọnahụrụ njikọ ọzọ
Mana Nnake kwuru na ya amaghị, ya esoghịkwa na, ọrụ maọbụ ihe ọbụla ọzọ a na-ekwu na ụlọọrụ ahụ mere karịa mmekọrịta gọọmentị ahụ.
O kwuru na ụlọọrụ ahụ rịọrọ ka Anambra Steeti kwadoo ma ọgbakọ 'South-East Made-in-Nigeria Fair', nke gọọmentị steeti kwadoro.
Dịka o si kwuo, a malitela ịhazi ihe maka ọgbakọ ahụ, nke e kwesịrị ime n'Anambra site n'ụbọchị abụọ ruo ụbọchị ise nke ọnwa Disemba afọ 2026.
Nnake sịrị na ọ nweghị ihe ọzọ jikọrọ ya na ha karịa mmekọrịta gọọmentị a.
































